Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mbilite n’Ọnwụ—Atụmanya Dị Ebube

Mbilite n’Ọnwụ—Atụmanya Dị Ebube

Mbilite n’Ọnwụ—Atụmanya Dị Ebube

NKWENKWE mbilite n’ọnwụ bụ ihe zuru ụwa ọnụ. Akwụkwọ nsọ ndị Alakụba, bụ́ Koran, nwere otu isiakwụkwọ nke kwuru banyere mbilite n’ọnwụ. Isiakwụkwọ nke 75 na-ekwu ná mgbubiri, sị: “Eji m Ụbọchị Mbilite n’Ọnwụ ṅụọ iyi . . . Mmadụ ò chere na Anyị apụghị ịchịkọta ọkpụkpụ ya? . . . Ọ na-ajụ, sị: ‘Olee mgbe Ụbọchị Mbilite n’Ọnwụ ga-abịa?’ Ó (otu onye ahụ) nweghị ike inyeghachi ndị nwụrụ anwụ ndụ?”—Isi 75:1-6, 40.

Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica, na-ekwu, sị: “Ndị òtù Zoroaster kweere na a ga-emeri Ihe Ọjọọ mmeri ikpeazụ, kwere ná mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume, Ikpe Ikpeazụ, na iweghachiri ndị ezi omume ụwa nke e mere ka ọ dị ọcha.”

Encyclopædia Judaica na-akọwa mbilite n’ọnwụ dị ka “nkwenkwe bụ́ na a ga-emesị mee ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ n’ahụ́ nkịtị ha ibi n’ụwa.” Otu akwụkwọ ntụaka ahụ na-ekwukwa na nkwenkwe nke na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ bụ́ nke okpukpe ndị Juu nakweere mere ka e nwee mgbagwoju anya. O kwetara, sị: “N’ụzọ bụ́ isi, nkwenkwe abụọ ahụ bụ́ mbilite n’ọnwụ na anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi na-emegiderịta onwe ha.”

Okpukpe Hindu na-akụzi na a na-amụgharị mmadụ, ma ọ bụ na mmadụ na-alọ ụwa, ọtụtụ ugboro. Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, ọ pụtara na mmadụ aghaghị inwe mkpụrụ obi na-adịgide ndụ mgbe ọ nwụsịrị. Akwụkwọ nsọ ndị Hindu bụ́ Bhagavad Gita na-ekwu, sị: “A pụghị ibibi ihe ahụ zuru ahụ́ dum ebibi. Ọ dịghị onye nwere ike ibibi mkpụrụ obi na-adịghị ere ure.”

Okpukpe Buddha dị nnọọ iche na nke Hindu n’ihi na o kwetaghị na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Ka o sina dị, ọtụtụ ndị Buddha taa bụ́ ndị bi n’Ime Ime Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa kweere na mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ pụrụ isi n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ. *

Mgbagwoju Anya Banyere Ozizi Mbilite n’Ọnwụ

Mgbe mgbe, okwu olili ozu ndị a na-ekwu na Krisendọm na-ezo aka ma ná mkpụrụ obi ịdịgide ndụ mgbe mmadụ nwụsịrị ma ná mbilite n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, ndị ụkọchukwu Anglịkan na-ekwughachikarị okwu ndị a: “Ebe ọ dịworo Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile mma n’ebere ukwu ya iwere n’onwe ya nwanna anyị nke a a hụrụ n’anya nke lara ala ugbu a, ya mere anyị na-arara arụ́ ya nye n’ala; ájá laara ájá, ntụ laara ntụ, uzuzu laara uzuzu; n’ezi olileanya kwesịrị ntụkwasị obi nke Mbilite n’Ọnwụ baa ná ndụ ebighị ebi, site n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.”—The Book of Common Prayer.

Okwu ndị ahụ na-eme ka mmadụ na-eche ma Bible ọ̀ na-akụzi mbilite n’ọnwụ ka ọ̀ bụ ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. Otú ọ dị, rịba ama ihe onye France bụ́ onye Protestant bụ́ Prọfesọ Oscar Cullmann kwuru. Ọ na-ede n’akwụkwọ ya bụ́ Immortality of the Soul or Resurrection of the Dead?, sị: “E nwere ọdịiche dị ukwuu n’etiti atụmanya mbilite n’ọnwụ nke Ndị Kraịst na nkwenkwe ndị Gris nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. . . . Ọ bụ ezie na Iso Ụzọ Kraịst mesịrị jikọta nkwenkwe abụọ a, taakwa, ọtụtụ Ndị Kraịst amatụghị ọdịiche dị n’etiti ha abụọ, ahụghị m ihe ga-eme ka m zochie ihe mụ na ihe ka ukwuu ná ndị ọkà mmụta ndị ọzọ lere anya dị ka eziokwu. . . . Agba Ọhụrụ dabeere kpamkpam n’okwukwe ná mbilite n’ọnwụ. . . . Mmadụ ahụ n’ozuzu, bụ́ onye nwụrụ anwụ n’ezie, na-adịghachi ndụ site na Chineke ike ya ọzọ.”

Ọ bụghị ihe ijuanya na ndị mmadụ n’ozuzu nọ ná mgbagwoju anya n’ihe banyere ọnwụ na mbilite n’ọnwụ. Iji mee ka nke ahụ doo anya, ọ dị anyị mkpa ilegara Bible anya, bụ́ ebe a na-enweta eziokwu nke Onye kere mmadụ, bụ́ Jehova Chineke, kpughere. E nwere ọtụtụ ihe ndekọ banyere mbilite n’ọnwụ n’ime Bible. Ka anyị nyochaa anọ n’ime ihe ndekọ ndị a ma tụlee ihe ha na-ekpughe.

“Ndị Inyom Natara Ndị Ha Nwụrụ Anwụ Site ná Mbilite n’Ọnwụ”

N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst, Pọl onyeozi kwuru na ndị inyom nwere okwukwe “natara ndị ha nwụrụ anwụ site ná mbilite n’ọnwụ.” (Ndị Hibru 11:35) Otu n’ime ndị inyom ahụ bi na Zarefat, bụ́ obodo ndị Fonishia dịdewere Saịdọn n’Ụsọ Oké Osimiri Mediterenian. Ọ bụ nwanyị di ya nwụrụ nke nabatara onye amụma Chineke bụ́ Ịlaịja ma nye ya nri ọbụna n’oge e nwere oké ụnwụ nri. N’ụzọ dị mwute, nwa nwanyị a dara ọrịa ma nwụọ. Ịlaịja buuru ya ozugbo rịgoo n’ụlọ elu bụ́ ebe onye amụma ahụ bi ma rịọ Jehova ka o mee ka nwata ahụ dịghachi ndụ. Ọrụ ebube weere ọnọdụ, nwata ahụ ‘dịghachikwara ndụ.’ Ịlaịja kpọghachiiri ya nne ya ma sị: “Lee nwa gị na-adị ndụ.” Gịnị ka nwanyị ahụ mere? O ji obi ụtọ kwuo, sị: “Ugbu a amawo m nke a na onye nke Chineke ka ị bụ, na okwu Jehova bụkwa eziokwu n’ọnụ gị.”—1 Ndị Eze 17:22-24.

N’ebe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị kilomita site n’ebe ndịda Zarefat, e nwere otu di na nwunye na-emesapụ aka bụ́ ndị lekọtara Ịlaịsha onye amụma, bụ́ onye nọchiri anya Ịlaịja. Nke nwanyị bụ onye a ma ama n’obodo ya bụ́ Shunem. Ya na di ya kwetara ka Ịlaịsha biri n’ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu ha. Mwute ha nwere n’ihi amụtaghị nwa mesịrị ghọọrọ ha ọṅụ mgbe nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke. Ka nwata ahụ nọ na-etolite, ọ na-agakwurukarị nna ya na ndị na-ebiri ha ọka n’ubi. Otu ụbọchị, njinji jiri. Nwata ahụ tiri mkpu na isi na-awa ya. Otu n’ime ụmụ okorobịa ha mere ngwa ngwa ma kpọlata ya n’ụlọ. Nne ya kuuru ya n’apata, ma nwata ahụ jiri nwayọọ nwayọọ nwụọ. Nne ya uche gbasasịrị kpebiri ịkpọ Ịlaịsha maka enyemaka. Ya na otu n’ime ụmụ okorobịa ha gara ebe ugwu ọdịda anyanwụ n’ụzọ e si aga Ugwu Kamel, bụ́ ebe Ịlaịsha bi.

N’ime ihe banyere ọnọdụ ahụ, onye amụma ahụ gwara nwa okorobịa ya, bụ́ Gihezi, ka ọ gatụwa, Gihezi hụkwara na nwa ahụ anwụọla n’ezie. Ịlaịsha na nwanyị ahụ sooro gawa, ma gịnị mere mgbe ha mesịrị rute Shunem? Ihe ndekọ dị ná 2 Ndị Eze 4:32-37 na-akọ, sị: “Ịlaịsha wee bata n’ụlọ ahụ, ma, lee, nwa okoro ahụ anwụwo, a tọgbọkwara ya n’ihe ndina ya. O wee baa, mechibido ha abụọ ụzọ kpeere Jehova. Ọ rịgoo dinaa n’elu nwata ahụ, tụkwasị ọnụ ya n’ọnụ ya, na anya ya abụọ n’anya ya abụọ, na ọbụ aka ya abụọ n’ọbụ aka ya abụọ, huru ala n’elu ya; anụ ahụ́ nwata ahụ wee dị ọkụ. O wee bịaghachi, jegharịa ihu na azụ n’ụlọ otu ugboro; ọ rịgoo, hurukwa n’elu ya: nwa okoro ahụ wee zee uzere ruo ugboro asaa, nwa okoro ahụ wee saghee anya ya abụọ. Ọ kpọọ Gihezi, sị, Kpọọ nwanyị Shunem nke a. Ọ kpọọ ya. Nwanyị ahụ wee bakwute ya, ọ sị, Kuru nwa gị. O wee baa n’ime, daa n’ala n’ụkwụ ya, kpọọ isiala, kuru nwa ya, pụọ.”

Dị ka nwanyị Zarefat ahụ di ya nwụrụ, nwanyị Shunem ahụ maara na ihe merenụ sitere n’ike Chineke. Ma ndị inyom a nwere ọṅụ dị ukwuu mgbe Chineke mere ka ụmụ ha ha hụrụ n’anya dịghachi ndụ.

Mbilite n’Ọnwụ Ndị Weere Ọnọdụ n’Oge Ije Ozi Jizọs

Ihe dị ka narị afọ itoolu ka e mesịrị, a kpọlitere mmadụ n’ọnwụ n’ebe na-adịghị anya site n’ebe ugwu Shunem ná mpụga obodo Nen. Ka Jizọs Kraịst na ndị na-eso ụzọ ya si Kapanọm na-agaru nso n’ọnụ ụzọ ámá obodo Nen, ha zutere ndị na-aga ili ozu, Jizọs hụkwara otu nwanyị di ya nwụrụ bụ́ onye nanị otu nwa o nwere nwụnahụrụ. Jizọs gwara ya ka ọ kwụsị ibe ákwá. Luk, bụ́ onye dibịa, kọwara ihe ọzọ merenụ, sị: “Mgbe nke ahụ mere, [Jizọs] garuru nso ma bitụ ihe ahụ e ji ebu ozu aka, ndị bu ya wee guzoro n’otu ebe, o wee sị: ‘Nwa okorobịa, asị m gị, Bilie!’ Onye ahụ nwụrụ anwụ wee bilie nọrọ ọdụ ma malite ikwu okwu, o wee kpọnye ya nne ya.” (Luk 7:14, 15) Ndị hụrụ ọrụ ebube a toro Chineke. Akụkọ banyere mbilite n’ọnwụ ahụ gbasara n’ebe ndịda ruo Judia na obodo ndị gbara ya gburugburu. N’ụzọ na-akpali mmasị, ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim nụrụ ya ma kọọrọ Jọn banyere ọrụ ebube ahụ. N’aka nke ya, o zipụrụ ha ka ha gaa chọọ Jizọs ma jụọ ya ma ọ̀ bụ Ya bụ Mezaịa ahụ a na-atụ anya ya. Jizọs gwara ha, sị: “Gawanụ, kọọrọ Jọn ihe unu hụrụ na ihe unu nụrụ: ndị ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-eje ije, a na-eme ka ndị ekpenta dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụkwa ihe, a na-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ, a na-ezikwa ndị ogbenye ozi ọma.”—Luk 7:22.

Ọrụ ebube mbilite n’ọnwụ Jizọs nke a kasị mara amara bụ nke Jizọs rụrụ mgbe ọ kpọlitere ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs. Na nke a, ọ nọtụla ọdụ Lazarọs nwụrụ tupu Jizọs erute n’ụlọ ha. Mgbe Jizọs mesịrị rute Betani, o ruwo ụbọchị anọ Lazarọs nwụrụ. Mgbe Jizọs kwuru ka e bupụ nkume e ji kpuchie ebe e liri ya, Mata jụrụ, na-ekwu, sị: “Onyenwe anyị, ka ọ dị ugbu a ọ ghaghị ịbụ na o siwela ísì, n’ihi na o meela ụbọchị anọ.” (Jọn 11:39) Ma, ire ure nke ahụ́ Lazarọs emeghị ka a ghara ịkpọlite ya n’ọnwụ. Mgbe Jizọs nyere iwu, “nwoke ahụ nwụworo anwụ pụtara buru ákwà e kere ya n’ụkwụ na n’aka, e kekwara ya ákwà n’ihu.” Ihe ndị iro Jizọs mere mgbe nke ahụ gasịrị gosiri na ọ bụ Lazarọs n’ezie ka a kpọlitere.—Jọn 11:43, 44; 12:1, 9-11.

Olee ihe ihe ndekọ mbilite n’ọnwụ anọ a na-eme ka anyị kwubie? Nke ọ bụla n’ime ndị ahụ a kpọlitere dịghachiri ndụ dị nnọọ ka onye ọ bụ tupu ya anwụọ. Ndị mmadụ matara ha, ọbụna ndị ikwu ha matakwara ha. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ kwuru ihe mere n’ime obere oge ahụ ha na-adịghị ndụ. Ọ dịghị nke kwuru na ya gara n’ụwa ọzọ. O yiri ka ha nile hà nwere ezi ahụ́ ike mgbe a kpọlitere ha. Nye ha, ọ dị ka hà hiri ụra ruo nwa oge ma teta, ọbụna dị ka Jizọs kwuru. (Jọn 11:11) Ka o sina dị, nke ọ bụla n’ime ha mesịrị nwụọ.

Ịhụ Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ Ọzọ—Atụmanya Dị Ebube

Obere oge ka ọnwụ na-agbawa obi nke Owen, nke a kọrọ n’isiokwu bu ụzọ, gasịrị, nna ya gara n’ụlọ onye agbata obi ha. Ọ hụrụ mpempe akwụkwọ na-akpọsa otu okwu ihu ọha nke Ndịàmà Jehova haziri n’elu tebụl. Isiokwu ya bụ́ “Olee Ebe Ndị Nwụrụ Anwụ Nọ?” masịrị ya. Nke ahụ bụ kpọmkwem ajụjụ nọworo na-enye ya nsogbu n’obi. Ọ gara gee okwu ihu ọha ahụ ma nweta ezi nkasi obi sitere na Bible. Ọ mụtara na ndị nwụrụ anwụ adịghị ata ahụhụ. Kama ịbụ ndị nọ na-ata ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ ma ọ bụ ịbụ ndị Chineke weere ịga ghọọ ndị mmụọ ozi n’eluigwe, ndị nwụrụ anwụ, gụnyere Owen, nọ na-echere n’ili ruo mgbe oge a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ga-eru.—Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4.

Ọdachi ọ̀ dakwasịrị gị na ezinụlọ gị? Dị ka nna Owen, ị̀ na-eche ebe ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ nọ ugbu a na otú ọ ga-esi kwe omume ịhụ ha ọzọ? Ya bụrụ otú ahụ, anyị na-akpọ gị òkù ịtụle ihe ndị ọzọ Bible na-akụzi banyere mbilite n’ọnwụ. Ikekwe, ị pụrụ ịdị na-eche, sị: ‘Olee mgbe mbilite n’ọnwụ ga-ewere ọnọdụ? Ole ndị kpọmkwem ga-erite uru na ya?’ Biko gụọ isiokwu ndị na-esonụ ebe a zara ajụjụ ndị a na ajụjụ ndị ọzọ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Lee akwụkwọ bụ́ Mankind’s Search for God, peeji nke 150-154, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ịlaịja rịọrọ Jehova arịrịọ ka o mee ka nwa okoro ahụ dịghachi ndụ

[Foto dị na peeji nke 5]

Jehova jiri Ịlaịsha mee ihe iji kpọlite nwa nwanyị Shunem

[Foto dị na peeji nke 6]

Jizọs kpọlitere nwa nke nwanyị Nen di ya nwụrụ

[Foto dị na peeji nke 7]

Mbilite n’ọnwụ ga-ejikọtaghachi ndị nwụrụ anwụ na ndị ikwu ha ha hụrụ n’anya