Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Bụ Ezie na Adịghị M Ike, Adị M Ike

Ọ Bụ Ezie na Adịghị M Ike, Adị M Ike

Akụkọ Ndụ

Ọ Bụ Ezie na Adịghị M Ike, Adị M Ike

DỊ KA LEOPOLD ENGLEITNER SI KỌỌ

Onye SS ahụ mịpụtara obere égbè ya, tụdo m ya n’isi ma jụọ, sị: “Ị̀ dị njikere ịnwụ? Aga m agbagbu gị n’ihi na n’ezie i nweghị mmekwata.” Agbalịrị m ime ka olu m ghara ịma jijiji ma kwuo, sị: “Adị m njikere.” Ejisiri m onwe m ike, mechie anya m ma chere ka ọ gbagbuo m, ma ọ dịghị ihe merenụ. O wepụrụ égbè ahụ n’isi m ma tie, sị: “Ị dị nnọọ iberibe nke na igbu gị agaghị abara anyị uru!” Olee otú m si baa n’ọnọdụ ahụ dị ize ndụ?

A MỤRỤ M na July 23, 1905, n’obodo Aigen-Voglhub, nke dị n’agbata Usoro Ugwu nke Austria. Abụ m ọkpara nke ọkwọ osisi, nne m bụkwa nwa onye ọrụ ugbo. Ndị mụrụ m dara ogbenye ma ha na-arụsi ọrụ ike. Mgbe m bụ nwata, e biri m na Bad Ischl nke dịdebere Salzburg, bụ́ ebe e nwere ọdọ mmiri na ugwu ndị na-adọrọ mmasị.

Mgbe m bụ nwata, ana m echekarị banyere ikpe na-ezighị ezi ndị jupụtara n’ụwa, ọ bụghị nanị n’ihi na ezinụlọ m dara ogbenye, kamakwa n’ihi na ọkpụkpụ azụ m gbagọrọ agbagọ mgbe a mụrụ m. Azụ mgbu nke a kpataara m emeela ka ọ fọdụ nke nta ka ọ bụrụ na apụghị m iguzo kwem. A naghị ekwe ka m mee egwuregwu mmega ahụ́ n’ụlọ akwụkwọ, ụmụ klas m na-akwakwa m emo n’ihi ya.

Mgbe Agha Ụwa Mbụ biri, obere oge tupu mụ eruo afọ 14, ekpebiri m na m kwesịrị ịchọ ọrụ iji pụọ n’ogbenye. Ana m anọ agụụ mgbe nile, ike na-agwụkwa m mgbe nile n’ihi oké ahụ́ ọkụ ndị m na-enwe, bụ́ ndị ahụ́ ọkụ Spen, nke gburula ọtụtụ nde mmadụ, kpatara. Otú ihe ka ọtụtụ ná ndị ọrụ ugbo si azaghachi m ma m rịọ ha ọrụ na-abụkarị: “Oleedị uru onye ume na-adịghị n’ahụ́ dị ka gị ga-abara anyị?” Otú ọ dị, otu onye ọrụ ugbo nwere obiọma kpọrọ m ọrụ.

Onye Ịhụnanya Chineke Kpaliri

Ọ bụ ezie na mama m na-anụrụ okpukpe Katọlik ọkụ n’obi, adịghị m agakebe chọọchị, karịsịa n’ihi na echiche papa m bụ na onye ọ bụla nwere ike ịga okpukpe nke masịrị ya. Ife ihe oyiyi ofufe, bụ́ nke a na-eme na Chọọchị Roman Katọlik n’ụwa nile, nyere m nsogbu n’obi.

Otu ụbọchị n’October 1931, otu enyi m gwara m ka m duga ya nzukọ okpukpe nke Ndị Mmụta Bible, bụ́ ihe a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. N’ebe ahụ, e ji Bible zaa m ajụjụ ndị dị mkpa, ndị dị ka: Iji ihe oyiyi efe ofufe ọ̀ na-amasị Chineke? (Ọpụpụ 20:4, 5) È nwere hel na-ere ọkụ? (Eklisiastis 9:5) À ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ?—Jọn 5:28, 29.

Ihe kasị masị m bụ eziokwu ahụ bụ́ na Chineke adịghị anabata agha ụmụ mmadụ ji emejụ agụụ nkwafu ọbara, ma a sịgodị na a na-alụ ha n’aha Ya. Amụtara m na “Chineke bụ ịhụnanya” nakwa na o nwere aha e buliri elu, bụ́ Jehova. (1 Jọn 4:8; Abụ Ọma 83:18) Obi dịkwa m ụtọ ịchọpụta na site n’Alaeze Jehova, ụmụ mmadụ ga-enwe ike ibi ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’obi ụtọ n’ime paradaịs zuru ụwa ọnụ. Amụtakwara m banyere olileanya dị ebube nke ụfọdụ mmadụ na-ezughị okè nwere bụ́ ndị Chineke kpọrọ iso Jizọs chịa n’Alaeze eluigwe Chineke. Adị m njikere inye ihe nile m nwere maka Alaeze ahụ. Ya mere, na May 1932, e mere m baptizim, m wee ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Nzọụkwụ ahụ chọrọ obi ike n’ihi ịkpọasị okpukpe nke jupụtara n’Austria nke oge ahụ, bụ́ ebe a na-ekpesi Katọlik ike.

Iche Nlelị na Mmegide Ihu

Iwe were ndị mụrụ m nke ukwuu mgbe m kwụsịrị ịga chọọchị, ụkọchukwu kpọsakwara akụkọ ahụ n’ọlta ozugbo. Ndị agbata obi anyị na-agbụpụ asọ n’ihu m iji gosi nlelị. Ka o sina dị, ekpebisiri m ike ịbanye n’ozi oge nile, amalitekwara m ịsụ ụzọ na January 1934.

Ọnọdụ ọchịchị bịara sikwuo ike n’ihi mmetụta siri ike ndị Nazi nọ na-enwe n’ógbè ahụ. N’oge m na-asụ ụzọ n’ógbè Ndagwurugwu Enns nke Styria, ndị uwe ojii nọ na-achụgharị m, aghaghịkwa m ‘ịdị akọ dị ka agwọ.’ (Matiu 10:16) Site na 1934 ruo 1938, a kpagburu m ugboro ugboro. Ọ bụ ezie na enweghị m ọrụ, a jụrụ ịkwụ m ụgwọ a na-akwụ ndị na-enweghị ọrụ, a makwara m ikpe ịga mkpọrọ obere oge ugboro ugboro, na nke ịnọ na mkpọrọ ruo ogologo oge ugboro anọ n’ihi ọrụ nkwusa.

Ìgwè Ndị Agha Hitler Eweghara Austria

Na March 1938, Ìgwè ndị agha Hitler nubatara n’Austria. N’ụbọchị ole na ole, e jidere ihe karịrị iri puku mmadụ itoolu—ihe dị ka pasent 2 nke ọnụ ọgụgụ ndị toro eto—ma kpụga ha n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ, bo ha ebubo na ha na-agba ọchịchị ndị Nazi mgba okpuru. Ndịàmà Jehova dị njikere ruo n’ókè ụfọdụ maka ihe na-aga imenụ. N’oge okpomọkụ nke 1937, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ dị n’obodo m ji ịnyịnya ígwè mee njem dị narị kilomita atọ na iri ise iji gaa mgbakọ mba nile na Prague. N’ebe ahụ, ha nụrụ banyere arụ e mere ndị kwere ekwe ibe anyị na Germany. O doro anya na oge nke anyị eruola.

Malite n’ụbọchị ndị agha Hitler zọnyere ụkwụ n’Austria, Ndịàmà Jehova malitere inwe nzukọ ha na ịrụ ọrụ nkwusa ha na nzuzo. Ọ bụ ezie na a ka na-ezobata akwụkwọ e ji amụ Bible site n’ókè Austria na Switzerland, ọnụ ọgụgụ e nwere agaghị ezu mmadụ nile. Ya mere, Ndị Kraịst ibe anyị bi na Vienna na-ebipụta akwụkwọ na nzuzo. Ana m arụkarị ọrụ dị ka onye obu ozi, na-ekesara Ndịàmà akwụkwọ.

Ịga n’Ogige Ịta Ahụhụ

N’April 4, 1939, ndị Gestapo jidere mụ na Ndị Kraịst ibe m atọ mgbe anyị nọ na-echeta ọnwụ Kraịst na Bad Ischl. E ji obere ụgbọala kwọrọ anyị gaa n’isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii mba dị na Linz. Nke ahụ bụ nke mbụ m bara n’obere ụgbọala, ma oké nchegbu ekweghị ka m nụ ụtọ ya. Na Linz, a gbara m ajụjụ ọnụ ndị siri ike ugboro ugboro, ma ajụghị m okwukwe m. Mgbe ọnwa ise gasịrị, a kpọtara m n’ihu ọkàikpe na-eme nnyocha n’Upper Austria. N’ụzọ m na-atụghị anya ya, a kwụsịrị ikpe ndị ahụ a na-ekpe m dị ka omempụ; ma nke ahụ abụghị ebe nsogbu m biri. Ka ọ dịgodị, a kpụgara atọ ndị ọzọ ahụ n’otu ogige ịta ahụhụ bụ́ ebe ha nọrọ nwụọ, na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ.

A tụbara m n’ebe a na-edebe ndị e ji eji, n’October 5, 1939, a gwakwara m na a ga-akpọga m n’ogige ịta ahụhụ Buchenwald nke Germany. Otu ụdị ụgbọ okporo ígwè pụrụ iche nọ na-echere anyị bụ́ ndị mkpọrọ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị na Linz. A rụnyere ọnụ ụlọ mkpọrọ ndị na-aba mmadụ abụọ abụọ n’ụgbọ okporo ígwè ahụ. Nwoke mụ na ya nọ n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ adịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ́ bụghị onye bụbu gọvanọ nke Upper Austria, bụ́ Dr. Heinrich Gleissner.

Mụ na Dr. Gleissner malitere ezigbo mkparịta ụka. Ọnọdụ m metụrụ ya nnọọ n’ahụ́, o wutekwara ya na ọbụna n’oge ọ nọ n’ọchịchị, Ndịàmà Jehova chere ọtụtụ nsogbu ndị metụtara iwu ihu n’ógbè ya. O ji mwute kwuo, sị: “Maazị Engleitner, apụghị m imezi ihe mebiri emebi, ma ana m arịọ mgbaghara. Ọ dị m ka ọchịchị anyị ò kpere ikpe na-ezighị ezi. Ọ bụrụ na ị chọọ enyemaka ọ bụla, aga m adị nnọọ njikere inyere gị aka ruo n’ókè m nwere ike.” Anyị zutere ọzọ mgbe agha ahụ biri. O nyeere m aka ịnata ụgwọ ezumike nká gọọmenti na-akwụ ndị ndị Nazi kpagburu.

“Aga m Agbagbu Gị”

N’October 9, 1939, erutere m n’ogige ịta ahụhụ Buchenwald. Obere oge mgbe nke ahụ gasịrị, a gwara onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ na e nwere Onyeàmà so ná ndị ahụ batara ọhụrụ, aghọkwara m onye o lekwasịrị anya. O ji obi ọjọọ kụọ m ihe. Mgbe ọ chọpụtaziri na ya agaghị emeli ka m jụ okwukwe m, ọ sịrị: “Engleitner, aga m agbagbu gị. Ma tupu m gbagbuo gị, aga m enye gị ohere idegara ndị mụrụ gị akwụkwọ ozi iji sị ha nọdụ nke ọma.” Echere m banyere okwu nkasi obi m nwere ike idegara ndị mụrụ m, ma mgbe ọ bụla m chọrọ ide ihe n’akwụkwọ, ọ na-akụ m ihe n’ikpere aka nke aka nri m, na-eme ka m dehie aka. Ọ kọrọ m ọnụ, sị: “Legodị ewu a! O nwedịghị ike ide ahịrị abụọ kwụ ọtọ. Ma nke ahụ adịghị egbochi ya ịgụ Bible, ọ́ bụghị eziokwu?”

Ọzọkwa, onye nlekọta ụlọ mkpọrọ ahụ mipụtara obere égbè ya, tụdo m ya n’isi ma mee ka m kweta na ya ga-agbagbu m, dị ka m si kọọ ná mmalite nke akụkọ a. Mgbe ahụ, ọ kwabara m n’otu obere ọnụ ụlọ mkpọrọ mmadụ karịrị akarị na ya. Eguzo m ọtọ n’abalị ahụ nile. Ma ọ dịtụghị otú ụra si tụọ m ebe ọ bụ na ahụ́ nile na-afụ m ụfụ. Nanị “nkasi obi” ndị mkpọrọ ibe m nwere inye m bụ: “Ịnwụ n’ihi okpukpe iberibe enweghị nnọọ isi!” Dr. Gleissner nọ n’ọnụ ụlọ mkpọrọ dịdebere nke m. Ọ nụrụ ihe merenụ ma kwuo ná mwute, sị, “Mmegide nke Ndị Kraịst esepụtawala isi ọjọọ ya ọzọ!”

N’oge okpomọkụ nke 1940, e nyere ndị mkpọrọ nile iwu isonye n’ọrụ ịgbari okwute n’ụbọchị Sunday, ọ bụ ezie na anyị anaghị arụ ọrụ n’ụbọchị Sunday. Nke a bụ iji taa anyị ahụhụ n’ihi “àgwà ọjọọ” nke ụfọdụ ndị mkpọrọ kpara. E nyere anyị iwu iburu nnukwu okwute site n’ebe a na-awa okwute gaa n’ogige ịta ahụhụ ahụ. Ndị mkpọrọ abụọ nọ na-agbalị ibokwasị m otu nnukwu okwute, ọ fọkwara obere ka m tụbọọ n’ihi ịdị arọ ya. Otú ọ dị, Arthur Rödl, bụ́ Lagerführer (onyeisi ogige) nke a na-atụ egwu, gbataara m ọsọ enyemaka n’ụzọ m na-atụghị anya ya. Mgbe ọ hụrụ otú o si siere m ike ibu okwute ahụ, ọ gwara m, sị: “Ị gaghị ebuli okwute ahụ n’azụ laruo n’ogige! Butuo ya ozugbo!” Emere m nke ahụ ozugbo. Mgbe ahụ, Rödl tụụrụ m otu okwute dị nnọọ obere aka ma kwuo, sị: “Buru nke ahụ, bulata ya n’ogige. Ọ ka mfe obubu!” N’ikpeazụ, n’ichigharịkwuru onye nlekọta anyị, o nyere iwu, sị: “Ka Ndị Mmụta Bible nile laghachi n’ogige ha. Nke ha rụrụ taa ezuola!”

Ná ngwụcha nke ụbọchị ọrụ ọ bụla, obi na-adị m ụtọ mgbe nile isoro ndị òtù ezinụlọ ime mmụọ m kpakọrịta. Anyị mere ndokwa ikesa nri ime mmụọ. Otu nwanna ga-edepụta otu amaokwu Bible n’obere akwụkwọ ma nye ya ndị ọzọ. E zobatakwala otu Bible n’ogige ahụ. E kewara ya gaa n’akwụkwọ ya nke ọ bụla. Ruo ọnwa atọ, e nyefere m akwụkwọ Job n’aka. Ezoro m ya n’ime sọks m. Ihe ndekọ Job nyeere m aka ịnọgide na-eguzosi ike.

N’ikpeazụ, na March 7, 1941, eso m ná ndị e bufere n’ogige ịta ahụhụ Niederhagen. Ọnọdụ m nọ na-akawanye njọ kwa ụbọchị. Otu ụbọchị, e nyere mụ na ụmụnna abụọ iwu ịkwanye ngwá ọrụ n’igbe ngwá ọrụ. Mgbe anyị mesịrị nke ahụ, anyị sooro ìgwè ndị mkpọrọ ọzọ laghachiwe n’ogige ahụ. Otu onye SS chọpụtara na m anaghị agasi ike. O were oké iwe nke na amaghị m mgbe o ji obi ọjọọ si n’azụ gbaa m ụkwụ, merụọ m ezigbo ahụ́. Ọ fụrụ m ụfụ nke ukwuu, ma n’agbanyeghị nke ahụ, agara m ọrụ n’echi ya.

Ntọhapụ A Na-atụghị Anya Ya

N’April nke 1943, a kpọpụsịrị ndị nile nọ n’ogige ịta ahụhụ Niederhagen. Mgbe nke ahụ gasịrị, a kpọfere m n’ogige ọnwụ nke dị na Ravensbrück. Mgbe ahụ, na June 1943, n’ụzọ m na-atụghị anya ya, e nyere m ohere inwere onwe m site n’ogige ịta ahụhụ ahụ. N’oge a, ntọhapụ m adabereghị na m ịjụ okwukwe m. Nanị ihe m ga-eme bụ ikweta ịrụ ọrụ mmanye n’ugbo ná ndụ m nile. Adị m njikere ime nke ahụ iji pụọ n’ọnọdụ ọjọọ dị n’ogige ahụ. Agara m ịhụ dọkịta nọ n’ogige ahụ maka nnyocha ikpeazụ. Ọ tụrụ dọkịta ahụ n’anya ịhụ m. O tiri mkpu, sị: “O, ị ka bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova!” Azara m, sị: “Dọkịta, i kwuru eziokwu.” “Ya bụrụ otú ahụ, ahụghị m ihe mere a ga-eji tọhapụ gị. N’aka nke ọzọ, ọ ga-abụ ihe ọma iwepụ nkịkara mmadụ dị ka gị n’ebe a.”

Nkọwa ya abụghị ikwubiga okwu ókè. Ọnọdụ ahụ́ ike m dị njọ n’ezie. Igwu richara akụkụ ahụ́ m ụfọdụ, ihe a kụrụ m kpọchiri otu ntị m, ọnyá ndị abụ nọ na ha jupụtakwara n’ahụ́ m nile. Mgbe ọnwa 46 nke ịnọ ná mkpa, agụụ na-anaghị ebi ebi na ọrụ mmanye gasịrị, adịzi m nanị kilogram 28 n’arọ. Nke a bụ ọnọdụ m nọ na ya mgbe a tọhapụrụ m n’ogige ọnwụ Ravensbrück na July 15, 1943.

E ji ụgbọ okporo ígwè bughachi m n’obodo m n’enweghị onye nche na-eso m n’azụ, agakwara m n’isi ụlọ ọrụ ndị Gestapo nke dị na Linz. Ọfịsa ndị Gestapo nyere m akwụkwọ ntọhapụ ma dọọ m aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na i chere na anyị na-atọhapụ gị ka ị ga nọgide na-ekwusa ozi ọma nzuzo gị, i hiere nnọọ ụzọ! Anyị nwaa anwaa jide gị ọzọ ebe ị na-ekwusa ozi ọma, nke gị agwụla.”

Emechara m lọta! Ọ dịbeghị ihe ọ bụla mama m metụrụ aka n’ụlọ m kemgbe ahụ ejidere m n’April 4, 1939. Ọbụna Bible m ka ghere oghe n’elu tebụl dị n’akụkụ àkwà m! Egburu m ikpere n’ala jiri obi m nile kpee ekpere ekele.

N’oge na-adịghị anya, e kenyere m ịrụ ọrụ n’otu ugbo dị n’ugwu. Onye nwe ugbo ahụ, nke bụ́ enyi m site na nwata, na-akwụ m obere ụgwọ, ọ bụ ezie na iwu ejighị ya ime otú ahụ. Tupu agha amalite, enyi m ahụ kwere ka m zoo ụfọdụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ụlọ ya. Obi dị m ụtọ na m ji obere ebe ndọba akwụkwọ ahụ mee ihe nke ọma iji nweta ume ime mmụọ. E gboro mkpa m nile, ekpebikwara m ịnọ n’ugbo ahụ ruo mgbe agha ga-ebi.

Izogharị n’Ugwu

Otú ọ dị, oge ndị ahụ dị jụụ m nweere onwe m adịteghị aka. N’etiti August 1943, e nyere m iwu ịga hụ dọkịta ndị agha ka o lee m ahụ́. Na mbụ, o kwuru na m agaghị agali agha n’ihi azụ m nke gbagọrọ agbagọ. Otú ọ dị, mgbe otu izu gasịrị, otu dọkịta ahụ degharịrị nchọpụta ya ịbụ: “Ọ ga-alụli agha n’ihu agha.” Ndị agha achọtalighị m ruo oge ụfọdụ, ma n’April 17, 1945, obere oge tupu agha ebie, ha chọtara m. Ha debara aha m n’akwụkwọ ịlụ agha n’ihu agha.

Eweere m ihe ole na ole tinyere Bible ma gbaga n’ugwu dị nso ebe ahụ. Na mbụ, ehiri m n’èzí, ma ọnọdụ ihu igwe bịara kawanye njọ, snow daranụ ruru ọkara mita n’ịdị elu. Ahụ́ m nile dere mmiri. Ejisiri m ike ruo n’otu obere ụlọ dị n’ugwu nke ji ihe dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu puku mita na narị abụọ dị elu karịa elu oké osimiri. N’ịbụ onye oyi na-atụsi ike, amụnyere m ọkụ n’ebe a na-amụnye ọkụ, nyaa ọkụ ma ṅakọọ ákwà m. N’ihi ike ọgwụgwụ, ụra buuru n’elu oche dị n’akụkụ ebe ahụ a na-amụnye ọkụ. Obere oge, oké ahụ́ ụfụ kpọtere m n’ike. Ọkụ abaala m n’ahụ́! Atụrụrụ m onwe m n’ala iji menyụọ ọkụ ahụ. Azụ m nile gbatosịrị.

N’ihi oké ụjọ nke ịbụ onye e jidere, tupu chi efoo, ezoghachiri m n’ugbo ahụ dị n’ugwu, ma ụjọ jidere nwunye onye nwe ugbo ahụ nke na ọ chụpụrụ m, na-agwa m na o nwere ndị e zipụrụ ka ha jide m. Ya mere, alakwuuru m ndị mụrụ m. Ọbụna ndị mụrụ m jụrụ ịnabata m na mbụ, ma ha mesịrị kwere ka m hie n’ebe a na-akwasa ihe, mama m sachakwara ọnyá m. Otú ọ dị, mgbe ụbọchị abụọ gasịrị, ụjọ jidere ndị mụrụ m nke ukwuu nke na ekpebiri m na ọ ga-akara m mma ịgaghachi n’ugwu ahụ gaa zoo.

Na May 5, 1945, otu oké mkpọtụ kpọtere m n’ụra. Ahụrụ m ụgbọelu nke Mba Ndị Jikọtara Aka Ọnụ ka ha na-efe ala ala. Ozugbo ahụ, amatara m na a kwatuola ọchịchị Hitler! Mmụọ Jehova ewusiela m ike ịtachi obi n’ahụmahụ ahụ jọgburu onwe ya. Ahụla m ịbụ eziokwu nke ihe e dekọrọ n’Abụ Ọma 55:22, bụ́ nke kasiri m nnọọ obi ná mmalite nke ule m. ‘Atụkwasịwo m Jehova ibu m,’ ọ bụkwa ezie na adịghị m ike n’anụ ahụ́, ọ kwagidere m mgbe m na-eje ije na “ndagwurugwu onyinyo ọnwụ.”—Abụ Ọma 23:4.

A Na-eme ka ‘Ike Jehova Zuo Okè n’Adịghị Ike’

Mgbe agha biri, ihe ji nke nta nke nta ka mma. Na mbụ, arụrụ m ọrụ dị ka onye ọrụ e goro ego n’ugbo enyi m nke dị n’ugwu. Ọ bụ nanị mgbe ndị agha enyemaka U.S. batara n’April 1946 ka a tọhapụrụ m n’ọrụ ugbo ahụ a manyere m ịrụ ná ndụ m nile.

Mgbe agha biri, Ndị Kraịst bi na Bad Ischl na gburugburu ya malitere inwechi nzukọ anya. Ha ji ume ọhụrụ malite ime nkwusa. E nyere m ọrụ dị ka onye nche n’otu ụlọ ọrụ na-emepụta ihe, esikwa m otú a nwee ike ịnọgide n’ọrụ ọsụ ụzọ m. N’ikpeazụ, abịaziri m biri n’ógbè St. Wolfgang, na 1949 kwa, alụrụ m Theresia Kurz, bụ́ onye mụụrụ di mbụ ya otu nwa nwanyị. Anyị bikọrọ ọnụ ruo afọ 32 ruo mgbe ezigbo nwunye mụ a nwụrụ na 1981. Elekọtala m ya ruo ihe karịrị afọ asaa.

Mgbe Theresia nwụsịrị, amaliteghachiri m ọrụ ọsụ ụzọ, bụ́ nke nyeere m aka idi nnukwu mfu ahụ. Ana m eje ozi ugbu a dị ka onye ọsụ ụzọ na okenye n’ọgbakọ m dị na Bad Ischl. Ebe ọ bụ na m na-anọzi n’oche a na-akwagharị akwagharị, ana m enyefe akwụkwọ e ji amụ Bible, na-agwakwa ndị mmadụ banyere olileanya Alaeze ahụ n’ogige ntụrụndụ dị na Bad Ischl ma ọ bụ n’ihu ụlọ m. Ezi nkwurịta okwu Bible mụ na ndị mmadụ na-enwe na-enye m ọṅụ dị ukwuu.

N’iche echiche laa azụ, apụrụ m ikwu na ahụmahụ ndị na-atụ ụjọ m gabigara emebeghị ka m nwee obi ilu. N’ezie, ọ dị oge ndị m dara mbà n’ihi ule ndị ahụ. Otú ọ dị, mmekọrịta ịhụnanya nke mụ na Jehova Chineke nyeere m aka ịnagide oge ndị ahụ siri ike. Ndụmọdụ ahụ Onyenwe anyị nyere Pọl, nke bụ́, “A na-eme ka ike m zuo okè n’adịghị ike,” ghọkwara eziokwu ná ndụ m. Ugbu a ọ fọrọ obere ka m ruo otu narị afọ, apụrụ m iso Pọl onyeozi kwuo, sị: “Ana m enweta obi ụtọ n’adịghị ike, ná mkparị, n’ịnọgasị ná mkpa, ná mkpagbu na ihe isi ike, maka Kraịst. N’ihi na mgbe m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.”—2 Ndị Kọrint 12:9, 10.

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Ndị Gestapo nwụchiri m, April 1939

Akwụkwọ e dere ebubo ndị Gestapo boro m, May 1939

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ihe osise abụọ a: Privatarchiv; B. Rammerstorfer

[Foto dị na peeji nke 26]

Ugwu ndị dị nso ghọrọ ebe mgbaba

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 23]

Foto Hofer, Bad Ischl, Austria