Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Omume A Ga-echeta

Ihe Omume A Ga-echeta

Ihe Omume A Ga-echeta

OLEE ihe omume a na-ekwu okwu ya? Ọ bụ ọnwụ nke otu nwoke nke nwụrụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga. O kwuru, sị: “M na-atọgbọ mkpụrụ obi m, ka m wee nweta ya ọzọ. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla napụworo m ya, kama m na-atọgbọ ya n’onwe m.” (Jọn 10:17, 18) Nwoke ahụ bụ Jizọs Kraịst.

Jizọs nyere ụmụazụ ya ntụziaka ka ha na-eme Ememe Ncheta nke ọnwụ ịchụàjà ya. A na-akpọ ememe ahụ “nri anyasị nke Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 11:20) Ndịàmà Jehova na ndị enyi ha ga-eme Ememe Ncheta Jizọs hiwere iji na-echeta ọnwụ ya na Thursday, March 24, 2005, mgbe anyanwụ dasịrị.

Okwu dabeere na Bible a ga-ekwu ga-akọwa ihe achịcha ahụ na-ekoghị eko na mmanya na-acha ọbara ọbara bụ́ ndị a na-eji eme ememe ahụ pụtara. (Matiu 26:26-28) Okwu ahụ ga-azakwa ajụjụ ndị dị ka ndị a: Ugboro ole ka Ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-eme ememe a? Olee ndị ruru eru iri ihe nnọchianya ndị ahụ bụ́ achịcha na mmanya? Olee ndị ga-erite uru site n’ọnwụ Jizọs? Ememe a pụrụ iche ga-enyere mmadụ nile aka ịghọta ihe mere Jizọs ji bie ndụ n’ụwa ma nwụọ.

A ga-eji obi ụtọ nabata gị n’Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs. Biko jụọ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị kpọmkwem oge na ebe a ga-enwe nzukọ a.