Inwe Mmeri n’Ụzọ Pụrụ Iche
Inwe Mmeri n’Ụzọ Pụrụ Iche
À NA-EMEGIDE gị n’ihi okwukwe gị—eleghị anya n’ụlọ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ime ezinụlọ, ma ọ bụ n’ihi ihe mgbochi ndị ndị ọchịchị tinyere? Ya bụrụ otú ahụ, adala mbà. Ọtụtụ Ndịàmà Jehova echewo ule ndị yiri ndị ahụ ihu, n’agbanyeghị nke ahụ, ha nwere mmeri. Tụlee ihe atụ nke Erna Ludolph.
A mụrụ Erna na Lübec, Germany, na 1908. Ọ bụ nanị ya jeere Jehova ozi n’ezinụlọ ya. Mgbe ọchịchị Hitler malitere na 1933, ihe bịara siere Ndịàmà Jehova ike. Ndị ọrụ ibe Erna katọrọ ya maka ịjụ igbuchapụrụ Hitler, nke a dugakwara ya n’ịbụ onye ndị Nazi jichiri. Ruo afọ asatọ, ọ nọrọ n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche, bụ́ ndị dị na Hamburg-Fuhlsbüttel, Moringen, Lichtenburg na Ravensbrück. Mgbe Erna nọ na Ravensbrück, otu ihe mere ka o nwee mmeri.
Onye Na-elekọta Ụlọ nke Pụrụ Iche
Prọfesọ Friedrich Holtz na nwunye ya, bụ́ Alice, biri na Berlin. Ha abụghị ndị òtù Nazi, ha akwadoghịkwa echiche ndị Nazi. Otú ọ dị, ha na otu ọfịsa ndị SS nọ n’ọkwá dị elu, bụ́ onye na-ahụ maka ndị mkpọrọ n’otu ogige ịta ahụhụ, bụ nwanne. Ya mere, mgbe prọfesọ ahụ na nwunye ya nọ na-achọ onye na-elekọta ụlọ, ọfịsa ndị SS a kwere ka ha họrọ onye mkpọrọ nwanyị. N’ihi ya, na March 1943, Alice gara Ravensbrück ịhọrọ onye na-elekọta ụlọ. Ònye ka ọ họọrọ? Ọ bụ Erna Ludolph. Erna sooro ndị ezinụlọ Holtz, bụ́ ndị mesoro ya ihe n’ụzọ dị mma, biri. Mgbe agha biri, o sooro ezinụlọ ahụ kwaga Halle nke dị na Saale. N’ebe ahụ, Erna zutere mmegide ọzọ, nke ugbu a site n’aka ndị ọchịchị Socialist n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Germany. Na 1957, a manyere ndị ezinụlọ ahụ ịga biri n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Germany, Erna sokwa ha gaa. N’ikpeazụ, Erna nweere onwe ya ikpe okpukpe ya.
Olee otú Erna si nwee mmeri n’ụzọ pụrụ iche? Dị ka ihe si n’omume ọma Erna nakwa na nkà ya n’ikwusa ozi ọma pụta, Alice Holtz na ụmụ ya ise ghọchara Ndịàmà Jehova e mere baptizim. Ọzọkwa, ụmụ ụmụ Alice 11 bụkwa Ndịàmà. Abụọ n’ime ha na-eje ozi ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Selters, Germany. Susanne, bụ́ otu n’ime ụmụ Alice ndị nwanyị na-ekwu, sị: “Ezinụlọ anyị nọ n’eziokwu, n’ụzọ bụ́ isi, n’ihi ihe nlereanya Erna.” A kwụghachiri ntachi obi Erna ụgwọ n’ụba. Olee banyere ọnọdụ gị? Gị iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi n’ọnọdụ ndị tara akpụ pụrụ iweta nkwụghachi ụgwọ yiri nke ahụ. Ee, omume ọma na iji nkà eme nkwusa pụrụ inyere gị aka inwe mmeri n’ụzọ pụrụ iche. *
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Ka a na-akwadebe ibipụta isiokwu a, Erna Ludolph nwụrụ ka ọ gbasịrị afọ 96. O kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ.
[Foto dị na peeji nke 31]
Erna Ludolph (onye nke nọ n’oche) na ndị ezinụlọ Holtz