Ọgụgụ Isi—Gịnị Mere O Ji Dị Nnọọ Ụkọ?
Ọgụgụ Isi—Gịnị Mere O Ji Dị Nnọọ Ụkọ?
OTU onye na-ekiri ihe na-emenụ kwuru, sị, “Oleedị ihe na-eme ya? O kwesịrị ịma na ihe ahụ o mere adịghị mma.” Onye ọzọ fufeere isi ya pụwa, na-ekwu, sị, “A sị na o nwetụrụ ọgụgụ isi, ọ dịghị ihe ga-eme ka o mee ihe ahụ o mere.” Ọ̀ dịtụwo otú i si nụ okwu ndị yiri ndị a? Oleekwanụ ihe bụ́ “ọgụgụ isi”?
Ọgụgụ isi pụtara mmadụ inwe ike iji amamihe kpebie ihe. O doro anya na ọgụgụ isi na-achọ ka anyị na-eche echiche. Kama ichere onwe ha echiche, ọtụtụ ndị na-ekwe ka ndị ọzọ chechitere ha echiche. Ha na-ekwe ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi, ndị ọgbọ ha, ma ọ bụ echiche ọtụtụ ndị nwere kpebie ihe ha ga-eme.
Ọgụgụ isi dị nnọọ ụkọ n’ụwa taa nke na otu nwoke anya na-eru ala kwuru n’otu oge, sị, ‘N’ikwu eziokwu, ọgụgụ isi dị nnọọ ụkọ.’ Olee otú anyị pụrụ isi nweta ọgụgụ isi? Olee uru ọ bara?
Olee Otú E Si Enweta Ya?
Ọ bụ ezie na inweta ọgụgụ isi na-ewe oge, na-achọ ichemi echiche echemi, ịnọgide na-eme mgbalị, na ichezi echiche echezi, ọ bụ nnọọ ihe a pụrụ inweta enweta. Ka anyị tụlee ihe atọ pụrụ inyere anyị aka inweta ọgụgụ isi.
Mụọ Bible, gbasoo ndụmọdụ ya. Bible, bụ́ nke e ji okwu magburu onwe ya na ụzọ iche echiche doro anya dee, bụ nnọọ ezigbo ihe enyemaka n’inweta amamihe na ezi ọgụgụ isi. (Ndị Efesọs 1:8) Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi na-agba Ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu, ihe ọ bụla nke kwesịrị nchebara echiche, ihe ọ bụla nke bụ́ ezi omume, ihe ọ bụla nke dị ọcha, ihe ọ bụla nke na-akpali ịhụnanya, ihe ọ bụla nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya, omume ọma ọ bụla dịnụ na ihe ọ bụla dịnụ nke kwesịrị otuto, nọgidenụ na-atụle ihe ndị a.” (Ndị Filipaị 4:8) Ọ bụrụ na anyị agbasochie ndụmọdụ a anya, anyị ga na-eche echiche nke ọma ma na-akpa àgwà ka ndị maara ihe.
Mụta ihe site n’ahụmahụ. N’ijikọta ọgụgụ isi na ahụmahụ mmadụ nwere ná ndụ, otu onye Switzerland na-ede uri kwuru, sị: “Ọgụgụ isi bụ . . . ahụmahụ na ilepụ anya n’ihu.” N’ezie, “onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” (Ilu 14:15) A pụrụ inweta ọgụgụ isi site n’ilere anya, ọzụzụ, na ahụmahụ. Anyị pụrụ ịmụta ime ihe n’ụzọ ka mma ka oge na-aga. Otú ọ dị, ịmụta ihe site n’ihe ndị anyị mejọrọ ga-achọ ka anyị dịrị umeala n’obi. Mmụọ ịnya isi, mpako na nke isi ike nke ndị mmadụ nwere n’ụbọchị ikpeazụ ndị a na-egosi na ha enweghị ọgụgụ isi.—2 Timoti 3:1-5.
Jiri amamihe na-ahọrọ ndị gị na ha na-akpakọ. Ndị enyi anyị na-enyere anyị aka iji ọgụgụ isi eme ihe ma ọ bụ na-egbochi anyị ime otú ahụ. Ilu 13:20 na-ekwu, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” Anyị agaghị adị na-anabata ụzọ iche echiche na echiche nke ndị na-enupụrụ Chineke isi ma na-eleghara Okwu ya anya. Ilu 17:12 si otú a kwuo ya: “Ka nne bea nke gbaara aka ụmụ ya zute mmadụ, karịa onye nzuzu n’uche ya gbagọrọ agbagọ.”
Olee Uru Ọ Bara?
Inweta ọgụgụ isi bara uru. Ọ na-eme ka ndụ dịkwuo ụtọ obibi ma chekwaara anyị oge. Ọgụgụ isi pụdịrị ibelata nkụda mmụọ nke ime ihe n’echeghị echiche na-akpatakarị. Ndị na-enweghị ezi uche na-eji aka ha eme ka ihe na-esikwuru ha ike. Bible na-ekwu, sị: “Ndọgbu nke ndị nzuzu na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na-agwụ onye ọ bụla n’ime ha ike.” (Eklisiastis 10:15) Ndị dị otú ahụ nwere ike ịdọgbu onwe ha n’ọrụ ruo ogologo oge ma kpatara onwe ha ike ọgwụgwụ; n’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị ezigbo ihe ha na-arụpụta.
Bible nwere ọtụtụ ndụmọdụ ndị bara uru n’ihe ndị metụtara idebe ihe ọcha, nkwurịta okwu, ịrụsi ọrụ ike, ịnagide ịda ogbenye, na ọtụtụ akụkụ ndị ọzọ nke ndụ. Ọtụtụ nde mmadụ pụrụ ịgba akaebe na ihe kpebiri ma ihe ọ̀ gaara ha nke ọma ma ọ bụ na ọ garaghị ha bụ ókè ha gbasoruru ụkpụrụ Bible, bụ́ nke nyeere ha aka igosipụta amamihe.
Ọgụgụ isi na-enyere anyị aka ịghara ịbụ ndị na-agbaso nanị ntụziaka ma ọ bụ iwu ndị a kapịrị ọnụ. Ọ na-enyere anyị aka ịrụzu ọrụ ndị dịịrị anyị. Otú ọ dị, ọgụgụ isi anaghị anọchi anya inweta ihe ọmụma. Ilu 1:5 na-ekwu, sị: “Ka onye maara ihe wee nụ, wee tụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya.” Anyị aghaghịkwa ịmụta inyocha ihe ọmụma ndị anyị nwetara, jiri ha mee ezi mkpebi. Nke a na-enyere anyị aka ‘ije ije n’amamihe.’—Ilu 28:26.
Ịdị umeala n’obi na ọgụgụ isi na-aga ụkwụ na ụkwụ. Ọ bụ ezie na anyị pụrụ inwe ọtụtụ ihe anyị ga-achọ ịrụzu, ọ dị anyị mkpa inwe ezi uche ma mee nanị ihe anyị ga-emeli. N’ezie, Pọl onyeozi gwara anyị ka anyị bụrụ ndị “nwere ọtụtụ ihe mgbe nile ime n’ọrụ Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 15:58) N’agbanyeghị nke ahụ, a ghaghị ime ka ndụmọdụ a kwekọọ n’ụkpụrụ ahụ e dekọrọ n’Eklisiastis 9:4: “Ọ dịịrị nkịta dị ndụ mma karịa ọdụm nwụrụ anwụ.” Ilebara ahụ́ ike anyị anya nke ọma ka anyị na-ejere Jehova ozi pụrụ ime ka anyị dịkwuo ogologo ndụ ma nọgide na-arụsi ọrụ ike. Ọgụgụ isi pụrụ inyere anyị aka ịhazi oge anyị nke ọma iji rụzuo ihe ndị dị mkpa ma ka nwee obi ụtọ. Ee, ọgụgụ isi bara ezigbo uru.
[Foto dị na peeji nke 14]
Bible nwere ọtụtụ ezigbo ndụmọdụ
[Foto dị na peeji nke 15]
A pụrụ inweta ọgụgụ isi site n’ilere anya, ọzụzụ, na ahụmahụ