Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Samuel nke Mbụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Samuel nke Mbụ

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Samuel nke Mbụ

Ọ BỤ n’afọ 1117 T.O.A. Ihe dị ka narị afọ atọ agafeela kemgbe Jọshụa merisịrị ndị bi n’Ala Nkwa ahụ. Ndị okenye Izrel abịakwute onye amụma Jehova ịrịọ ya otu arịrịọ dị ịrịba ama. Onye amụma ahụ ejiri okwu ahụ gakwuru Jehova n’ekpere, Jehova ekwekwa ka ha mee ihe ha chọrọ. Nke a kara akara njedebe nke oge Ndị Ikpe na mmalite nke oge ndị eze bụ́ mmadụ. Akwụkwọ Bible bụ́ Samuel nke Mbụ na-akọ banyere ihe ndị na-akpali akpali mere n’oge ahụ e nwere mgbanwe n’akụkọ ihe mere eme nke mba Izrel.

N’ịbụ nke Samuel, Netan na Gad dere, akwụkwọ Samuel nke Mbụ na-akọ banyere ihe omume ndị were otu narị afọ na afọ abụọ—site na 1180 ruo 1078 T.O.A. (1 Ihe E Mere 29:29) Ọ bụ akụkọ banyere ndị ndú Izrel anọ. Abụọ jere ozi dị ka ndị ikpe, abụọ dị ka ndị eze; abụọ rubeere Jehova isi, abụọ erubereghị ya isi. Anyị ga-amatakwa ụmụ nwanyị abụọ àgwà ha kwesịrị nṅomi na otu dike nwere obi ike ma dị nwayọọ. Ihe atụ ndị dị otú ahụ na-akụziri anyị ihe ndị bara uru banyere àgwà na omume ndị anyị kwesịrị iṅomi na ndị anyị kwesịrị izere. Ya mere, ihe ndị dị na Samuel nke Mbụ pụrụ ịkpa ike n’echiche na n’omume anyị.—Ndị Hibru 4:12.

SAMUEL ANỌCHIE ANYA ILAỊ DỊ KA ONYEIKPE

(1 Samuel 1:1–7:17)

Oge eruola maka Ememe nke Nchịkọta Ihe, obi dịkwa Hana, bụ́ onye bi na Rema, ụtọ nke ukwuu. * Jehova azala ekpere ya, ọ mụọkwala nwa nwoke. Iji mezuo nkwa ya, Hana enyefee nwa ya nwoke bụ́ Samuel ije ozi “n’ụlọ Jehova.” N’ebe ahụ, nwata ahụ aghọọ onye “na-ejere Jehova ozi n’ihu Ilaị, bụ́ onye nchụàjà.” (1 Samuel 1:24; 2:11) Mgbe Samuel ka bụ nwata, Jehova agwa ya okwu, na-ekwupụta amamikpe megide ụlọ Ilaị. Ka Samuel nọ na-eto, ndị Izrel nile abịa mara ya dị ka onye amụma Jehova.

Ka oge na-aga, ndị Filistia abịa ịlụso Izrel ọgụ. Ha eburu Igbe Ọgbụgba Ndụ ahụ ma gbuo ụmụ Ilaị abụọ. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ahụ, Ilaị merela agadi anwụọ, ka o ‘kpesịrị Izrel ikpe ruo iri afọ anọ.’ (1 Samuel 4:18) Igbe Ọgbụgba Ndụ ahụ ewetara ndị Filistia ọdachi, n’ihi ya, ha ebughachiri ya ndị Izrel. Samuel ekpewezie Izrel ikpe, udo adịkwa n’ala ahụ.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:10—Gịnị mere Hana ji kpee ekpere ka Jehova ‘nye eze Ya ike’ ebe a na-enweghị eze bụ́ mmadụ nke na-achị Izrel? E buru amụma n’Iwu Mozis na ndị Izrel ga-enwe onye eze bụ́ mmadụ. (Deuterọnọmi 17:14-18) N’amụma Jekọb buru mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ, o kwuru, sị: “Mkpanaka eze [ihe na-anọchi anya ikike eze] agaghị esi n’ebe Juda nọ wezụga onwe ya.” (Jenesis 49:10) Ọzọkwa, Jehova kwuru banyere Sera—nne ochie nke ndị Izrel—sị: “Ndị eze nke ndị dị iche iche ga-esite na ya dị.” (Jenesis 17:16) Ya mere, Hana nọ na-ekpe ekpere maka eze a ga-enwe n’ọdịnihu.

3:3—Samuel ò dinara ala n’ezie n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile? Ee e, o meghị otú ahụ. Samuel bụ onye Livaị nke sitere n’ezinụlọ ndị Kohat na-abụghị ndị nchụàjà. (1 Ihe E Mere 6:33-38) N’ihi ya, o nweghị ike ‘ịbata ịhụ ebe nsọ ahụ.’ (Ọnụ Ọgụgụ 4:17-20) Nanị akụkụ ebe nsọ ahụ nke Samuel nwere ike ịba bụ ogige ụlọikwuu ahụ. Ọ ga-abụrịrị ebe ahụ ka o dinara ala. Ihe àmà na-egosikwa na Ilaị dinara ala n’otu akụkụ nke ogige ahụ. Ihe àmà na-egosi na ahịrịokwu ahụ bụ́ “ebe igbe Chineke dị” na-ezo aka n’ebe ụlọikwuu ahụ dị.

7:7-9, 17—Gịnị mere Samuel ji chụọ àjà na Mizpa ma guzobe ebe ịchụàjà na Rema ebe ọ bụ na e kwesịrị ịdị na-achụ àjà mgbe nile nanị n’ebe Jehova họpụtara? (Deuterọnọmi 12:4-7, 13, 14; Joshua 22:19) Mgbe e bupụsịrị Igbe nsọ ahụ n’ụlọikwuu dị na Shaịlo, Jehova anọghịzi ebe ahụ. Ya mere, dị ka onye nnọchianya Chineke, Samuel chụrụ àjà na Mizpa ma guzobekwa ebe ịchụàjà na Rema. Ihe àmà na-egosi na Jehova kwadoro ihe omume ndị a.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

1:11, 12, 21-23; 2:19. Àgwà ikpe ekpere Hana, ịdị umeala n’obi ya, ekele o nwere maka obiọma Jehova na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide dị ka nne, bụ ihe nlereanya nye ndị inyom nile na-atụ egwu Chineke.

1:8. Lee ihe nlereanya Elkena setịpụrụ n’iji okwu ọnụ ewusi ndị ọzọ ike! (Job 16:5) O buru ụzọ jiri obi ọcha jụọ Hana bụ́ onye nọ ná mwute, sị: “N’ihi gịnị ka obi gị jọrọ njọ?” Nke a gbara ya ume ịgwa Elkena nchegbu ya. Mgbe ahụ Elkena mesiri ya obi ike na ya hụrụ ya n’anya, na-asị: “Mụ onwe m àdịghị mma n’ebe ị nọ karịa ụmụ ndị ikom iri?”

2:26; 3:5-8, 15, 19. Site n’iji ịdị uchu na-arụ ọrụ Chineke nyere anyị, site n’iji ọzụzụ ime mmụọ anyị nwetara na-eme ihe, na site n’ịsọpụrụ ndị ọzọ ma na-akwanyere ha ùgwù, anyị na-aghọ ndị “dị mma” ma n’ebe Chineke nọ ma n’ebe ụmụ mmadụ nọ.

4:3, 4, 10. Ọbụna ihe dị nsọ dị ka igbe ọgbụgba ndụ ahụ arụghị ọrụ dị ka ọtụmọkpọ maka nchebe. Anyị aghaghị ‘iche onwe anyị nche pụọ n’arụsị.’—1 Jọn 5:21.

EZE MBỤ NKE IZREL—Ò NWERE IHE ỊGA NKE ỌMA KA Ọ̀ KỤRỤ AFỌ N’ALA?

(1 Samuel 8:1–15:35)

Samuel kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova ná ndụ ya nile, ma ụmụ ya adịghị eje ije n’ụzọ Chineke. Mgbe ndị okenye nke Izrel rịọrọ maka eze bụ́ mmadụ, Jehova anabata arịrịọ ha. Samuel agbasoo ntụziaka Jehova ma tee Sọl, bụ́ onye Benjamin mara mma, mmanụ ịbụ eze. Sọl emee ka e nwekwuo obi ike n’ebe ọ nọ dị ka eze site n’imeri ụmụ Amọn.

Ọkpara Sọl bụ́ Jonatan, bụ́ nwoke dị ike, emerie usuu ndị agha Filistia. Usuu ndị agha bara ụba nke ndị Filistia abịa ịlụso Izrel agha. Sọl atụọ ụjọ ma jiri nnupụisi chụọ àjà nsure ọkụ n’onwe ya. N’ịkpọrọ nanị onye na-eburu ya ihe agha, Jonatan nwere obi ike awakpo ìgwè ndị agha ọzọ nke Filistia. Otú ọ dị, iyi Sọl gbara n’echeghị echiche emee ka a ghara inwecha mmeri. Sọl wee “buo agha megide ndị iro ya nile gburugburu.” (1 Samuel 14:47) Otú ọ dị, mgbe o merisịrị ndị Amalek, ya enupụrụ Jehova isi site n’ịghara ibibi ihe ndị “e wezụgara ka e bibie.” (Levitikọs 27:28, 29) N’ihi ya, Jehova ajụ Sọl dị ka eze.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

9:9—Olee ihe dị ịrịba ama banyere okwu ahụ bụ́ “onye a na-akpọ Onye amụma taa, a na-akpọ ya Onye ọhụ ụzọ na mgbe gara aga”? Okwu ndị ahụ pụrụ igosi na ka ndị amụma na-amụbawanye n’oge Samuel nakwa n’oge ndị eze n’Izrel, a bịara jiri okwu ahụ bụ́ “onye amụma” dochie anya okwu bụ́ “onye ọhụ ụzọ.” E weere Samuel dị ka onye mbụ n’usoro ndị amụma.—Ọrụ 3:24.

14:24-32, 44, 45—Chineke ò wesara Jonatan iwe n’ihi ịracha mmanụ aṅụ n’imebi iyi Sọl gbara? Omume a eyighị ka ò mere ka Chineke wesa Jonatan iwe. Nke mbụ, Jonatan amaghị banyere iyi nna ya gbara. Ọzọkwa, iyi ahụ, nke ihe mere e ji gbaa ya bụ ịnụ ọkụ n’obi hiere ụzọ ma ọ bụ inwe echiche na-ezighị ezi banyere ikike onye eze, kpataara ndị mmadụ nsogbu. Olee otú Chineke ga-esi kwado iyi dị otú ahụ? Ọ bụ ezie na Jonatan dị njikere ịnara ihe ndị ga-esi n’imebi iyi ahụ pụta, e chebere ndụ ya.

15:6—Olee ihe mere Sọl ji mesoo ndị Kena ihe n’ụzọ pụrụ iche? Ndị Kena bụ ụmụnne nwunye Mozis. Ha nyeere ndị Izrel aka mgbe ha si n’Ugwu Saịnaị kwapụ. (Ọnụ Ọgụgụ 10:29-32) N’ala Kenan, ndị Kena binyeere ụmụ Juda ruo oge ụfọdụ. (Ndị Ikpe 1:16) Ọ bụ ezie na ha mechara biri n’etiti ndị Amalek na n’etiti ọtụtụ ndị ọzọ, ndị Kena nọgidere bụrụ ndị enyi Izrel. N’ihi ya, e nwere ezi ihe mere Sọl ji chebe ndị Kena.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

9:21; 10:22, 27. Ọmụma Sọl maara ebe ikike ya ruru na obi umeala ọ dị mgbe ọ malitere ịbụ eze gbochiri ya ime omume n’echeghị echiche mgbe “ndị [ụfọdụ] jọgburu onwe ha” na-anabataghị ọbụbụeze ya. Lee ka àgwà dị otú ahụ si mee ka o zere ime ihe iberibe!

12:20, 21. Ekwela ka ‘ihe ndị tọgbọrọ n’efu,’ dị ka ịtụkwasị mmadụ obi, ịtụkwasị ike agha nke mba obi, ma ọ bụ ikpere arụsị, mee ka ị kwụsị ijere Jehova ozi.

12:24. Isi ihe na-eme ka anyị nọgide na-atụ Jehova egwu nsọpụrụ ma jiri obi anyị dum na-ejere ya ozi bụ ịhụ ‘ihe ukwu O mewooro’ ndị ya ma n’oge ochie ma n’oge a.

13:10-14; 15:22-25, 30. Nọrọ na nche megide ibuli onwe onye elu—ma è gosipụtara ya n’omume nnupụisi ma ọ bụ n’omume mpako.—Ilu 11:2.

A HỌRỌ NWA OKORO NA-AZỤ ATỤRỤ ỊBỤ EZE

(1 Samuel 16:1–31:13)

Samuel etee Devid nke ebo Juda mmanụ ịbụ eze n’ọdịnihu. Obere oge ka nke ahụ gasịrị, Devid ejiri otu obere nkume gbuo dike ndị Filistia bụ́ Golaịat. Devid na Jonatan aghọọ ezigbo enyi. Sọl emee Devid onyeisi ndị agha ya. Ndị inyom Izrel abụọ abụ n’ihi ọtụtụ mmeri ndị Devid nwere, sị: “Sọl etigbuwo ndị iro ya, [ọtụtụ puku ndị ikom, ọtụtụ puku ndị ikom], Devid kwa ndị iro ya, [ọtụtụ iri puku ndị ikom, ọtụtụ iri puku ndị ikom].” (1 Samuel 18:7) N’ihi oké anyaụfụ, Sọl achọọ igbu Devid. Mgbe Sọl nwachara igbu ya ugboro atọ, Devid agbalaga ma ghọọ onye na-agba ọsọ ndụ.

N’afọ ndị a ọ nọ n’ọsọ, Devid ahapụ igbu Sọl ugboro abụọ o nwere ohere ime otú ahụ. Ya ezutekwa ma mesịa lụọ Abigail bụ́ nwanyị mara mma. Mgbe ndị Filistia bịara ịlụso Izrel agha, Sọl ajụọ Jehova ase. Ma Jehova ahapụla ya. Samuel anwụọla. N’amaghị ihe ọ ga-eme, Sọl agakwuru onye na-ajụ ndị mmụọ ihe, a gwakwa ya na ọ ga-anwụ n’agha ahụ ọ na-aga ịlụso ndị Filistia. N’agha ahụ, e merụọ Sọl ahụ́ nke ukwuu, e gbuokwa ụmụ ya. Akụkọ ahụ agwụ mgbe Sọl nwụrụ dị ka onye e meriri emeri. Devid aka na-ezogharị.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

16:14—Olee mmụọ ọjọọ mere ka Sọl tụọ egwu nke ukwuu? Mmụọ ọjọọ nke mere ka Sọl ghara inwe obi iru ala bụ ọchịchọ ọjọọ dị ya n’obi—ọchịchọ ya ime ihe ọjọọ. Mgbe Jehova wepụrụ mmụọ nsọ ya, Sọl enweghịzi nchebe ya, mmụọ ọjọọ nke Sọl n’onwe ya chịkwawakwara ya. Ebe ọ bụ na Chineke kwere ka mmụọ ahụ nọchie anya mmụọ nsọ Ya, a kpọrọ mmụọ ọjọọ a ‘mmụọ ọjọọ si n’ebe Jehova nọ.’

17:55-58—N’ihi ihe e dere na 1 Samuel 16:17-23, gịnị mere Sọl ji jụọ onye mụrụ Devid? Ajụjụ Sọl abụghị nanị iji mata aha nna Devid. O yikarịrị ka ọ̀ chọrọ ịmata ụdị onye mụrụ nwata mere ihe ahụ tụrụ onye ọ bụla n’anya, bụ́ igbu dike.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

16:6, 7. Kama ịbụ ndị ọdịdị elu ahụ́ nke ndị ọzọ na-adọrọ mmasị ha ma ọ bụ ndị na-ekpe ndị ọzọ ikpe n’echeghị echiche, anyị kwesịrị ịgbalị ịdị na-ele ha anya dị ka Jehova si ele ha.

17:47-50. Anyị nwere ike iji obi ike chee mmegide ma ọ bụ mkpagbu sitere n’aka ndị iro yiri Golaịat ihu n’ihi na ọ bụ “Jehova nwe agha nke a.”

18:1, 3; 20:41, 42. A pụrụ ịchọta ezi ndị enyi n’etiti ndị hụrụ Jehova n’anya.

21:12, 13. Jehova na-atụ anyị anya n’aka ịdị na-eji ọgụgụ isi na nkà anyị emeri ihe isi ike nke ndụ. O nyela anyị Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee, bụ́ nke na-eme ka anyị nwee uche, ihe ọmụma na ikike iche echiche. (Ilu 1:4) Anyị nwekwara enyemaka nke ndị okenye a họpụtara ahọpụta.

24:6; 26:11. Lee ihe nlereanya magburu onwe ya nke ịkwanyere onye Jehova tere mmanụ ùgwù nke Devid setịpụrụ!

25:23-33. Ezi uche Abigail kwesịrị nṅomi.

28:8-19. Ná mgbalị ha iduhie ma ọ bụ imerụ ndị mmadụ ahụ́, ndị mmụọ ọjọọ nwere ike ime ka à ga-asị na ha bụ mmadụ ụfọdụ nwụrụ anwụ. Anyị kwesịrị izere ụdị nile nke mgbaasị.—Deuterọnọmi 18:10-12.

30:23, 24. Mkpebi a, nke dabeere n’Ọnụ Ọgụgụ 31:27, na-egosi na Jehova na-eji ndị na-arụ ọrụ nkwado n’ọgbakọ akpọrọ ihe. Ya mere, ihe ọ bụla anyị na-eme, ka anyị jiri “mkpụrụ obi dum na-arụ ya dị ka ọ bụ nye Jehova, ọ bụghịkwa nye ndị mmadụ.”—Ndị Kọlọsi 3:23.

Olee Ihe “Dị Mma Karịa Ịchụ Àjà”?

Olee eziokwu bụ́ isi ahụmahụ Ilaị, Samuel, Sọl na Devid mere ka ọ pụta ìhè? Ọ bụ nke a: “Ige ntị dị mma karịa ịchụ àjà, ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebulu. N’ihi na mmehie nke ịjụ ase n’aka ndị mmụọ ka nnupụisi bụ, ikpere arụsị na terafim ka isi ike bụkwa.”—1 Samuel 15:22, 23.

Lee ihe ùgwù anyị nwere ikere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ zuru ụwa ọnụ! Ka anyị na-achụrụ Jehova àjà “egbugbere ọnụ anyị, dị ka oké ehi,” anyị aghaghị ime ihe nile anyị nwere ike ime iji na-erubere nduzi ọ na-enye site n’Okwu ya e dere ede na nzukọ elu ala ya isi.—Hosea 14:2; Ndị Hibru 13:15.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Iji mara ebe ebe dị iche iche a kpọtụrụ aha n’akwụkwọ Samuel nke Mbụ dị, lee peeji nke 18-19 nke broshuọ bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ,’ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 23]

Eze mbụ nke Izrel gbanwere site n’ịbụ onye ọchịchị dị umeala n’obi nke maara ebe ike ya ruru gaa n’ịbụ eze dị mpako na nke na-amaghị ebe ike ya ruru

[Foto dị na peeji nke 24]

Gịnị ka anyị kwesịrị ijide n’aka mgbe ndị iro yiri Golaịat na-emegide anyị?