Sayensị na Okpukpe Mmalite nke Esemokwu Ha
Sayensị na Okpukpe Mmalite nke Esemokwu Ha
OTU onye na-enyocha mbara igwe nke dị afọ 70 nọ n’ọnụ ọnwụ, na-agbalị ịgụ ihe. Otu akwụkwọ o dere, bụ́ nke ọ kwadocharala ibipụta, dị n’aka ya. Ma ọ̀ ma ma ọ bụ na ọ maghị, akwụkwọ ya ga-agbanwe echiche ụmụ mmadụ banyere eluigwe na ala kpamkpam. Ọ ga-akpatakwa oké esemokwu n’ime Krisendọm, bụ́ nke ka na-emetụta ndị mmadụ taa.
Nwoke ahụ nọ n’ọnụ ọnwụ bụ Nicolaus Copernicus, bụ́ onye Poland na-ekpe Katọlik, ihe ahụ mekwara n’afọ 1543. Akwụkwọ Copernicus, nke isiokwu ya bụ On the Revolutions of the Heavenly Spheres, kwuru na ọ bụ anyanwụ, ọ bụghị ụwa, dị n’etiti usoro mbara igwe anyị. Site n’otu akwụkwọ a o dere, Copernicus ji echiche dị nnọọ mfe nghọta dochie echiche ahụ siri nnọọ ike nghọta nke bụ́ na ọ bụ ụwa dị n’etiti mbara igwe.
Ná mmalite, a hụchaghị ihe àmà nke esemokwu ahụ a ga-enwe n’ọdịnihu. Otu ihe kpatara ya bụ na Copernicus ji akọ mee ihe mgbe ọ na-ekwupụta echiche ya. Ọzọkwa, Chọọchị Katọlik, bụ́ nke nabataworo echiche nke ụwa ịdị n’etiti mbara igwe, yiri ka ọ̀ na-anabata akọmakọ nkà mmụta sayensị karị n’oge ahụ. Popu n’onwe ya gbadịrị Copernicus ume ka o bipụta akwụkwọ ya. Mgbe Copernicus mesịrị bipụta ya, onye editọ ụjọ ji dere ná mmalite nke akwụkwọ ahụ na echiche nke anyanwụ ịdị n’etiti mbara igwe bụ ihe dị mma iji eme mgbakọ na mwepụ ma na o zichaghị ezi n’ịkọwa mbara igwe.
Esemokwu ahụ Aka Njọ
Onye ọzọ tụnyere ụtụ n’esemokwu ahụ bụ onye Ịtali na-enyocha mbara igwe, nke bụ́ ọkà ná mgbakọ na mwepụ na n’ihe ọmụmụ physics bụ́ Galileo Galilei (1564-1642), nke bụ́kwa onye Katọlik. Site n’iji ígwè teliskop o ji anya kamera bụ́ nke pụtara ọhụrụ rụọ eme ihe, Galileo hụrụ ihe ndị a na-ahụtụbeghị mbụ na mbara igwe. Ihe ndị ọ hụrụ mesiri ya obi ike na ihe ndị Copernicus kwuru ziri ezi. Galileo hụkwara ntụpọ ụfọdụ n’anyanwụ, bụ́ ndị a na-akpọ ntụpọ anyanwụ taa, si otú ahụ gbaa nkwenkwe ọzọ nke ndị ọkà mmụta na ndị okpukpe jisiri ike ụkwụ—nke bụ́ na anyanwụ apụghị ịgbanwe agbanwe ma ọ bụ gbaa ọrụ.
N’adịghị ka Copernicus, Galileo ji obi ike na ịnụ ọkụ n’obi kwalite echiche ya. O mekwara *
otú ahụ mgbe mmegide okpukpe ka njọ, n’ihi na mgbe ahụ, Chọọchị Katọlik emegidewela ozizi Copernicus n’ụzọ pụtara ìhè. N’ihi ya, mgbe Galileo rụrụ ụka na ọ bụghị nanị na echiche nke anyanwụ ịdị n’etiti mbara igwe ziri ezi, kamakwa na o kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ, chọọchị ahụ nyowere ya enyowe dị ka onye na-ezi ozizi nduhie.Galileo gara Rom ịzara ọnụ ya ma nke ahụ enweghị isi. N’afọ 1616, chọọchị nyere ya iwu ka ọ kwụsị ịgbasa ozizi Copernicus. E mechiri Galileo ọnụ ruo nwa oge. Mgbe ahụzi n’afọ 1632, o bipụtara akwụkwọ ọzọ iji kwado ozizi Copernicus. Kpọmkwem n’afọ na-esonụ, Ndị Njụta Okwukwe tụrụ Galileo mkpọrọ mkpụrụ ọka. Otú ọ dị, n’ihi afọ ndụ ya, ha gbanwere nke ahụ n’egbughị oge ma sịzie ka a tụọ ya mkpọrọ n’ụlọ ya.
Ọtụtụ ndị na-ele esemokwu Galileo na chọọchị ahụ anya dị ka oké mmeri sayensị meriri chọọchị ahụ nakwa Bible. Otú ọ dị, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ, iru ná nkwubi okwu a dị mfe ga-abụ ileghara ọtụtụ ihe anya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 Galileo kpasuru ndị a ma ama iwe n’ụzọ na-enweghị isi site n’ịza ha okwu ọkụ ọkụ na ịgwa ha okwu ndị na-akpasu iwe. Ọzọkwa, site n’ikwu na echiche nke anyanwụ ịdị n’etiti mbara igwe kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ, o mere onwe ya onye na-akụzi ihe banyere okpukpe, bụ́ nke kpasukwuru chọọchị ahụ iwe.
[Foto dị na peeji nke 3]
Copernicus
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’akwụkwọ bụ́ Giordano Bruno and Galilei (nke e dere n’asụsụ German)
[Foto dị na peeji nke 3]
Galileo ka ọ na-azara ọnụ ya n’ihu Ndị Njụta Okwukwe Rom
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’akwụkwọ bụ́ The Historian’s History of the World, Mpịakọta nke Itoolu, 1904
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
N’azụ: Chaatị na-egosi otú Copernicus chere usoro mbara igwe dị