Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ọmụma E Nwere Ọ̀ Karịrị Anyị Akarị?

Ihe Ọmụma E Nwere Ọ̀ Karịrị Anyị Akarị?

Ihe Ọmụma E Nwere Ọ̀ Karịrị Anyị Akarị?

Otu di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ nọ ọdụ n’ụsọ otu oké osimiri dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa na-ekiri ọnwa ka ọ na-egbukepụ na mbara igwe. Nke nwoke kwuru, sị: “Olee ókè ihe ụmụ mmadụ maara banyere ọnwa hà, oleekwa ókè ihe ha ka ga-amụta banyere ya hà?”

Nwunye ya zara, sị: “Cheedị otú ọ gaara adị ma a sị na anyị pụrụ ịhụ ụwa ka ọ na-agbagharị otú a—ihe ọmụma ha aṅaa ka ndị nọ n’ụwa nwerela, ònye makwa ókè ihe ọmụma ha ka ga-enweta hà? Cheekwa nnọọ banyere ya! Ọ bụghị nanị na ụwa na-agba anyanwụ gburugburu kama usoro mbara igwe anyị dum na-agbagharị agbagharị. Ihe nke a pụtara bụ na o nwere ike ịbụ na anyị agakwaghị anọ kpọmkwem ebe anyị nọ ugbu a na mbara igwe ọzọ. N’ezie, ihe anyị na-eji ama ebe anyị nọ ugbu a bụ ebe anyị nọ site n’ebe ihe ndị dị na mbara igwe, bụ́ ndị anyị maara nke ọma, dị. Anyị maara ọtụtụ ihe banyere ihe ụfọdụ, ma e nwere otú ọ ga-abụ e si lee ya anya, ya abụrụ na anyị amadịghị ebe anyị nọ!”

OKWU ndị ahụ metụtara eziokwu ụfọdụ ndị bụ́ isi. O yiri ka è nwere ọtụtụ ihe ịmụ. N’ezie, onye nke ọ bụla n’ime anyị na-amụta ihe ọhụrụ kwa ụbọchị. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ókè ihe anyị na-amụta hà, o yiri ka anyị adịghị enwe ike ịmata ihe nile anyị ga-achọ ịmata.

N’ikwu eziokwu, tụkwasị n’inwe ike inweta ihe ọmụma ndị ọhụrụ, ikike ichekwa ihe ọmụma amụbawo nnọọ nke ukwuu. Ihe ọmụma ụmụ mmadụ n’ozuzu pụrụ ichekwa ebuwo nnọọ ibu site n’enyemaka nke nkà na ụzụ. Ihe ọmụma kọmputa pụziri ichekwa ebuola ibu nke ukwuu nke na e chepụtawo okwu mgbakọ na mwepụ ọhụrụ iji kọwaa ya. Obere ihe nchekwa ihe ọmụma kọmputa a na-akpọ CD-ROM pụrụ ichekwa ihe ọmụma buru nnọọ ibu; a na-akọwa ihe ọ pụrụ ichekwa dị ka narị megabyte isii na iri asatọ ma ọ bụ karịa. Ụdị ihe nchekwa ihe ọmụma kọmputa a na-akpọ DVD pụrụ ichekwa ihe ọmụma karịrị nke ahụ okpukpu asaa, a rụpụtawakwala ndị nwedịrị ike ichekwa ihe ọmụma karịrị nke ahụ.

Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na anyị apụghị ịghọtacha ụzọ nile ụmụ mmadụ pụrụ isi zirịta ozi n’oge a. Ígwè obibi akwụkwọ ndị na-ebi ihe n’ihu na n’azụ akwụkwọ n’otu mgbe na-agba ọsọ dị egwu, na-ebipụta akwụkwọ akụkọ, magazin, na akwụkwọ ọgụgụ. Nye onye ji Intanet eme ihe, nanị ịpị aka na bọtịn kọmputa ga-eme ka o nweta ụbara ihe ọmụma. N’ụzọ ndị a na n’ụzọ ndị ọzọ, ihe ọmụma a na-agbasa karịrị ihe mmadụ ọ bụla pụrụ ịchịkọta. Mgbe ụfọdụ, e jiriwo ụbara ihe ọmụma ndị a tụnyere osimiri, o buru ibu ruo n’ókè nke na a pụrụ ịsị na anyị aghaghị igwugharị n’ime ya ma gbalịa ịghara ịṅụcha ya. Nanị otú ihe ọmụma si baa ụba na-amanye anyị ịhọ ya ahọ.

Ihe ọzọ mere anyị ga-eji na-ahọ ihe ọmụma ndị e nwere ahọ bụ na ọtụtụ n’ime ha abachaghị uru. N’ezie, ụfọdụ n’ime ha adịdịghị mma, ha ekwesịghị ka mmadụ mara ha. Cheta na e nwere ma ihe ọmụma ndị dị mma ma ndị na-adịghị mma. Nke kadị njọ bụ na ụfọdụ n’ime ihe ọtụtụ ndị chere na ha bụ eziokwu bụ ụgha. Ugboro ugboro, ọbụna ihe ndị a na-akwanyere ùgwù kwuru emesịwo nnọọ bụrụ ndị na-eduhie eduhie, ma ọ bụ ụgha! Dị ka ihe atụ, chee banyere onye nlekọta Efesọs oge ochie, bụ́ onye e lere nnọọ anya dị ka onye ọrụ gọọmenti maara ihe. Ọ zọọrọ, sị: “Ònye ka ọ bụ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ nke na-amaghị na obodo ndị Efesọs bụ ebe e nwere ụlọ nsọ Atemis ukwu ahụ nakwa ebe e nwere onyinyo ahụ nke si n’eluigwe daa?” (Ọrụ 19:35, 36) Ọ bụ ezie na nke a yiri ihe onye ọ bụla maara—ọtụtụ ga-asị na ọ dịdịghị onye gbaghara ya—ọ bụghị eziokwu na ihe oyiyi ahụ si n’eluigwe daa. E nwere ezi ihe mere Bible Nsọ ji adọ Ndị Kraịst aka ná ntị izere ihe “a na-akpọ ‘ihe ọmụma’ n’ụzọ ụgha.”—1 Timoti 6:20.

Ihe gbara ọkpụrụkpụ mere anyị ga-eji na-ahọ ihe ọmụma ahọ bụ na ndụ anyị dị ugbu a dị nnọọ mkpụmkpụ. N’agbanyeghị afọ ole ị dị, o doro anya na e nwere ọtụtụ ihe ị ga-achọ ịmụ, ma, ị maara na afọ ole ị ga-adị ndụ agaghị ezu iji mụọ ha.

Ọ̀ dị mgbe nsogbu a bụ́ isi ga-akwụsị? È nwere ike inwe ihe ọmụma ga-agbatị ndụ anyị ruo nnọọ ogologo oge, ọbụna ruo mgbe ebighị ebi? Ò nwere nnọọ ike ịbụ na e nweelarị ụdị ihe ọmụma ahụ? Ya bụrụ na e nweela ya, ọ̀ ga-erutụrụ mmadụ nile? À ga-enwe mgbe ihe ọmụma nile ga-abụ ihe anyị na-atụ anya ka ha bụrụ—ya bụ, eziokwu? Di na nwunye ahụ bụ́ ndị ozi ala ọzọ e kwuru banyere ha ná mmalite achọtawo azịza ndị na-eju afọ nye ajụjụ ndị ahụ, ị pụkwara ime otú ahụ. Biko gụọ isiokwu na-esonụ bụ́ nke ga-enye gị ohere inweta ihe ọmụma ruo mgbe ebighị ebi.