Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-eto Eto Bụ́ Ndị Na-eto Jehova Na-eme Ka Ndụ Ha Ka Mma

Ndị Na-eto Eto Bụ́ Ndị Na-eto Jehova Na-eme Ka Ndụ Ha Ka Mma

“Inyeaka M Na-esi n’Aka Jehova Bịa”

Ndị Na-eto Eto Bụ́ Ndị Na-eto Jehova Na-eme Ka Ndụ Ha Ka Mma

“ACHỌRỌ M inweta ihe ndị kasị mma ná ndụ!” Ọ bụ otú ahụ ka otu nwa okoro dị afọ iri na ụma si kọwaa ihe ndị ọ na-atụ anya ha. Ma olee otú onye na-eto eto pụrụ isi nweta ihe ndị kasị mma ná ndụ? Bible na-enye azịza doro anya: “Buru Onye Okike gị n’uche mgbe ị ka na-eto eto!”—Eklisiastis 12:1, Contemporary English Version.

Ọ bụghị nanị ndị toworo eto na-eto Jehova ma na-ejere ya ozi. Samuel, nwa Elkena na Hana, ka dị obere mgbe o jeere Jehova ozi n’ụlọikwuu. (1 Samuel 1:19, 20, 24; 2:11) Otu nwa agbọghọ nta bụ́ onye Hibru gosipụtara okwukwe zuru ezu na Jehova mgbe ọ tụrụ aro ka onyeisi usuu ndị agha Siria bụ́ Neeman gakwuru Ịlaịsha onye amụma ka e wee gwọọ ya ekpenta. (2 Ndị Eze 5:2, 3) N’Abụ Ọma 148:7, 12, e nyere ma ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọ iwu ito Jehova. * Mgbe Jizọs dị nanị afọ 12, o nwere mmasị miri emi n’ozi Nna ya. (Luk 2:41-49) N’ihi ọzụzụ ha nwetara site n’Akwụkwọ Nsọ, ụfọdụ ụmụ okoro ndị hụrụ Jizọs n’ụlọ nsọ tiri mkpu, sị: “Biko, zọpụta Nwa Devid!”—Matiu 21:15, 16.

Ito Jehova Taa

Taa, ọtụtụ ndị ntorobịa n’etiti Ndịàmà Jehova na-eji nkwenkwe ha akpa nganga ma jiri obi ike na-agwa ndị ọzọ banyere ha n’ụlọ akwụkwọ na n’ebe ndị ọzọ. Tụlee ihe atụ abụọ.

Na Britain, ụmụ klas Stephanie, bụ́ onye dị afọ iri na asatọ, na-ekwurịta banyere nsikwopụ afọ ime na ihe ndị ọzọ metụtara omume ndị a na-anakwere na ndị a na-adịghị anakwere. Onye nkụzi ha kwuru hoo haa na a na-anakwerezi nsikwopụ afọ ime n’ebe nile, nakwa na ọ dịghị nwa agbọghọ nwere ihe mere ọ ga-eji jụ ya. Mgbe ndị klas ahụ nile nakweere ihe onye nkụzi ahụ kwuru, Stephanie chere na ya kwesịrị ikwupụta ihe o kweere bụ́ nke dabeere na Bible. Ohere iji mee otú ahụ pụtara mgbe onye nkụzi ahụ jụrụ Stephanie ihe bụ́ echiche ya. Ọ bụ ezie na ụjọ ji ya na mbụ, Stephanie ji ohere ahụ kọwaa ihe bụ́ echiche Akwụkwọ Nsọ. O kwuru ihe dị n’Ọpụpụ 21:22-24 ma kọwaa na ọ bụrụ na ọ dị njọ imerụ nwa nọ n’afọ ahụ́, o doro anya na isikwopụ afọ ime ga-emegidekwa uche Chineke.

Onye nkụzi ahụ, nke bụ́ onye ụkọchukwu, agụtụbeghị amaokwu ndị a. Àmà Stephanie ji obi ike gbaa mere ka ya na ụmụ klas ya nwee ọtụtụ nkwurịta okwu ndị dị mma n’isiokwu dị iche iche. Ugbu a, otu nwa agbọghọ ya na ya nọ na klas na-ewere Ụlọ Nche na Teta! ndị kasị ọhụrụ mgbe mgbe, abụọ ndị ọzọ gara otu mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova ịhụ mgbe a ga-eme Stephanie baptizim ná ngosipụta nke nrara ọ raara onwe ya nye Chineke.

Vareta dị afọ isii nke bi na Suriname, n’Ebe Ndịda America, jiri ohere o nwetara too Chineke mgbe nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ dị onye nkụzi ya mkpa. Mgbe onye nkụzi ahụ maliteghachiri ịbịa ụlọ akwụkwọ ka ọ ghasịrị ụlọ akwụkwọ ruo ụbọchị atọ, ọ jụrụ ụmụ akwụkwọ ya ma hà maara ihe mere ya jiri ghara ịbịa ụlọ akwụkwọ. Ha zara ya, sị, “Ọ dị ka ị̀ rịara ọrịa.” Onye nkụzi ahụ zaghachiri, sị: “Ọ bụghị ya, nwanne m nwanyị nwụrụ, obi adịghịkwa m mma. Ya mere, unu ga-anọ jii.”

N’ehihie ahụ, ka mama ya nọ na-ehi ụra, Vareta nọ nnọọ na-asapesị magazin ndị metụrụla ochie, na-agụ isiokwu ha. Ọ chọtara Ụlọ Nche July 15, 2001, nke isiokwu ya bụ “À Na-adị Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?” O ji ịnụ ọkụ n’obi kpọtee mama ya ma kwuo, sị, “Mama, Mama, lee! Achọtala m magazin na-ekwu banyere ọnwụ nke m ga-enye onye nkụzi m!” E wegaara onye nkụzi ahụ magazin ahụ tinyere akwụkwọ ozi Vareta dere. O dere, sị: “Nke a bụ nnọọ maka gị. Na Paradaịs, ị ga-ahụ nwanne gị nwanyị ọzọ n’ihi na Jehova adịghị agha ụgha. O kwela nkwa na ya ga-eweta paradaịs, ọ bụghị n’eluigwe, kama n’ụwa.” Onye nkụzi ahụ gosipụtara ekele miri emi o nwere maka nkasi obi ahụ dabeere na Bible nke isiokwu ndị ahụ nyere ya.

Ime Atụmatụ Maka Ọdịnihu

Jehova bụ “Chineke onye obi ụtọ,” ọ chọkwara ka ndị na-eto eto nwee obi ụtọ. (1 Timoti 1:11) Okwu ya na-ekwu, sị: “Nwee obi ụtọ n’onye ntorobịa ị bụ. Nwee obi ụtọ mgbe ị ka na-eto eto.” (Eklisiastis 11:9, Today’s English Version) Jehova na-ahụ ihe ga-eme n’ọdịnihu ma na-aghọta ihe ndị ga-esi ma n’omume ọma ma na nke ọjọọ pụta. Ọ bụ ya mere Okwu ya ji agba ndị ntorobịa ume, na-asị: “Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa, mgbe ụbọchị ihe ọjọọ aka-abịaghị, na mgbe afọ aka-abịarughị nso, mgbe ị ga-asị, Ha atọghị m ụtọ.”—Eklisiastis 12:1.

Ee, Jehova chọrọ ka ndị ntorobịa nụ ụtọ onyinye dị oké ọnụ ahịa nke ndụ ruo n’isi. Site n’icheta na ito Chineke, ndị na-eto eto pụrụ ibi ndụ na-eju afọ, nke na-akwụghachi ụgwọ. Ọbụna mgbe ha na-eche ihe ịma aka dị iche iche ihu, ha pụrụ iji obi ike kwuo, sị: “Inyeaka m na-esi n’aka Jehova bịa.”—Abụ Ọma 121:2.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Lee 2005 Calendar of Jehovah’s Witnesses, March/April.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

“Toonụ Jehova site n’ụwa, unu . . . ụmụ okorobịa [na] ụmụ agbọghọ.”—ABỤ ỌMA 148:7, 12

[Igbe dị na peeji nke 8]

JEHOVA NA-AKWADO NDỊ NA-ETO ETO

“Gị onwe gị bụ olileanya m, Onyenwe anyị Jehova: Gị bụ ntụkwasị obi m site na nwata.”—Abụ Ọma 71:5.

“[Chineke] na-ewere ezi ihe mee ka afọ ju ọnụ gị; ịdị na nwata gị ewee mee onwe ya ka ọ dị ọhụrụ dị ka ugo.”—Abụ Ọma 103:5.