Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu “Pim” Agbaa Akaebe na Bible Kwekọrọ n’Akụkọ Ihe Mere Eme

Otu “Pim” Agbaa Akaebe na Bible Kwekọrọ n’Akụkọ Ihe Mere Eme

Otu “Pim” Agbaa Akaebe na Bible Kwekọrọ n’Akụkọ Ihe Mere Eme

OKWU ahụ bụ́ “pim” pụtara nanị otu ugboro n’ihe odide Hibru mbụ nke Bible. N’oge ọchịchị Eze Sọl, ọ bụ ndị ọkpụ ụzụ Filistia na-amụrụ ndị Izrel ngwá ọrụ ha ndị e ji ígwè kpụọ. Bible na-ekwu, sị: “[“Ụgwọ a na-akwụ iji mụọ ihe ndị ahụ bụ otu pim,” NW] mma ogè na nke ndụdụ ịrụ ọrụ ubi na nke anyụike wee ghara ịdị nkọ; na ịkpụ ọnụ ndụdụ e ji achụ ehi.”—1 Samuel 13:21.

Gịnị bụ pim? E nwetaghị azịza nke ajụjụ a ruo 1907 O.A., bụ́ mgbe e gwupụtara nkume ihe ọ̀tụ̀tụ̀ pim mbụ n’obodo oge ochie bụ́ Giza. O siiri ndị nsụgharị Bible oge mbụ ike ịsụgharị okwu ahụ bụ́ “pim.” Dị ka ihe atụ, Bible Nsọ nke Union Version sụgharịrị 1 Samuel 13:21 ịbụ: “Ọnụ ọ́gụ̀ na nke mma ogè na nke ndụdụ ịrụ ọrụ ubi na nke anyụike wee ghara ịdị nkọ; na ịkpụ ọnụ ndụdụ e ji achụ ehi.”

Ndị ọkà mmụta nke oge a maara na pim bụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ fọrọ nke nta ka o ruo gram asatọ, ma ọ bụ ihe dị ka ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke otu shekel, bụ́ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bụ́ isi nke ndị Hibru. Otu pim nke mpekere ọlaọcha bụ ọnụ ahịa ndị Filistia na-ana ndị Izrel iji mụọrọ ha ngwá ọrụ ha. A kwụsịrị iji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ shekel eme ihe mgbe e bibiri alaeze Juda na isi obodo ya, bụ́ Jeruselem, na 607 T.O.A. Ya mere, olee otú ihe ọ̀tụ̀tụ̀ pim si agba akaebe na ihe odide Hibru ahụ kwekọrọ n’akụkọ ihe mere eme?

Ụfọdụ ndị ọkà ihe ọmụma na-arụ ụka na e dere Akwụkwọ Nsọ Hibru, gụnyere akwụkwọ Samuel nke Mbụ, n’agbata oge ndị Gris na ndị Rom na-achị, ụfọdụ na-asịdị na e dere ya n’agbata narị afọ nke abụọ na nke mbụ T.O.A. N’ihi ya, a na-azọrọ na “o . . . ‘kwekọghị n’akụkọ ihe mere eme,’ na ọ baghị uru iji ya akọwa ihe mere ‘n’oge Bible’ ma ọ bụ ‘n’Izrel oge ochie,’ bụ́cha ihe ndị Juu na Ndị Kraịst na-ede akwụkwọ chepụtara nnọọ n’oge a.”

Otú ọ dị, n’izo aka n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ pim a kpọtụrụ aha na 1 Samuel 13:21, William G. Dever, bụ́ prọfesọ nke nkà mmụta ihe ochie na nkà mmụta banyere ịdị adị mmadụ na Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, na-ekwu, sị: “[Ọ] pụtụghị ịbụ ihe ndị edemede dịrị ndụ n’agbata oge ndị Gris na ndị Rom na-achị ‘chepụtara’ bụ́ mgbe a na-adịghịzi eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị a eme ihe, bụ́kwa mgbe ndị mmadụ chefuworo ha. N’ezie, a ghọtaghị akụkụ Bible a . . . ruo na narị afọ nke 20 A.D., bụ́ mgbe mbụ e gwupụtara ihe e dere okwu Hibru ahụ bụ́ pîm n’ahụ́ ya.” Prọfesọ ahụ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na akụkọ Bible bụcha ‘ihe ndị edemede chepụtara’ n’agbata oge ndị Gris na ndị Rom na-achị, oleezi otú akụkọ a si dịrị na Bible Hibru? N’ezie, mmadụ pụrụ ikwu na ihe ahụ e kwuru banyere pîm bụ ‘nanị obere ihe.’ Nke ahụ bụ eziokwu; ma dị ka a maara nke ọma, ‘ọ bụ obere ihe na-emejupụta akụkọ ihe mere eme.’”

[Foto dị na peeji nke 29]

Otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ pim bụ ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke otu shekel