Ime Ka Jehova Bụrụ Chineke Gị
Ime Ka Jehova Bụrụ Chineke Gị
N’OGE Bible, Jehova na ụmụ mmadụ ụfọdụ nwere mmekọrịta chiri nnọọ anya nke na a kpọrọ ya Chineke ha. Dị ka ihe atụ, n’Akwụkwọ Nsọ, a na-akpọ Jehova “Chineke nke Ebreham,” “Chineke Devid,” na “Chineke Ịlaịsha.”—Jenesis 31:42; 2 Ndị Eze 2:14; 20:5.
Olee otú nke ọ bụla n’ime ndị ikom a na Chineke si nwee mmekọrịta chiri anya? Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’aka ha ka anyị onwe anyị kwa wee nwee ike ịmalite ma nọgide soro Onye Okike na-emekọrịta ihe n’ụzọ chiri anya?
Ebreham Wee “Kwere na Jehova”
Ebreham bụ onye mbụ Bible kwuru na o kweere na Jehova. Okwukwe bụ àgwà bụ́ isi nke Ebreham bụ́ nke mere ka o nweta ihu ọma Chineke. N’ezie, Ebreham nwere ihu ọma Jehova nke na Onye Okike mesịrị kọwaara Mozis onwe ya dị ka “Chineke nke Ebreham” na nke nwa ya na nwa nwa ya, bụ́ Aịzik na Jekọb.—Jenesis 15:6; Ọpụpụ 3:6.
Olee otú Ebreham siri nwee ụdị okwukwe a n’ebe Chineke nọ? Nke mbụ, Ebreham wukwasịrị okwukwe ya na ntọala siri ike. Ọ pụrụ ịbụ na nwa Noa bụ́ Shem, bụ́ onye ji anya ya hụ nzọpụta Chineke, kụziiri ya ụzọ Jehova. Shem ji anya ya hụ na Jehova “chebere Noa, onye na-ekwusa ezi omume, ya na mmadụ asaa ndị ọzọ mgbe o wetara iju mmiri n’elu ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 2:5) O nwekwara ike ịbụ na Ebreham mụtara, site n’ọnụ Shem, na Jehova kwehaala nkwa, ọ ga-emezurịrị ya. Otú o sina dị, mgbe Chineke kwere Ebreham n’onwe ya nkwa, ọ ṅụrịrị ọṅụ ma bie ndụ n’ụzọ na-egosi na o ji n’aka na nkwa ahụ ga-emezurịrị.
Ebe ọ bụ na okwukwe ya nwere ntọala siri ike, Ebreham jizi ọrụ mee ka o sikwuo ike. Pọl onyeozi dere, sị: “Site n’okwukwe, Ebreham, mgbe a kpọrọ ya, rubere isi n’ịpụ jee n’ebe a kara aka na ọ ga-enweta dị ka ihe nketa; o wee pụọ, ọ bụ ezie na ọ maghị ebe ọ na-eje.” (Ndị Hibru 11:8) Nrubeisi dị otú ahụ mere ka Ebreham nwekwuo okwukwe, Jems onye na-eso ụzọ dekwara banyere ya, sị: “Ị hụrụ na okwukwe ya na ọrụ ya rụkọrọ ọrụ, e sitekwara n’ọrụ ya mee ka okwukwe ya zuo okè.”—Jems 2:22.
Ọzọkwa, Jehova kwere ka a nwalee okwukwe Ebreham, na-eme ka o sikwuo ike. Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “Site n’okwukwe, Ebreham, mgbe a nwalere ya, fọrọ nke nta ka ọ chụọ Aịzik n’àjà.” Ule na-anụcha okwukwe ma na-eme ka o sikwuo ike, na-eme ka Ndị Hibru 11:17; 1 Pita 1:7.
ọ baa “oké uru karịa ọlaedo.”—Ọ bụ ezie na Ebreham ahụghị mmezu nke nkwa nile Chineke kwere, o nwere ọṅụ nke ịhụ ka ndị ọzọ na-agbaso ihe nlereanya ya. A jakwara nwunye ya bụ́ Sera na ndị òtù ezinụlọ ya atọ ndị ọzọ—Aịzik, Jekọb, na Josef—mma n’ime Bible n’ihi okwukwe dị ịrịba ama ha gosipụtara.—Ndị Hibru 11:11, 20-22.
Okwukwe Dị Ka nke Ebreham Taa
Okwukwe dị onye ọ bụla nke na-achọ ime ka Jehova bụrụ Chineke ya oké mkpa. Pọl dere, sị: “Ma okwukwe adịghị ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị [Chineke] ezi mma.” (Ndị Hibru 11:6) Olee otú onye na-ejere Chineke ozi taa pụrụ isi nwee okwukwe siri ike dị ka nke Ebreham?
Dị ka Ebreham mere, anyị aghaghị iwukwasị okwukwe anyị na ntọala siri ike. Ụzọ kasị mma isi mee nke ahụ bụ ịmụchi Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible anya. Ịgụ Bible na ịtụgharị uche n’ihe ndị anyị gụtara na ya pụrụ ime ka anyị jide n’aka na Chineke ga-emezu nkwa ya. Nke ahụ ga-akpalizi anyị ime ka ndụ anyị kwekọọ n’atụmanya ahụ e ji n’aka. Nrubeisi, nke na-agụnye ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na ịga nzukọ Ndị Kraịst, na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike.—Matiu 24:14; 28:19, 20; Ndị Hibru 10:24, 25.
A ga-elerịrị okwukwe anyị ule, eleghị anya site ná mmegide, ọrịa siri ike, ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya, ma ọ bụ ihe ọzọ. Ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova mgbe a na-ele anyị ule na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, na-eme ka ọ baa oké uru karịa ọlaedo. Ma ànyị dị ndụ hụ mmezu nke nkwa nile nke Chineke, ma ànyị nwụrụ tupu ha emezuchaa, okwukwe anyị ga-eme ka anyị bịarukwuo Jehova nso. Ọzọkwa, ihe nlereanya anyị ga-agba ndị ọzọ ume iṅomi okwukwe anyị. (Ndị Hibru 13:7) Nke ahụ bụ ihe mere n’ọnọdụ Ralph, bụ́ onye hụrụ ma ṅomie okwukwe nke ndị mụrụ ya. Ọ na-akọwa, sị:
“Mgbe m ka nọ n’ụlọ, ndị mụrụ m na-agba mmadụ nile nọ n’ezinụlọ anyị ume iteta ụra n’oge ka anyị wee nwee ike ịgụkọ Bible ọnụ. Anyị si otú ahụ gụchapụ Bible.” Ralph ka na-agụ Bible kwa ụtụtụ, nke a na-emekwa ka ọ malite ụbọchị ọ bụla n’ụzọ dị mma. Ralph na-eso papa ya aga ozi ọma kwa izu. “Ọ bụ mgbe ahụ ka m mụtara ime nletaghachi na iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi.” Ralph na-eje ozi ugbu a dị ka onye ọrụ afọ ofufo n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Europe. Lee ihe ọma nke okwukwe ndị mụrụ ya rụpụtara!
Nwoke Dị Ka Obi Jehova Si Chọọ
Devid, bụ́ onye a mụrụ ihe dị ka narị afọ itoolu ka Ebreham nwụsịrị, bụ onye pụtara ìhè n’etiti ndị ohu Jehova a kpọtụrụ aha n’Akwụkwọ Nsọ. Banyere nhọrọ Jehova họọrọ Devid ịbụ eze n’ọdịnihu, Samuel onye amụma kwuru, sị: “Jehova achọpụtaworo Onwe ya otu nwoke dị ka obi Ya si chọọ.” Mmekọrịta dị n’etiti Jehova na Devid chiri anya nke ukwuu nke na Aịzaịa onye amụma mechara gwa Eze Hezekaịa banyere “Jehova, bụ́ Chineke Devid nna gị.”—1 Samuel 13:14; 2 Ndị Eze 20:5; Aịsaịa 38:5.
Ọ bụ ezie na Devid bụ nwoke dị ka obi Jehova si chọọ, e nwere oge ndị o kwere ka ọchịchọ ya merie ya. O mere mmehie dị oké njọ ugboro atọ: O kwere ka e buru igbe ọgbụgba ndụ ahụ gaa Jeruselem n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị; ọ kwasoro Bat-sheba iko ma kpaa nkata ka e gbuo di ya bụ́ Yuraịa; o kwukwara ka a gụọ Izrel na Juda ọnụ, bụ́ 2 Samuel 6:2-10; 11:2-27; 24:1-9.
nke Jehova na-enyeghị n’iwu. Na nke ọ bụla n’ime ha, Devid mebiri Iwu Chineke.—Otú ọ dị, mgbe a tụrụ Devid mmehie ya n’anya, o kwetara na ya mehiere, ọ taghịkwa ndị ọzọ ụta. O kwetara na e bughị Igbe ahụ otú e kwesịrị isi buo ya, na-ekwu na “anyị achọghị [Jehova] dị ka ikpe Ya sị dị.” Mgbe Netan onye amụma kpughere iko Devid kwara, Devid zaghachiri site n’ikwu, sị: “Emehiewo m megide Jehova.” Mgbe Devid hụkwara ihe nzuzu ọ bụ ịgụ ụmụ Izrel ọnụ, o kwuru, sị: “Emehiewo m nke ukwuu n’ihe m meworo.” Devid chegharịrị ná mmehie ya nile ma nọgide n’akụkụ Jehova.—1 Ihe E Mere 15:13; 2 Samuel 12:13; 24:10.
Mgbe Anyị Mehiere
Ná mgbalị anyị ime ka Jehova bụrụ Chineke anyị, ihe nlereanya Devid na-agba anyị ume. Ọ bụrụ na onye dị otú ahụ nke dị ka obi Jehova si chọọ nwere ike ime mmehie ndị dị otú ahụ dị oké njọ, anyị ekwesịghị inwe nkụda mmụọ ma ọ bụrụ na anyị emehie mgbe ụfọdụ ma ọ bụ mee mmehie ndị dị oké njọ n’agbanyeghị mgbalị ndị kasị mma anyị na-eme. (Eklisiastis 7:20) Anyị pụrụ inweta nkasi obi site n’eziokwu ahụ bụ́ na mgbe Devid chegharịrị, a gbaghaara ya mmehie ya. Nke ahụ bụ ihe mere Uwe * afọ ole na ole gara aga.
Uwe na-ejebu ozi dị ka okenye n’otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova. N’otu oge, o kwenyeere ọchịchọ ọjọọ ma mee omume rụrụ arụ. Na mbụ, dị ka Eze Devid, Uwe gbalịrị izochi mmehie ahụ, na-eche na Jehova ga-eleghara ya anya. Ka e mesịrị, akọ na uche Uwe nyere ya nsogbu nke ukwuu nke na ọ gwara otu okenye ibe ya ime merenụ, e mekwara ihe iji nyere Uwe aka inwetaghachi onwe ya site n’ọdachi ime mmụọ ya.
Uwe chegharịrị site ná mmehie ya ma nọgide n’akụkụ Jehova na ọgbakọ ya. O nwere obi ụtọ maka enyemaka ahụ o nwetara nke na mgbe izu ole na ole gasịrị, o degaara ndị okenye akwụkwọ, na-ekwupụta obi ekele sitere n’ala ala obi o nwere maka enyemaka ahụ. O dere, sị: “Unu nyeere m aka iwepụ aha Jehova n’ụta.” Uwe si otú a jigide mmekọrịta ya na Jehova, ka e mesịkwara, a họpụtaghachiri ya ije ozi n’otu ọgbakọ ahụ.
“Nwoke Nwere Mmetụta Ndị Yiri nke Anyị”
Ịlaịja, bụ́ onye biri ndụ otu narị afọ ka Devid nwụsịrị, bụ otu n’ime ndị amụma mbụ nke Izrel. Ịlaịja kwadoro ezi ofufe n’oge mpụ na omume rụrụ arụ jupụtara ebe nile, ọ laghịkwa azụ ná nrara ọ raara onwe ya nye Jehova. Ka a sịkwa ihe mere osote ya, bụ́ Ịlaịsha, n’otu oge, jiri kpọọ Jehova “Chineke Ịlaịja”!—2 Ndị Eze 2:14.
Otú o sina dị, Ịlaịja bụ mmadụ nkịtị. Jems dere, sị: “Ịlaịja bụ nwoke nwere mmetụta ndị yiri nke anyị.” (Jems 5:17) Dị ka ihe atụ, mgbe o merisịrị ndị na-efe Bel n’Izrel oké mmeri, Nwunye Eze bụ́ Jezibel yiri egwu igbu ya. Olee otú o siri meghachi omume? Ụjọ tụrụ ya, ya agbalagakwa n’ịkpa. Ka ọ nọ ebe ahụ n’okpuru osisi broom, Ịlaịja kwara arịrị, sị: “O zuwo; ugbu a, Jehova, wepụ ndụ m; n’ihi na mụ onwe m adịghị mma karịa nna m hà.” Ịlaịja achọghịzi ịbụ onye amụma, kama ọ sịrị na ọnwụ kaara ya mma.—1 Ndị Eze 19:4.
Otú ọ dị, Jehova gosiri na ya ghọtara mmetụta Ịlaịja nwere. Chineke wusiri Ịlaịja ike, na-emesi ya obi ike na ọ nọghị nanị ya n’ihi na a ka nwere ndị ọzọ na-eguzosi ike n’ezi ofufe. Ọzọkwa, Jehova ka tụkwasịrị Ịlaịja obi, nweekwa ọrụ ọ ka ga-arụ.—1 Ndị Eze 19:5-18.
Obi erughị ala Ịlaịja egosighị na o nweghịzi ihu ọma Chineke. Ka ihe dị ka 1,000 afọ gasịrị, mgbe e nwoghara Kraịst Jizọs n’ihu Pita, Jems na Jọn, olee ndị Jehova họọrọ ka ha na Jizọs pụta n’ọhụụ ahụ? Ọ bụ Mozis na Ịlaịja. (Matiu 17:1-9) O doro anya na Jehova weere Ịlaịja dị ka onye amụma kwesịrị nṅomi. Ọ bụ ezie na Ịlaịja bụ nnọọ “nwoke nwere mmetụta ndị yiri nke anyị,” Chineke ji ọrụ siri ike ọ rụrụ iweghachi ofufe dị ọcha na ido aha nsọ Ya nsọ, kpọrọ ihe.
Obi Erughị Ala Anyị
Mgbe ụfọdụ, ndị ohu Jehova taa pụrụ inwe nkụda mmụọ ma ọ bụ nchegbu. Lee ihe nkasi obi ọ bụ ịmata na Ịlaịja nwere otu mmetụta ndị ahụ! Leekwa ihe na-emesi obi ike ọ bụ ịmara na dị nnọọ ka Jehova ghọtara mmetụta Ịlaịja, Ọ na-aghọtakwa obi erughị ala anyị.—Abụ Ọma 103:14.
Anyị hụrụ Chineke na ụmụ mmadụ ibe anyị n’anya ma chọọ ịrụ ọrụ Jehova nke ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ. N’aka nke ọzọ, anyị pụrụ inwe nkụda mmụọ n’ihi na ndị mmadụ adịghị anabata ozi anyị ma ọ bụ anyị pụdịrị ịdị na-atụ ụjọ n’ihi mmaja ndị iro nke ezi ofufe na-amaja anyị. Otú ọ dị, dị nnọọ ka Jehova nyere Ịlaịja ihe dị ya mkpa iji gaa n’ihu n’ozi ya, Ọ na-enyekwa ndị ohu ya ihe ndị dị ha mkpa taa. Were Herbert na Gertrud dị ka ihe atụ.
E mere Herbert na Gertrud baptizim dị ka Ndịàmà Jehova na Leipzig, n’ebe bụbu German Democratic Republic, n’afọ 1952. N’oge ahụ, ihe na-esiri ndị ohu Chineke ike ebe ọ bụ na a machibidoro ọrụ ha iwu. Gịnị ka Herbert chere banyere ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ?
“Anyị nwere oké nchegbu mgbe ụfọdụ. Mgbe anyị na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị anaghị ama ma ndị ọchịchị hà ga-apụta na mberede ma nwụchie anyị.” Gịnị nyeere Herbert na ndị ọzọ aka imeri egwu ha? “Anyị nwere ọtụtụ ọmụmụ Bible onwe onye. Jehova nyekwara anyị ume iji gaa n’ihu n’ọrụ nkwusa anyị.” N’ozi ya, Herbert nwere ọtụtụ ahụmahụ wusiri ya ike—ọbụna ndị tọrọ ya ọchị.
Herbert zutere otu nwanyị katatụrụla ahụ́ bụ́ onye gosiri mmasị na Bible. Mgbe Herbert laghachiri ileta ya ụbọchị ole na ole ka e mesịrị, otu nwa okorobịa nọ ebe ahụ ma gee ntị ná mkparịta ụka ha. Mgbe minit ole na ole gasịrị, Herbert hụrụ ihe tụrụ ya ụjọ. Ọ hụrụ okpu onye uwe ojii n’elu oche dị n’otu akụkụ nke ọnụ ụlọ ahụ. Ọ bụ nwa okorobịa ahụ nwe ya, bụ́ onye o doro anya na ọ bụ onye uwe ojii nke kpebisiri ike ijide Herbert.
“Ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova!” ka nwa okorobịa ahụ jụrụ ya n’olu ike. “Gosi m kaadị gị.” Herbert nyere ya kaadị ya. Mgbe ahụ, ihe a na-atụghị anya ya mere. Nwanyị ahụ lere onye uwe ojii ahụ anya ma dọọ ya aka ná ntị, sị: “Ọkọ kọọ onye nke Chineke a, agaghịzi m achọ ịhụ ụkwụ gị n’ụlọ a.”
Nwa okorobịa ahụ chetụrụ echiche, nyeghachi Herbert kaadị ya, ma hapụ ya ka ọ laa. Herbert mechara chọpụta na onye uwe ojii ahụ na-achọ ịlụ ada nwanyị ahụ. O doro anya na o chere na ọ ga-akara ya mma ịnọgide na-ebedo ada nwanyị ahụ kama ijide Herbert.
Mee Ka Jehova Bụrụ Chineke Anyị
Olee ihe anyị pụrụ ịmụta site n’ihe ndị a merenụ? Dị ka Ebreham, anyị aghaghị inwe okwukwe siri ike ná nkwa Jehova. Dị ka Devid, anyị kwesịrị iji obi anyị dum chegharịa ma rịọ Jehova mgbaghara mgbe ọ bụla anyị mehiere. Dịkwa ka Ịlaịja, ọ dị anyị mkpa ịdabere na Jehova maka ume n’oge ndị anyị na-enwe nchegbu. Site n’ime otú ahụ, anyị pụrụ ime ka Jehova bụrụ Chineke anyị ugbu a nakwa ruo mgbe nile ebighị ebi, ebe ọ bụ na Jehova bụ “Chineke dị ndụ, onye bụ́ Onye Nzọpụta nke ụdị mmadụ nile, karịsịa nke ndị na-ekwesị ntụkwasị obi.”—1 Timoti 4:10.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 20 A gbanwere aha ya.
[Foto ndị dị na peeji nke 25]
Nrubeisi mere ka okwukwe Ebreham sikwuo ike
[Foto dị na peeji nke 26]
Dị ka Devid, anyị kwesịrị ichegharị mgbe anyị mere mmehie
[Foto dị na peeji nke 28]
Dị ka Jehova ghọtara mmetụta Ịlaịja, ọ na-aghọtakwa nke anyị