Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Igbo Mkpa na Masedonia

Igbo Mkpa na Masedonia

Igbo Mkpa na Masedonia

“GAFETA na Masedonia nyere anyị aka.” (Ọrụ 16:9) Okwu ndị a otu nwoke Pọl onyeozi hụrụ n’ọhụụ gwara ya gosiri na e nwere mkpa nke ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ókèala ọhụrụ, n’obodo ndị dị na Gris ugbu a.

Ná mba Masedonia nke oge a, e nwere nanị otu Onyeàmà Jehova maka otu puku, narị mmadụ asatọ na iri anọ ọ bụla bi ebe ahụ. Ọtụtụ ndị anụtụbeghị banyere Jehova Chineke. Ee, e nwere mkpa dị ukwuu ime ka ndị mba a nụ ozi nke udo.—Matiu 24:14.

Chineke emeela ka o kwe omume inye aka gboo mkpa ahụ. Otu ụbọchị na November 2003, ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na Masedonia nke dị na Skopje zara òkù telifon ha na-atụghị anya ya. Ndị kpọrọ òkù telifon ahụ bụ Òtù Na-ahụ Maka Mmekọrịta Mba Masedonia na Mba Ndị Ọzọ. Ha kpọrọ Ndịàmà òkù iguzobe ụlọ ntu ebe ha ga-anọ kọwaa nkwenkwe ha n’oge ngosi ngwá ahịa ga-ewe ụbọchị atọ nke ga-amalite na November 20. Lee ohere magburu onwe ya nke ahụ bụ iji zie ọtụtụ puku mmadụ ndị na-anụtụbeghị ozi ọma Alaeze ahụ ozi ọma!

Ndị ọrụ afọ ofufo gbara mbọ iguzobe ụlọ ntu na idebesị ụdị akwụkwọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova n’asụsụ Macedonian n’ebe ahụ. E debere ụfọdụ n’ime akwụkwọ ndị a ebe onye ọ bụla ga-ahụ ha ma were ndị ha chọrọ. Nke a nyere ọtụtụ ndị ohere ịnara mmiri ime mmụọ na-enye ume ọhụrụ n’efu.—Mkpughe 22:17.

Ndị bịara ebe ahụ họọrọ nnọọ akwụkwọ ndị metụtara ndụ ha, ndị dị ka Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè na Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. * Mmadụ 98 nyere aha ha ma rịọ ka Ndịàmà Jehova kpọtụrụ ha. Ọtụtụ kwuru ihe ndị dị mma banyere Ndịàmà Jehova na otú akwụkwọ ndị ahụ si dị mma.

Otu nwoke se obere nwa ya nwoke n’aka bịa n’ụlọ ntu ahụ. Nwoke ahụ jụrụ ma è nwere akwụkwọ maka ụmụaka. Ndịàmà ahụ gosiri ya Akwukwọm nke Akukọ Bible. * O ji oké ọṅụ na-asapesị ya ma jụọ ego ole a na-ere ya. Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ nanị onyinye afọ ofufo ka e ji akwado ọrụ izi ihe nke Ndịàmà Jehova, obi tọkwudịrị ya ụtọ. (Matiu 10:8) O gosiri nwa ya nwoke akwụkwọ ahụ ma sị ya: “Akwụkwọ a amaka! M ga na-agụrụ gị otu akụkọ kwa ụbọchị!”

Otu prọfesọ nkà ihe ọmụma bịakwara n’ụlọ ntu ahụ. O nwere nnọọ mmasị n’okpukpe n’ozuzu ma karịsịa na nkwenkwe Ndịàmà Jehova. Ka ọ na-asape akwụkwọ Mankind’s Search for God, * prọfesọ ahụ kwuru, sị: “E dere ya n’ụzọ kwere nnọọ nghọta! Nke a bụ nnọọ otú m chere e kwesịrị isi na-ede akwụkwọ.” Mgbe e mesịrị, ụfọdụ ụmụ akwụkwọ si n’ụlọ akwụkwọ ya bịara n’ụlọ ntu ahụ ma rịọ ka e nye onye nke ọ bụla n’ime ha akwụkwọ ahụ prọfesọ ahụ nwetara. Ha chọrọ ịmụ otu akwụkwọ ahụ. Ha chere na ọ ga-esi n’akwụkwọ ahụ weta ihe ọ ga-akụziri ha.

Ihe ngosi ahụ nyere ụfọdụ ndị ohere mbụ ha ịnụ eziokwu Akwụkwọ Nsọ. Otu ìgwè ndị ogbi na-eto eto bịara ebe ahụ ilegharị anya. Otu Onyeàmà ji obere oge gwa ha okwu, otu nwata nwanyị nyekwaara ya aka ịtụgharị ihe ọ na-ekwu gaa n’asụsụ ogbi. O ji ihe osise ndị dị n’akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ * kọwaara ha na Jizọs gwọrọ ndị ọrịa, gụnyere ndị ogbi. Obi dị ha ụtọ “ịnụ” nkwa Bible bụ́ na n’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-emekwara ndị bi n’ụwa n’oge anyị a otu ihe ahụ. Ọtụtụ n’ime ha natara akwụkwọ ndị dabeere na Bible, e mekwara ndokwa ka Onyeàmà maara asụsụ ogbi leta ha.

E wezụga akwụkwọ ndị e dere n’asụsụ Macedonian, e nwekwara ndị e dere n’asụsụ Albanian, Bekee na Turkish. Otu nwoke na-amaghị asụsụ Macedonian rịọrọ ka e nye ya akwụkwọ ụfọdụ n’asụsụ Bekee. Ka ọ natasịrị magazin Ụlọ Nche na Teta!, o kwuru na ya na-asụ asụsụ Turkish. Mgbe e gosiri ya akwụkwọ n’asụsụ nke ya, o siiri ya ike ikweta ihe anya ya na-ahụ! Ọ hụrụ na Ndịàmà Jehova chọrọ inyere onye ọ bụla aka.

Lee àmà dị mma a gbara n’oge ihe ngosi ahụ, leekwa ka o si bụrụ ihe na-agba ume ịhụ ka ọtụtụ mmadụ na-egosi mmasị na Bible! Ee, Jehova mere ka o kwe omume ịgbasakwu ozi Alaeze ahụ na Masedonia.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ha nile.

^ par. 7 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ha nile.

^ par. 8 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ha nile.

^ par. 9 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ha nile.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]

IHE OMUME DỊ ỊRỊBA AMA!

Na May 17, 2003, e nwetara nnukwu enyemaka ná mgbalị a na-eme ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. A raara ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova nye na Skopje. O were afọ abụọ iji wuchaa ya, ihe owuwu ndị e nwekwara ugbu a n’ebe ahụ ji okpukpu anọ karịa ndị e nweburu.

E nwere ihe owuwu atọ bụ́ ebe e nwere ọfịs nlekọta na nke nsụgharị tinyere ebe obibi, ụlọ isi nri, na ebe ịsa ákwà. Guy Pierce, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, bịara, ọ bụkwa ya kwuru okwu nraranye. Ndị ọbịa si mba iri bịara ihe omume nraranye ahụ. Ha nile nwere obi ụtọ ịhụ ụlọ ọhụrụ ndị ahụ mara mma.

[Map dị na peeji 8, 9]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

BULGARIA

MASEDONIA

Skopje

ALBANIA

GRIS

[Foto dị na peeji nke 8]

Skopje, Masedonia