Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebelebe Egbuo

Ebelebe Egbuo

Ebelebe Egbuo

OWEN, bụ́ nwata nwoke dị afọ abụọ na ọkara, nọ na-egwuri egwu n’ọnụ ụlọ ịsa ahụ́ dị n’ụlọ ha. Ọ rịgooro n’ebe aka ya ga-eru na kọbọd a na-etinye ọgwụ bụ́ nke nne na nna ya chere na aka ya agaghị eru. N’ihe ndị dị n’ime kọbọd ahụ, ọ hụrụ otu karama dọọrọ mmasị ya. O mepere ya ma ṅụọ ihe dị n’ime ya. Ebelebe gburu.

Ihe dị n’ime karama ahụ bụ acid na-erikasị ahụ́, n’ụzọ dịkwa mwute, obere Owen nwụrụ. Obi gbawara nne na nna ya. Nna ya, bụ́ Percy, gara ka ụkọchukwu chọọchị ya kasie ya obi. Ọ jụrụ, sị: “Gịnị mere ihe a ji mee?” Ụkọchukwu ahụ zara, sị, “Chineke chọrọ obere mmụọ ozi ọzọ n’eluigwe.” N’ịbụ onye nwere oké mwute, nna Owen chere na nke a ezighị nnọọ ezi. Chineke ò zubere n’ezie ka ọdachi dị otú ahụ mee? Percy ji iwe kpebie na ya agaghị aga chọọchị ahụ ọzọ.

N’ịtụgharị uche n’ihe merenụ, Percy chere, sị: ‘Obere nwa m ọ̀ ka na-ata ahụhụ? Ọ̀ dị mgbe m ga-ahụ ya ọzọ?’

Ọ pụrụ ịbụ na gị onwe gị echewo echiche banyere ihe na-eme mgbe mmadụ nwụrụ, ma ọ̀ ga-ekwe omume ijikọtaghachi anyị na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ n’ọdịnihu. Okwu Chineke, bụ́ Bible, zara ajụjụ ndị a. Bible nwere azịza ndị doro anya na ndị na-akasi obi maka ndị nile ọdachi ndị yiri nke a dakwasịrị. Nke ka mkpa bụ na ọ na-ekpughe atụmanya dị ebube nke Chineke kwere ná nkwa—mbilite n’ọnwụ.

Biko gụọ isiokwu na-esonụ iji mụtakwuo banyere olileanya a magburu onwe ya.