Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

Gịnị mere e ji họrọ December 25 dị ka ụbọchị a ga na-eme ememe ọmụmụ Jizọs?

Okwu Chineke ekwughị ụbọchị a mụrụ Jizọs. Enciclopedia Hispánica na-ekwu, sị: “Nhọrọ a họọrọ December 25 dị ka ụbọchị a ga na-agba Krismas abụghị n’ihi nnyocha e leziri anya mee nke ụbọchị a mụrụ Jizọs, kama nke ahụ, ọ bụ n’ihi mgbanwe a gbanwere ememe etiti oge oyi ịghọ ememe Ndị Kraịst.” Ndị Rom oge ochie na-eme ememe mpụta nke anyanwụ n’oge oyi site n’ime oriri oké mkpọtụ na inyerịta onyinye.—12/15, peeji nke 4-5.

Ọrụ 7:59 ọ̀ na-apụta na Stivin kpegaara Jizọs ekpere?

Ee e. Bible gosiri na ọ bụ nanị Jehova Chineke ka e kwesịrị ikpegara ekpere. N’ịhụ Jizọs n’ọhụụ, ihe àmà na-egosi na ahụ́ ruru Stivin ala ịrịọ Jizọs n’onwe ya arịrịọ, na-asị: “Onyenwe anyị Jizọs, nara mmụọ m.” Stivin maara na e nyewo Jizọs ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 5:27-29) N’ihi ya Stivin rịọrọ Jizọs ka o chebe ike ndụ ya ruo oge mbilite n’ọnwụ.—1/1, peeji nke 31.

• Olee otú anyị si mara na a kaghị ọdịnihu mmadụ aka?

Chineke enyewo mmadụ nnwere onwe ime nhọrọ, nke a na-egosi na a kaghị ọdịnihu mmadụ aka. Ọ gaara abụrụ Jehova enweghị ịhụnanya na ekpeghị ikpe ziri ezi ibu ụzọ kpebie ihe anyị ga-eme, ma taa anyị ahụhụ n’ihi ihe ndị anyị mere. (Deuterọnọmi 32:4; 1 Jọn 4:8)—1/15, peeji nke 4-5.

• N’ihi gịnị ka ọ ga-eji bụrụ adịghị umeala n’obi mmadụ ikwu na ọrụ ebube apụghị ime eme?

N’ihi na ha aghọtala na ha amachaghị nkà ndị di ebube dị n’ihe ndị Chineke kere, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekweta na ha enweghịzi ike ikwu hoo haa na ihe agaghị eme eme. Nanị ihe ha nwere ike ikwu bụ na ihe ahụ eyighị ihe ga-eme eme.—2/15, peeji nke 5-6.

• Gịnị mere Onyeikpe Samsin ji gwa ndị mụrụ ya na ya chọrọ ịlụ nwanyị sitere ná ndị Filistia? (Ndị Ikpe 14:2)

Ọ bụ ihe megidere iwu Chineke ịlụ onye na-efe ofufe ụgha. (Ọpụpụ 34:11-16) N’agbanyeghị nke ahụ, nwanyị Filistia ahụ “ziri ezi” n’anya Samsin. Samsin “na-achọ ụzọ ọ ga-esi megide ndị Filistia,” nwanyị ahụ ziri ezi maka nzube ahụ. Chineke kwadoro Samsin site na mmụọ nsọ Ya. (Ndị Ikpe 13:25; 14:3, 4, 6)—3/15, peeji nke 26.

• Onye Kraịst ò kwesịrị inye onye ọrụ gọọmenti ego mmiri oyi ma ọ bụ ụdị onyinye ọzọ n’ihi ozi ndị ọ na-eje?

Ọ dị njọ mmadụ inye onye ọrụ gọọmenti ihe iri ngo, inye ya ihe bara uru ka o wee mee ihe iwu na-akwadoghị, kpee ikpe na-ezighị ezi, ma ọ bụ menyere ya. Ma inye onye na-arụrụ ọha na eze ọrụ ego mmiri oyi ma ọ bụ onyinye mgbe ọ na-arụ ọrụ ya ma ọ bụ iji mee ka o jeere gị ozi iwu kwadoro ma ọ bụ iji zere mmeso na-adịghị mma abụghị inye ihe iri ngo.—4/1, peeji nke 29.