Ole Ndị Ka A Ga-akpọlite n’Ọnwụ?
Ole Ndị Ka A Ga-akpọlite n’Ọnwụ?
“Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.”—JỌN 5:28, 29.
1. Okwu dị aṅaa pụrụ iche ka Mozis nụrụ n’osisi nta ahụ na-ere ọkụ, ònyekwa mechara kpọtụghachi uche n’okwu ndị ahụ?
IHE a na-adịghị nnọọ ahụkarị mere ihe karịrị puku afọ atọ na narị ise gara aga. Mozis nọ na-elekọta atụrụ nke nna ochie bụ́ Jetro. Ná nso Ugwu Horeb, mmụọ ozi Jehova mere ka Mozis hụ ya anya n’ire ọkụ n’etiti otu osisi nta. Ihe ndekọ dị n’Ọpụpụ na-akọ, sị: “O wee hụ, ma, lee, osisi nta ahụ na-ere ọkụ, ma e repịaghị osisi nta ahụ.” Mgbe ahụ otu olu sitere n’osisi nta ahụ kpọọ ya òkù. Olu ahụ kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Chineke nke nna gị, Chineke nke Ebreham, na Chineke nke Aịzik, na Chineke nke Jekọb.” (Ọpụpụ 3:1-6) Ka e mesịrị, na narị afọ mbụ O.A., Ọkpara Chineke n’onwe ya, bụ́ Jizọs, kpọtụghachiri uche n’okwu ndị ahụ.
2, 3. (a) Olileanya dị aṅaa ka Ebreham, Aịzik na Jekọb nwere? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa na-ebilite?
2 Jizọs na ụfọdụ ndị Sadusii, bụ́ ndị na-ekweghị ná mbilite n’ọnwụ, nọ na-ekwurịta okwu. Jizọs kwuru, sị: “Na a na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ka ọbụna Mozis mere ka a mara, n’ihe ndekọ banyere obere osisi ogwu ahụ, mgbe ọ na-akpọ Jehova ‘Chineke nke Ebreham na Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.’ Ọ bụ Chineke, ọ bụghị nke ndị nwụrụ anwụ, kama nke ndị dị ndụ, n’ihi na nye ya, ha nile dị ndụ.” (Luk 20:27, 37, 38) Site n’ikwu nke a, Jizọs gbara akaebe na, site n’otú Chineke si ele ihe anya, Ebreham, Aịzik na Jekọb, bụ́ ndị nwụrụ ogologo oge tupu mgbe ahụ, ka dị ndụ ná ncheta Chineke. Dị ka Job, ha na-eche ọgwụgwụ nke “obubu agha” ha, bụ́ ụra ọnwụ ha. (Job 14:14) N’ime ụwa ọhụrụ Chineke, a ga-akpọlite ha n’ọnwụ.
3 Oleekwanụ maka ọtụtụ ijeri ndị ọzọ bụ́ ndị nwụrụlanụ kemgbe ọtụtụ afọ ụmụ mmadụ dịwara ndụ? À ga-akpọlitekwu ha onwe ha n’ọnwụ? Tupu anyị enweta azịza na-eju afọ nye ajụjụ ndị a, ka anyị chọpụta site n’Okwu Chineke ebe ụmụ mmadụ na-aga ma ha nwụọ.
Olee Ebe Ndị Nwụrụ Anwụ Nọ?
4. (a) Olee ebe ụmụ mmadụ na-aga ma ha nwụọ? (b) Gịnị bụ Shiol?
4 Bible na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla.” Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, a dịghị ata ya ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ, ma ọ bụ ya echewe ruo ogologo oge na Limbo, kama ọ na-alaghachi nnọọ n’ájá. N’ihi ya, Okwu Chineke na-agba ndị dị ndụ ume, sị: “Ihe ọ bụla aka gị na-ahụ ime, were ike gị mee ya; n’ihi na ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na “Shiol,” NW], ebe gị onwe gị na-ala.” (Eklisiastis 9:5, 10; Jenesis 3:19) Ọtụtụ ndị amaghị ihe okwu ahụ bụ́ “Shiol” pụtara. Ọ bụ okwu Hibru a na-amaghị ebe e si nweta ya. Ọtụtụ okpukpe na-akụzi na ndị nwụrụ anwụ ka dị ndụ, ma dị ka Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ na-egosi, ndị nọ na Shiol nwụrụ anwụ, ha amaghịkwa ihe ọ bụla. Shiol bụ ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ.
5, 6. Ebee ka Jekọb gara mgbe ọ nwụrụ, oleekwa ndị o sonyeere n’ebe ahụ?
5 Ebe mbụ okwu ahụ bụ́ “Shiol” pụtara na Bible bụ na Jenesis 37:35. Mgbe o chere na nwa ya nwoke bụ́ Josef anwụọla, nna ochie bụ́ Jekọb ekweghị ka a kasie ya obi, o kwuru, sị: “M ga-arịdakwuru nwa m ruo [“Shiol,” NW] na-eru újú.” N’ikweta na nwa ya nwoke anwụọla, Jekọb chọrọ ịnwụ ma nọrọ na Shiol. Ka e mesịrị, itoolu n’ime ụmụ Jekọb ndị nke okenye chọrọ ịkpọrọ nwa ya nke kasị nta, bụ́ Benjamin, gaa Ijipt iji nweta ihe oriri n’ihi ụnwụ nri. Otú ọ dị, Jekọb jụrụ, na-ekwu, sị: “Nwa m agaghị eso unu rịdaa; n’ihi na nwanne ya anwụwo, ya onwe ya, nanị ya, fọdụkwara: a sị na ajọ ihe adakwasị ya n’ụzọ nke unu na-eje na ya, unu ga-ewedakwa isi awọ m ruo [“Shiol,” NW] ná mwute.” (Jenesis 42:36, 38) Akụkụ Bible abụọ a na-ejikọ ọnwụ na Shiol, ọ bụghị ya na ụdị ụfọdụ nke ndụ mgbe a nwụsịrị.
6 Ihe ndekọ Jenesis na-ekpughe na Josef aghọọla onye na-elekọta ihe oriri n’Ijipt. N’ihi ya, Jekọb gara ebe ahụ ịga zuteghachi Josef, nke ahụ mekwara ha abụọ obi ụtọ. Mgbe nke ahụ gasịrị, Jekọb gara biri n’ala ahụ ruo mgbe ọ nwụrụ ka ọ kasịrị ezigbo nká, bụ́ mgbe ọ gbara otu narị na iri afọ anọ na asaa. N’imere ya ihe ọ rịọrọ ha mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ, ụmụ ya buuru ozu ya gaa lie n’ọgba Makpila nke dị n’ala Kenan. (Jenesis 47:28; 49:29-31; 50:12, 13) Ya mere, Jekọb sonyeere Aịzik, bụ́ nna ya, na Ebreham bụ́ nna nna ya.
‘Ndị A Chịkọtara Ha na Ndị Nna Nna Ha’
7, 8. (a) Olee ebe Ebreham gara mgbe ọ nwụrụ? Kọwaa. (b) Olee ihe na-egosi na ndị ọzọ bara na Shiol mgbe ha nwụrụ?
7 Tupu mgbe ahụ, mgbe Jehova kwupụtaghachiri ọgbụgba ndụ ya na Ebreham ma kwe nkwa na mkpụrụ Ebreham ga-aba ụba, o kwuru ihe ga-eme Ebreham. Jehova kwuru, sị: “Ma gị onwe gị ga-alakwuru nna gị ha n’udo; a ga-eli gị n’ezi isi awọ.” (Jenesis 15:15) Nke a bụkwa nnọọ ihe merenụ. Jenesis 25:8 na-ekwu, sị: “Ebreham wee kubie ume, nwụọ n’ezi isi awọ, bụrụ agadi, ndụ ya jukwara ya afọ; e wee chịkọta ya na ụmụnna ya [na “Shiol,” NW].” Ole ndị bụ ụmụnna ya a? Jenesis 11:10-26 depụtasịrị aha ndị nna nna ya laa azụ ruo na nwa Noa bụ́ Shem. Ya mere, ọ bụ ndị a, bụ́ ndị na-ehi ụra na Shiol, ka a chịkọtara ha na Ebreham mgbe ọ nwụrụ.
8 Okwu ahụ bụ́ a “chịkọta ya na ụmụnna ya” pụtara ugboro ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. N’ihi ya, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na nwa Ebreham bụ́ Ishmael na nwanne Mozis bụ́ Erọn gachara Shiol mgbe ha nwụrụ, nọrọ n’ebe ahụ na-echere mbilite n’ọnwụ. (Jenesis 25:17; Ọnụ Ọgụgụ 20:23-29) N’otu aka ahụ, Mozis gakwara Shiol, ọ bụ ezie na ọ dịghị onye maara ebe ili ya dị. (Ọnụ Ọgụgụ 27:13; Deuterọnọmi 34:5, 6) N’ụzọ yiri nke ahụ, Jọshụa, bụ́ onye nọchiri Mozis dị ka onye ndú Izrel, na ọtụtụ ndị ọzọ gakwara Shiol mgbe ha nwụrụ.—Ndị Ikpe 2:8-10.
9. (a) Olee otú Bible si egosi na okwu Hibru bụ́ “Shiol” na okwu Grik bụ́ “Hedis” na-ezo aka n’otu ebe? (b) Olee olileanya ndị nọ na Shiol, ma ọ bụ Hedis, nwere?
1 Ndị Eze 2:10) Ọ̀ nọkwu na Shiol? N’ụzọ na-akpali mmasị, n’ụbọchị Pentikọst 33.O.A., Pita onyeozi zoro aka n’ọnwụ Devid ma hota Abụ Ọma 16:10: “Ị gaghị ahapụrụ [“Shiol,” NW] mkpụrụ obi m.” Mgbe o kwusịrị na Devid ka nọ n’ili ya, Pita ji okwu ndị ahụ mee ihe n’ebe Jizọs nọ ma mee ka ọ pụta ìhè na Devid “hụrụ tupu oge eruo ma kwuo okwu banyere mbilite n’ọnwụ Kraịst ahụ, na a gbahapụghị ya na Hedis, anụ ahụ́ ya ahụghịkwa ire ure. Jizọs a ka Chineke kpọlitere n’ọnwụ, bụ́ eziokwu nke anyị nile bụ ndị àmà ya.” (Ọrụ 2:29-32) N’ebe a, Pita ji okwu ahụ bụ́ “Hedis” mee ihe, nke bụ́ okwu Grik ya na okwu Hibru ahụ bụ́ “Shiol” pụtara otu ihe. N’ihi ya, ndị a sị na ha nọ na Hedis na ndị a sị na ha nọ na Shiol nọ n’otu ọnọdụ. Ha na-ehi ụra, na-echere mbilite n’ọnwụ.
9 Mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị, Devid ghọrọ eze nke ebo 12 nke Izrel. Mgbe ọ nwụrụ, o “soro nna ya ha dinaa n’ọnwụ.” (È Nwere Ndị Ajọ Omume na Shiol?
10, 11. Gịnị mere anyị pụrụ iji kwuo na ụfọdụ ndị ajọ omume gara Shiol, ma ọ bụ Hedis, mgbe ha nwụrụ?
10 Mgbe Mozis dupụtasịrị mba Izrel n’Ijipt, ụfọdụ ndị nupụrụ isi n’ịkpa. Mozis gwara mba ahụ ka ha kewapụ onwe ha n’ebe ndị nnupụisi ahụ—Kora, Detan na Abaịram—nọ. Ha ga-anwụ ọnwụ ike. Mozis kọwara, sị: “Ọ bụrụ na ọnwụ dị ka ọnwụ mmadụ nile ka ndị a ga-anwụ, ọ bụrụkwa na ọ bụ nleta mmadụ nile ka a ga-eleta ha; Jehova eziteghị m. Ma ọ bụrụ na ihe okike ọhụrụ ka Jehova ga-eke, ala ewee saghepụ ọnụ ya, loda ha, ha na ihe nile ha nwere, ha wee rịda ná ndụ ruo [“Shiol,” NW]; unu ga-amarakwa na ndị ikom ndị a elelịwo Jehova.” (Ọnụ Ọgụgụ 16:29, 30) Ya mere, ma ọ̀ bụ site n’ala imeghe ma loda ha, ma ọ̀ bụ site n’ọkụ irepịa ha dị ka o repịara Kora na narị ndị Livaị abụọ na iri ise ahụ kwadoro ya, ndị nnupụisi a nile gara Shiol, ma ọ bụ Hedis.—Ọnụ Ọgụgụ 26:10.
11 Shimaị, bụ́ onye kọchara Eze Devid, nwetara ntaramahụhụ site n’aka onye nọchiri Devid, bụ́ Solomọn. Devid nyere iwu, sị: “Agụla ya n’onye ikpe na-amaghị, n’ihi na onye maara ihe ka ị bụ; ị ga-amarakwa ihe ị ga-eme ya, ma ị ga-eme ka isi awọ ya rịda [na “Shiol,” NW] n’ọbara.” Solomọn mere ka Benaịa mezuo ikpe ọmụma ahụ. (1 Ndị Eze 2:8, 9, 44-46) Onye ọzọ Benaịa gburu bụ onye bụbu onyeisi usuu ndị agha Izrel bụ́ Joab. Isi awọ ya ‘arịdaghị [na “Shiol,” NW] n’udo.’ (1 Ndị Eze 2:5, 6, 28-34) Ihe atụ abụọ ndị a na-egosi na abụ Devid e ji ike mmụọ nsọ dee bụ eziokwu, bụ́ nke na-asị: “Ndị na-emebi iwu ga-alaghachi [na “Shiol,” NW], bụ́ mba nile ndị na-echezọ Chineke.”—Abụ Ọma 9:17.
12. Ònye bụ Ahitofel, oleekwa ebe ọ gara mgbe ọ nwụrụ?
12 Ahitofel bụ onye ndụmọdụ Devid. A na-eji ndụmọdụ ya akpọrọ ihe ka à ga-asị na ọ bụ Jehova n’onwe ya nyere ya. (2 Samuel 16:23) N’ụzọ dị mwute, odibo a a tụkwasịrị obi ghọrọ onye sabo ma sonye na nkata nkwatu ọchịchị nke nwa Devid bụ́ Absalọm nọ n’isi ya. O doro anya na Devid zoro aka na mgba okpuru a mgbe o dere, sị: “N’ihi na ọ bụghị onye iro na-ata m ụta; m ga-anagidekwa ya: ọ bụghị onye na-akpọ m asị mere onwe ya ukwuu megide m; m ga-ezonahụkwa ya onwe m.” Devid gara n’ihu kwuo, sị: “Ka ọnwụ bịakwasị ha na mberede, ka ha rịdaruo [“Shiol,” NW] ná ndụ: n’ihi na ihe ọjọọ nile dị n’ebe ha nọ dị ka ọbịa, n’etiti ha.” (Abụ Ọma 55:12-15) Mgbe ha nwụsịrị, Ahitofel na ndị òtù ya gara Shiol.
Ole Ndị Nọ na Gehena?
13. Gịnị mere e ji kpọọ Judas “nwa mbibi”?
13 Jiri ọnọdụ Devid tụnyere nke Devid ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jizọs. Otu n’ime ndịozi 12 nke Jizọs, bụ́ Judas Iskarịọt, ghọrọ sabo dị ka Ahitofel. Aghụghọ Judas dị nnọọ njọ karịa nke Ahitofel. Judas megidere Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya. N’otu ekpere Ọkpara Chineke kpere ná ngwụcha nke ozi elu ala ya, o kwuru banyere ụmụazụ ya, sị: “Mgbe mụ na ha nọ m na-adị eche ha nche n’ihi aha gị bụ́ nke i nyeworo m; edebewokwa m ha, ọ dịghịkwa otu n’ime ha e bibiri ma e wezụga nwa mbibi ahụ, ka otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ wee mezuo.” (Jọn 17:12) Site n’ịkpọ Judas “nwa mbibi,” Jizọs gosiri na mgbe Judas nwụrụ, o nweghị olileanya nke ịdịghachi ndụ. Ọ nọghị ná ncheta Chineke. Ọ gara Gehena, ọ bụghị Shiol. Gịnị bụ Gehena?
14. Gịnị ka Gehena na-anọchi anya ya?
14 Jizọs katọrọ ndị ndú okpukpe nke oge ya n’ihi na ha na-eme ka onye ọ bụla na-eso ụzọ ha “ghọọ onye a ga-atụba na Gehena.” (Matiu 23:15) Laa azụ n’oge ahụ, ndị mmadụ maara Ndagwurugwu Hinọm nke ọma, bụ́ ebe e ji mere ebe ikpofu ihe, ebe a na-atụnye ozu ndị omekome e gburu egbu, bụ́ ndị e chere na e kwesịghị ili ha nke ọma. Tupu mgbe ahụ, Jizọs n’onwe ya akpọtụla Gehena aha n’Ozizi Elu Ugwu ya. (Matiu 5:29, 30) Ihe ọ pụtara n’ụzọ ihe atụ doro ndị na-ege ya ntị anya. Gehena nọchiri anya mbibi zuru ezu n’enweghị olileanya mbilite n’ọnwụ. E wezụga Judas Iskarịọt nke oge Jizọs, è nweela ndị ọzọ gara Gehena mgbe ha nwụrụ kama ịga Shiol, ma ọ bụ Hedis?
15, 16. Olee ndị gara Gehena mgbe ha nwụrụ, gịnịkwa mere ha ji gaa ebe ahụ?
15 E kere ụmụ mmadụ mbụ, bụ́ Adam na Iv, dị ka ndị zuru okè. Ha ma ụma mee mmehie ha mere. E debere ndụ ebighị ebi ma ọ bụ ọnwụ n’ihu ha. Ha nupụụrụ Chineke isi ma dunyere Setan úkwù. Mgbe ha nwụrụ, ha enweghị atụmanya nke irite uru n’àjà mgbapụta Kraịst. Kama nke ahụ, ha gara Gehena.
16 Ọkpara Adam, bụ́ Ken, gburu nwanne ya nwoke, sitekwa n’oge ahụ gaa n’ihu, o biri 1 Jọn 3:12) Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na, dị ka ndị mụrụ ya, ọ gara Gehena mgbe ọ nwụrụ. (Matiu 23:33, 35) Lee otú nke a si dị nnọọ iche n’ọnọdụ Ebel onye ezi omume! Pọl kọwara, sị: “Site n’okwukwe, Ebel chụụrụ Chineke àjà dị oké ọnụ ahịa karịa nke Ken, bụ́ okwukwe nke e sitere na ya gbaa àmà banyere ya na ọ bụ onye ezi omume, ebe Chineke na-agba àmà banyere onyinye ya,” na-agbakwụnye, sị, “o sitekwara na ya na-ekwu okwu, ọ bụ ezie na ọ nwụrụ anwụ.” (Ndị Hibru 11:4) Ee, Ebel nọ na Shiol ugbu a na-echere mbilite n’ọnwụ.
ndụ dị ka onye gbara ọsọ ndụ. Pọl onyeozi kọwara Ken dị ka “onye sitere n’ajọ onye ahụ.” (Mbilite n’Ọnwụ “Mbụ” na nke “Ka Mma”
17. (a) Na mgbe “ọgwụgwụ” a, ole ndị na-aga Shiol? (b) Olileanya dị aṅaa ka ndị nọ na Shiol na ndị nọ na Gehena nwere?
17 Ọtụtụ n’ime ndị na-agụ akwụkwọ a ga na-eche ihe ga-abụ ọnọdụ ndị nwụrụ na mgbe “ọgwụgwụ” a. (Daniel 8:19) Mkpughe isi 6 na-akọ banyere ndị ịnyịnya anọ ga na-agba n’oge ahụ. Ọ na-akpali mmasị ịmara na aha onye nke ikpeazụ n’ime ha bụ Ọnwụ, Hedis na-esokwa ya n’azụ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị, bụ́ ndị nwụrụ ọnwụ ike n’ihi ọrụ nke ndị ịnyịnya ahụ bu ụzọ, gara na Hedis ịga nọrọ ebe ahụ chere mbilite n’ọnwụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. (Mkpughe 6:8) Gịnịzi bụ olileanya nke ndị nọ na Shiol (Hedis) na nke ndị nọ na Gehena? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ bụ mbilite n’ọnwụ maka ndị nọ na Shiol; mbibi ebighị ebi—adịghị adị—maka ndị nọ na Gehena.
18. Olileanya dị aṅaa ka “mbilite n’ọnwụ mbụ” ahụ na-enye?
18 Jọn onyeozi dere, sị: “Onye obi ụtọ na onye dị nsọ ka onye ọ bụla nke nwere òkè ná mbilite n’ọnwụ mbụ bụ; ọnwụ nke abụọ enweghị ikike n’ebe ndị a nọ, kama ha ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst ahụ, ha ga-esokwa ya chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ ahụ.” Ndị ha na Kraịst ga-eso chịa nwere òkè ná “mbilite n’ọnwụ mbụ” ahụ, ma olee olileanya ndị ọzọ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ nwere?—Mkpughe 20:6.
19. Olee otú ụfọdụ ga-esi rite uru ná “mbilite n’ọnwụ ka mma”?
19 Site n’ụbọchị ndị ohu Chineke bụ́ Ịlaịja na Ịlaịsha, ọrụ ebube nke mbilite n’ọnwụ mere ka ndị mmadụ dịghachi ndụ. Pọl kọrọ, sị: “Ndị inyom natara ndị ha nwụrụ anwụ site ná mbilite n’ọnwụ; ma e mekpọrọ ndị ọzọ ọnụ n’ihi na ha jụrụ ịnakwere ka e jiri ihe mgbapụta ọ bụla tọhapụ ha, ka ha wee nweta mbilite n’ọnwụ ka mma.” Ee, ndị a nwere okwukwe, bụ́ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe, lepụrụ anya n’ihu maka mbilite n’ọnwụ nke ga-enye ha, ọ bụghị nanị ndụ afọ ole na ole nke ọnwụ ga-emesị sochie, kama olileanya nke ndụ ebighị ebi! Nke ahụ ga-abụ n’ezie, “mbilite n’ọnwụ ka mma.”—Ndị Hibru 11:35.
20. Gịnị ka isiokwu na-esonụ ga-atụle?
20 Ọ bụrụ na anyị anwụọ n’ikwesị ntụkwasị obi tupu Jehova eweta ajọ usoro ihe a ná njedebe, anyị nwere olileanya e ji n’aka nke inweta “mbilite n’ọnwụ ka mma,” nke ka mma n’echiche bụ́ na ọ bụ n’olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi. Jizọs kwere nkwa, sị: “Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) Isiokwu anyị na-esonụ ga-atụlekwu nzube nke mbilite n’ọnwụ. Ọ ga-egosi otú olileanya mbilite n’ọnwụ si ewusi anyị ike ịbụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe ma nyere anyị aka ịzụlite mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà.
Ị̀ Na-echeta?
• Gịnị mere e ji kọwaa Jehova dị ka Chineke nke “ndị dị ndụ”?
• Gịnị bụ ọnọdụ ndị nọ na Shiol?
• Olileanya dị aṅaa dịịrị ndị nọ na Gehena?
• Olee otú ụfọdụ ndị ga-esi rite uru ná “mbilite n’ọnwụ ka mma”?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 15]
Dị ka Ebreham, ndị gara Shiol na-echere mbilite n’ọnwụ
[Foto ndị dị na peeji nke 16]
Gịnị mere Adam na Iv, Ken na Judas Iskarịọt ji gaa Gehena?