Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere Pọl ji dee banyere Onye Kraịst bụ́ nwunye, sị: “Ọ ga-abụ onye e chebere site n’ịmụ nwa”?—1 Timoti 2:15.

Gịnị ka ihe ndị gbara amaokwu a gburugburu na-ekpughe banyere ihe Pọl bu n’uche? O ji ike mmụọ nsọ na-enye ndụmọdụ banyere ihe bụ́ ọrụ nwanna nwanyị n’ọgbakọ. O dere, sị: “Achọrọ m ka ụmụ nwanyị jiri uwe a haziri nke ọma na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè, ọ bụghị n’ụdị dị iche iche nke ịkpa isi na ọlaedo ma ọ bụ nkume pel ma ọ bụ ejiji dị nnọọ oké ọnụ, kama n’ụzọ kwesịrị ụmụ nwanyị ndị na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke, ya bụ, site n’ezi ọrụ.” (1 Timoti 2:9, 10) Pọl nọ na-agba ụmụnna ya nwanyị ume ka ha na-emeru ihe n’ókè, na-ahọrọ ihe ịchọ mma ndị na-agabigaghị ókè, na ‘ịchọ onwe ha mma’ site n’ezi ọrụ.

Ọzọ, Pọl kọwara ndokwa ịbụisi n’ime ọgbakọ, na-ekwu, sị: “Enyeghị m nwanyị ikike izi ihe, ma ọ bụ inwe ikike n’ebe nwoke nọ, kama ka ọ na-agbachi nkịtị.” (1 Timoti 2:12; 1 Ndị Kọrint 11:3) Ọ kọwara ihe ndabere nke ndokwa a site n’igosi na ọ bụ ezie na Setan aghọgbughị Adam, “a ghọgburu [Iv] kpam kpam, o wee nọrọ ná mmebi iwu.” Olee otú a pụrụ isi chebe nwanna nwanyị pụọ ná mmehie Iv? Pọl na-aza, sị: “Otú ọ dị, ọ ga-abụ onye e chebere site n’ịmụ nwa, ma ọ bụrụhaala na ha anọgide n’okwukwe na ịhụnanya na ịdị nsọ tinyere uche zuru okè.” (1 Timoti 2:14, 15) Olee ihe Pọl bu n’uche mgbe o kwuru okwu ndị a?

O yiri ka ụfọdụ ndị nsụgharị hà na-ekwu na nzọpụta nwanyị dabeere na ya ịmụ ụmụ. Dị ka ihe atụ, Bible Nsọ nke Union Version na-ekwu, sị: “A ga-esite n’ọmụmụ nwa ya zọpụta ya.” Otú ọ dị, otú a e si sụgharịa okwu Pọl ezighị ezi. Ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ na-egosi na iji bụrụ onye a zọpụtara, mmadụ aghaghị ịmara Jehova, kwere na Jizọs ma gosipụta okwukwe, jirikwa ọrụ sochie okwukwe ahụ. (Jọn 17:3; Ọrụ 16:30, 31; Ndị Rom 10:10; Jems 2:26) Tụkwasị na nke ahụ, ihe Pọl bu n’uche abụghị na ụmụ nwanyị kwere ekwe ga na-amụ nwa n’udo mgbe nile. Ụmụ nwanyị amụwo nwa n’udo, ma hà bụ ndị kwere ekwe ma ọ bụ na ha abụghị. N’ụzọ dịkwa mwute, ụfọdụ anwụwo mgbe ha na-amụ nwa, ma hà bụ ndị kwere ekwe ma ọ bụ na ha abụghị.—Jenesis 35:16-18.

Ndụmọdụ ọzọ Pọl nyere ụmụ nwanyị n’otu akwụkwọ ozi a na-enyere anyị aka ịghọta ihe o bu n’uche. Ọ na-adọ aka ná ntị banyere ụmụ nwanyị ụfọdụ di ha nwụrụ bụ́ ndị na-akatabeghị ahụ́, bụ́ ndị “nọ nkịtị, na-epiogharị n’ụlọ dị iche iche; ee, ọ bụghị nanị ịnọ nkịtị, kamakwa bụrụ ndị asịrị na ndị na-etinye ọnụ n’ihe ndị gbasara ndị ọzọ, na-ekwu banyere ihe ndị ha na-ekwesịghị ikwu.” Olee ndụmọdụ Pọl nyere? Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ya mere ana m achọ ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụ́ ndị na-akatabeghị ahụ́ lụọ di, ka ha mụọ ụmụ, ka ha lekọta ezinụlọ, ka ha ghara inye onye mmegide ahụ ihe ọ ga-eji kwujọọ ekwujọ.”—1 Timoti 5:13, 14.

Pọl mere ka ihe bụ́ ọrụ bara uru ụmụ nwanyị nwere ná ndokwa ezinụlọ pụta ìhè. N’ịbụ onye tinyere onwe ya n’ọrụ ndị dị ka ‘ịmụ ụmụ na ilekọta ezinụlọ,’ nwanyị nọgidere “n’okwukwe na ịhụnanya na ịdị nsọ tinyere uche zuru okè,” agaghị adaba n’omume na-adịghị ewuli elu. A ‘ga-echebe’ ọnọdụ ime mmụọ ya. (1 Timoti 2:15) Ime otú ahụ ga-enyere ọtụtụ ụmụ nwanyị na-akatabeghị ahụ́ aka izere ọnyà Setan.

Okwu ndị Pọl gwara Timoti na-echetara anyị nile, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị, ịdị na-eji oge anyị eme ihe ndị bara uru. Okwu Chineke na-adụ Ndị Kraịst nile ọdụ, sị: “Nọrọsienụ ike na nche ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe.”—Ndị Efesọs 5:15.