Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inwe Obi Ike Mgbe A Na-eche Mmegide Ihu

Inwe Obi Ike Mgbe A Na-eche Mmegide Ihu

Inwe Obi Ike Mgbe A Na-eche Mmegide Ihu

ÌGWÈ iwe ji manyere Geọs na Arịstakọs, bụ́ ndị ibe abụọ nke Pọl onyeozi, ịbanye n’ebe a na-eme ihe nkiri n’Efesọs. N’ebe ahụ, ìgwè ahụ iwe ji tiri mkpu ruo awa abụọ, sị: “Atemis nke ndị Efesọs dị ukwuu!” (Ọrụ 19:28, 29, 34) Ndị ibe Pọl hà guzosiri ike n’ihu mmegide a? Gịnịdị kpatara ọnọdụ a?

Pọl ezisawo ozi ọma n’ụzọ gara nke ọma n’obodo Efesọs ruo ihe dị ka afọ atọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị Efesọs kwụsịrị ikpere arụsị. (Ọrụ 19:26; 20:31) Arụsị a ma ama n’Efesọs bụ obere arụsị ọlaọcha nke Atemis, bụ́ chi nwanyị ọmụmụ, nke a na-anọ n’ụlọ nsọ ya dị ebube ahụ obodo ahụ. A na-anya obere ihe oyiyi ụlọ nsọ ahụ n’olu dị ka ọgwụ nchebe ma ọ bụ konye ha n’ụlọ. N’ezie, Ndị Kraịst agaghị azụ arụsị ndị a.—1 Jọn 5:21.

Dimitriọs, bụ́ otu n’ime ndị na-akpụ ọlaọcha, kweere na ozi Pọl na-emebiri ha ọrụ na-enye ha ezigbo ego. Site n’ikwu ihe ndị na-abụchaghị eziokwu na ikwubiga okwu ókè, o mere ka ndị omenkà ibe ya kwere na mmadụ nile n’Eshia Maịnọ ga-akwụsị ife Atemis. Ozugbo ahụ, ndị na-akpụ ọlaọcha iwe ji malitere itiri Atemis mkpu otuto, nnukwu ọgba aghara bilitere, obodo ahụ nile jupụtakwara n’aghara.—Ọrụ 19:24-29.

Ọtụtụ puku mmadụ gbakọtara n’ebe ahụ a na-eme ihe nkiri, nke pụrụ ịba iri puku mmadụ abụọ na ise. Pọl chọrọ ịgwa ìgwè ahụ iwe ji okwu, ma ụfọdụ ndị ọrụ ọchịchị nwere omume enyi gwara ya ka ọ ghara ime otú ahụ. N’ikpeazụ, onye nlekọta obodo ahụ mere ka ìgwè ahụ nọrọ jụụ, Geọs na Arịstakọs gbapụrụ n’enweghị ihe mere ha.—Ọrụ 19:35-41.

Taa, ndị Chineke pụkwara iche ndị mmegide na ọbụna ọgba aghara ihu ka ha na-ekwusa ozi ha. Ha na-ekwusakarị ozi ọma n’obodo ebe ikpere arụsị, omume rụrụ arụ na isi ike jupụtara. N’agbanyeghị nke ahụ, ha ji obi ike na-eṅomi Pọl onyeozi, bụ́ onye ‘na-alaghị azụ n’izi ihe n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ’ n’obodo Efesọs. (Ọrụ 20:20) Ha na-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe ha na-ahụ na “okwu Jehova nọgidere na-eto eto ma na-enwe mmeri.”—Ọrụ 19:20.

[Foto dị na peeji nke 30]

Mkpọmkpọ ebe nke ebe a na-eme ihe nkiri dị n’Efesọs