Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tụkwasị Okwu Jehova Obi

Tụkwasị Okwu Jehova Obi

Tụkwasị Okwu Jehova Obi

“Atụkwasịwo m okwu Gị obi.”—Abụ Ọma 119:42.

1. Ònye ka ị ga-asị na ọ bụ ya dere Abụ Ọma nke 119, gịnịkwa ka ị pụrụ ikwu banyere àgwà ya?

ONYE dere Abụ Ọma nke 119 jiri okwu Jehova kpọrọ ihe. Ọ pụrụ ịbụ Nwa Eze bụ́ Hezekaịa nke Juda dere ya. Mmetụta ndị e kwupụtara n’abụ a e ji ike mmụọ nsọ dee kwekọrọ n’àgwà Hezekaịa, bụ́ onye “rapaara Jehova n’ahụ́” mgbe ọ bụ eze Juda. (2 Ndị Eze 18:3-7) Otu ihe doro anya: Onye dere abụ ahụ maara mkpa nke ime mmụọ ya.—Matiu 5:3.

2. Gịnị bụ isi ihe dị n’Abụ Ọma nke 119, oleekwa otú e si hazie abụ a?

2 Ihe bụ́ isi Abụ Ọma nke 119 na-ekwu bụ uru okwu, ma ọ bụ ozi Chineke, bara. * O yiri ka onye dere abụ ọma ahụ ò dere ya n’usoro e si ede mkpụrụ akwụkwọ iji nyere ndị na-agụ ya aka icheta abụ a. Amaokwu 176 dị n’abụ ọma a dabeere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị na-eso onwe ha n’usoro mkpụrụ akwụkwọ Hibru. Na Hibru mbụ, nke ọ bụla n’ime ahịrị abụ 22 nke abụ ọma ahụ nwere ahịrị 8 ndị ji otu ụdị mkpụrụ akwụkwọ malite. Abụ ọma a zoro aka n’okwu, iwu, ihe àmà, ụzọ, ihe ịrịba ama, ụkpụrụ, ikpe na okwu ọnụ Chineke. N’isiokwu a na na nke na-eso ya, a ga-atụle Abụ Ọma nke 119 dabere ná nsụgharị ka zie ezie nke ihe odide Bible Hibru. Ịtụgharị uche n’ahụmahụ nke ndị ohu Jehova n’oge gara aga na n’oge a kwesịrị ime ka anyị ghọtakwuo abụ a e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee ma mee ka anyị nwekwuo ekele maka Okwu Chineke e dere ede, bụ́ Bible.

Rubere Okwu Chineke Isi Ma Nwee Obi Ụtọ

3. Kọwaa ihe ịbụ onye na-enweghị ntụpọ pụtara, ma nye ihe atụ.

3 Ezi obi ụtọ na-adabere n’anyị ijegharị n’iwu Chineke. (Abụ Ọma 119:1-8) Ọ bụrụ na anyị emee nke a, Jehova ga-ele anyị anya dị ka ‘ndị zuru okè [“ndị enweghị ntụpọ,” NW] n’ụzọ ha.’ (Abụ Ọma 119:1) Ịbụ ndị na-enweghị ntụpọ apụtaghị na anyị zuru okè, kama ọ na-egosi na anyị na-agbalịsi ike ime uche Jehova Chineke. Noa gosipụtara onwe ya dị ka “onye zuru okè [“onye na-na-enweghị ntụpọ,” NW] n’ọgbọ ya nile” dị ka onye ya “na Chineke yịkọrọ na-ejegharị.” Nna ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na ezinụlọ ya lanarịrị Iju Mmiri ahụ n’ihi na o biri ụdị ndụ Jehova chọrọ. (Jenesis 6:9; 1 Pita 3:20) N’otu aka ahụ, anyị ịlanarị ọgwụgwụ nke ụwa a na-adabere n’anyị ‘idebesi ihe ịrịba ama Chineke ike,’ si otú ahụ na-eme uche ya.—Abụ Ọma 119:4.

4. Obi ụtọ na ihe ịga nke ọma anyị na-adabere na gịnị?

4 Jehova agatụghị ahapụ anyị ma ọ bụrụ na anyị ‘ewere obi ziri ezi kelee ya ma nọgide na-edebe ụkpụrụ ya.’ (Abụ Ọma 119:7, 8) Chineke agbahapụghị onye ndú Izrel bụ́ Jọshụa, bụ́ onye tinyere n’ọrụ ndụmọdụ ahụ bụ́ ‘ịtụgharị uche n’ime akwụkwọ iwu ahụ ehihie na abalị ka o wee nwee ike ime dị ka ihe nile si dị nke e deworo n’ime ya.’ Nke ahụ mere ka o nwee ihe ịga nke ọma ma nyere ya aka iji amamihe mee ihe. (Joshua 1:8) Ka ọnwụ ya na-eru nso, Jọshụa ka nọ na-ekele Chineke ma nwee ike ichetara ụmụ Izrel, sị: “Unu amawo n’obi unu nile na n’ime mkpụrụ obi unu nile, na ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu, ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ime ya.” (Joshua 23:14) Dị ka Jọshụa na onye dere Abụ Ọma nke 119, anyị pụrụ inweta obi ụtọ ma nwee ihe ịga nke ọma site n’ito Jehova na ịtụkwasị okwu ya obi.

Okwu Jehova Na-eme Ka Anyị Dị Ọcha

5. (a) Kọwaa otú o si kwe omume ịnọgide na-adị ọcha n’ụzọ ime mmụọ. (b) Enyemaka dị aṅaa ka e nwere maka onye na-eto eto nke mere mmehie dị oké njọ?

5 Anyị pụrụ ịdị ọcha n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụrụ na anyị elezie ụzọ anyị anya dị ka okwu Chineke si dị. (Abụ Ọma 119:9-16) Nke a ga-ekwe omume ma ọ bụrụgodị na ndị mụrụ anyị esetịpụghị ezi ihe nlereanya. Ọ bụ ezie na nna Hezekaịa bụ onye na-ekpere arụsị, Hezekaịa ‘mere ka ụzọ ya dị ọcha’ ikekwe pụọ n’ikpere arụsị. Gịnị ma ọ bụrụ na onye na-eto eto nke na-ejere Chineke ozi taa emee mmehie dị oké njọ? Nchegharị, ekpere, enyemaka nke ndị mụrụ ya, na enyemaka ịhụnanya nke ndị okenye pụrụ inyere ya aka ịdị ka Hezekaịa na ‘ime ka ụzọ ya dị ọcha ma na-elezi ya anya.’—Jems 5:13-15.

6. Olee ndị inyom ‘mere ka ụzọ ha dị ọcha ma lezie ya anya dị ka okwu Chineke si dị’?

6 Ọ bụ ezie na Rehab na Rut biri ndụ ogologo oge tupu e dee Abụ Ọma nke 119, ha ‘mere ka ụzọ ha dị ọcha.’ Rehab bụ nwanyị akwụna bụ́ onye Kenan, ma a bịara mara ya n’ihi okwukwe ya dị ka onye na-efe Jehova. (Ndị Hibru 11:30, 31) Rut bụ́ onye Moab hapụrụ chi ndị ọ na-efe, jeere Jehova ozi ma mee ihe kwekọrọ n’Iwu O nyere Izrel. (Rut 1:14-17; 4:9-13) Ndị inyom abụọ a na-abụghị ndị Izrel ‘leziri ụzọ ha anya dị ka okwu Chineke si dị’ ma nwee ihe ùgwù magburu onwe ya nke ịghọ ndị nne ochie Jizọs Kraịst.—Matiu 1:1, 4-6.

7. Olee otú Daniel na ndị ntorobịa Hibru atọ ọzọ si setịpụ ezi ihe nlereanya n’ịnọgide na-adị ọcha n’ụzọ ime mmụọ?

7 “Nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata,” ma ndị na-eto eto pụrụ ịgbaso ụzọ dị ọcha, ọbụna n’ụwa a rụrụ arụ nke Setan na-achịkwa. (Jenesis 8:21; 1 Jọn 5:19) Mgbe a dọọrọ ha n’agha gaa Babilọn, Daniel na ndị ntorobịa Hibru atọ ọzọ ‘leziri ụzọ ha anya dị ka okwu Chineke si dị.’ Dị ka ihe atụ, ha ‘agaghị ewere ihe oriri ọma eze merụọ onwe ha.’ (Daniel 1:6-10) Ndị Babilọn na-eri anụ ndị na-adịghị ọcha, bụ́ ndị Iwu Mozis machibidoro. (Levitikọs 11:1-31; 20:24-26) Ọ bụghị mgbe nile ka ha na-egbupụ anụ ha ọbara, anụ a na-egbupụghị ọbara ha na-eri megidekwara iwu Chineke banyere ọbara. (Jenesis 9:3, 4) Ka a sịkwa ihe mere ndị Hibru anọ ahụ ji jụ iri ihe oriri ọma eze! Ndị ntorobịa ahụ nọgidere na-adị ọcha n’ụzọ ime mmụọ ma si otú ahụ setịpụ ezi ihe nlereanya.

Okwu Chineke, Ihe Na-enyere Anyị Aka Ikwesị Ntụkwasị Obi

8. Àgwà na ihe ọmụma dị aṅaa dị anyị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-aghọta ma tinye iwu Chineke n’ọrụ?

8 Okwu Chineke ịtọ anyị ụtọ bụ ihe dị mkpa na-eme ka anyị nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova. (Abụ Ọma 119:17-24) Ọ bụrụ na anyị dị ka ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ, ọ ga-agụsị anyị agụụ ike ịghọta “oké ihe dị iche iche” nke iwu Chineke. Anyị ga-anọgide ‘na-achọsi ikpe Jehova ike’ ma na-egosi na ‘ihe àmà ya na-atọ anyị ụtọ nke ukwuu.’ (Abụ Ọma 119:18, 20, 24) Ọ bụrụgodị na ọ dịbeghị anya anyị raara onwe anyị nye Jehova, ànyị ‘azụlitewo agụụ maka mmiri ara a na-agwagbughị agwagbu nke dịịrị okwu ahụ’? (1 Pita 2:1, 2) Ọ dị anyị mkpa ịghọta ozizi Bible ndị bụ́ isi ka anyị wee nwee ike ịghọta iwu Chineke nke ọma ma tinye ya n’ọrụ.

9. Gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe ihe ụmụ mmadụ chọrọ ka anyị mee megidere iwu Chineke?

9 Ihe àmà Chineke pụrụ ịdị na-atọ anyị ụtọ, ma gịnị ma ọ bụrụ na “ndị isi” ana-ekwugide anyị n’ihi ihe ụfọdụ? (Abụ Ọma 119:23, 24) Taa, ndị nwere ikike n’ọchịchị na-amanyekarị anyị ibute iwu ụmụ mmadụ ụzọ karịa nke Chineke. Mgbe ihe ụmụ mmadụ chọrọ megidere uche Chineke, gịnị ka anyị ga-eme? Okwu Chineke ịtọ anyị ụtọ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova. Dị ka ndịozi Jizọs Kraịst bụ́ ndị a kpagburu, anyị ga-asị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.

10, 11. Gosi otú anyị pụrụ isi nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova n’ọnọdụ ndị kasị taa akpụ.

10 Anyị pụrụ ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị taa akpụ. (Abụ Ọma 119:25-32) Ka anyị wee nwee ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke, anyị aghaghị ịbụ ndị a pụrụ izi ihe, anyị aghaghịkwa ịdị na-ekpesi ekpere ike maka ntụziaka ya. Anyị aghaghịkwa ịhọrọ “ụzọ nke ikwesị ntụkwasị obi.”—Abụ Ọma 119:26, 30.

11 Hezekaịa, bụ́ onye o yiri ka ọ̀ bụ ya dere Abụ Ọma nke 119, họọrọ “ụzọ nke ikwesị ntụkwasị obi.” O mere otú ahụ ọ bụ ezie na ndị na-efe ofufe ụgha gbara ya gburugburu, ọ pụkwara ịbụ na ndị ezinụlọ eze kwara ya emo. O yikarịrị ka nke ahụ ò mere ka ‘mkpụrụ obi ya tụpụ dị ka mmiri site n’iru újú’ n’ihi ọnọdụ ndị dị otú ahụ. (Abụ Ọma 119:28) Ma Hezekaịa tụkwasịrị Chineke obi, bụrụ eze ọma, ma “mee ihe ziri ezi n’anya Jehova.” (2 Ndị Eze 18:1-5) Site n’ịdabere na Chineke, anyị onwe anyị pụkwara ịtachi obi n’ule dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe.—Jems 1:5-8.

Okwu Jehova Na-emesi Anyị Obi Ike

12. Olee otú anyị pụrụ isi tinye Abụ Ọma 119:36, 37 n’ọrụ n’onwe anyị?

12 Ịgbaso nduzi nke okwu Chineke na-enye anyị obi ike dị anyị mkpa iji nagide ule ndị a na-enwe ná ndụ. (Abụ Ọma 119:33-40) Anyị na-eji obi umeala achọ ịnara ntụziaka Jehova ka anyị wee nwee ike ‘iwere obi anyị nile’ debe iwu ya. (Abụ Ọma 119:33, 34) Dị ka ọbụ abụ ahụ, anyị na-arịọ Chineke, sị: “Wezụga obi m iche ihe àmà Gị nile ihu, ewezụgakwala ya iche uru na-ezighị ezi ihu.” (Abụ Ọma 119:36) Dị ka Pọl onyeozi, anyị “na-achọ ịdị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.” (Ndị Hibru 13:18) Ọ bụrụ na onye were anyị n’ọrụ achọọ ka anyị ghọọ aghụghọ, anyị na-eji obi ike agbasosi nduzi Chineke ike—Jehova na-agọzikwa ụzọ ndụ dị otú ahụ mgbe nile. N’ezie, ọ na-enyere anyị aka ịchịkwa ọchịchọ nile na-ezighị ezi. Ya mere, ka anyị na-ekpe ekpere, sị: “Mee ka anya m abụọ si n’ile ihe efu gabiga.” (Abụ Ọma 119:37) Ya adịla mgbe anyị ga-achọ ile ihe efu ọ bụla Chineke kpọrọ asị anya dị ka ihe dị mma. (Abụ Ọma 97:10) Tinyekwara ihe ndị ọzọ, nke a na-eme ka anyị zere ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na mgbaasị.—1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Mkpughe 21:8.

13. Olee otú ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs bụ́ ndị a kpagburu si nweta obi ike dị ha mkpa iji gbaa àmà n’atụghị egwu?

13 Ezi ihe ọmụma nke okwu Chineke na-eme ka anyị nwee obi ike ịgba àmà n’atụghị egwu. (Abụ Ọma 119:41-48) Obi ike dịkwa anyị mkpa iji ‘zaa onye na-ata anyị ụta okwu.’ (Abụ Ọma 119:42) Mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ ịdị ka ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs a na-akpagbu akpagbu, bụ́ ndị kpere ekpere, sị: “Jehova, . . . nyekwa ndị ohu gị ikike ịnọgide na-ekwu okwu gị n’atụghị egwu ọ bụla.” Gịnị siri na ya pụta? “Ha nile jupụtakwara na mmụọ nsọ, na-ekwukwa okwu Chineke n’atụghị egwu.” Otu Eze Onyenwe anyị ahụ ga-enye anyị obi ike iji na-ekwu okwu ya n’atụghị egwu.—Ọrụ 4:24-31.

14. Gịnị na-enyere anyị aka iji obi ike na-agba àmà dị ka Pọl mere?

14 Anyị ga-enwe obi ike dị anyị mkpa iji na-agba àmà n’emeghị ihere ọ bụla ma ọ bụrụ na anyị ji “okwu nke eziokwu” ahụ kpọrọ ihe ma ‘na-edebe iwu Chineke mgbe nile.’ (Abụ Ọma 119:43, 44) Iji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke e dere ede na-eme ka anyị ‘na-ekwu okwu banyere ihe àmà ya nile n’ihu ndị eze.’ (Abụ Ọma 119:46) Ekpere na mmụọ Jehova ga-enyekwara anyị aka ikwu ihe ndị dị mma n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Matiu 10:16-20; Ndị Kọlọsi 4:6) Pọl ji obi ike gwa ndị ọchịchị narị afọ mbụ banyere ihe àmà Chineke. Dị ka ihe atụ, ọ gbaara Gọvanọ Filiks nke Rom àmà bụ́ onye ‘gere ya ntị n’ihe metụtara inwe okwukwe na Kraịst Jizọs.’ (Ọrụ 24:24, 25) Pọl gbakwaara Gọvanọ Festọs na Eze Agrịpa àmà. (Ọrụ 25:22—26:32) Site n’enyemaka Jehova, anyị onwe anyị pụkwara ịbụ ndị àmà nwere obi ike, ndị ‘ihere ozi ọma ahụ na-adịghị eme.’—Ndị Rom 1:16.

Okwu Chineke Na-akasi Anyị Obi

15. Olee otú Okwu Chineke pụrụ isi kasie anyị obi mgbe ndị ọzọ na-akwa anyị emo?

15 Okwu Jehova na-enye anyị nkasi obi na-adịgide adịgide. (Abụ Ọma 119:49-56) E nwere oge ndị ọ ga-adị nnọọ mkpa ka a kasie anyị obi. Ọ bụ ezie na anyị na-eji obi ike ekwu okwu dị ka Ndịàmà Jehova, mgbe ụfọdụ, “ndị nganga”—ndị na-akpara Chineke nganga—pụrụ ‘ịkwa anyị emo nke ukwuu.’ (Abụ Ọma 119:51) Otú ọ dị, mgbe anyị na-ekpe ekpere, anyị pụrụ icheta ihe ndị dị mma e kwuru n’Okwu Chineke, sikwa otú ahụ ‘na-achọtara onwe anyị nkasi obi.’ (Abụ Ọma 119:52) Ka anyị na-ekpe ekpere, anyị pụrụ icheta otu iwu ma ọ bụ ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ nke na-enye anyị nkasi obi na obi ike dị anyị mkpa mgbe anyị nọ n’ọnọdụ ndị na-akpata nchegbu.

16. Olee ihe ndị ohu Chineke na-emebeghị n’agbanyeghị mkpagbu?

16 Ndị nganga ahụ bụ́ ndị kwara ọbụ abụ ahụ emo bụ ụmụ Izrel—ndị si ná mba a raara nye Chineke. Lee ihe ihere ọ bụ! Otú ọ dị, n’adịghị ka ha, ka anyị kpebisie ike ịghara isi n’iwu Chineke wezụga onwe anyị. (Abụ Ọma 119:51) N’agbanyeghị mkpagbu ndị Nazi na mmeso ndị yiri nke ahụ e mesoworo ha ruo ọtụtụ afọ, ọtụtụ puku ndị ohu Chineke ajụwo iwezụga onwe ha n’iwu na ụkpụrụ ndị dị n’Okwu Chineke. (Jọn 15:18-21) Idebe iwu Jehova abụghịkwa ibu arọ, n’ihi na ụkpụrụ ya dị ka abụ ọma ndị na-akasi anyị obi.—Abụ Ọma 119:54; 1 Jọn 5:3.

Nwee Ekele Maka Okwu Jehova

17. Gịnị ka inwe ekele maka okwu Chineke na-akpali anyị ime?

17 Anyị na-egosipụta ekele anyị nwere maka okwu Chineke site n’ibi ndụ kwekọrọ na ya. (Abụ Ọma 119:57-64) Ọbụ abụ ahụ ‘sịrị na ya ga-edebe okwu Jehova nile,’ ọbụnakwa ‘n’etiti abalị o biliri ikele Chineke n’ihi ikpe nile nke ezi omume Ya.’ Ọ bụrụ na anyị eteta n’abalị, lee ohere ọma anyị nwere ikwupụta ekele anyị nwere n’ebe Chineke nọ n’ekpere! (Abụ Ọma 119:57, 62) Ojiji anyị ji okwu Chineke kpọrọ ihe na-akpali anyị ịchọ ka Chineke zie anyị ihe ma mee ka anyị bụrụ ‘ndị e kekọtara ha na ndị na-atụ egwu Jehova n’otu’—ụmụ mmadụ ndị nwere egwu nsọpụrụ maka Chineke. (Abụ Ọma 119:63, 64) Ọ̀ dị ndị enyi ọzọ ka mma anyị pụrụ ịchọta n’ụwa a?

18. Olee otú Jehova si aza ekpere anyị mgbe ‘ụdọ nile nke ndị na-emebi iwu hikọrọ anyị gburugburu’?

18 Mgbe anyị ji obi anyị nile na-ekpe ekpere ma jiri obi umeala na-arịọ Jehova ka o zie anyị ihe, anyị na-eme ka ‘ihu ya dajụọ’ n’atụmanya nke inweta ihu ọma ya. Ọ dị anyị mkpa ikpe ekpere karịsịa mgbe ‘ụdọ nile nke ndị na-emebi iwu hikọrọ anyị gburugburu.’ (Abụ Ọma 119:58, 61) Jehova pụrụ igbubi ụdọ mgbochi nile nke onye iro ma mee ka anyị nwere onwe anyị ịrụ ọrụ nkwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) A hụwo nke a ugboro ugboro n’ala ebe ndị a machibidoro ọrụ anyị iwu.

Nwee Okwukwe n’Okwu Chineke

19, 20. Olee otú mweda n’ala pụrụ isi dị mma?

19 Inwe okwukwe na Chineke na n’okwu ya na-enyere anyị aka ịtachi obi mgbe a na-eweda anyị n’ala, na-enyekwara anyị aka ime uche ya. (Abụ Ọma 119:65-72) Ọ bụ ezie na ndị nganga ‘etekpuwo ya okwu ụgha dị ka ihe ntekpu,’ ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ọ dị m mma na e wedawo m n’ala.” (Abụ Ọma 119:66, 69, 71) Olee otú ọ pụrụ isi dịrị ohu Jehova ọ bụla mma ịbụ onye e wedara n’ala?

20 Mgbe a na-eweda anyị n’ala, obi abụọ adịghị ya na anyị na-ekpegara Jehova ekpere, nke ahụ na-emekwa ka anyị nọrọ ya nso karị. Anyị pụrụ ịdị na-etinye oge dị ukwuu n’ịmụ Okwu Chineke e dere ede na itinye ya n’ọrụ. Nke a na-eme ka anyị nwekwuo obi ụtọ ná ndụ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na otú anyị si meghachi omume mgbe e wedara anyị n’ala egosi na anyị nwere àgwà ndị na-adịghị mma, dị ka enweghị ndidi na mpako? Site n’ikpesi ekpere ike na enyemaka nke Okwu Chineke na mmụọ ya, anyị pụrụ imeri ntụpọ ndị dị otú ahụ ma ‘yikwasị onwe anyị ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ’ n’ụzọ ka zuo ezuo. (Ndị Kọlọsi 3:9-14) Ọzọkwa, a na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike mgbe anyị tachiri obi n’ahụhụ. (1 Pita 1:6, 7) Pọl ritere uru ná mkpagbu ya n’ihi na ha mere ka ọ daberekwuo na Jehova. (2 Ndị Kọrint 1:8-10) Ànyị na-ekwe ka ahụhụ nwee mmetụta dị mma n’ebe anyị nọ?

Na-atụkwasị Jehova Obi Mgbe Nile

21. Gịnị na-eme mgbe Chineke mere ka ihere mee ndị nganga?

21 Okwu Chineke na-enye anyị ezi ihe mere anyị ga-eji tụkwasị Jehova obi. (Abụ Ọma 119:73-80) Ọ bụrụ na anyị tụkwasịrị Onye Okike anyị obi n’ezie, ọ dịghị ihe ga-eme ka ihere mee anyị. Otú ọ dị, n’ihi ihe ndị ọzọ na-eme, nkasi obi pụrụ ịdị anyị mkpa, anyị achọọkwa ikpe ekpere, sị: “Ka ihere mee ndị nganga.” (Abụ Ọma 119:76-78) Mgbe Jehova mere ka ihere mee ndị dị otú ahụ, nke a na-eme ka e kpughee ụzọ ọjọọ ha, meekwa ka e doo aha nsọ ya nsọ. Anyị pụrụ ijide n’aka na ndị na-akpagbu ndị Chineke adịghị enweta uru ọ bụla n’ezie. Dị ka ihe atụ, ọ dịbeghị mgbe ha nwere ike—ọ dịkwaghị mgbe ha ga-enwe ike—ikpochapụ Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị tụkwasịrị Chineke obi ha nile.—Ilu 3:5, 6.

22. N’echiche dị aṅaa ka ọbụ abụ ahụ dị ka “karama akpụkpọ dị n’anwụrụ ọkụ”?

22 Okwu Chineke na-eme ka ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe Ọ nọ sikwuo ike mgbe a na-akpagbu anyị. (Abụ Ọma 119:81-88) N’ihi na ndị nganga nọ na-akpagbu ya, ọbụ abụ ahụ dịrị ka “karama akpụkpọ dị n’anwụrụ ọkụ.” (Abụ Ọma 119:83, 86) N’oge Bible, a na-eji karama ndị e ji akpụkpọ mee agbanye mmiri, mmanya na ihe ndị ọzọ dị mmiri mmiri. Mgbe ọ na-adịghị ihe dị n’ime ha, karama ndị a pụrụ ịfịkpọ ma e konye ha n’akụkụ ọkụ n’ọnụ ụlọ na-enweghị mpio anwụrụ ọkụ. Ihe isi ike ma ọ bụ mkpagbu ọ̀ na-eme ka ị dị ka “karama akpụkpọ dị n’anwụrụ ọkụ”? Ya bụrụ otú ahụ, tụkwasị Jehova obi ma na-ekpe ekpere, sị: “Dị ka ebere Gị si dị, mee ka m dị ndụ, m ga-edebekwa ihe àmà nke ọnụ Gị.”—Abụ Ọma 119:88.

23. Gịnị ka anyị tụleworo n’Abụ Ọma 119:1-88, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịjụ onwe anyị ka anyị na-atụ anya ịmụ Abụ Ọma 119:89-176?

23 Ihe anyị tụleworo n’akụkụ nke mbụ nke Abụ Ọma nke 119 na-egosi na Jehova na-enwe obiọma sitere n’ịhụnanya n’ebe ndị ohu ya nọ n’ihi na ha tụkwasịrị okwu ya obi, ụkpụrụ na iwu ya ana-atọkwa ha ụtọ. (Abụ Ọma 119:16, 47, 64, 70, 77, 88) Ọ na-atọ ya ụtọ ka ndị na-efe ya na-elezi ụzọ ha anya dị ka okwu ya si dị. (Abụ Ọma 119:9, 17, 41, 42) Ka ị na-atụ anya ịmụ akụkụ fọdụrụnụ nke abụ ọma a na-enye ume ọhụrụ, ị pụrụ ịjụ onwe gị, sị, ‘M̀ na-ekwe n’ezie ka okwu Jehova bụrụ ìhè dịịrị okporo ụzọ m?’

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Ihe a na-ezo aka na ya n’ebe a bụ ozi Jehova, ọ bụghị n’ihe nile dị na Bible—Okwu Chineke.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Na gịnị ka ezi obi ụtọ dabeere?

• Olee otú okwu Jehova si eme ka anyị dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka okwu Chineke si emesi anyị obi ike ma na-akasi anyị obi?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị inwe okwukwe na Jehova na n’okwu ya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

Rut, Rehab na ndị ntorobịa Hibru atọ e mere ka ha gaa biri na Babilọn ‘leziri ụzọ ha anya dị ka okwu Chineke si dị’

[Foto dị na peeji nke 12]

Pọl ji obi ike ‘kwuo okwu banyere ihe àmà Chineke nile n’ihu ndị eze’