Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nne na Nna, Chebenụ Ihe Nketa Unu Dị Oké Ọnụ Ahịa

Ndị Nne na Nna, Chebenụ Ihe Nketa Unu Dị Oké Ọnụ Ahịa

Ndị Nne na Nna, Chebenụ Ihe Nketa Unu Dị Oké Ọnụ Ahịa

“Amamihe bụ ndò . . . [ọ] na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.”—Eklisiastis 7:12.

1. N’ihi gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị iji na-ele ụmụ ha anya dị ka onyinye?

NDỊ NNE NA NNA na-amụpụta mmadụ ọhụrụ dị ndụ nke yiri ha n’ọdịdị na n’àgwà. Bible na-akpọ ụmụaka dị otú ahụ “ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa.” (Abụ Ọma 127:3) Ebe ọ bụ ya bụ ezi Onye Na-enye Ndụ, Jehova na-enyefe nnọọ ndị nne na nna ihe bụ́ nke Ya n’ezie. (Abụ Ọma 36:9) Ndị nne na nna, olee otú unu si ele ịnata onyinye dị otú ahụ dị oké ọnụ ahịa sitere n’aka Chineke anya?

2. Gịnị ka Manoa mere mgbe ọ matara na ya ga-aghọ nna?

2 N’ezie, e kwesịrị iji umeala n’obi na ekele nara onyinye dị otú ahụ. Ihe karịrị puku afọ atọ gara aga, onye Izrel bụ́ Manoa mere otú ahụ mgbe otu mmụọ ozi gwara nwunye ya na ọ ga-amụ nwa. Mgbe ọ nụrụ ozi ọma ahụ, Manoa kpere ekpere, sị: “Biko, Onyenwe anyị, ka onye nke Chineke ahụ nke I zitere bịaghachikwute anyị ọzọ, arịọ m Gị, ka o zikwa anyị ihe anyị ga-eme nwata ahụ nke a ga-amụ.” (Ndị Ikpe 13:8) Ndị nne na nna, gịnị ka unu pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Manoa?

Ihe Mere Enyemaka Chineke Ji Dị Mkpa Ugbu A

3. N’ihi gịnị ka enyemaka Chineke ji dị ezigbo mkpa n’ịzụlite ụmụaka taa?

3 Karịa mgbe ọ bụla ọzọ, enyemaka Jehova dị ndị nne na nna mkpa ugbu a n’ịzụlite ụmụ ha. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? E siwo n’eluigwe chụdata Setan bụ́ Ekwensu na ndị mmụọ ozi ya n’ụwa. Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:7-9, 12) Bible na-akọwa na “dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ,” Setan “na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Pita 5:8) Ọdụm na-awakpokarị anụ ndị ọ ga-adọgbuli, ọ na-abụkarịkwa ndị ka dị obere. Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-eji amamihe elegara Jehova anya maka nduzi iji chebe ụmụ ha. Mgbalị há aṅaa ka ị na-eme iji mee otú ahụ?

4. (a) Ịmata na ọdụm na-akpagharị n’ógbè ha kwesịrị ime ka ndị nne na nna mee gịnị? (b) Gịnị dị ụmụaka mkpa iji bụrụ ndị e chebere?

4 Ọ bụrụ na ị maara na ọdụm na-akpagharị n’ógbè unu, n’ezie nchegbu gị bụ́ isi ga-abụ ichebe ụmụ gị. Setan yiri anụ na-adọgbu adọgbu. Ọ na-achọ imerụ obi nke ndị Chineke, si otú ahụ mee ka ihe ha gharazie ịmasị Chineke. (Job 2:1-7; 1 Jọn 5:19) Ụmụaka na-adịrị ya mfe nnweta. Iji zere ọnyà Ekwensu, ụmụaka aghaghị ịmara Jehova ma na-erubere ya isi. Ihe ọmụma Bible dị ha oké mkpa iji mee nke a. Jizọs kwuru, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Tụkwasị na nke ahụ, amamihe—ikike nke ịghọta ihe na itinye ihe ha mụtara n’ọrụ—dị ụmụaka mkpa. Ebe ọ bụ na “amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ,” ọ dị unu bụ́ ndị nne na nna mkpa ịkụnye eziokwu ahụ n’ime obi ụmụ unu. (Eklisiastis 7:12) Olee otú unu pụrụ isi mee nke a?

5. (a) Olee otú a pụrụ isi kụnye amamihe n’ime ụmụaka? (b) Olee otú Ilu si kọwaa uru amamihe bara?

5 Ị pụrụ—i kwesịkwara—ịdị na-agụrụ ụmụ gị Okwu Chineke. Ma inyere ha aka ịhụ Jehova n’anya na irubere ya isi chọrọ ihe karịrị nke ahụ—ọ chọrọ ha inwe nghọta. Iji maa atụ: A pụrụ ịgwa nwata ka o buru ụzọ lee anya n’aka nri na n’aka ekpe tupu ya agafee okporo ámá. Ma, ụmụaka ụfọdụ adịghị eme otú ahụ. N’ihi gịnị? Ọ pụrụ ịbụ na a kọwabeghịrị nwata ahụ ọtụtụ ugboro na ụgbọala pụrụ ịkụtu ya ma ọ bụ kọwaara ya ya n’ụzọ ga-eme ka ọ ghọta ihe ize ndụ dị na ya, si otú ahụ wepụ “uche gbagọrọ agbagọ” nke pụrụ ime ka ọ daba n’ihe mberede. Ịkụnye amamihe n’ime ụmụaka na-ewe oge, ọ na-achọkwa ndidi. Ma lee ka amamihe si baa uru! Bible na-ekwu, sị: “Ụzọ ya nile bụ ụzọ nke ịdị ụtọ, okporo ụzọ ya nile bụkwa udo. Osisi na-enye ndụ ka ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka: ee, onye ọ bụla nke na-ejisi ya aka ike bụ onye ihe na-agara nke ọma.”—Ilu 3:13-18; 22:15.

Izi Ihe nke Na-eme Ka Mmadụ Mara Ihe

6. (a) Olee ihe na-akpatakarị ụmụaka ime ihe ndị amamihe na-adịghị na ha? (b) Olee ọgụ na-aga n’ihu?

6 Mgbe mgbe, ihe mere ụmụaka ji eme ihe na-adịghị mma abụghị n’ihi na a kụzibeghịrị ha ime ihe ziri ezi, kama ọ bụ n’ihi na ihe a na-akụziri ha erubeghị ha n’obi—ma ọ bụ baa ha n’ime. Ekwensu na-ebu agha iji nweta obi ụmụaka. Ọ na-eme atụmatụ ịhụ na mmụọ asọpụrụghị Chineke nke ụwa a metụtara ha. Ọ na-agbalịkwa iji ọchịchọ ime mmehie bụ́ nke ha bu pụta ụwa eme ihe iji kpalie ha ime ihe ọjọọ. (Jenesis 8:21; Abụ Ọma 51:5) Ọ dị ndị nne na nna mkpa ịghọta na a na-alụ ọgụ siri ike inweta obi ụmụ ha.

7. N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị zuo ezuo ịgwa nwata ihe bụ́ ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ?

7 Ndị nne na nna na-agwakarị nwa ha ihe bụ́ ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ, na-eche na ha akụziworo ya ụkpụrụ omume ọma. Ha pụrụ ịgwa nwa ahụ na ịgha ụgha, izu ohi, ma ọ bụ iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye mmadụ enwe mmekọahụ adịghị mma. Otú ọ dị, ọ dị nwa ahụ mkpa inwe ihe ka sie ike ga-akpali ya irube isi kama ịbụ nanị n’ihi na ndị nne na nna ya gwara ya mee otú ahụ. Ọ bụ iwu Jehova pụrụ ime nke ahụ. Nwata ahụ kwesịrị ịmụta na ọ bụ ihe amamihe dị na ya irubere iwu Chineke isi.—Ilu 6:16-19; Ndị Hibru 13:4.

8. Olee ụdị izi ihe pụrụ ime ka ụmụaka na-akpa àgwà ka ndị maara ihe?

8 Ịdị mgbagwoju anya nke eluigwe na ala, ụbara nke ihe ndị e kere eke, mgbanwe nke oge ndị a na-enwe n’afọ—ihe ndị dị otú a pụchara inyere nwata aka ịghọta na e nwere Onye Okike nke maara ihe nile. (Ndị Rom 1:20; Ndị Hibru 3:4) Ọzọkwa, e kwesịrị ịkụziri nwata ahụ na Chineke hụrụ ya n’anya, na o mewokwa ndokwa site n’àjà mgbapụta nke Ọkpara Ya inye ya ndụ agwụghị agwụ nakwa na ọ pụrụ ime Chineke obi ụtọ site n’irube isi n’ihe Ọ na-ekwu. Mgbe ahụ, o yiri ka nwata ahụ ọ̀ ga-achọ ijere Jehova ozi, n’agbanyeghị mgbalị Ekwensu na-eme iji kwụsị ya.—Ilu 22:6; 27:11; Jọn 3:16.

9. (a) Gịnị ka izi ihe nke na-echebe ndụ na-achọ? (b) Gịnị ka a gwara ndị nna ka ha mee, gịnịkwa ka nke a na-agụnye?

9 Ụdị izi ihe na-echebe nwata ma na-akpali ya ime ihe ziri ezi na-ewe oge, chọọkwa nlebara anya na nhazi. Ọ na-achọ ka ndị nne na nna kwere ka Chineke duzie ha. Bible na-ekwu, sị: “Ndị bụ́ nna, . . . nọgidenụ na-azụlite [ụmụ unu] n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) Gịnị ka nke ahụ pụtara? Na Grik mbụ, “nduzi echiche” na-enye echiche nke “itinye uche n’ime.” Ya mere, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, a gbara ndị nna ume itinye uche Jehova n’ime ụmụ ha. Lee ihe nchebe nke ahụ ga-abụrụ ụmụaka! Ọ bụrụ na a kụnye echiche Chineke, ya bụ, ụzọ o si eche echiche, n’ime obi ha, ọ ga-echebe ha pụọ n’ime ihe ọjọọ.

Ọchịchọ nke Ịhụnanya Kwaliri

10. Iji duzie nwa gị n’ụzọ dị irè, gịnị ka ọ dị mkpa ka ị mara?

10 Otú ọ dị, iji mezuo ọchịchọ gị nke ịzụlite nwa gị n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ dị mkpa ka ọ bụrụ ịhụnanya na-akwali mgbalị gị. Otu ihe dị mkpa bụ ezi nkwurịta okwu. Chọpụta ihe na-aga ná ndụ nwa gị na ihe ọ na-eche. N’oge ahụ́ ruru nwa gị ala, jiri akọ jụpụta ya ihe dị ya n’obi. Mgbe ụfọdụ, ihe ọ ga-ekwu pụrụ iju gị anya. Kpachara anya ka ị ghara ime ihe n’iwe. Kama nke ahụ, jiri ọmịiko gee ya ntị.

11. Olee otú nne ma ọ bụ nna pụrụ isi tinye uche Chineke n’ime nwa ya?

11 N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na ị gụworo nwa gị iwu Chineke ndị megidere mmekọahụ rụrụ arụ site na Bible, ọbụna mee nke ahụ ọtụtụ ugboro. (1 Ndị Kọrint 6:18; Ndị Efesọs 5:5) Nke a pụrụ imewo ka ụmụ gị mata ihe ndị na-atọ Jehova ụtọ na ihe ndị na-adịghị atọ ya ụtọ. Otú ọ dị, itinye uche ya n’obi ụmụaka chọrọ ihe karịrị nke ahụ. Ọ dị mkpa ka e nyere ụmụaka aka ịtụgharị uche n’abamuru nke iwu Jehova. Ọ dị mkpa ka e mee ka ha kweta na iwu ya ziri ezi ma baa uru, nakwa na irubere ha isi bụ ihe kwesịrị ekwesị na ihe na-egosi ịhụnanya. Ọ bụ nanị mgbe i sooro ụmụ gị tụgharịa uche n’Akwụkwọ Nsọ ruo n’ókè nke na ha nakweere echiche Chineke ka a pụrụ ikwu na i tinyewo uche ya n’ime ụmụ gị.

12. Olee otú nne ma ọ bụ nna pụrụ isi nyere nwa ya aka inwe echiche ziri ezi banyere mmekọahụ?

12 Mgbe a na-ekwu okwu banyere mmekọahụ, ị pụrụ ịjụ, sị, “Ì chere na irube isi n’iwu Jehova nke sịrị ka mmadụ ghara ịkwa iko tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye ga-eme ka onye ahụ ghara inwe obi ụtọ?” Gbaa nwa gị ume ịkọwa ihe ọ zara. Mgbe i sosịrị ya tụlee ndokwa magburu onwe ya Chineke mere maka ịmụ nwa, ị pụrụ ịjụ, sị: “Ì chere na Chineke anyị na-ahụ n’anya ga-enye iwu ndị ga-anapụ anyị obi ụtọ ná ndụ? Ka ì chere na iwu ndị o nyere bụ iji mee ka anyị nwee obi ụtọ ma chebe anyị?” (Abụ Ọma 119:1, 2; Aịsaịa 48:17) Chọpụta ihe bụ́ echiche nwa gị n’okwu a. Mgbe ahụ, ị pụrụ ịdọrọ echiche ya gaa n’ihe atụ ndị gosiri otú mmekọahụ rụrụ arụ si duga n’obi mgbawa na nsogbu. (2 Samuel 13:1-33) Site n’iso nwa gị tụgharịa uche n’ụzọ ga-eme ka ọ ghọta ma nakwere echiche Chineke, ị ga-arụwo ọrụ dị ukwuu n’itinye echiche Chineke n’ime nwa gị. Otú ọ dị, ọ dị ihe ọzọ ị pụrụ ime.

13. Ịghọta gịnị ga-akpali nnọọ nwata irubere Jehova isi?

13 N’iji amamihe eme ihe, ihe ị ga-akụziri nwa gị abụghị nanị ihe ndị na-esi n’erubeghịrị Jehova isi apụta, kama nke ahụ, ị ga-akọwakwara ya otú ụzọ anyị si ebi ndụ si emetụta Jehova. Gosi nwa gị site na Bible na anyị pụrụ ịkpatara Jehova mwute mgbe anyị na-emeghị uche ya. (Abụ Ọma 78:41) Ị pụrụ ịjụ, sị, “Gịnị mere na ị chọghị ime ihe ga-ewute Jehova?” ma kọwaa, sị: “Onye iro Chineke bụ́ Setan na-ekwu na anyị na-ejere Jehova ozi nanị n’ihi ọdịmma onwe anyị ọ bụghị n’ihi na anyị hụrụ Ya n’anya.” Mgbe ahụ, kọwaa na site n’iguzosi ike n’ezi ihe, Job mere ka obi Chineke ṅụrịa, si otú a nye azịza maka ebubo ụgha Setan. (Job 1:9-11; 27:5) Ọ dị nwa gị mkpa ịghọta na dabere n’otú o si akpa àgwà, ọ pụrụ ịkpatara Jehova mwute ma ọ bụ mee ya obi ụtọ. (Ilu 27:11) A pụrụ iji akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ * kụziere ụmụaka nke a na ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị mkpa.

Ezi Ihe Ndị A Rụpụtara

14, 15. (a) Olee ihe ọmụmụ ndị dị n’akwụkwọ Onye Ozizi bụ́ ndị kpaliworo ụmụaka ime ihe? (b) Olee ihe ndị dị mma ị rụpụtaworo site n’iji akwụkwọ ahụ eme ihe? (Leekwa igbe dị na peeji nke 18-19.)

14 Otu nna ochie na Croatia bụ́ onye na-agụrụ nwa nwa ya dị afọ asaa akwụkwọ Onye Ozizi dere na nwa nwa ya ahụ gwara ya ihe ndị a: “Ọ dị ihe mama m gwara m ka m mee, ma achọghị m ime ya. Mgbe ahụ, echetara m isiokwu bụ́ ‘Nrubeisi Na-echebe Gị,’ n’ihi ya, m gara gwa ya na m ga-erubere ya isi.” Otu di na nwunye na Florida, U.S.A., kwuru banyere isiokwu bụ́ “Ihe Mere Anyị Na-ekwesịghị Iji Na-agha Ụgha,” sị: “O nwere ajụjụ ndị na-eme ka ụmụaka kwupụta ihe dị ha n’obi ma nakwere ihe ndị ha mejọrọ bụ́ ndị ha na-agaraghị anakwere.”

15 Akwụkwọ Onye Ozizi nwere ihe karịrị narị ihe osise abụọ na iri atọ, o nwekwara okwu nkọwa maka ihe osise nke ọ bụla ma ọ bụ ihe osise ndị nọkọtara ọnụ. Otu nne nke nwere obi ekele kwuru, sị: “Mgbe mgbe, nwa m nwoke na-elegide anya n’otu ihe osise nke na ọ gaghị achọ ka a safee peeji ahụ. Ọ bụghị nanị na ihe osise ndị ahụ na-adọrọ mmasị kama ha na-akụzi ihe n’onwe ha, ma ọ bụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, na-akpali ụmụaka ịjụ ajụjụ. Banyere otu ihe osise ebe otu nwatakịrị na-ekiri telivishọn n’ụlọ gbara ọchịchịrị, nwa m nwoke jiri olu gosiri na ọ maara na nwatakịrị ahụ na-eme ihe na-adịghị mma jụọ m, sị, ‘Mama, gịnị ka nwa a na-eme?’” Okwu nkọwa nke ihe osise ahụ na-agụ, sị: “Ònye pụrụ ịhụ ihe nile anyị na-eme?”

Izi Ihe nke Dị Oké Mkpa Taa

16. Gịnị ka ọ dị oké mkpa ka a kụziere ụmụaka taa, n’ihi gịnịkwa?

16 Ọ dị ụmụaka mkpa ịmata ụzọ kwesịrị ekwesị na nke na-ekwesịghị ekwesị isi eji akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ eme ihe. Ma, ikwurịta nke a adịghị adịcha mfe mgbe nile. Otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ kwuru na ya tolitere n’oge a na-ele iji okwu ndị na-ezo aka n’akụkụ ahụ́ ndị e ji enwe mmekọahụ eme ihe anya dị ka ihe na-egosi enweghị nsọpụrụ. N’ikwu banyere ịkụziri ụmụ ya ihe, o dere, sị: “Aghaghị m ịkwụsị ime ihere.” N’ezie, mgbe ndị nne na nna zeere iso nwa ha kwurịta ihe metụtara mmekọahụ n’ihi ihere, ọ dịghị echebe ya. Ọ na-adịrị ndị na-emetọ ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ mfe ime otú ahụ n’ihi na nwatakịrị ahụ amaghị ihe banyere mmekọahụ. Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ tụlere okwu ahụ n’ụzọ na-ewuli elu ma dị ùgwù. Ịkọwara ụmụaka banyere mmekọahụ adịghị eme ka ha mara ihe karịrị ha, ma emeghị otú ahụ pụrụ ime ka e metọọ ha.

17. Olee otú akwụkwọ Onye Ozizi si enyere ndị nne na nna aka ịkụziri ụmụ ha banyere mmekọahụ?

17 N’isi nke 10, mgbe ọ na-ekwu banyere ajọ ndị mmụọ ozi bụ́ ndị bịara n’ụwa ma mụọ ụmụ, akwụkwọ ahụ jụrụ nwata ajụjụ bụ́, “Gịnị ka ị maara banyere inwe mmekọahụ?” Akwụkwọ ahụ nyere azịza dị mfe ma dị ùgwù. Isi nke 32 kọwaziri otú a pụrụ isi chebe ụmụaka pụọ n’aka ndị na-achọ imetọ ha n’ụzọ mmekọahụ. Ọtụtụ akwụkwọ ozi ndị e nwetara na-egosi na izi ihe dị otú a dị oké mkpa. Otu nne dere, sị: “N’izu gara aga, mgbe mụ na nwa m nwoke bụ́ Javan gara ịhụ dọkịta ya, ọ jụrụ ma ànyị akọwaworo nwa anyị nwoke ụzọ kwesịrị ekwesị isi eji akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ eme ihe. Obi dị ya nnọọ ụtọ na anyị ejirila akwụkwọ ọhụrụ ahụ mee otú ahụ.”

18. Olee otú akwụkwọ Onye Ozizi si kụzie ihe banyere ịkwanyere ihe nnọchianya mba ùgwù?

18 Isiokwu ọzọ tụlere banyere ihe ndekọ Bible nke ụmụ okorobịa Hibru atọ bụ́ Shedrak, Mishak na Abednego, bụ́ ndị jụrụ ịkpọ isiala nye ihe oyiyi na-anọchi anya mba Babilọn. (Daniel 3:1-30) Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ echeghị na ịkwanyere ihe oyiyi ùgwù na ikele ọkọlọtọ nwere njikọ, dị ka akwụkwọ Onye Ozizi si kwuo. Otú ọ dị, rịba ama ihe onye edemede bụ́ Edward Gaffney nwere ikwu n’ajụjụ ọnụ magazin U.S. Catholic gbara ya. O kwuru na ụbọchị mbụ nwa ya nwanyị gara ụlọ akwụkwọ, na ọ lọtara ma gwa ya na ya amụtala “ekpere ọhụrụ n’ụlọ akwụkwọ,” ọ gwara nwa ya nwanyị ka o kpee ya ka ya nụ. Gaffney kwuru, sị: “Nwa m nwanyị tụkwasịrị aka ya n’obi ya ma jiri nganga malite ikwu, sị, Ana m ekwe nkwa ikwesị ntụkwasị obi nye ọkọlọtọ anyị. . . . ’” Gaffney gara n’ihu kwuo, sị: “Anya mepere m ozugbo ahụ. Ihe Ndịàmà Jehova kwuru bụ eziokwu. Ọ dị okpukpe mba a na-akụziri obere ụmụaka anyị n’ụlọ akwụkwọ—ikwesị ntụkwasị obi zuru nnọọ ezu.”

O Kwesịrị Mgbalị Ndị E Mere Maka Ya

19. Olee ụgwọ a na-enweta site n’ịkụziri ụmụaka ihe?

19 N’ezie, ịkụziri ụmụ gị ihe kwesịrị mgbalị nile i mere maka ya. Anya mmiri gbara otu nwanyị bi na Kansas, U.S.A., mgbe ọ natara akwụkwọ ozi nke nwa ya nwoke deere ya. Nwa ya nwoke dere, sị: “Echere m na enwere m ihe ndabara ọma ịbụ onye e nyere ọzụzụ nke mere ka m na-echezi echiche echezi. Gị na papa m kwesịrị nnọọ ịja mma.” (Ilu 31:28) Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ ka pụrụ inyere ọtụtụ ndị nne na nna aka izi ụmụ ha ihe iji chebe ihe nketa a dị oké ọnụ ahịa.

20. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ịdị na-echeta mgbe nile, mmetụta dịkwa aṅaa ka nke ahụ kwesịrị inwe n’ahụ́ ha?

20 Oge, nlebara anya, na mgbalị nile anyị pụrụ inye ụmụ anyị kwesịịrị ha. Ha ga-abụ ụmụaka ruo nanị nwa oge. Jiri ohere ọ bụla mee ihe iji soro ha na-anọkọ ma na-enyere ha aka. Ị gaghị akwa ụta ọ bụla maka ime otú ahụ. Ha ga-ahụ gị n’anya. Na-echeta mgbe nile na ụmụ gị bụ onyinye Chineke nyere gị. Lee ihe nketa dị oké ọnụ ahịa ha bụ! (Abụ Ọma 127:3-5) Ya mere, na-emeso ha ihe dị ka ihe nketa dị oké ọnụ ahịa, dị ka onye ga-aza Chineke ajụjụ banyere otú i si zụlite ha, n’ihi na nke bụ́ eziokwu bụ na, ị ga-aza ajụjụ banyere ha.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara. Lee isi nke 40, “Ụzọ Isi Mee Ka Chineke Nwee Obi Ụtọ.”

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ugbu a karịsịa ka ndị nne na nna chebe ụmụ ha?

• Olee ụdị izi ihe na-eme ka mmadụ mara ihe?

• Olee ihe ndị dị oké mkpa gị na ụmụ gị kwesịrị ikwurịta taa?

• Olee otú akwụkwọ Onye Ozizi siworo nyere ndị nne na nna aka ịkụziri ụmụ ha ihe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]

Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile

A kwadebere akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ iji nyere ndị nne na nna ma ọ bụ ndị ọzọ toworo eto aka isoro ụmụaka gụọ ma tụlee ozizi Jizọs Kraịst. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị toworo eto bụ́ ndị gụrụ akwụkwọ ahụ n’onwe ha egosipụtala ekele sitere n’obi maka ihe ha mụtara.

Otu nwoke na Texas, U.S.A., kwuru, sị: “Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ na-akpali akpali n’otú o si dị mfe, na-akpali ndị nọ n’afọ ndụ ọ bụla—ọbụna onye gbara iri afọ asaa na isii dị ka m. Unu emeela nke ukwuu, site n’aka onye jewooro Jehova ozi site na nwata.”

Otu onye si London, England, bụ́ onye gụrụ akwụkwọ ahụ na-akọ, sị: “O doro anya na ihe osise ndị magburu onwe ha dị na ya ga-adọrọ uche ma ndị nne na nna ma ụmụaka. Ajụjụ ndị dị na ya na otú e si dee akwụkwọ ahụ bụ ọkpọka, a tụlekwara okwu ndị chọrọ nlezianya n’ụzọ magburu onwe ya, dị ka n’isi nke 32, ‘Otú E Si Chebe Jizọs.’” O kwubiri, sị: “Ọ bụ ezie na ọ bụ nnọọ ụmụ Ndịàmà Jehova karịsịa ka e bu n’obi bipụta akwụkwọ a, echere m na ndị nkụzi na ndị ọzọ ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu inweta ya. Ana m atụ anya iji ya eme ihe n’ọnwa na n’afọ ndị na-abịanụ.”

Otu nwanyị si Massachusetts, U.S.A., kwuru okwu banyere ọtụtụ “ihe osise ya ndị e ji nlezianya see.” O kwuru, sị: “Achọpụtara m na ọ bụ ezie na ọ bụ ụmụaka ka e bu n’obi kwadebe akwụkwọ ahụ, isiokwu ndị dị na ya pụkwara inyere anyị bụ́ ndị toworo eto aka ichebara mmekọrịta anyị na Jehova echiche.”

“Chei! Akwụkwọ a amagbuola onwe ya!” ka otu nwanyị si Maine, U.S.A., tiri ná mkpu. “Ọ bụghị nanị maka ụmụaka kama maka anyị nile dị ka ụmụ Chineke. Ọ baala m n’ụmị, ọ kpaliwokwa mmụọ m ma zaa ajụjụ m nile, bụ́ nke mere ka m wee nwee udo nke obi. Enwere m mmetụta nke ịnọkwu Jehova nso dị ka Nna m. O wepụla ihe mgbu ndị m nwere n’afọ ndị gara aga ma mee ka nzube Ya dokwuo m nnọọ anya.” O kwubiziri, sị: “Ana m agwa onye ọ bụla, sị, ‘Biko gụọ ya.’”

Otu nwanyị si Kyoto, Japan, kọrọ na mgbe ya nọ na-agụrụ ụmụ ụmụ ya akwụkwọ ahụ, ha jụrụ ajụjụ ndị dị ka: “‘Gịnị ka nwata nwoke a na-eme? Gịnị mere e ji abara nwata nwanyị a mba? Gịnịkwanụ ka mama mmadụ a na-eme? Olee maka ọdụm a?’ Ọ na-akụzi ihe ndị anyị nwere mmasị na ha, ya mere, enwere m mmasị na ya karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ m nwere ike ịhụ n’ọ́bá akwụkwọ.”

Otu nna na Calgary, Canada, na-ekwu na ozugbo ya nwetara akwụkwọ ahụ, na ya malitere ịgụrụ ya nwa ya nwanyị dị afọ 6 na nwa ya nwoke dị afọ 9. Ọ na-akọ, sị: “O nwere mmetụta dị mma n’ahụ́ ha ozugbo. Ụmụ m nọ na-ege ntị nke ọma ma na-aza ajụjụ site n’obi ha. Ha tinyere obi ha dum n’ọmụmụ ihe ahụ, o nyekwara ha ohere ikwupụta ihe dị ha n’obi. Ha na-anụrụ ya ọkụ n’obi, nwa m nwanyị kwukwara na ya chọrọ ịdị na-amụ akwụkwọ ọhụrụ ahụ kwa abalị.”

Mgbe ha mụsịrị ihe n’otu oge, otu nna kwuru, sị: “Mụ na nwa m nwoke kwurịtara banyere Jehova na nzube ya ruo ọtụtụ awa. O nwere ọtụtụ ajụjụ ịjụ site n’akwụkwọ ahụ. Anya mmiri gbara m mgbe ọ sịrị m ka chi foo ma jụọ m, sị: ‘Papa, ànyị nwere ike ịmụ ihe a ọzọ? Enwere m ọtụtụ ajụjụ, achọkwara m ịma ihe nile banyere Jehova.’”

[Foto dị na peeji nke 15]

Ndị nne na nna, gịnị ka unu pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Manoa?

[Foto dị na peeji nke 16]

Ụmụaka, gịnị ka unu pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya nke ndị Hibru atọ ahụ?

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ihe osise na okwu nkọwa ha ndị dị n’akwụkwọ “Onye Ozizi” bụ ngwá ọrụ dị irè iji zie ihe

Olee ụgha Ananaịas na-aghara Pita?

Ònye pụrụ ịhụ ihe nile anyị na-eme?