Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmetụta Jizọs Na-enwe n’Ụwa Dum

Mmetụta Jizọs Na-enwe n’Ụwa Dum

Mmetụta Jizọs Na-enwe n’Ụwa Dum

“Ọ PỤRỤ ịbụ na Jizọs kwuru ihe nile oziọma anọ ahụ sịrị na o kwuru, ma ndị o kwuru na nzuzo ma ndị o kwuru n’ihu ọha, n’awa abụọ,” ka onye nsụgharị Bible bụ́ Edgar Goodspeed kwuru. “N’agbanyeghị nke ahụ, ozizi ndị ahụ na-akpali nnọọ akpali ma na-eru n’obi nke na a pụrụ nnọọ ikwu na o nwebeghị onye ọzọ metụtara ụwa n’ụzọ siri ike otú ahụ.”

Mgbe Jizọs Kraịst gazuru ozi elu ala ya n’afọ 33 O.A., ụmụazụ ya dị ọ dịkarịa ala ihe dị ka otu narị ndị nwoke na ndị nwanyị na iri abụọ n’ọnụ ọgụgụ. (Ọrụ 1:15) Taa, ihe karịrị ijeri mmadụ abụọ na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst. Ọtụtụ narị nde mmadụ ndị ọzọ na-ewere Jizọs dị ka onye amụma. N’ezie, ozizi ya enweela mmetụta dị nnọọ ukwuu n’ahụ́ ihe a kpọrọ mmadụ.

Ọbụna ndị ndú na-abụghị Ndị Kraịst ekwetawo na Jizọs nwere mmetụta n’ahụ́ ndị mmadụ n’ụwa dum. Dị ka ihe atụ, onye Juu bụ́ rabaị bụ́ Hyman Enelow dere, sị: “Jizọs aghọọla onye a kasị mara amara, onye a kasị mụọ banyere ya, onye kasị nwee mmetụta n’ahụ́ ndị mmadụ n’akụkọ ihe mere eme nke okpukpe nke ihe a kpọrọ mmadụ.” Enelow kwukwara, sị: “Ònye ga-ekwuli otú mmetụta Jizọs nweworo n’ahụ́ ụmụ mmadụ hà? Ịhụnanya o meworo ka e nwee, nkasi obi o nyeworo, ihe ọma ndị o meworo, olileanya na ọṅụ o meworo ka e nwee—ọ dịbeghị onye ruru ya n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. N’ime ndị ukwu na ndị omepụrụ onye ọ dịịrị nile e nwetụrụla n’agbụrụ mmadụ, o nwedịghị nke bịara Jizọs nso mgbe a bịara n’ebe ihe ndị o mere gbasaruru na otú ha metụtaruru ndị mmadụ. Ọ ghọọla onye kasị adọrọ mmasị n’akụkọ ihe mere eme.” Onye ndú ndị Hindu bụ́ Mohandas K. Gandhi kwukwara, sị: “O nweghị onye m maara meerela ụmụ mmadụ ihe karịrị nke Jizọs meere ha. N’ikwu eziokwu, Iso Ụzọ Kraịst agbaghị ọrụ n’ụzọ ọ bụla.” Otú ọ dị, ọ gbakwụnyere, sị: “Ndị nwere nsogbu bụ unu bụ́ Ndị Kraịst. Unu anatụdịghị ebi ndụ kwekọrọ n’ozizi unu.”

Ọ dịla anya a maara Krisendọm maka ibi ndụ na-ekwekọghị n’ozizi Jizọs. Onye na-akọ banyere Iso Ụzọ Kraịst, bụ́ Cecil John Cadoux, kwuru na “kemgbe . . . 140 A.D., ndị ndú Ndị Kraịst amatala” na “ọnụ ọgụgụ mmadụ nọgidere na-amụba nke nta nke nta na Chọọchị ahụ dum ejichaghịzi omume ọma kpọrọ ihe.” O kwuru, sị: “Ndalata a nke ụkpụrụ omume ha ndị dịbu elu ga-eme nnọọ ka ọ dịkwuoro ha mfe ịmalite ibi ndụ dị ka ndị ụwa.”

Nke a biiri ọkụ na narị afọ nke anọ, mgbe Eze Ukwu Constantine nke Rom batara n’Iso Ụzọ Kraịst. Cadoux dere, sị: “Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme achọpụtala nnọọ, mgbe ụfọdụkwa, kwaa arịrị banyere nnukwu ihe ọjọọ Chọọchị ahụ mere site n’iso Constantinus mekọọ ihe.” Na narị afọ ndị gafeworonụ kemgbe ahụ, ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst emeela ọtụtụ omume ndị jọgburu onwe ha bụ́ ndị na-emebi aha Kraịst.

Mgbe ahụ, ajụjụ ndị anyị kwesịrị ichebara echiche bụ: Gịnị ka Jizọs kụziri n’ezie? Oleekwa mmetụta ozizi ya kwesịrị inwe n’ahụ́ anyị?

[Foto dị na peeji nke 3]

“O nweghị onye m maara meerela ụmụ mmadụ ihe karịrị nke Jizọs meere ha.”—Mohandas K. Gandhi

[Foto dị na peeji nke 3]

“O nwebeghị onye ọzọ metụtara ụwa n’ụzọ siri ike otú ahụ.”—Edgar Goodspeed

[Ebe E Si Nweta Foto]

Culver Pictures