Mbilite n’Ọnwụ—Ozizi Metụtara Gị
Mbilite n’Ọnwụ—Ozizi Metụtara Gị
“Enwekwara m olileanya n’ebe Chineke nọ . . . na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”—ỌRỤ 24:15.
1. Olee otú mbilite n’ọnwụ si ghọọ ihe iseokwu n’etiti ndị Sanhedrin?
NÁ NGWỤSỊ njem ozi ala ọzọ ya nke atọ na 56 O.A., Pọl onyeozi nọ na Jeruselem. Mgbe ndị Rom jidesịrị ya, e nyere ya ohere ịwụcha n’ihu ụlọikpe ukwu ndị Juu, bụ́ Sanhedrin. (Ọrụ 22:29, 30) Ka Pọl nọ na-ekiri ndị òtù ụlọikpe ahụ, ọ chọpụtara na ụfọdụ bụ ndị Sadusii, ndị ọzọ abụrụkwa ndị Farisii. Ìgwè abụọ a nwere otu ọdịiche pụtara ìhè. Ndị Sadusii ekweghị ná mbilite n’ọnwụ; ndị Farisii kweere na ya. Iji gosi ebe ọ kwụ n’okwu ahụ, Pọl kwuru, sị: “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii, nwa onye Farisii. Ọ bụ n’ihi olileanya mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ ka a na-ekpe m ikpe.” Site n’ime otú ahụ, o tinyere ọgba aghara n’etiti ndị gbakọtara ebe ahụ!—Ọrụ 23:6-9.
2. Gịnị mere Pọl ji dị njikere ịgọpụrụ nkwere o kweere ná mbilite n’ọnwụ?
2 Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, mgbe Pọl na-aga Damaskọs, ọ hụrụ ọhụụ bụ́ nke ọ nụrụ olu Jizọs na ya. Pọl jụdịrị Jizọs, sị: “Gịnị ka m ga-eme, Onyenwe m?” Jizọs zara ya, sị: “Bilie, banye na Damaskọs, n’ebe ahụkwa a ga-agwa gị ihe nile a kaworo aka ka i mee.” Mgbe Pọl bịaruru Damaskọs, Ananaịas, bụ́ Onye na-eso ụzọ Kraịst nke na-enyere ndị ọzọ aka, chọtara ya ma kọwaara ya, sị: “Chineke nke ndị nna nna anyị hà ahọrọwo gị ịbịa mara uche ya na ịhụ Onye ezi omume ahụ [Jizọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite] na ịnụ okwu ọnụ ya.” (Ọrụ 22:6-16) Ka a sịkwanụ ihe mere Pọl ji dị njikere ịgọpụrụ nkwere o kweere ná mbilite n’ọnwụ.—1 Pita 3:15.
Ikwusa Olileanya Mbilite n’Ọnwụ n’Ihu Ọha
3, 4. Olee otú Pọl si gosi na ya na-akwadosi mbilite n’ọnwụ ike, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya ya?
3 Pọl mesịrị wụchaa n’ihu Gọvanọ Filiks. N’oge ahụ, Tetọlọs, bụ́ “ọkà okwu ihu ọha” nke kwuru ihe ndị Juu nwere megide Pọl, boro ya ebubo na ọ bụ onye ndú nke ịrọ òtù na onye na-agba ọchịchị mgba okpuru. Ná nzaghachi, Pọl kwuru hoo haa, sị: “Ma ana m ekweta nke a n’ihu gị, na, dị ka ụzọ ahụ ha na-akpọ ‘ịrọ òtù’ si dị, n’ụzọ a ka m si na-ejere Chineke nke nna nna m hà ozi dị nsọ.” Banyere isi ihe na-ese okwu, ọ gaziri n’ihu ikwu, sị: “Enwekwara m olileanya n’ebe Chineke nọ, bụ́ olileanya nke ndị a n’onwe ha nwekwara, na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”—Ọrụ 23:23, 24; 24:1-8, 14, 15.
4 Mgbe ihe dị ka afọ abụọ gasịrị, onye nọchiri Filiks, bụ́ Pọshiọs Festọs, kpọrọ Eze Herọd Agrịpa isonyere ya n’ịgba onye mkpọrọ ahụ bụ́ Pọl ajụjụ ọnụ. Festọs kọwara na ndị boro Pọl ebubo gbaghara ihe o kwuru nke bụ́ na “otu Jizọs nke nwụworo anwụ . . . dị ndụ.” N’ịgọrọ ọnụ ya, Pọl jụrụ, sị: “N’ihi gịnị ka unu ji were ya na ọ bụ ihe a na-apụghị ikwere Ọrụ 24:27; 25:13-22; 26:8, 22, 23) Lee ka Pọl si bụrụ onye na-akwadosi mbilite n’ọnwụ ike! Dị ka Pọl, anyị onwe anyị pụkwara iji nkwenye siri ike na-akpọsa na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ. Ma, olee mmeghachi omume anyị pụrụ ịtụ anya ya? Ikekwe ọ bụ ụdị ahụ Pọl nwetara.
ekwere na Chineke na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ?” O kwuziri, sị: “N’ihi na enwetawo m enyemaka sitere n’ebe Chineke nọ, anọgidere m na-agbara ma ndị nta ma ndị ukwu àmà ruo taa, ma n’adịghị ekwu ihe ọ bụla ma e wezụga ihe Ndị Amụma nakwa Mozis kwuru na ha gaje iwere ọnọdụ, na Kraịst ahụ gaje ịta ahụhụ, dị ka onye mbụ e si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite, ọ gajekwa ikwusa ìhè nye ma ndị nke a ma ndị mba ọzọ.” (5, 6. (a) Olee otú ndị mmadụ si meghachi omume mgbe ndịozi kwusara mbilite n’ọnwụ? (b) Ka anyị na-ekwupụta olileanya anyị ná mbilite n’ọnwụ, gịnị dị oké mkpa?
5 Tụlee ihe mere ná mmalite nke njem ozi ala ọzọ nke abụọ nke Pọl (ihe dị ka 49-52 O.A.) mgbe ọ gara Atens. O sooro ndị kweere n’ọtụtụ chi tụgharịa uche, ọ gbakwara ha ume ịrịba ama nzube Chineke nke ikpe elu ụwa mmadụ bi ikpe n’ezi omume site n’aka otu nwoke Ọ họpụtaworo. Ọ dịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ́ bụghị Jizọs. Pọl kọwara na Chineke enyewo ihe mmesi obi ike site n’ịkpọlite Jizọs n’ọnwụ. Olee otú ndị ọ na-agwa okwu si meghachi omume? Anyị na-agụ, sị: “Mgbe ha nụrụ banyere mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ụfọdụ malitere ịkwa emo, ebe ndị ọzọ sịrị: ‘Anyị ga-anụ banyere nke a ọbụna n’oge ọzọ.’”—Ọrụ 17:29-32.
6 Mmeghachi omume ahụ yiri nke Pita na Jọn nwetara obere oge ka Pentikọst 33 O.A. gasịrị. Ọzọkwa, ọ bụ ndị Sadusii nọ n’isi esemokwu ahụ. Ọrụ 4:1-4 na-akọ ihe merenụ: “Ma ka mmadụ abụọ ahụ nọ na-agwa ndị Juu okwu, ndị isi nchụàjà na onyeisi ndị nche ụlọ nsọ na ndị Sadusii zutere ha, bụrụkwa ndị iwe ji n’ihi na ha na-ezi ìgwè mmadụ ahụ ihe, na-akpọsakwa n’ụzọ doro anya banyere mbilite n’ọnwụ n’ihe banyere Jizọs.” Otú ọ dị, ndị ọzọ meghachiri omume n’ụzọ dị mma. “Ọtụtụ n’ime ndị geworo ntị n’okwu ahụ kweere, ọnụ ọgụgụ nke ndị ikom ahụ wee dị ihe dị ka puku ise.” Ihe àmà na-egosi na anyị pụrụ ịtụ anya mmeghachi omume dị iche iche mgbe anyị na-ekwu banyere olileanya mbilite n’ọnwụ. N’ihi nke ahụ, ọ dị oké mkpa ka anyị mee ka okwukwe anyị n’ozizi a sie ike.
Okwukwe na Mbilite n’Ọnwụ
7, 8. (a) Dị ka e gosiri n’akwụkwọ ozi e degaara ọgbakọ Kọrint nke narị afọ mbụ, olee otú okwukwe pụrụ isi bụrụ ihe efu? (b) Olee otú ịghọta olileanya mbilite n’ọnwụ nke ọma si eme ka ezi Ndị Kraịst pụọ iche?
7 Ọ bụghị mmadụ nile bụ́ ndị ghọrọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ O.A. ka ọ dịịrị mfe ịnakwere olileanya mbilite n’ọnwụ. Ụfọdụ ndị o siiri ike nnakwere nọ n’ọgbakọ dị na Kọrint. Pọl degaara ha akwụkwọ ozi, sị: “Enyefere m unu, n’ime ihe ndị mbụ, ihe ahụ nke m natakwara, na Kraịst nwụrụ maka mmehie anyị dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo; nakwa na e liri ya, ee, na a kpọlitewo ya n’ụbọchị nke atọ dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo.” Pọl kwuziri ihe na-agbara eziokwu a akaebe site n’ikwu na Kraịst ahụ a kpọlitere n’ọnwụ “pụtara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise,” Pọl gbakwụnyere na ihe ka ọtụtụ n’ime ha ka dị ndụ n’oge ahụ. (1 Ndị Kọrint 15:3-8) Ọ gara n’ihu iso ha tụgharịa uche, na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na a na-ekwusa na e siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Kraịst, olee ihe mere ụfọdụ n’ime unu ji ekwu na e nweghị mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ? N’ezie, ọ bụrụ na e nweghị mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, a kpọlitebeghịkwa Kraịst. Ma ọ bụrụ na a kpọlitebeghị Kraịst, nkwusa anyị na-eme bụ ihe efu n’ezie, okwukwe anyị bụkwa ihe efu.”—1 Ndị Kọrint 15:12-14.
8 Ee, ozizi nke mbilite n’ọnwụ dị nnọọ mkpa nke na okwukwe Ndị Kraịst bụ ihe efu ma ọ bụrụ na a nakwereghị mbilite n’ọnwụ dị ka ihe ga-eme eme. N’ezie, ịghọta mbilite n’ọnwụ nke ọma na-eme ka ezi Ndị Kraịst Jenesis 3:4; Ezikiel 18:4) N’ihi ya, Pọl gụnyere ozizi mbilite n’ọnwụ ‘n’ozizi mmalite’ nke Iso Ụzọ Kraịst. Ka mkpebi anyị siri ike bụrụ ‘ijisi ike ruo ntozu okè.’ Pọl na-agba ume, sị: “Nke a kwa ka anyị ga-eme, ma ọ bụrụ n’ezie na Chineke ekwe.”—Ndị Hibru 6:1-3.
pụọ iche ná ndị nke ụgha. (Olileanya Mbilite n’Ọnwụ
9, 10. Gịnị ka Bible na-ekwu mgbe ọ na-ezo aka ná mbilite n’ọnwụ?
9 Iji wusikwuo okwukwe anyị nwere ná mbilite n’ọnwụ ike, ka anyị tụlee ajụjụ ndị dị ka: Gịnị ka Bible na-ekwu mgbe ọ na-ezo aka ná mbilite n’ọnwụ? Olee otú ozizi mbilite n’ọnwụ si eme ka ịhụnanya Jehova pụta ìhè? Azịza nye ajụjụ ndị a ga-adọtakwu anyị nso n’ebe Chineke nọ, n’otu mgbe ahụkwa, nyere anyị aka izi ya ndị ọzọ.—2 Timoti 2:2; Jems 4:8.
10 “Mbilite n’ọnwụ” bụ nsụgharị nke okwu Grik nke pụtara n’ụzọ nkịtị “ibili ọtọ ọzọ.” Gịnị ka okwu ahụ na-agụnye? Dị ka Bible si kwuo, olileanya mbilite n’ọnwụ bụ nkwenye siri ike na onye nwụrụ anwụ pụrụ ịdị ndụ ọzọ. Bible na-egosikwa na a na-enyeghachi onye ahụ ahụ́ mmadụ ma ọ bụ nke mmụọ, na-adabere n’olileanya ya, ma ọ̀ bụ nke elu ala ma ọ bụ nke eluigwe. Ịhụnanya, amamihe na ike Jehova, bụ́ ndị na-apụta ìhè n’olileanya mbilite n’ọnwụ a dị ebube, na-atụ anyị n’anya.
11. Olee atụmanya mbilite n’ọnwụ e nyere ndị ohu Chineke e tere mmanụ?
11 Mbilite n’ọnwụ nke Jizọs na ụmụnna ya e tere mmanụ ga-eme ka ha nwee ahụ́ mmụọ ka ha wee nwee ike ije ozi n’eluigwe. (1 Ndị Kọrint 15:35-38, 42-53) Ha ga-abụ ndị ọchịchị nke Alaeze Mezaịa ahụ, bụ́ nke ga-eme ka ụwa ghọọ Paradaịs. N’ịbụ ndị nọ n’okpuru Jizọs dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà, ndị e tere mmanụ na-aghọ òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze. Ha ga-eji abamuru ndị sitere n’àjà mgbapụta Kraịst mee ihe maka ihe a kpọrọ mmadụ n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume ahụ. (Ndị Hibru 7:25, 26; 9:24; 1 Pita 2:9; Mkpughe 22:1, 2) Ka ọ dịgodị, ndị so ná ndị e tere mmanụ bụ́ ndị ka dị ndụ n’ụwa nwere ọchịchọ nke ịnọgide bụrụ ndị Chineke na-anakwere. Mgbe ha nwụrụ, ha ga-enweta “nkwụghachi ụgwọ” ha site n’ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ nke mmụọ n’eluigwe. (2 Ndị Kọrint 5:1-3, 6-8, 10; 1 Ndị Kọrint 15:51, 52; Mkpughe 14:13) Pọl dere, sị: “Ọ bụrụ na e mewo ka anyị na ya dị n’otu n’ọdịdị nke ọnwụ ya, n’ezie a ga-emekwa ka anyị na ya dị n’otu n’ọdịdị nke mbilite n’ọnwụ ya.” (Ndị Rom 6:5) Oleekwanụ maka ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ịdị ndụ ọzọ n’ụwa dị ka mmadụ? Olee otú olileanya mbilite n’ọnwụ ga-esi mee ka ha bịarukwuo Chineke nso? Anyị pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe site n’ihe atụ Ebreham.
Mbilite n’Ọnwụ na Ịbụ Enyi Jehova
12, 13. Olee ihe gbara ọkpụrụkpụ mere Ebreham ji kwere ná mbilite n’ọnwụ?
12 Ebreham, bụ́ onye a kọwara dị ka “enyi Jehova,” bụ nwoke nwere okwukwe pụtara ìhè. (Jems 2:23) Pọl zoro aka n’okwukwe Ebreham ugboro atọ n’ihe ndekọ ya nke ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi nke dị n’isi nke 11 nke akwụkwọ Ndị Hibru. (Ndị Hibru 11:8, 9, 17) Aka nke atọ o zoro n’okwukwe Ebreham dọọrọ uche gaa n’okwukwe o gosipụtara mgbe o ji nrubeisi kwadebe ịchụ nwa ya nwoke bụ́ Aịzik n’àjà. Obi siri Ebreham ike na Jehova ga-emezurịrị nkwa o kwere na otu mkpụrụ ga-esi n’Aịzik pụta. Ya bụrụgodị na Aịzik anwụọ dị ka onye e jiri chụọ àjà, Ebreham “weere ya na Chineke nwere ike ịkpọlite ya ọbụna site ná ndị nwụrụ anwụ.”
13 Mgbe Jehova hụrụ otú okwukwe Ebreham siruru n’ike, o mesịrị hazie ka e jiri anụmanụ chụọ àjà kama iji Aịzik. Otú ọ dị, ahụmahụ Aịzik bụ ihe atụ nke mbilite n’ọnwụ dị ka Pọl kọwara: “Sitekwa n’ebe ahụ ọ [Ebreham] natakwara ya [Aịzik] n’ụzọ ihe atụ.” (Ndị Hibru 11:19) Tụkwasị na nke ahụ, Ebreham enweelarị ihe gbara ọkpụrụkpụ mere o ji kwere ná mbilite n’ọnwụ. Ọ̀ bụ na Jehova eweghachighị ikike ịmụ nwa Ebreham mgbe ya na nwunye ya, bụ́ Sera, nwere mmekọahụ n’oge agadi ha ma mụọ nwa ha nwoke, bụ́ Aịzik?—Jenesis 18:10-14; 21:1-3; Ndị Rom 4:19-21.
14. (a) Dị ka Ndị Hibru 11:9, 10 si kwuo, gịnị ka Ebreham na-echere? (b) Olee ihe a na-aghaghị ime Ebreham ka o wee nweta ngọzi nke Alaeze ahụ n’ụwa ọhụrụ? (ch) Olee otú anyị pụrụ isi nweta ngọzi nke Alaeze ahụ?
14 Pọl kọwara Ebreham dị ka onye ala ọzọ na onye na-ebi n’ụlọikwuu nke “na-echere obodo ahụ nke nwere ezi ntọala, bụ́ obodo nke ọ bụ Chineke bụ onye wuru ma mee ya.” (Ndị Hibru 11:9, 10) Nke a abụghị obodo nkịtị dị ka Jeruselem, bụ́ ebe ụlọ nsọ Chineke dị. Kama nke ahụ, ọ bụ obodo ihe atụ. Ọ bụ Alaeze eluigwe Chineke nke Kraịst Jizọs na ndị ọchịchị ibe ya dị narị puku na iri puku anọ na anọ mejupụtara. A na-akpọkwa narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ, bụ́ ndị nọ n’ebube eluigwe ha, “obodo nsọ ahụ, bụ́ Jeruselem Ọhụrụ,” “nwanyị [Kraịst] na-alụ ọhụrụ.” (Mkpughe 21:2) Na 1914, Jehova mere ka Jizọs nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze Mezaịa nke Alaeze eluigwe ahụ ma nye ya iwu ịchị n’etiti ndị iro ya. (Abụ Ọma 110:1, 2; Mkpughe 11:15) Iji nweta ngọzi nke ọchịchị Alaeze ahụ, Ebreham, bụ́ “enyi Jehova,” aghaghị ịdị ndụ ọzọ. N’otu aka ahụ, ka anyị wee nweta ngọzi nke Alaeze ahụ, anyị aghaghị ịdị ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke, dị ka ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ bụ́ ndị lanahụrụ Amagedọn ma ọ bụ dị ka ndị a kpọlitere n’ọnwụ. (Mkpughe 7:9, 14) Ma, olee ihe olileanya mbilite n’ọnwụ dabeere na ya?
Ịhụnanya Chineke—Ihe Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Dabeere na Ya
15, 16. (a) Olee otú amụma mbụ nke Bible si bụrụ ihe ndabere maka olileanya anyị nke mbilite n’ọnwụ? (b) Olee otú ikwere ná mbilite n’ọnwụ pụrụ isi mee ka anyị bịarukwuo Jehova nso?
15 Mmekọrịta chiri anya nke anyị na Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya, okwukwe anyị siri ike nke dị ka nke Ebreham na anyị irubere iwu Chineke isi na-eme ka a gụọ anyị ná ndị ezi omume, na-emekwa ka Jehova were anyị dị ka ndị enyi ya. Nke a na-eme ka anyị soro ná ndị ga-erite uru n’ọchịchị Alaeze ahụ. N’ezie, olileanya mbilite n’ọnwụ na nke ịbụ enyi Chineke dabeere n’amụma mbụ ahụ e dekọrọ n’Okwu Chineke, na Jenesis 3:15. O buru amụma, ọ bụghị nanị banyere ngwepịa a ga-egwepịa isi Setan, kamakwa, n’aka nke ọzọ, banyere nchifịa a ga-echifịa ikiri ụkwụ nke Mkpụrụ nwanyị Chineke. Ọnwụ Jizọs n’elu osisi bụ nchifịa n’ikiri ụkwụ n’ụzọ ihe atụ. Mbilite n’ọnwụ ya n’ụbọchị nke atọ gwọrọ ọnyá ahụ ma mee ka o kwe omume ime ihe ngwa ngwa megide “onye ahụ nke nwere ihe e ji akpata ọnwụ, ya bụ, Ekwensu.”—Ndị Hibru 2:14.
16 Pọl na-echetara anyị na “Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya nke ya n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ maka anyị.” (Ndị Rom 5:8) Anyị inwe ekele maka obiọma a na-erughịrị anyị na-eme ka anyị bịarukwuo Jizọs na Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya nso n’ezie.—2 Ndị Kọrint 5:14, 15.
17. (a) Olileanya dị aṅaa ka Job kwupụtara? (b) Gịnị ka Job 14:15 na-ekpughe banyere Jehova, oleekwa mmetụta nke a na-eme ka i nwee?
17 Job, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi nke biri ndụ tupu oge Ndị Kraịst, tụkwara anya mbilite n’ọnwụ. Ọ tara ahụhụ dị ukwuu n’aka Setan. N’adịghị ka ndị enyi ụgha ya, bụ́ ndị na-akpọtụghị mbilite n’ọnwụ aha, Job nwetara nkasi obi site n’olileanya a ma jụọ, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?” Ná nzaghachi, Job n’onwe ya kwuru, sị: “Ụbọchị nile nke obubu agha m ka m ga-eche, ruo mgbe mgbanwe m ga-abịa.” N’ịgwa Chineke ya, bụ́ Jehova, okwu, o kwetara, sị: “Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa Gị.” N’ikwu banyere mmetụta nke Onye Okike anyị na-ahụ n’anya, Job sịrị: “Agụụ ọrụ aka Gị ga-agụ Gị.” (Job 14:14, 15) Ee, Jehova ji ịnụ ọkụ n’obi na-atụ anya mgbe ndị ya nile kwesịrị ntụkwasị obi ga-adịghachi ndụ site ná mbilite n’ọnwụ. Lee otú nke a si adọtakwu anyị nso n’ebe ọ nọ ka anyị na-atụgharị uche n’ịhụnanya na obiọma na-erughịrị mmadụ o nwere n’ebe anyị nọ, n’agbanyeghị na anyị ezughị okè!—Ndị Rom 5:21; Jems 4:8.
18, 19. (a) Atụmanya dị aṅaa ka Daniel nwere ịdị ndụ ọzọ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
18 Daniel onye amụma, bụ́ onye mmụọ ozi Chineke kọwara dị ka “onye bụ ihe a na-achọsi ike nke ukwuu,” dịrị ogologo ndụ ma jiri ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi. (Daniel 10:11, 19) Ọ nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova malite n’oge e mere ka o jee biri n’ala ọzọ na 617 T.O.A. ruo n’ọnwụ ya obere oge ka ọ hụsịrị ọhụụ na 536 T.O.A., n’afọ nke atọ nke ọchịchị Saịrọs, bụ́ eze Peasia. (Daniel 1:1; 10:1) Oge ụfọdụ n’afọ nke atọ nke ọchịchị Saịrọs, Daniel hụrụ ọhụụ mpụta nke ike ọchịchị ụwa dị iche iche bụ́ ndị ga-agwụsị n’oké mkpagbu ahụ. (Daniel 11:1–12:13) Ebe ọ bụ na Daniel aghọtachaghị ọhụụ ahụ, ọ jụrụ mmụọ ozi ahụ gosiri ya ọhụụ ahụ, sị: “Onyenwe m, Gịnị bụ mgbe ikpeazụ nke ihe ndị a?” Ná nzaghachi, mmụọ ozi ahụ kwuru banyere “mgbe ọgwụgwụ,” bụ́ mgbe “ndị nwere uche ga-aghọta.” Ma gịnị ga-abụ ọdịnihu Daniel n’onwe ya? Mmụọ ozi ahụ kwuru, sị: “Ị ga-ezukwa ike, guzo ọtọ n’ebe e keworo nye gị, n’ọgwụgwụ ụbọchị ndị a.” (Daniel 12:8-10, 13) Daniel ga-abịa “ná mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume” n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst.—Luk 14:14.
19 Anyị bi n’akụkụ ikpeazụ nke mgbe ọgwụgwụ, anyị nọkwa mmalite nke Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst nso ugbu a karịa ka anyị nọ ya mgbe anyị ghọrọ ndị kwere ekwe. N’ihi ya, anyị aghaghị ịjụ onwe anyị, sị, ‘M̀ ga-anọ n’ụwa ọhụrụ ahụ iji soro Ebreham, Job, Daniel na ndị ikom na ndị inyom ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi kpakọọ?’ Anyị ga-anọ ya ma ọ bụrụhaala na anyị anọrọ Jehova nso ma na-erube isi n’iwu ya. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle olileanya mbilite n’ọnwụ n’ụzọ sakwuru mbara iji chọpụta ndị a ga-akpọlite.
Ị̀ Na-echeta?
• Olee otú ndị mmadụ si meghachi omume mgbe Pọl kwupụtara olileanya ya nke mbilite n’ọnwụ?
• N’ihi gịnị ka olileanya mbilite n’ọnwụ ji eme ka ezi Ndị Kraịst pụọ iche ná ndị nke ụgha?
• Olee otú anyị si mara na Ebreham, Job na Daniel nwere okwukwe ná mbilite n’ọnwụ?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 8]
Mgbe Pọl wụchara n’ihu Gọvanọ Filiks, o ji nkwenye siri ike kpọsaa olileanya mbilite n’ọnwụ
[Foto dị na peeji nke 10]
Gịnị mere Ebreham ji nwee okwukwe ná mbilite n’ọnwụ?
[Foto dị na peeji nke 12]
Job nwetara nkasi obi site n’olileanya mbilite n’ọnwụ
[Foto dị na peeji nke 12]
Daniel ga-alọghachi ná mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume