Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Anyị Pụrụ Isi Gụta Ụbọchị nke Ọ Bụla

Otú Anyị Pụrụ Isi Gụta Ụbọchị nke Ọ Bụla

Otú Anyị Pụrụ Isi Gụta Ụbọchị nke Ọ Bụla

“SI OTÚ A mee ka anyị mara ịgụta ụbọchị anyị, ka anyị wee mee ka obi amamihe bịa.” (Abụ Ọma 90:12) Nke a bụ ekpere onye so dee Bible bụ́ Mozis ji obi umeala kpee. Gịnị kpọmkwem ka ọ na-arịọ? Ànyị kwesịrị ịrịọ arịrịọ ofufe yiri nke ahụ?

N’amaokwu nke 10, Mozis kwara arịrị banyere ịdị mkpụmkpụ nke ndụ mmadụ. N’oge ọzọ, o dekọrọ nkwupụta nke Job, bụ́ onye kwuru, sị: “Mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ.” (Job 14:1) O doro anya na Mozis maara n’ụzọ dị mwute ịdị mkpụmkpụ nke ndụ mmadụ na-ezughị okè. N’ihi ya, o lere ndụ nke ụbọchị ọ bụla anya dị ka onyinye dị oké ọnụ ahịa. N’ịrịọ Chineke arịrịọ a, Mozis kwupụtara ọchịchọ ya ibi ndụ ya fọdụrụnụ n’ụzọ amamihe na n’ụzọ ga-amasị Onye Okike ya. N’otu aka ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịchọ ibi ndụ anyị n’ụzọ bara uru? Nke ahụ ga-abụ ihe anyị ga-agbalịsi ike ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ihu ọma Chineke ugbu a.

E nwere ihe ọzọ kwaliri ma Mozis ma Job, bụ́ nke kwesịkwara ịkwali anyị. Ndị ikom abụọ a fere Chineke tụrụ anya inweta ụgwọ ọrụ n’ọdịnihu—ndụ n’elu ụwa n’ọnọdụ ka mma. (Job 14:14, 15; Ndị Hibru 11:26) N’oge ahụ, ọ dịghị onye ọnwụ ga-egbochi ịrụ ezi ọrụ. Onye Okike anyị zubere ka ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya bie ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Aịsaịa 65:21-24; Mkpughe 21:3, 4) Nke a pụkwara ịbụ atụmanya gị ma ọ bụrụ na ‘ị gụta ụbọchị gị, ka i wee mee ka obi amamihe bịa.’