“E Nwere Ọnụ Ahịa A Zụtara Unu”
“E Nwere Ọnụ Ahịa A Zụtara Unu”
“E nwere ọnụ ahịa a zụtara unu. Hụnụ na unu na-enye Chineke otuto.”—1 Ndị Kọrint 6:20.
1, 2. (a) Dị ka Iwu Mozis si kwuo, olee otú a ga-esi emeso ndị Izrel bụ́ ohu ihe? (b) Nhọrọ dị aṅaa ka ohu hụrụ nna ya ukwu n’anya pụrụ ime?
AKWỤKWỌ bụ́ Holman Illustrated Bible Dictionary na-ekwu, sị: “Ịgba ohu juru ebe nile ma bụrụ ihe a nabatara ebe nile n’ụwa oge ochie.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ịgba ohu bụ ihe bụ́ isi nyere ndị Ijipt, Gris, na Rom ego. Na narị afọ mbụ nke Ndị Kraịst, otu onye n’ime mmadụ atọ ọ bụla nọ n’Ịtali na otu onye n’ime mmadụ ise ọ bụla n’ebe ndị ọzọ bụ ohu.”
2 Ọ bụ ezie na e nwekwara ndị ohu n’Izrel oge ochie, Iwu Mozis hụrụ na e chebere ndị ohu bụ́ ndị Hibru. Dị ka ihe atụ, Iwu ahụ kwuru na onye Izrel pụrụ ịgba ohu ruo ihe na-agafeghị afọ isii. N’afọ nke asaa, ọ “ga-apụ nwere onwe ya n’efu.” Ma iwu ndị na-achịkwa otú e si emeso ndị ohu ihe bụ nnọọ ndị ezi uche dị na ha na ndị na-egosi ọmịiko nke na Iwu Mozis mere ndokwa na-esonụ: “Ọ bụrụ na ohu ahụ asị n’ezie, Ahụrụ m onye nwe m na nwunye m na ụmụ m n’anya; m gaghị apụ nwere onwe m: onye nwe ya ga-emekwa ka ọ bịakwute Chineke nso, ọ ga-emekwa ka ọ bịaruo nso ọnụ ụzọ, ma ọ bụ nso awara ụzọ; onye nwe ya ga-ewere ahà hapuo ntị ya; ọ ga-abụkwa ohu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Ọpụpụ 21:2-6; Levitikọs 25:42, 43; Deuterọnọmi 15:12-18.
3. (a) Ụdị ịgba ohu dị aṅaa ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ nakweere? (b) Gịnị na-akpali anyị ijere Chineke ozi?
3 Ndokwa nke mmadụ iji aka ya họrọ ịbụ ohu bụ ihe atụ nke ụdị ohu ezi Ndị Kraịst na-agba. Dị ka ihe atụ, ndị so dee Bible bụ́ Pọl, Jems, Pita na Jud kọwara onwe ha dị ka ndị ohu Chineke na Kraịst. (Taịtọs 1:1; Jems 1:1; 2 Pita 1:1; Jud 1) Pọl chetaara ndị Tesalonaịka bụ́ Ndị Kraịst na ha ‘ahapụwo arụsị ha chigharịkwuru Chineke iji bụrụ ohu ezi Chineke dị ndụ.’ (1 Ndị Tesalonaịka 1:9) Gịnị kpaliri Ndị Kraịst ahụ iji ọchịchọ obi ha ghọọ ndị ohu Chineke? Ọ dị mma, gịnị kpaliri ndị Izrel ụfọdụ bụ́ ndị ohu ịjụ inwere onwe ha? Ọ́ bụghị ịhụnanya maka nna ha ukwu? Ịbụ ohu Ndị Kraịst dabeere n’ịhụnanya maka Chineke. Mgbe anyị bịara mara ma hụ ezi Chineke ahụ dị ndụ n’anya, a na-akpali anyị “iwere obi [anyị] nile na mkpụrụ obi [anyị] nile” na-ejere ya ozi. (Deuterọnọmi 10:12, 13) Otú ọ dị, gịnị ka ịghọ ohu Chineke na Kraịst na-agụnye? Olee otú nke a si emetụta ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị?
“Na-emenụ Ihe Nile Iji Nye Chineke Otuto”
4. Olee otú anyị si aghọ ndị ohu nke Chineke na Kraịst?
4 A kọwawo ohu dị ka “onye onye ọzọ ma ọ bụ ndị ọzọ nwe n’ụzọ iwu, ọ ghaghịkwa ime ihe ọ bụla onye nwe ya chọrọ ka o mee.” Anyị na-aghọ ndị Jehova nwe n’ụzọ iwu mgbe anyị raara ndụ anyị nye ya, e meekwa anyị baptizim. Pọl onyeozi na-akọwa, sị: “Ọ bụghị unu nwe onwe unu, n’ihi na e nwere ọnụ ahịa a zụtara unu.” (1 Ndị Kọrint 6:19, 20) N’ezie, ọnụ ahịa ahụ bụ àjà mgbapụta Jizọs Kraịst, ebe ọ bụ na dabere na ya Chineke na-anakwere anyị dị ka ndị ohu ya ma ànyị bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ma ànyị bụ ndị ibe ha nwere olileanya elu ala. (Ndị Efesọs 1:7; 2:13; Mkpughe 5:9) Ya mere, site n’oge e mere anyị baptizim, “anyị bụ nke Jehova.” (Ndị Rom 14:8) Ebe ọ bụ na e ji ọbara dị oké ọnụ ahịa nke Jizọs Kraịst zụta anyị, anyị na-aghọ ndị ohu ya, iwu jikwa anyị irubere ya isi.—1 Pita 1:18, 19.
5. Dị ka ndị ohu Jehova, olee ibu ọrụ bụ́ isi anyị nwere, oleekwa otú anyị pụrụ isi rụzuo ya?
5 Ndị ohu aghaghị irubere nna ha ukwu isi. Ịgba ohu anyị bụ nke anyị ji aka anyị họrọ, ọ Jọn nke Mbụ 5:3 na-ekwu, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu; ma ihe ndị o nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” Mgbe ahụzi, anyị irubere ya isi na-egosi na anyị hụrụ ya n’anya ma na-edo onwe anyị n’okpuru ya. Ọ na-apụta ìhè n’ihe nile anyị na-eme. Pọl kwuru, sị: “Ma unu na-eri ihe ma unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe nile iji nye Chineke otuto.” (1 Ndị Kọrint 10:31) Ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị, ọbụna n’obere ihe, anyị na-achọ igosi na anyị ‘bụ ndị ohu Jehova.’—Ndị Rom 12:11.
bụkwa ịhụnanya anyị nwere n’ebe Nna anyị Ukwu nọ na-akwali anyị.6. Olee otú anyị ịbụ ndị ohu Chineke si emetụta mkpebi anyị na-eme ná ndụ? Gosi ihe atụ nke a.
6 Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-eme mkpebi, anyị kwesịrị ịhụ na anyị na-eme ihe kwekọrọ n’uche Nna anyị Ukwu nke eluigwe, bụ́ Jehova. (Malakaị 1:6) Mkpebi ndị siri ike pụrụ itinye nrubeisi anyị n’ebe Chineke nọ n’ule. Mgbe ahụ, ànyị ga-agbaso ndụmọdụ ya kama ịgbaso ọchịchọ nke obi anyị “dị aghụghọ” na nke “na-adịghị nghọta”? (Jeremaịa 17:9) N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị Melisa, bụ́ Onye Kraịst na-alụbeghị di, baptizim, otu nwa okorobịa malitere inwe mmasị n’ebe ọ nọ. O yiri nnọọ ka ọ̀ bụ ezigbo mmadụ, ya na Ndịàmà Jehova anọwokwa na-amụ Bible. Otú ọ dị, otu okenye gwara Melisa banyere amamihe dị n’ịgbaso iwu Jehova bụ́ ịlụ “nanị n’ime onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39; 2 Ndị Kọrint 6:14) Melisa na-ekweta, sị: “Ọ dịghịrị m mfe ịgbaso ndụmọdụ a. Ma ekpebiri m na ebe ọ bụ na ararawo m onwe m nye Chineke ime uche ya, m ga-erubere iwu ya doro anya isi.” N’icheta ihe merenụ, ọ na-ekwu, sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ na m gbasoro ndụmọdụ ahụ. N’oge na-adịghị anya, nwoke ahụ kwụsịrị ịmụ ihe. A sị na m nọgidere ná mmekọrịta ahụ, agaarala m alụ onye na-ekweghị ekwe.”
7, 8. (a) N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji na-echegbubiga onwe anyị ókè banyere ime ihe ga-amasị ndị mmadụ? (b) Nye ihe atụ nke otú a pụrụ isi merie egwu mmadụ.
7 Dị ka ndị ohu Chineke, anyị agaghị abụ ndị ohu mmadụ. (1 Ndị Kọrint 7:23) N’eziokwu, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ ịgbapụ iche, ma anyị aghaghị iburu n’uche na Ndị Kraịst nwere ụkpụrụ ha na-agbaso bụ́ nke dị nnọọ iche na nke ụwa. Pọl jụrụ, sị: “M̀ na-achọ ime ihe na-amasị mmadụ?” Nkwubi okwu ya bụ: “Ya bụrụ na m ka na-eme ihe na-amasị mmadụ, agaghị m abụ ohu Kraịst.” (Ndị ) Anyị apụghị nnọọ ikwe ka nrụgide ndị ọgbọ mata anyị n’ọnyà, anyị ewee ghọọ ndị na-eme ihe na-amasị mmadụ. Gịnịzi ka anyị pụrụ ime mgbe nrụgide ndị ọgbọ na-achọ ịmata anyị n’ọnyà? Galeshia 1:10
8 Tụlee ihe banyere Elena, bụ́ Onye Kraịst na-eto eto nke nọ na Spen. Ọtụtụ ụmụ klas ya na-enye ndị ọzọ ọbara ha. Ha maara na Elena, dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, agaghị enye ọbara ya ma ọ bụ kwe ka a mịnye ya ọbara. Mgbe ohere iji kọwaara ụmụ klas ya ọnọdụ ya bilitere, Elena kwetara ikwu okwu banyere ya. Elena na-akọwa, sị: “N’ikwu eziokwu, ahụ́ erughị m ala ime ya. Ma akwadoro m nke ọma, ihe ndị si na ya pụta tụkwara m n’anya. Ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ibe m malitere ịkwanyere m ùgwù, onye nkụzi anyị gwakwara m na ya nwere mmasị n’ọrụ m na-arụ. Karịsịa, enwere m afọ ojuju na agbachiteere m aha Jehova ma nwee ike ịkọwa n’ụzọ doro anya ihe mere m ji mee mkpebi m nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ.” (Jenesis 9:3, 4; Ọrụ 15:28, 29) N’ezie, dị ka ndị ohu Chineke na nke Kraịst, anyị na-eguzopụ iche. Otú ọ dị, anyị pụrụ inweta nkwanye ùgwù nke ndị mmadụ ma ọ bụrụ na anyị na-adị njikere iji nkwanye ùgwù agbachitere nkwenkwe anyị.—1 Pita 3:15.
9. Gịnị ka anyị na-amụta site n’aka mmụọ ozi ahụ Jọn onyeozi hụrụ?
9 Icheta na anyị bụ ndị ohu Chineke pụkwara ime ka anyị dị umeala n’obi. N’otu oge, ọhụụ nke Jeruselem eluigwe kpaliri nnọọ Jọn onyeozi nke na ọ dara n’ala n’ụkwụ mmụọ ozi rụrụ ọrụ dị ka ọnụ na-ekwuru Chineke ma chọọ ịkpọrọ ya isiala. Mmụọ ozi ahụ gwara ya, sị: “Kpachara anya! Emela nke ahụ! Abụ m nanị ohu ibe gị na nke ụmụnna gị bụ́ ndị amụma na nke ndị na-edebe okwu nke akwụkwọ mpịakọta nke a. Kpọọ isiala nye Chineke.” (Mkpughe 22:8, 9) Lee ihe nlereanya magburu onwe ya mmụọ ozi ahụ setịpụụrụ ndị ohu Chineke nile! Ndị Kraịst ụfọdụ pụrụ inwe ibu ọrụ ndị pụrụ iche n’ọgbakọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-achọ ịbụ onye ukwu n’etiti unu aghaghị ịbụ onye na-ejere unu ozi, onye ọ bụla nke na-achọkwa ịbụ onye mbụ n’etiti unu aghaghị ịbụ ohu unu.” (Matiu 20:26, 27) Dị ka ụmụazụ Jizọs, anyị nile bụ ndị ohu.
“Ihe Anyị Meworo Bụ Ihe Anyị Kwesịrị Ime”
10. Nye ihe atụ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị na-egosi na ọ bụghị mgbe nile ka ọ dịịrị ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi mfe ime uche ya.
10 Ime uche Chineke adịghị adịrị ụmụ mmadụ na-ezughị okè mfe mgbe nile. Mozis onye amụma latụrụ azụ n’irube isi mgbe Jehova gwara ya ka ọ gaa kpọpụta ụmụ Izrel n’agbụ n’Ijipt. (Ọpụpụ 3:10, 11; 4:1, 10) Mgbe e nyere Jona ọrụ ịga kpọsaara ndị Ninive ozi amamikpe, o ‘biliri isi n’ihu Jehova gbalaga na Tashish.’ (Jona 1:2, 3) Beruk, bụ́ odeakwụkwọ Jeremaịa onye amụma, mere mkpesa na ike gwụrụ ya. (Jeremaịa 45:2, 3) Olee ihe anyị kwesịrị ime mgbe ọchịchọ anyị ma ọ bụ ihe ndị na-amasị anyị na-ekwekọghị n’uche Chineke? Ihe atụ Jizọs nyere zara ajụjụ a.
11, 12. (a) Kọọ ná mkpirikpi ihe atụ Jizọs e dekọrọ na Luk 17:7-10. (b) Olee ihe anyị na-amụta n’ihe atụ Jizọs?
11 Jizọs kwuru banyere ohu nke ji ụbọchị dum lekọta ìgwè atụrụ nna ya ukwu n’ọhịa. Mgbe ohu ahụ lọtara, ike agwụchaakwa ya n’ihi awa 12 o ji rụọ ọrụ ike, nna ya ukwu akpọghị ya ka ọ nọdụ ala ma rie nri anyasị a kwọrọ aka sie. Kama nke ahụ, nna ya ukwu sịrị ya: “Kwadebere m ihe ka m wee rie nri anyasị Luk 17:7-10.
m, yirikwa eprọn ma jeere m ozi ruo mgbe m risịworo ihe oriri ma ṅụsịakwa ihe ọṅụṅụ, e mesịakwa i nwere ike iri ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ.” Ohu ahụ pụrụ ilebara mkpa nke ya anya nanị mgbe o jesịịrị nna ya ukwu ozi. Jizọs mechiri ihe atụ ahụ site n’ịsị: “Ya mere, unu onwe unu kwa, mgbe unu meworo ihe nile e kenyere unu, kwuonụ, sị, ‘Anyị bụ ndị ohu na-abaghị uru ọ bụla. Ihe anyị meworo bụ ihe anyị kwesịrị ime.’”—12 Jizọs enyeghị ihe atụ a iji gosi na Jehova adịghị enwe ekele maka ihe anyị na-eme n’ozi ya. Bible kwuru n’ụzọ doro anya, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.” (Ndị Hibru 6:10) Kama, isi ihe dị n’ilu Jizọs bụ na ohu apụghị ịdị na-eme ihe na-amasị ya onwe ya ma ọ bụ ilekwasị anya n’ime ihe ndị ga-ewetara ya onwe ya ntụsara ahụ́. Mgbe anyị raara onwe anyị nye Chineke ma họrọ ịbụ ndị ohu ya, anyị na-ekweta ime ka uche ya butere nke anyị ụzọ. Anyị aghaghị ido uche nke anyị n’okpuru uche Chineke.
13, 14. (a) N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ime ihe megidere ọchịchọ anyị? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji kwere ka uche Chineke bute ụzọ?
13 Ịmụchi Okwu Chineke na akwụkwọ ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ebipụta anya pụrụ ịchọ mgbalị dị ukwuu n’aka anyị. (Matiu 24:45) Nke a pụrụ ịdị otú a karịsịa ma ọ bụrụ na ịgụ akwụkwọ na-esiri anyị ike ma ọ bụ ya abụrụ na akwụkwọ ahụ na-ekwu banyere “ihe ndị miri emi nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 2:10) Otú ọ dị, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iwepụta oge maka ọmụmụ ihe onwe onye? Anyị pụrụ ime ka ọ mara anyị ahụ́ ịnọdụ ọdụ ma jiri nwayọọ mụọ ihe. Ma, ọ bụrụ na anyị emeghị otú ahụ, olee otú anyị ga-esi malite inwe agụụ maka “nri siri ike [bụ́ nke] dịịrị ndị tozuru okè”?—Ndị Hibru 5:14.
14 Gịnị banyere oge ndị ike gwụchara anyị ka anyị rụsịrị ọrụ ụbọchị? Ọ pụrụ ịbụ na anyị aghaghị ịrụ ahụ́ anyị ụka iji gaa nzukọ Ndị Kraịst. Ọ pụkwara ịbụ na ikwusara ndị anyị na-amabughị ozi ọma ekwekọghị n’àgwà ebumpụta ụwa anyị. Pọl n’onwe ya ghọtara na a pụrụ inwe oge ndị anyị na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ụzọ ‘megidere ọchịchọ anyị.’ (1 Ndị Kọrint 9:17) Otú ọ dị, anyị na-eme ihe ndị a n’ihi na Jehova—Nna anyị Ukwu nke eluigwe, bụ́ onye anyị hụrụ n’anya—gwara anyị ka anyị mee ha. Ọ̀ bụ na anyị adịghị enwe afọ ojuju na ume ọhụrụ mgbe anyị tinyesịrị mgbalị n’ịmụ ihe, ịga nzukọ na ime nkwusa?—Abụ Ọma 1:1, 2; 122:1; 145:10-13.
Elela Anya “n’Ihe Ndị Dị n’Azụ”
15. Olee otú Jizọs si setịpụ ihe nlereanya nke ido onwe ya n’okpuru Chineke?
15 Jizọs Kraịst gosipụtara n’ụzọ na-enweghị atụ na ya na-edo onwe ya n’okpuru Nna ya nke eluigwe. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Esiwo m n’eluigwe bịa ime, ọ bụghị uche m, kama uche nke onye ahụ zitere m.” (Jọn 6:38) Mgbe ọ nọ ná nhụjuanya n’ogige Getsemeni, o kpere ekpere, sị: “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ka iko a gabiga m. Ma, ọ bụghị dị ka m si chọọ ya, kama dị ka i si chọọ.”—Matiu 26:39.
16, 17. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ihe ndị anyị hapụrụ ahapụ anya? (b) Gosi otú o si bụrụ na Pọl nwere echiche ziri ezi site n’iwere ihe ndị ọ gaara enweta n’ụwa dị ka “ihe mkpofu dị ukwuu.”
16 Jizọs Kraịst chọrọ ka anyị mee ihe kwekọrọ ná mkpebi anyị nke ịbụ ndị ohu Chineke. O kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke jideworo aka n’ọgụ ma na-ele anya n’ihe ndị dị n’azụ nke kwesịrị nnọọ ekwesị maka alaeze Chineke.” (Luk 9:62) Ịdị na-eche echiche banyere ihe ndị anyị hapụrụ abụtụghị ihe kwesịrị ekwesị ime mgbe anyị na-agbara Chineke ohu. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị iji ihe ndị anyị nwetaworo n’ihi ịhọrọ ịbụ ndị ohu Chineke kpọrọ ihe. Pọl degaara ndị Filipaị akwụkwọ, sị: “Ana m agụkwa ihe nile n’ezie dị ka mfu n’ihi abamuru na-enweghị atụ nke ihe ọmụma banyere Kraịst Jizọs Onyenwe m. N’ihi ya, ekwerewo m ka ihe nile funahụ m, ana m agụkwa ha dị ka ihe mkpofu dị ukwuu, ka m wee nweta Kraịst.”—Ndị Filipaị 3:8.
17 Cheedị echiche banyere ihe nile Pọl lere anya dị ka ihe mkpofu dị ukwuu ma hapụ ha Ọrụ 22:3; Ndị Galeshia 1:14) Simiọn ghọrọ onye ndú ndị Farisii ma kere òkè pụtara ìhè ná nnupụisi ndị Juu megide Rom na 66-70 O.A.—n’agbanyeghị na ọ nabatachaghị nnupụisi ahụ. Ọ nwụrụ n’ọgba aghara ahụ, ma ọ́ bụghị ndị Juu na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè gburu ya, ya abụrụ ndị agha Rom.
n’ihi ụgwọ ọrụ ime mmụọ ọ ga-enweta dị ka ohu Chineke. Ihe ọ hapụrụ abụghị nanị ntụsara ahụ́ nke ọ gaara enweta n’ụwa kamakwa atụmanya nke ịghọ onye ndú okpukpe ndị Juu n’ọdịnihu. A sị na Pọl nọgidere n’okpukpe ndị Juu, ma eleghị anya, ọ gaara arịgoru n’ọkwá yiri nke Simiọn, bụ́ nwa onye nkụzi Pọl, bụ́ Gameliel. (18. Nye ihe atụ iji gosi otú ihe ndị a rụzuru n’ụzọ ime mmụọ si eweta ụgwọ ọrụ.
18 Ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova agbasowo ihe nlereanya Pọl. Jean na-ekwu, sị: “Afọ ole na ole ka m gụsịrị akwụkwọ, enwetara m ọrụ dị ka odeakwụkwọ ukwu nke otu ọkàiwu a ma ama na London. Ọrụ m tọrọ m ụtọ, a na-akwụkwa m ezigbo ụgwọ, ma n’ime obi m, amaara m na m pụrụ ijere Jehova ozi n’ụzọ ka zuo ezuo. N’ikpeazụ, agbara m arụkwaghị m ma malite ịsụ ụzọ. Obi dị m nnọọ ụtọ na m mere mkpebi ahụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 20 gara aga! Ozi oge nile m enyewo m ọṅụ ọ na-adịghị ọrụ odeakwụkwọ ọ bụla pụrụ inye m ya. Ọ dịghị ihe na-enye afọ ojuju karịa ịhụ otú Okwu Jehova pụrụ isi gbanwee ndụ mmadụ. Ọ bụ ihe magburu onwe ya ikere òkè na ya. Ihe anyị na-enye Jehova adịghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ihe anyị na-enweta n’aka ya.”
19. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime, n’ihi gịnịkwa?
19 Ọnọdụ anyị pụrụ ịgbanwe ka oge na-aga. Ma, nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke adịghị agbanwe agbanwe. Anyị ka bụ ndị ohu Jehova, ọ na-enyekwa anyị ohere iji aka anyị kpebie ụzọ kasị mma anyị pụrụ isi jiri oge, ike, nkà na ihe ndị ọzọ anyị nwere mee ihe. N’ihi ya, mkpebi ndị anyị na-eme n’akụkụ a pụrụ igosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ. Ha na-egosikwa ókè anyị dịruru njikere ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà. (Matiu 6:33) N’agbanyeghị ọnọdụ anyị, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ikpebisi ike inye Jehova ihe kasị mma anyị nwere? Pọl dere, sị: “Ọ bụrụ na ịdị njikere ahụ bu ụzọ dịrị, a na-anara ya nke ọma karịsịa dị ka ihe mmadụ nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe mmadụ na-enweghị si dị.”—2 Ndị Kọrint 8:12.
“Unu Na-enweta Mkpụrụ Unu”
20, 21. (a) Olee mkpụrụ ndị ohu Chineke na-amịpụta? (b) Olee otú Jehova na-esi akwụghachi ndị nile na-enye ya ihe kasị mma ha nwere ụgwọ?
20 Ịbụ ndị ohu Chineke abụghị mmegbu. Kama nke ahụ, ọ na-echebe anyị pụọ n’ụdị ịgba ohu tara akpụ bụ́ nke na-anapụ anyị obi ụtọ anyị. Pọl dere, sị: “N’ihi na e mere ka unu nwere onwe unu pụọ ná mmehie, ma ghọọ ndị ohu nke Chineke, unu na-enweta mkpụrụ unu n’ihe banyere ịdị nsọ, njedebe ya ga-abụkwa ndụ ebighị ebi.” (Ndị Rom 6:22) Anyị ịgbara Chineke ohu na-amịpụta mkpụrụ n’ihe banyere ịdị nsọ n’echiche bụ́ na anyị na-enweta abamuru nke omume dị nsọ ma ọ bụ nke dị ọcha. Ọzọkwa, ọ ga-eduga ná ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.
21 Jehova na-emesapụrụ ndị ohu ya aka. Mgbe anyị mere ike anyị nile n’ozi ya, ọ na-emeghere anyị “windo nile nke eluigwe” ma wụkwasị anyị “ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.” (Malakaị 3:10) Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ ịnọgide na-abụ ndị ohu Jehova ruo mgbe nile ebighị ebi!
Ị̀ Na-echeta?
• N’ihi gịnị ka anyị ji aghọ ndị ohu Chineke?
• Olee otú anyị si egosipụta na anyị na-edo onwe anyị n’okpuru uche Chineke?
• Gịnị mere anyị ji kwesị ịdị njikere ime ka uche Jehova butere nke anyị ụzọ?
• N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji ‘na-ele anya n’ihe ndị dị n’azụ?’
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 16, 17]
Ndokwa nke mmadụ iji aka ya họrọ ịbụ ohu n’Izrel bụ ihe atụ nke ụdị ohu Ndị Kraịst na-agba
[Foto dị na peeji nke 17]
Anyị na-aghọ ndị ohu Chineke mgbe e mere anyị baptizim
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
Ndị Kraịst na-ebute ime uche Chineke ụzọ
[Foto dị na peeji nke 18]
Mozis lara azụ n’ịnakwere ọrụ e nyere ya