Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inweta Ihe Ọmụma Ugbu a na Ruo Mgbe Ebighị Ebi

Inweta Ihe Ọmụma Ugbu a na Ruo Mgbe Ebighị Ebi

Inweta Ihe Ọmụma Ugbu a na Ruo Mgbe Ebighị Ebi

DỌKỊTA onye Germany bụ́ Ulrich Strunz dere akwụkwọ nwere mpịakọta dị iche iche isiokwu ya bụ Forever Young (Akaghị Nká Ruo Mgbe Ebighị Ebi). N’akwụkwọ ndị a, o kwuru na imega ahụ́, iri ezigbo nri na ibi ndụ dị mma pụrụ ime ka mmadụ gbasikwuo ike na ma eleghị anya dị ogologo ndụ. Ma, o kweghị ndị na-agụ akwụkwọ ya nkwa na ha pụrụ nnọọ ịdị ndụ ebighị ebi site n’ịgbaso ndụmọdụ ya.

Otú ọ dị, e nwere ụdị ihe ọmụma ga-eme ka mmadụ dị ndụ ebighị ebi. I leekwa ya anya n’ụzọ ọzọ, ọ bụrụ na ị dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ị pụrụ ịnọgide na-enweta ihe ọmụma ruo mgbe ebighị ebi. Jizọs kwuru n’ekpere o kpegaara Chineke, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ka anyị buru ụzọ kọwaa ihe okwu ahụ bụ́ “ndụ ebighị ebi” pụtara, mgbe ahụzi, mata ihe ihe ọmụma ahụ gụnyere na otú ị pụrụ isi nweta ya.

Dị ka Bible si kwuo, Onye Okike ga-agbanwe ụwa n’oge na-adịghị anya ịghọ paradaịs nkịtị, bụ́ nke ga-eme ka o kwe omume ịdị ogologo ndụ. Iweta Paradaịs ahụ ga-agụnye ime ihe gbara ọkpụrụkpụ, nke yiri Iju Mmiri nke ụbọchị Noa. Matiu isi 24, amaokwu 37 ruo 39, na-egosi na Jizọs ji oge anyị tụnyere “ụbọchị Noa,” bụ́ mgbe ndị mmadụ ‘na-amaghị’ ọnọdụ ọjọọ ha nọ na ya. Ha leghakwaara ozi Noa kwusara anya. O ruziri “ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ,” Iju Mmiri ahụ bibikwara ndị nile jụrụ ihe ọmụma a. Noa na ndị ya na ha nọ n’ime ụgbọ ahụ dịgidere ndụ.

Jizọs kwuru na “ụbọchị” yiri ya ga-abịa n’oge anyị. Ndị nabatara ma mee ihe kwekọrọ n’ihe ọmụma metụtara ihe omume a ga-enwe olileanya, ọ bụghị nanị ịdịgide ndụ, kamakwa ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọzọkwa, a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị Chineke na-echeta ma nye ha ohere nke ịghara ịnwụ anwụ ọzọ. (Jọn 5:28, 29) Rịba ama otú Jizọs si kwupụta ihe abụọ a. Mgbe ọ na-agwa Mata banyere mkpọlite nke ndị nwụrụ anwụ, o kwuru, sị: “Onye na-egosipụta okwukwe na mụ, ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ga-abịa dịrị ndụ; onye ọ bụla nke dị ndụ ma na-egosipụta okwukwe na mụ adịghị mgbe ọ ga-anwụ ma ọlị.” Ihe àmà nile e nwere na-egosi na “ụbọchị” a dị ezi nso, nke pụtara na ọ pụrụ ịbụ na ‘ọ dịghị mgbe ị ga-anwụ ma ọlị.’—Jọn 11:25-27.

Jizọs jụziri Mata, sị: “Ì kweere nke a?” Mata zara ya, sị: “Ee, Onyenwe anyị.” Ka e were ya na Jizọs jụrụ gị otu ajụjụ ahụ taa, gịnị ka ị ga-aza? Ma eleghị anya, ọ ga-esiri gị ike ikweta na ọ ga-ekwe omume ịghara ịnwụ anwụ ma ọlị. Ma a sịgodị na ọ bụ otú ahụ ka i chere, o doro anya na ị ga-achọ inwe ike ikwere ya. Cheedị ihe ị pụrụ ịmụta ma ọ bụrụ na ‘ọ dịghị mgbe ị ga-anwụ ma ọlị’! Cheedị otú ọ ga-adị gị ime ihe nile na-agụ gị agụụ ugbu a ịmụta na ime ma ya abụrụ na i nwetụghị oge iji mee ha. Cheekwa nnọọ otú ọ ga-adị ma ọ bụrụ na ị hụ ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ! Olee ihe ọmụma pụrụ ime ka i nweta ihe ndị dị otú ahụ, oleekwa otú ị pụrụ isi nweta ya?

Inweta Ihe Ọmụma Na-enye Ndụ —Ihe Anyị Ga-emeli

Inweta ihe ọmụma banyere Chineke na Kraịst ọ̀ bụ ihe anyị na-agaghị emeli? Ee e. Ọ bụ ezie na ihe ọmụma banyere ọrụ nke Onye Okike enweghị nsọtụ. Ma, Jizọs anọghị na-ekwu banyere nkà mmụta mbara igwe ma ọ bụ otu n’ime ihe ọmụmụ sayensị ndị ọzọ mgbe o jikọtara “ihe ọmụma” na “ndụ ebighị ebi.” Ilu isi 2, amaokwu 1 na nke 5, na-egosi na “okwu ọnụ” na “ihe ndị [e] nyere n’iwu” dị na Bible dị mkpa iji nweta “ihe ọmụma Chineke.” Mgbe ọ na-ekwukwa banyere Jizọs, Jọn 20:30, 31 na-egosi na ihe ndị e deturu edetu zuru ezu ime ka anyị “wee nwee ndụ.”

Ya mere, ihe ọmụma banyere Jehova na Jizọs Kraịst bụ́ ndị e dere na Bible zuru ezu igosi gị otú ị ga-esi nweta ndụ ebighị ebi. Bible bụ akwụkwọ pụrụ iche. Onye Okike ji obiọma nye ike mmụọ nsọ ya ka e jiri dee ya n’ụzọ ga-eme ka ọbụna ndị na-agụghị oké akwụkwọ nwee ike inweta ihe ọmụma ga-ezu iji nweta ndụ ebighị ebi. N’otu aka ahụ, onye nwere ụbụrụ na-aghọ nkọ nke nwere ohere na ego ga-enwe nnọọ ike ịmụta ihe ọhụrụ site n’Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ. Na i nwere ike ịgụ isiokwu a na-egosi na i nwere ikike ịmụta ihe, ma olee otú i kwesịrị isi jiri ikike ahụ mee ihe?

Gburugburu ụwa, ahụmahụ egosiwo na ụzọ kasị dị irè isi nweta ihe ọmụma a bụ mmadụ ịmụ Bible site n’enyemaka nke onye ghọtaworo ya. Dị nnọọ ka Noa gbalịsiri ike ime ka ndị ya na ha dịkọrọ ndụ nweta ihe ọmụma, Ndịàmà Jehova dị njikere ịbịa n’ụlọ gị iso gị kwurịta ihe ndị dị na Bible. Ha pụrụ iji broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ obere akwụkwọ a kpọrọ aha kwesịrị ekwesị bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi * mee ihe. Ya bụrụgodị na o siiri gị ike ikwere na na Paradaịs elu ala, ndị kwesịrị ntụkwasị obi ‘adịghị mgbe ha ga-anwụ ma ọlị,’ nkwurịta okwu ndị a dabeere na Bible ga-eme ka ị tụkwasị nkwa a obi. Ya mere, ya bụrụ na ị ga-achọ ịdị ndụ ebighị ebi ma ọ bụ chọọ nanị ịma ma ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na ị pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi, gịnị ka i kwesịrị ime? I kwesịrị ịnabata ohere a a na-enye gị ịmụ Bible.

Oge ha aṅaa ka ọ ga-ewe? Broshuọ ahụ a ka kpọpụrụ aha nke nwere peeji 32, bụ́ nke dị n’ọtụtụ narị asụsụ, nwere nanị ihe ọmụmụ 16. Ma ọ bụ, ya bụrụ na ị pụrụ iwepụta otu awa kwa izu, ọ ga-ewe gị nanị ọnwa ole na ole ịmụ isiokwu Bible ndị bụ́ isi site n’iji akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi eme ihe. Akwụkwọ ndị a enyeworo ọtụtụ ndị aka inweta ihe ọmụma buru ibu na ịhụ Chineke n’anya n’ụzọ miri emi. Onye Okike ga-akwụ ndị hụrụ ya n’anya n’ezie ụgwọ ọrụ, nyere ha aka inweta ndụ ebighị ebi.

N’ezie, ihe ọmụma na-enye ndụ ebighị ebi bụ ihe anyị ga-enwetali, ọ raghịkwa ahụ́ nnweta. A sụgharịwo Bible, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ akụkụ ya ụfọdụ, gaa na puku asụsụ abụọ. Ndịàmà Jehova nọ na narị ala abụọ na iri atọ na ise nwere obi ụtọ iwepụta onwe ha inyere gị aka na inye gị akwụkwọ ndị dabeere na Bible ka i wee nwee ike ịmụbakwu ihe ọmụma gị.

Ọmụmụ Ihe Onwe Onye

Mmekọrịta gị na Chineke bụ ihe dịịrị nanị gị na Onye Okike. Ọ bụ nanị gị pụrụ ime ka mmekọrịta ahụ sie ike, ọ bụkwa nanị ya pụrụ inye gị ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, i kwesịrị ịnọgide na-amụ Okwu ya e dere ede. Site n’inwe onye na-abịachi anya na nke gị, ọ pụrụ ịdịkwuru gị mfe iwepụta oge iji mụọ ihe.

Ebe ọ bụ na Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible nwere “ihe ọmụma Chineke,” ọ dị ezigbo mkpa ilekọta ha anya nke ọma. (Ilu 2:5) Nke a ga-eme ka ha dịruoro gị ọtụtụ afọ. Ya bụrụ na i bi ná mba ka na-emepe emepe, ọ pụrụ ịbụ na ị gụghị ọtụtụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ, ikekwe, ụzọ bụ́ isi i si mụta ihe ndị ị ma bụ ịṅa ntị na ilere anya. Dị ka ihe atụ, ná mba Benin, a na-asụ ihe karịrị asụsụ 50. Ọ bụghị ihe ijuanya ịhụ onye asụsụ anọ ma ọ bụ ise na-aga werewere n’ọnụ, n’agbanyeghị na o nwetụbeghị akwụkwọ ọ bụla n’asụsụ ndị a. Ọ bụ ngọzi na ị pụrụ ịmụta ihe site n’ịṅa ntị, ilere anya ma ọ bụ site n’itinye uche n’ihe. Ma, ị ga-achọpụta na akwụkwọ pụrụ inyere gị nnọọ aka n’ọmụmụ ihe gị.

Ya bụrụgodị na ụlọ ebe i bi kpara akpa, gbalịa inwe ebe kwesịrị ekwesị ị ga na-edebe Bible gị na akwụkwọ ndị e ji amụ ya. Debe ha ebe aka gị ga na-eru ha ngwa ngwa na ebe ọ na-adịghị ihe ga-eme ha.

Ọmụmụ Ihe Ezinụlọ

Ọ bụrụ na i nwere ụmụ, i kwesịkwara inwe mmasị n’inyere ụmụ gị aka inweta otu ihe ọmụma ahụ ị na-enweta. Ná mba ndị ka na-emepe emepe, ndị nne na nna na-akụzikarịrị ụmụ ha nkà ndị dị mkpa ná ndụ. Ọ pụrụ ịgụnye isi nri, ịkpa nkụ, ịrụ ọrụ ugbo, ịkụ azụ, na ịzụ ihe n’ahịa. Nke a bụ n’ezie ọzụzụ dị mkpa ná ndụ. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nne na nna anaghị agbakwụnye ihe ọmụma pụrụ iduga ná ndụ ebighị ebi n’ọzụzụ a.

N’agbanyeghị ọnọdụ ị nọ na ya, o yikarịrị ka ị̀ na-eche na i nweghị ohere. Onye Okike makwa na ọ dị otú ahụ. Rịba ama ihe o kwuru ogologo oge gara aga mgbe ọ na-ekwu banyere otú mmadụ ga-esi na-ezi ụmụ ya ụzọ Chineke: “Ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Deuterọnọmi 6:7) N’ihi okwu ndị a, gịnị ma ị gbalịa iwepụta usoro ị ga na-eji ezi ụmụ gị ihe, dị ka nke na-esonụ:

1. “Mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị”: Gbalịa ka gị na ụmụ gị na-ekwurịtachi okwu anya n’ụlọ, ikekwe kwa izu, dị nnọọ ka onye ọzọ meere gị ma eleghị anya. Ndịàmà Jehova nwere akwụkwọ ndị dabeere na Bible dị mma iji na-ezi ụmụaka nọ n’afọ ndụ nile ihe.

2. “Mgbe ị na-eje ije n’ụzọ”: Mgbe gị na ụmụ gị na-eme ihe ndị dịịrị unu n’ụbọchị, na-agwa ha banyere Jehova, dị nnọọ ka i si akụziri ha ihe ndị dị mkpa ná ndụ ma ọ bụ na-enye ha nduzi n’oge a na-eyighị eyi.

3. “Mgbe ị na-edina ala”: Soro ụmụ gị na-ekpe ekpere kwa abalị.

4. “Mgbe ị na-ebili ọtọ”: Ọtụtụ ezinụlọ arụpụtawo ihe ndị na-enye obi ụtọ site n’ịtụle otu akụkụ Bible kwa ụtụtụ. Ndịàmà Jehova na-eji akwụkwọ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị * eme nke a.

Ná mba ndị ka na-emepe emepe, ọtụtụ ndị nne na nna na-eme mgbalị dị ukwuu iji hụ na otu n’ime ụmụ ha gụrụ akwụkwọ otú kwesịrịnụ. Nke ahụ ga-eme ka nwata ahụ nwee ike ilekọta nne na nna ya mgbe ha mere agadi. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị mụọ Bible ma nyere ụmụ gị aka imekwa otú ahụ, ị ga-enweta ihe ọmụma ga-eme ka gị na ezinụlọ gị nwee ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ̀ dị mgbe anyị ga-ama ihe nile? Ee e. Ka ụwa anyị nọgidere na-eme njem ya na-adịghị agwụ agwụ na mbara igwe, anyị ga-anọgide na-enweta ihe ọmụma. N’ezie, Eklisiastis 3:11 na-ekwu, sị: “Ihe nile ọ bụla ka [Chineke] meworo ka ọ maa mma na mgbe ya: ọzọ, mgbe ebighị ebi ka O tinyeworo n’obi ha, ma ka O si tinye ya mmadụ agaghị achọpụta ọrụ ahụ nke Chineke rụworo site ná mmalite wee ruo na nsọtụ.” Inweta ihe ọmụma bụ ihe na-enye obi ụtọ nke na-agatụghị akwụsị akwụsị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtachara ha.

^ par. 23 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

“Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị . . . ”

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Nyere ezinụlọ gị aka inweta ihe ọmụma ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi