Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Samsin Enwee Mmeri n’Ike Jehova!

Samsin Enwee Mmeri n’Ike Jehova!

Samsin Enwee Mmeri n’Ike Jehova!

NDỊ chọrọ imegwara ya ihe o mere ha jidere ya, rụkpọsịa ya anya ma nye ya ọrụ ahụhụ. Ha sizi n’ụlọ mkpọrọ kpọbata ya n’ụlọ nsọ ndị ọgọ mmụọ ka o mee ìgwè mmadụ ihe ọchị. Ha kpụgharịrị ya n’ihu ọtụtụ puku mmadụ ma jiri ya mee ihe ọchị. Onye mkpọrọ ahụ abụghị omempụ nke o ji abụ onyeisi agha ndị iro. Ọ bụ onye na-efe Jehova nke rụworo ọrụ dị ka onyeikpe n’Izrel ruo afọ 20.

Olee otú Samsin—nwoke kasị nwee ike ọkpụkpụ aka nke dịworo ndụ—si banye n’ọnọdụ mweda n’ala dị otú ahụ? Ike ya na-enweghị atụ ọ̀ ga-azọpụta ya? Olee ebe ike Samsin si? Olee ihe anyị pụrụ ịmụta n’akụkọ ndụ ya ma ọ bụrụ na ọ dị?

Ọ “Ga-amalitekwa Ịzọpụta Izrel”

E jiri ịgbahapụ ezi ofufe mara ndị Izrel. N’ihi ya, mgbe ha ‘mere ihe ọjọọ n’anya Jehova ọzọ, Jehova nyere ha n’aka ndị Filistia ruo iri afọ anọ.’—Ndị Ikpe 13:1.

Akụkọ banyere Samsin malitere mgbe mmụọ ozi Jehova mere ka nwunye onye Izrel aha ya bụ Manoa nke bụ́ nwanyị aga hụ ya anya ma gwa ya na ọ ga-amụta nwa nwoke. Mmụọ ozi ahụ nyere ya ntụziaka, sị: “Agụba agaghị aga n’elu isi ya: n’ihi na onye Naziraịt nke Chineke ka nwata ahụ ga-abụ site n’afọ: ya onwe ya ga-amalitekwa ịzọpụta Izrel n’aka ndị Filistia.” (Ndị Ikpe 13:2-5) Tupu a tụrụ ime Samsin, Jehova kpebiri na Samsin ga-enwe ọrụ a kapịrị ọnụ. Site n’ụbọchị a mụrụ ya, ọ ga-abụ onye Naziraịt—onye e doro iche maka ụdị ozi dị nsọ pụrụ iche.

O “Ziri Ezi n’Anya M”

Ka Samsin nọgidere na-eto, “Jehova wee gọzie ya.” (Ndị Ikpe 13:24) Otu ụbọchị, Samsin bịakwutere nne ya na nna ya ma sị ha: “Ahụwo m otu nwanyị n’ime Timna sitere n’ụmụ ndị inyom ndị Filistia: ma ugbu a, lụtara m ya na nwunye.” (Ndị Ikpe 14:2) Lee otú nke ahụ na-aghaghị isiwo ju ha anya. Kama ịnapụta Izrel n’aka ndị na-emegbu ha, nwa ha nwoke chọrọ ịghọ ọgọ ha. Ịlụ nwanyị na-efe arụsị megidere Iwu Chineke. (Ọpụpụ 34:11-16) N’ihi ya, ndị mụrụ ya jụrụ, na-asị ya: “Ọ́ dịghị nwanyị dị n’etiti ụmụ ndị inyom ụmụnne gị, ma ọ bụ n’etiti ndị m nile, na gị onwe gị na-eje ịlụrụ nwunye sitere ná ndị Filistia, bụ́ ndị a na-ebighị úgwù?” Ma, Samsin siri ọnwụ, na-asị: “Lụtara m ya; n’ihi na ya onwe ya ziri ezi n’anya m.”—Ndị Ikpe 14:3.

N’ụzọ dị aṅaa ka nwanyị Filistia a “ziri ezi” nye Samsin? Ọ bụghị n’ụdị na ọ “mara mma, na-adọrọ adọrọ,” ka Cyclopedia nke McClintock na Strong dere na-enye echiche ya, “kama nke ahụ, o ziri ezi n’inyere ya aka imezu otu nzube, ma ọ bụ ebumnobi.” Nzube dị aṅaa? Ndị Ikpe 14:4 na-akọwa na Samsin ‘na-achọ ụzọ ọ ga-esi megide ndị Filistia.’ Ọ bụ nzube ahụ ka Samsin ji nwee mmasị na nwanyị ahụ. Ka Samsin na-etoru ogo mmadụ, “mmụọ nke Jehova wee malite ịkwali obi ya,” ma ọ bụ ịkpali ya ime ihe. (Ndị Ikpe 13:25) Ya mere, ọ bụ mmụọ Jehova kpaliri Samsin ịrịọ ka a lụtara ya ụdị nwunye ahụ ọ rịọrọ ka a lụtara ya, ọ bụkwa mmụọ ahụ chịkwara ndụ ya dum dị ka onyeikpe Izrel. Samsin ò nwetara ohere ahụ ọ na-achọ? Ka anyị buru ụzọ hụ otú Jehova si mesie ya obi ike na ya nọnyeere ya.

Samsin nọ na-aga n’obodo ndị na-aga ịghọ ndị ọgọ ya, bụ́ Timna. Akwụkwọ Nsọ na-akọ, sị: “Ha wee bịaruo ubi vaịn Timna: ma, lee, nwa ọdụm tozuru etozu na-agbọ ụja izute ya. Mmụọ nke Jehova wee dakwasị ya n’ike, o wee dọwaa ya.” Ngosipụta a dị ịrịba ama nke ike weere ọnọdụ mgbe Samsin nọ nanị ya. O nweghị onye ọzọ hụrụ ihe merenụ. Nke a ọ̀ bụ ụzọ Jehova si gosi Samsin na dị ka onye Naziraịt, o nwere ike ịrụzu ọrụ Chineke nyere ya? Bible ekwughị, ma o doro anya na Samsin ghọtara na ike ahụ dị ịrịba ama esighị ya n’aka. Ọ ghaghị isitewo n’aka Chineke. Ọ pụrụ ịdabere na Jehova inyere ya aka n’ọrụ chere ya ihu. N’ịbụ onye ọdụm ahụ o gburu mere ka obi sie ike, Samsin “wee rịdaa, gwa nwanyị ahụ okwu; o ziri ezi n’anya [ya].”—Ndị Ikpe 14:5-7.

Mgbe Samsin mesịrị gaa ikuru nwanyị ahụ, ‘o wezụgara onwe ya ịhụ ozu ọdụm ahụ: ma, lee, ìgwè aṅụ dị n’ozu ọdụm ahụ, na mmanụ aṅụ.’ Mgbe ọ hụrụ nke a, Samsin ji ya luoro ndị ikom Filistia 30 na-enyere ya aka n’ụbọchị agbamakwụkwọ ya ilu, sị: “N’ahụ́ onye na-eri eri ka ihe oriri si pụta, n’ahụ́ ihe dị ike ka ihe ụtọ si pụtakwa.” Ọ bụrụ na ha akọta ilu ya, Samsin ga-enye ha ákwà ọcha na mgbanwe uwe 30. Ọ bụrụ na ha akọtaghị ya, ha ga-enye ya otu ihe ahụ. Ilu ahụ gbagwojuru ndị Filistia anya ruo ụbọchị atọ. N’ụbọchị nke anọ, ha malitere iyi nwanyị ahụ egwu. Ha gwara ya, sị: “Raa di gị ọnụ ka o wee gosi anyị ilu ahụ, ka anyị wee ghara isure gị na ụlọ nna gị n’ọkụ.” Lee ka ha si dị obi ọjọọ! Ọ bụrụ na ndị Filistia mesoro ndị nke ha otú a, chezienụ ọnọdụ ndị Izrel ha na-emegbu ga-anọ na ya!—Ndị Ikpe 14:8-15.

Nwanyị ahụ ụjọ ji rụgidere Samsin ịgwa ya azịza ya. N’igosi na ọ hụghị Samsin n’anya, nakwa na o guzosighị ike n’ihe nye ya, ọ kọọrọ ya ndị ikom ahụ na-enyere Samsin aka n’egbughị oge. Ha kọtara ilu ahụ, Samsin makwa ihe kpatara ya. Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na unu ejighị nwa agbọghọ ehi m dọọ ihe e ji egwu ala ubi, unu agaghị achọtaworị ilu m.” Samsin nwetaziri ohere ọ nọworo na-achọ. “Mmụọ nke Jehova wee dakwasị ya n’ike, o wee rịdaruo Ashkelọn, tigbuo [iri ndị ikom atọ] n’etiti ha, chịrị ihe ha ọ lụtara, nye ndị gosiworo ilu ahụ uwe mgbanwe.”—Ndị Ikpe 14:18, 19.

Ọ̀ bụ ọchịchọ imegwara ihe e mere ya kpaliri Samsin ime ihe o mere n’Ashkelọn? Ee e. Nke ahụ bụ ihe Chineke ji onye nnapụta ọ họọrọ mee. Site n’aka Samsin, Jehova malitere ịlụso ndị ji obi ọjọọ na-emegbu ndị ya ọgụ. Ọgụ ahụ ga-aga n’ihu. Ohere ọzọ dapụtara mgbe Samsin bịara ileta nwunye ya.

Agha Otu Onye

Mgbe ọ bịaghachiri Timna, Samsin chọpụtara na ọgọ ya nwoke enyewo onye ọzọ nwunye ya n’ihi na o chere na Samsin ahụghịzi nwanyị ahụ n’anya. Iwe were Samsin. O jidere narị nkịta ọhịa atọ, kekọta ọdụ ha abụọ abụọ ma kenyechaa ha ọwa ndị ọ mụnyere ọkụ. Mgbe ọ tọhapụrụ ha, ha mụnyere ọkụ n’ubi, ubi ọka na ubi oliv, si otú ahụ bibie ụdị àkụ̀kụ̀ atọ bụ́ isi ndị Filistia kụrụ n’afọ ahụ. Ndị Filistia ahụ iwe ji gosipụtara obi ọjọọ ha. Ha weere ya na ọ bụ nwunye Samsin na nna ya ka ụta dịịrị maka ihe ahụ merenụ, ha kpọkwara ha ọkụ. Mmegwara ahụ ha ji obi ọjọọ megwara nyere Samsin ohere ọ na-achọ. Ya onwe ya tigburu ha ntigbu ukwu.—Ndị Ikpe 15:1-8.

Ndị Izrel hà ghọtara na Jehova Chineke na-agọzi Samsin, n’ihi ya, tinyere ya aka ịkwụsị ọchịchị mmegbu ndị Filistia? N’ebeekwanụ. Iji zere nsogbu, ndị Juda dunyere puku mmadụ atọ ije jide onye ndú Chineke họpụtara ma kpụgara ya ndị iro ya. Otú ọ dị, omume eguzosighị ike n’ihe nke ndị Izrel a nyere Samsin ohere igbukwu ndị iro ya. Ka a na-achọ inyefe ya n’aka ndị Filistia, “mmụọ nke Jehova wee dakwasị ya n’ike, ụdọ abụọ nke dị n’ogwe aka ya abụọ wee dị ka flax nke reworo n’ọkụ, agbụ ya nile wee gbazepụ n’aka ya abụọ.” Ọ tụtụziiri ọkpụkpụ agbà ịnyịnya ibu ma tigbuo otu puku ndị iro ya.—Ndị Ikpe 15:10-15.

Samsin kpọkuru Jehova, sị: “Gị onwe gị esiwo n’aka ohu gị nye nzọpụta ukwu a: ma ugbu a m̀ ga-anwụ n’akpịrị ịkpọ nkụ, daba n’aka ndị a a na-ebighị úgwù?” Jehova nụrụ ekpere Samsin ma zaa ya. “Chineke wee gbawaa olulu ahụ nke dị n’ime . . . , mmiri wee si n’ime ya pụta; o wee ṅụọ, mmụọ ya wee bịaghachi, o wee dị ndụ.”—Ndị Ikpe 15:18, 19.

Samsin ji mkpebi siri ike chụsoo ihe mgbaru ọsọ ya, nke bụ́ ịlụso ndị Filistia ọgụ. Ihe mere o jiri nọọ n’ụlọ otu nwanyị na-akwa iko na Geza bụ iji lụsoo ndị iro Chineke ọgụ. Samsin chọrọ ebe ọ ga-ehi n’abalị ahụ n’obodo ndị iro ya, ebe ọ pụkwara ịchọta ya bụ n’ụlọ nwanyị na-akwa iko. Samsin ebughị ihe ọ bụla rụrụ arụ n’obi. Ọ hapụrụ ụlọ nwanyị ahụ n’etiti abalị, jide ibo ọnụ ụzọ obodo ahụ, jidekwa ide ya abụọ, ma buru ha rịgoro n’elu ugwu dị nso na Hibrọn, nke dị ihe dị ka kilomita 60 site n’ebe ahụ. Chineke kwadoro ihe a o mere, ọ bụkwa Ya nyere ya ike ime ya.—Ndị Ikpe 16:1-3.

Otú mmụọ nsọ si rụọ ọrụ n’ahụ́ Samsin pụrụ iche n’ihi ọnọdụ pụrụ iche e nwere mgbe ahụ. Ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi taa pụrụ ịdabere n’otu mmụọ ahụ inye ha ike. Jizọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na Jehova ‘ga-enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.’—Luk 11:13.

N’ihi Gịnị Ka Jehova Ji ‘Si n’Ebe Samsin Nọ Wezụga Onwe Ya’?

Samsin mesịrị nwee mmasị n’ahụ́ otu nwanyị aha ya bụ Delaịla. Ndị isi ise nke Filistia chọsiri nnọọ ike ibibi Samsin nke na ha chọrọ enyemaka Delaịla. Ha gakwuuru Delaịla ma sị ya: “Raa ya ọnụ, hụ ihe ọ bụ, bụ́ nke ike ukwu ya dị n’ime ya, na ihe anyị ga-eji pụọ imegide ya.” Dị ka ihe iri ngo, nke ọ bụla n’ime ndị isi ise ahụ kwere nkwa inye ya “[otu puku na otu narị mkpụrụ ọlaọcha].”—Ndị Ikpe 16:4, 5.

Ọ bụrụ na mkpụrụ ọlaọcha ndị ahụ bụ shekel, puku shekel ise na narị ise bụ nnọọ ihe buru ibu inye mmadụ dị ka ihe iri ngo. Ebreham ji narị shekel anọ zụtara nwunye ya ebe ili ozu, a na-erekwa ohu shekel iri atọ. (Jenesis 23:14-20; Ọpụpụ 21:32) Eziokwu ahụ bụ́ na ndị isi ahụ—ndị na-achị obodo ise nke Filistia—chọrọ iji anyaukwu Delaịla enweta ya kama ịbụ nguzosi ike ya nye ndị ya na-enye echiche na ọ bụ onye Izrel. Otú o sina dị, Delaịla nabatara atụmatụ ahụ.

Ugboro atọ, Samsin nyere Delaịla azịza na-ezighị ezi nye ajụjụ ya, ugboro atọ ahụkwa ka ọ gbara Samsin mgba okpuru site n’ịnwa inyefe ya n’aka ndị iro ya. Ma ‘Delaịla sogburu ya nke na mkpụrụ obi ya enweghịzi ntachi obi ruo ọnwụ.’ Samsin mesịrị gwa ya eziokwu—a kpụtụbeghị ya isi. Ọ bụrụ na a kpụọ ya isi, ọ gaghị adịkwa ike, ọ ga-adịkwa ka onye ọ bụla ọzọ.—Ndị Ikpe 16:6-17.

Nke ahụ bụ ihe gburu Samsin. Delaịla ghọrọ ya aghụghọ iji hụ na a kpụrụ ya isi. Otú ọ dị, ọ bụghị n’ezie ná ntutu Samsin ka ike ya dị. Nanị ihe ntutu ya bụ bụ ihe nnọchianya nke mmekọrịta pụrụ iche ya na Chineke nwere dị ka onye Naziraịt. Mgbe Samsin tinyere onwe ya n’ọnọdụ metụtara ịbụ onye Naziraịt ya site n’isi ahụ a kpụrụ ya, ‘Jehova si n’ebe ọ nọ wezụga Onwe ya.’ Ndị Filistia jideziri Samsin, rụkpọsịa ya anya ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ.—Ndị Ikpe 16:18-21.

Lee ihe dị mkpa nke a na-akụziri anyị! Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iji mmekọrịta anyị na Jehova kpọrọ ihe, na-ele ya anya dị ka ihe dị nnọọ oké ọnụ ahịa? Ọ bụrụ na anyị esi n’ụzọ ọ bụla mee ihe megidere nraranye anyị dị ka Ndị Kraịst, olee otú anyị pụrụ tụọ anya na Chineke ga-anọgide na-agọzi anyị?

“Ka Mụ Onwe M Soro Ndị Filistia Nwụọ”

Ndị Filistia ahụ aṅụrị juru obi kelere chi ha bụ́ Degọn maka mmeri ahụ ha meriri Samsin. Iji mee ememe mmeri ahụ, ha dugara onye ahụ ha dọtara n’agha n’ụlọ nsọ Degọn. Ma Samsin maara ihe bụ́ isi tinyere ya ná nsogbu. Ọ maara ihe mere Jehova jiworo si n’ebe ọ nọ wezụga onwe ya, o chegharịkwara site ná mmejọ a. Ka ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, ntutu ya malitere irute. Ugbu a ọ nọ n’ihu ọtụtụ nde ndị Filistia, gịnị ka ọ ga-eme?

Samsin kpere ekpere, sị: “Onyenwe anyị Jehova, biko, cheta, biko, Chineke, meekwa m ka m dị ike nanị otu ugboro a, ka m bọọkwara onwe m ọ́bọ̀ otu mgbe n’ahụ́ ndị Filistia n’ihi anya m abụọ.” Mgbe ahụ, o bigidere aka ná mgbidi abụọ dị n’etiti ụlọ ahụ “wee were ike hulata onwe ya.” Gịnị meziri? “Ụlọ ahụ wee dakwasị ndị isi ahụ, dakwasịkwa ndị nile nọ n’ime ya. Ndị nwụrụ anwụ ndị o mere ka ha nwụọ n’ọnwụ ya wee dị ọtụtụ karịa ndị o mere ka ha nwụọ ná ndụ ya.”—Ndị Ikpe 16:22-30.

A bịa n’ike ọkpụkpụ aka, ọ dịghị onye ya na Samsin ha n’etiti ụmụ mmadụ. N’ezie, ọ kpara ike dị egwu. Ma nke kasị mkpa bụ na Okwu Jehova gụnyere Samsin ná ndị dị ike n’okwukwe.—Ndị Hibru 11:32-34.

[Foto dị na peeji nke 26]

Olee ebe ike Samsin si?