Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmata Ụzọ Jehova

Ịmata Ụzọ Jehova

Ịmata Ụzọ Jehova

“Mee m ka m mara ụzọ Gị nile, m ga-amarakwa Gị.”—ỌPỤPỤ 33:13.

1, 2. (a) Gịnị mere Mozis ji mee ihe o mere mgbe ọ hụrụ onye Ijipt na-eti onye Hibru ihe? (b) Iji bụrụ onye Jehova ga-eji mee ihe n’ozi ya, gịnị ka ọ dị Mozis mkpa ịmụta?

A ZỤLITERE Mozis n’ụlọ Fero, kụziekwara ya amamihe nke ndị a ma ama n’Ijipt ji kpọrọ ihe. Otú ọ dị, Mozis ghọtara na ya abụghị onye Ijipt. Ndị mụrụ ya bụ ndị Hibru. Mgbe ọ dị afọ 40, ọ gara ileta ụmụnne ya, bụ́ ụmụ Izrel. Mgbe ọ hụrụ ka otu onye Ijipt na-eti otu n’ime ndị Hibru ihe, Mozis elefughị anya. O tigburu onye Ijipt ahụ. Mozis họọrọ ịdịnyere ndị Jehova, o chekwara na Chineke ji ya na-eme ihe iji napụta ụmụnne ya. (Ọrụ 7:21-25; Ndị Hibru 11:24, 25) Mgbe a matara ihe a merenụ, ndị obí eze Ijipt lere Mozis anya dị ka onye nnupụisi, ọ ghaghịkwa ịgba ọsọ ndụ. (Ọpụpụ 2:11-15) Ọ bụrụ na Chineke ga-eji Mozis mee ihe, ọ ghaghị ịmata ụzọ Jehova nke ọma karị. Mozis ọ̀ ga-ekwe ka e zie ya ihe?—Abụ Ọma 25:9.

2 Ruo afọ 40 sochirinụ, Mozis biri n’ala ọzọ dị ka onye na-azụ atụrụ. Kama inwe oké obi ilu n’ihi na o yiri ka ụmụnne ya ndị Hibru ejighị ya kpọrọ ihe, Mozis nakweere ihe Chineke kwere ka o mee. Ọ bụ ezie na ọtụtụ afọ gafere n’enweghị onye gosiri ekele maka ihe Mozis mere, o kwere ka Jehova kpụzie ya. O mesịrị dee site n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bụghị n’echiche nke ya, sị: “Nwoke ahụ, bụ́ Mozis, dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) Jehova jiri Mozis mee ihe n’ụzọ ndị pụtara ìhè. Ọ bụrụ na anyị onwe anyị kwa achọọ umeala n’obi, Jehova ga-agọzi anyị.—Zefanaịa 2:3.

E Nye Ya Ọrụ

3, 4. (a) Olee ọrụ Jehova nyere Mozis? (b) Enyemaka dị aṅaa ka Mozis nwetara?

3 Otu ụbọchị, otu mmụọ ozi nke na-anọchite anya Jehova gwara Mozis okwu n’akụkụ Ugwu Horeb n’Ala Dịịrị Banye na Mmiri nke Saịnaị. A gwara Mozis, sị: “Ahụwo m n’ezie mweda n’ala nke ndị m nke dị n’Ijipt, anụwokwa m iti mkpu ha n’ihi ndị na-achị ha n’ihe ike; n’ihi na amawo m ihe mgbu ha nile; M wee rịdata ịnapụta ha n’aka ndị Ijipt, na ime ka ha si n’ala ahụ rịgoruo ala dị mma nke sakwara mbara, ruo ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” (Ọpụpụ 3:2, 7, 8) Banyere nke a, Chineke nwere ọrụ ọ ga-enye Mozis, ma ọ ghaghị ịrụ ya otú Jehova si chọọ.

4 Mmụọ ozi Jehova gara n’ihu kwuo, sị: “Ugbu a kwa, bịa, M ga-ezikwa gị jekwuru Fero; gị meekwa ka ndị m, bụ́ ụmụ Izrel, si n’Ijipt pụta.” Mozis ekweghị na mbụ. O chere na ya erughị eru, n’ike nke aka ya kwa, o rughị eru. Otú ọ dị, Jehova mesiri Mozis obi ike, sị: “Mụ na gị ga-anọ.” (Ọpụpụ 3:10-12) Jehova nyere Mozis ike ịrụ ọrụ ebube ndị ga-agba akaebe na ọ bụ Chineke zitere ya n’ezie. Nwanne Mozis, bụ́ Erọn, ga-eso Mozis dị ka ọnụ na-ekwuchitere ya. Jehova ga-akụziri ha ihe ha kwesịrị ikwu ma mee. (Ọpụpụ 4:1-17) Mozis ọ̀ ga-eji ikwesị ntụkwasị obi rụzuo ọrụ ahụ?

5. Gịnị mere àgwà ndị Izrel ji ghọọrọ Mozis nsogbu?

5 Ndị okenye Izrel kwere ihe Mozis na Erọn kwuru na mbụ. (Ọpụpụ 4:29-31) Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, “ndị na-ele ụmụ Izrel anya n’ọrụ” tara Mozis na nwanne ya ụta n’ihi ime ka ha “sie ísì ọjọọ” n’anya Fero na n’anya ndị ohu ya. (Ọpụpụ 5:19-21; 6:9) Mgbe ndị Izrel na-apụ n’Ijipt, ụjọ tụrụ ha ịhụ ka ụgbọ agha ndị Ijipt na-achụ ha. N’ịbụ ndị Oké Osimiri Uhie dị n’ihu, nakwa ndị ụgbọ ịnyịnya na-achụ n’azụ, ndị Izrel chere na ha tọrọ atọ, ha takwara Mozis ụta. Gịnị ka ị gaara eme? Ọ bụ ezie na ụmụ Izrel enweghị ụgbọ mmiri, n’ịgbaso ntụziaka Jehova, Mozis gbara ha ume ka ha bulie ije. Chineke meziri ka mmiri nke Oké Osimiri Uhie laa azụ, ala mmiri ghọrọ ala akọrọ ka ndị Izrel nwee ike ịgafe.—Ọpụpụ 14:1-22.

Ihe Dị Mkpa Karịa Nnapụta

6. Gịnị ka Jehova mesiri ike mgbe ọ na-enye Mozis ọrụ?

6 Mgbe ọ nọ na-enye Mozis ọrụ, Jehova mesiri ịdị mkpa nke aha nsọ ya ike. Ịkwanyere aha ahụ na Onye nwe ya ùgwù dị oké mkpa. Mgbe Mozis jụrụ ya aha ya, Jehova gwara ya, sị: “Abụ m ihe m bụ.” Ọzọkwa, a gwara Mozis ka ọ gwa ụmụ Izrel, sị: “Jehova, bụ́ Chineke nke nna unu hà, Chineke nke Ebreham, na Chineke nke Aịzik, na Chineke nke Jekọb, O zitewo m n’ebe unu nọ.” Jehova gbakwụnyere, sị: “Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, nke a bụkwa ihe ncheta m ruo ọgbọ nile.” (Ọpụpụ 3:13-15) Jehova ka bụ aha ndị ohu Chineke ji mara ya gburugburu ụwa.—Aịsaịa 12:4, 5; 43:10-12.

7. Gịnị ka Chineke gbara Mozis ume ime n’agbanyeghị mpako Fero?

7 Mgbe ha jekwuuru Fero, Mozis na Erọn ziri ya ozi n’aha Jehova. Ma Fero ji mpako kwuo, sị: “Ònye bụ Jehova, na m ga-ege ntị n’olu Ya izipụ Izrel? amaghị m Jehova, ọzọkwa, m gaghị ezipụ Izrel.” (Ọpụpụ 5:1, 2) Fero ghọrọ ma onye obi kpọrọ nkụ ma onye aghụghọ, n’agbanyeghị nke ahụ, Jehova gbara Mozis ume izi ya ozi ugboro ugboro. (Ọpụpụ 7:14-16, 20-23; 8:1, 2, 20) Mozis pụrụ ịhụ na iwe na-ewe Fero. Ọ̀ dị ezigbo ihe pụrụ ịpụta n’ịgakwuru ya ọzọ? Izrel chọsiri nnapụta ike. Fero jụwara isi ịhapụ ha. Gịnị ka ị gaara eme?

8. Olee abamuru si n’otú Jehova si mesoo Fero ihe pụta, oleekwa otú ihe omume ndị ahụ kwesịrị isi metụta anyị?

8 Mozis zikwara ya ozi ọzọ, sị: ‘Otú a ka Jehova, bụ́ Chineke nke ndị Hibru, sịrị, Zipụ ndị m, ka ha wee fee m.’ Chineke kwukwara, sị: “Ugbu a m ga-esetịpụworị aka m, were ajọ ọrịa na-efe efe tigbuo gị na ndị gị, e wee zopụ gị n’ụwa: ma otú ọ dị ọ bụ n’ihi nke a ka M guzoworo gị, ka M wee mee ka ị hụ ike m, ka e wee kọọkwa akụkọ aha m n’ụwa nile.” (Ọpụpụ 9:13-16) Site n’ihe ọ ga-eme Fero bụ́ onye obi kpọrọ nkụ, Jehova zubere igosipụta ike ya n’ụzọ ga-adọ ndị nile na-elelị ya aka ná ntị. Nke a gụnyere Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye Jizọs Kraịst mesịrị kpọọ “onye na-achị ụwa.” (Jọn 14:30; Ndị Rom 9:17-24) Dị ka e buru n’amụma, a kpọsara aha Jehova gburugburu ụwa. Ogologo ntachi obi ya dugara n’ichebe ụmụ Izrel nakwa ọtụtụ ndị gwara ọgwa bụ́ ndị sonyeere ha n’ife ya ofufe. (Ọpụpụ 9:20, 21; 12:37, 38) Eri mgbe ahụ, mkpọsa nke aha Jehova abaworo ọtụtụ nde ndị ọzọ uru bụ́ ndị maliteworo ife ya ezi ofufe.

Ịchịkwa Ndị Na-enupụ Isi

9. Olee otú ndị obodo Mozis si kparịa Jehova?

9 Ndị Hibru maara aha Chineke. Mozis jiri aha ahụ mee ihe mgbe ọ na-agwa ha okwu, ma ọ bụghị mgbe nile ka ha kwanyeere Onye nwe aha ahụ ùgwù otú kwesịrịnụ. Gịnị mere mgbe ụmụ Izrel na-enwetaghị ezigbo mmiri ọṅụṅụ ngwa ngwa obere oge ka Jehova napụtasịrị ha site n’Ijipt n’ụzọ ọrụ ebube? Ha tamuru ntamu megide Mozis. Ọzọ, ha mere mkpesa banyere ihe oriri. Mozis dụrụ ha ọdụ na ọ bụghị ya na Erọn ka ha na-atamu ntamu megide kama na ọ bụ Jehova. (Ọpụpụ 15:22-24; 16:2-12) N’Ugwu Saịnaị, Jehova nyere ụmụ Izrel Iwu ahụ, o gosipụtakwara ike karịrị nke mmadụ ka ọ na-eme nke a. Otú ọ dị, ndị ahụ nupụrụ isi ma kpụọ nwa ehi ọlaedo ife ofufe ya ofufe, kwuokwa na ha ‘na-emere Jehova ememe.’—Ọpụpụ 32:1-9.

10. N’ihi gịnị ka arịrịọ Mozis nke e dekọrọ n’Ọpụpụ 33:13 ga-eji baara nnọọ Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta taa uru?

10 Olee otú Mozis ga-esi mesoo ndị Jehova n’onwe ya kọwara dị ka ndị kwesiri olu ike ihe? Mozis rịọrọ Jehova arịrịọ, sị: “Biko, ọ bụrụ na ahụtawo m amara n’ihu Gị, biko, mee m ka m mara ụzọ Gị nile, m ga-amarakwa Gị, ka m wee hụta amara n’ihu Gị.” (Ọpụpụ 33:13) N’ilekọta Ndịàmà Jehova nke oge a, Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta na-azụ ìgwè atụrụ dị nnọọ umeala n’obi karịa mba Izrel. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-ekpe ekpere n’ụzọ yiri nke ahụ, sị: “Jehova, mee ka m mara ụzọ Gị nile; zi m okporo ụzọ Gị nile.” (Abụ Ọma 25:4) Ịmara ụzọ Jehova na-enyere ndị nlekọta aka ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu Chineke na n’àgwà ya.

Ihe Jehova Na-achọ n’Aka Ndị Ya

11. Ntụziaka ndị dị aṅaa ka Jehova nyere Mozis, oleekwa ihe mere anyị ji nwee mmasị na ha?

11 E ji ọnụ gwa ndị Jehova ihe ọ na-atụ anya ya n’aka ha n’Ugwu Saịnaị. Mozis mechara nweta mbadamba nkume abụọ bụ́ ebe e deturu Iwu Iri ahụ. Ka o si n’ugwu ahụ na-agbadata, ọ hụrụ ka ụmụ Izrel na-efe nwa ehi a kpụrụ akpụ ma jiri iwe tụọ mbadamba nkume ndị ahụ n’ala, ha etiwasịa. Jehova deghachiri Iwu Iri ahụ ná mbadamba nkume ndị Mozis jiri aka ya wapụta. (Ọpụpụ 32:19; 34:1) Iwu ndị a agbanwebeghị kemgbe e nyere ha. Mozis ga-eme ihe kwekọrọ na ha. Chineke mekwara ka Mozis mata ụdị onye Ọ bụ, si otú ahụ gosi Mozis otú ọ ga-esi na-akpa àgwà dị ka onye nnọchiteanya Jehova. Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mozis, ma ihe Jehova gwara Mozis nwere ọtụtụ ụkpụrụ ndị bụ́ isi na-agbanwebeghị, bụ́ ndị ka metụtara ndị nile na-efe Jehova. (Ndị Rom 6:14; 13:8-10) Ka anyị tụlee ole na ole n’ime ha.

12. Olee otú Jehova ịchọ ofufe a na-ekewaghị ekewa kwesịrị isiwo metụta Izrel?

12 Nye Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa. Mba Izrel nọ mgbe Jehova kwuru na ya chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa. (Ọpụpụ 20:2-5) Ụmụ Izrel ahụwo ọtụtụ ihe na-egosi na Jehova bụ ezi Chineke ahụ. (Deuterọnọmi 4:33-35) Jehova mere ka o doo anya na n’agbanyeghị ihe ndị mba ọzọ nọ na-eme na ya agaghị ekwe ka ndị ya fee ụdị arụsị ọ bụla ma ọ bụ tinye aka n’ụdị mgbaasị ọ bụla. Ofufe ha ga-enye ya agaghị abụ iji mezuo iwu. Ha nile ga-eji obi ha dum, mkpụrụ obi ha dum na ike ha dum hụ Jehova n’anya. (Deuterọnọmi 6:5, 6) Nke a ga-agụnye ihe ha na-ekwu, ihe ha na-eme—n’ezie, akụkụ nile nke ndụ ha. (Levitikọs 20:27; 24:15, 16; 26:1) Jizọs Kraịst mekwara ka ọ pụta ìhè na Jehova chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.—Mak 12:28-30; Luk 4:8.

13. N’ihi gịnị ka Izrel ji kwesị irubere nnọọ Chineke isi, gịnịkwa kwesịrị ịkwalị anyị irubere ya isi? (Eklisiastis 12:13)

13 Na-erubere nnọọ iwu Jehova isi. Ọ dị mkpa ka e chetara ndị Izrel na mgbe ha na Jehova bara ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ, ha kwere nkwa irubere ya nnọọ isi. Ha nweere nnọọ onwe ha, ma a bịa n’ihe ndị Jehova nyere iwu banyere ha, ha aghaghị irubere ya nnọọ isi. Ha ime otú ahụ ga-egosipụta ịhụnanya ha nwere maka Chineke, ọ ga-abakwara ha na ụmụ ha uru n’ihi na ihe nile Jehova chọrọ n’aka ha bụ maka ọdịmma ha.—Ọpụpụ 19:5-8; Deuterọnọmi 5:27-33; 11:22, 23.

14. Olee otú Chineke si mee ka ndị Izrel ghọta mkpa ọ dị ibute nchụso ime mmụọ ụzọ?

14 Na-ebute ihe ime mmụọ ụzọ. Mba Izrel ekwesịghị ikwe ka igbo mkpa anụ ahụ́ ha mee ka ha leghara ihe ime mmụọ anya. Ụmụ Izrel ekwesịghị iji ndụ ha chụsoo nanị ihe anụ ahụ́. Jehova wepụtara oge ụfọdụ kwa izu bụ́ ndị o doro nsọ, bụ́ oge ndị e ji mee nanị ihe ndị metụtara ofufe nke ezi Chineke ahụ. (Ọpụpụ 35:1-3; Ọnụ Ọgụgụ 15:32-36) Kwa afọ, e wepụtakwara oge ndị ọzọ maka mkpọkọta nsọ ndị a haziiri ha. (Levitikọs 23:4-44) Oge ndị a ga-enye ha ohere ịkọ akụkọ oké ọrụ ndị Jehova rụrụ, ịbụ ndị e chetaara ụzọ ya, na ikele ya maka ịdị mma ya. Ka ndị ahụ na-ekwupụta nrara ha raara onwe ha nye Jehova, ha ga-enwekwu egwu Chineke na ịhụnanya, a ga-enyekwara ha aka ije ije n’ụzọ ya. (Deuterọnọmi 10:12, 13) Ụkpụrụ ndị bara uru dị ná ntụziaka ndị ahụ na-abara ndị ohu Jehova uru taa.—Ndị Hibru 10:24, 25.

Ịghọta Àgwà Jehova

15. (a) N’ihi gịnị ka ịghọta àgwà Jehova ji baara Mozis uru? (b) Olee ajụjụ ndị pụrụ inyere anyị aka iche echiche miri emi banyere àgwà Jehova nke ọ bụla?

15 Ịghọta àgwà Jehova ga-enyekwara Mozis aka n’imeso ndị ahụ ihe. Ọpụpụ 34:5-7 na-ekwu na Chineke gabigara n’ihu Mozis ma kwuo, sị: “Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; Onye na-edebere [otu puku] ọtụtụ ugboro ebere, Onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie: ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị; Ọ na-ewere ajọ omume nke ndị bụ́ nna leta ụmụ ha, letakwa ụmụ ụmụ, leta ụmụ ụmụ nke atọ, letakwa nke anọ.” Jiri oge ụfọdụ tụgharịa uche n’okwu ndị a. Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka àgwà nke ọ bụla pụtara? Olee otú Jehova si egosipụta ya? Olee otú Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta pụrụ isi gosipụta àgwà a? Olee otú àgwà a kwesịrị isi metụta ihe onye nke ọ bụla n’ime anyị na-eme?’ Tụlee nanị ihe atụ ole na ole.

16. Olee otú anyị pụrụ isi ghọtakwuo ebere Chineke, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa ime nke a?

16 Jehova bụ “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara.” Ọ bụrụ na i nwere akwụkwọ ntụaka bụ́ Insight on the Scriptures, gịnị ma ị gụọ ihe ọ na-ekwu banyere okwu ahụ bụ́ “Mercy” (Ebere)? Ma ọ bụ jiri akwụkwọ bụ́ Watch Tower Publications Index ma ọ bụ ihe omume kọmputa bụ́ Watchtower Library (CD-ROM) * mee nnyocha n’okwu ahụ. Jiri okwu ndepụta dị n’azụ Bible mee ihe iji chọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị zoro aka n’ebere. Ị ga-ahụ na e wezụga ibelata ntaramahụhụ mgbe ụfọdụ, ebere Jehova na-agụnyekwa ọmịiko. Ọ na-akpali Chineke ime ihe iji wetara ndị ya ahụ́ efe. Iji gosi ihe àmà nke a, Chineke nyere ụmụ Izrel ihe ndị na-akpa ha, ma nke anụ ahụ́ ma nke ime mmụọ, n’oge ha na-aga n’Ala Nkwa ahụ. (Deuterọnọmi 1:30-33; 8:4) Jehova ji obi ebere gbaghara ha mgbe ha mehiere. O gosiri ndị ya oge ochie obi ebere. Leenụ ka o si dị ndị ohu ya nke oge a mkpa igosirịta ibe ha ọmịiko!—Matiu 9:13; 18:21-35.

17. Olee otú anyị ịghọta amara Jehova pụrụ isi kwalite ezi ofufe?

17 Ebere Jehova na amara ya na-aga ụkwụ na ụkwụ. Olee otú ị ga-esi kọwaa ihe okwu ahụ bụ́ “amara” pụtara? Jiri nkọwa ahụ tụnyere ihe dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-akọwa Jehova dị ka onye na-eme amara. Bible na-egosi na amara Jehova na-agụnye ya iji ịhụnanya echebara ndị ọ na-enweghị ka ọ ha ha n’etiti ndị ya echiche. (Ọpụpụ 22:26, 27) Ná mba ọ bụla, ndị ala ọzọ nakwa ndị ọzọ pụrụ ịnọ n’ihe isi ike. Mgbe ọ na-akụziri ndị ya ka ha ghara ịdị na-ele mmadụ anya n’ihu na ka ha na-eji obiọma emeso ndị dị otú ahụ ihe, Jehova chetaara ha na ha bibu n’ala ọzọ—n’Ijipt. (Deuterọnọmi 24:17-22) Gịnị banyere anyị dị ka ndị Chineke taa? Anyị ịbụ ndị na-eme amara na-eme ka anyị dị n’otu ma na-adọta ndị ọzọ n’ofufe Jehova.—Ọrụ 10:34, 35; Mkpughe 7:9, 10.

18. Olee ihe anyị na-amụta site n’ihe ndị Jehova kụziiri Izrel banyere ụzọ ndị mba ọzọ si eme ihe?

18 Otú ọ dị, ichebara ndị mba ọzọ echiche agaghị ebutere ịhụnanya ndị Izrel nwere maka Jehova na ụkpụrụ omume ọma ya ụzọ. Ya mere, a kụziiri ụmụ Izrel ịghara ibi ndụ dị ka mba ndị gbara ha gburugburu, ịghara ime omenala okpukpe e ji mara mba ndị ahụ na ịghara ibi ndụ rụrụ arụ dị ka ha. (Ọpụpụ 34:11-16; Deuterọnọmi 7:1-4) Nke ahụ metụtakwara anyị taa. Anyị aghaghị ịdị nsọ, ọbụna dị ka Chineke anyị, bụ́ Jehova, dị nsọ.—1 Pita 1:15, 16.

19. Olee otú ịghọta otú Jehova si ele mmehie anya pụrụ isi chebe ndị ya?

19 Ka Mozis wee nwee ike ịghọta ụzọ Ya, Jehova mere ka o doo anya na ọ bụ ezie na ya adịghị anabata mmehie, na ya adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ. Ọ na-enye ndị mmadụ ohere iji mụta ihe ndị ọ chọrọ ha n’aka na ime ha. Mgbe onye mmehie chegharịrị, Jehova na-agbaghara ya, ma ọ dịghị ahapụ inye ndị mere mmehie dị oké njọ ntaramahụhụ kwesịrị ha. Ọ dọrọ Mozis aka ná ntị na ihe ụmụ Izrel mere pụrụ inwe mmetụta ọma ma ọ bụ nke ọjọọ n’ahụ́ ọgbọ ndị a ga-enwe n’ọdịnihu. Ịghọta ụzọ Jehova pụrụ ichebe ndị Chineke pụọ n’ịta Chineke ụta maka ọnọdụ ndị ha wetaara onwe ya ma ọ bụ pụọ n’ikwubi na ọ na-egbu oge.

20. Gịnị pụrụ inyere anyị aka imeso ndị kwere ekwe ibe anyị na ndị anyị na-ezute n’ozi ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị? (Abụ Ọma 86:11)

20 Ọ bụrụ na ị chọrọ inwetakwu ihe ọmụma banyere Jehova na ụzọ ya, nọgide na-eme nnyocha ma na-atụgharị uche mgbe ị na-agụ Bible. Jiri nlezianya na-enyocha akụkụ dịgasị iche iche na-akpali akpali nke àgwà Jehova. Jiri ekpere tụlee otú ị pụrụ isi na-eṅomi Chineke ma na-eme ka ndụ gị kwekọkwuo n’uche ya n’ụzọ zuru ezu. Nke a ga-enyere gị aka izere ọnyà, imeso ndị kwere ekwe ibe gị ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, na inyere ndị ọzọ aka ịbịa mara ma hụ Chineke anyị dị ebube n’anya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 Ndị Ndịàmà Jehova bipụtara.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• N’ihi gịnị ka obi umeala ji dị Mozis mkpa, oleekwa ihe mere o ji dị anyị oké mkpa?

• Olee ezi ihe iwegara Fero okwu Jehova ugboro ugboro rụpụtara?

• Olee ụkpụrụ ụfọdụ ndị gbara ọkpụrụkpụ a kụziiri Mozis, bụ́kwa ndị metụtara anyị?

• Olee otú anyị pụrụ isi ghọtakwuo àgwà Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 21]

Mozis ji ikwesị ntụkwasị obi zie Fero ozi Jehova ziri ya

[Foto dị na peeji nke 23]

Jehova kpugheere Mozis ihe ndị ọ na-achọ

[Foto dị na peeji nke 24, 25]

Na-atụgharị uche n’àgwà Jehova