Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụmụ Mmadụ Hà Pụrụ Ime Ka Ịda Ogbenye Kwụsị?

Ụmụ Mmadụ Hà Pụrụ Ime Ka Ịda Ogbenye Kwụsị?

Ụmụ Mmadụ Hà Pụrụ Ime Ka Ịda Ogbenye Kwụsị?

ỌTỤTỤ nde mmadụ toro n’amaghị ihe bụ́ ịda ogbenye. Ọ dịbeghị mgbe ha buuru ọnụ laba. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ n’ime ndị ahụ na-emetara ndị ogbenye ebere ma na-agbalịsi ike inyere ha aka.

Otú ọ dị, ịda ogbenye ka na-akpa ndị agha obodo, idei mmiri, oké ọkọchị na nsogbu ndị ọzọ tiri ihe otiti, aka ọjọọ. Ihe ndị a na-emetụta ndị ọrụ ugbo ọkọta orie n’Africa n’ụzọ jọgburu onwe ya. A manyela ụfọdụ ịhapụ ụlọ ha ma kwaga n’obodo ukwu ma ọ bụ ịga biri ná mba ọzọ dị ka ndị gbara ọsọ ndụ. Ndị ọzọ bi n’ime ime obodo na-akwaga n’obodo ukwu n’ihi na ibi ndụ ka mma dọọrọ mmasị ha.

Inwe ọnụ ọgụgụ mmadụ karịrị akarị n’obodo ukwu na-akpatakarị ịda ogbenye. Ebe a na-akọ ubi na-adị nnọọ obere ma ọ bụrụdị na e nwere enwe. Inweta ọrụ na-esikarị ike. Ọtụtụ ndị na-aghọ ndị omekome n’ihi enweghị nnọọ olileanya. Ndị bi n’obodo ukwu na-eti mkpu maka enyemaka, ma ọchịchị ụmụ mmadụ enweghị ike ịkwụsị nsogbu na-arịwanye elu nke ịda ogbenye. N’izo aka n’akụkọ Mba Ndị Dị n’Otu wepụtara na November 2003, akwụkwọ akụkọ bụ́ The Independent nke London kwuru, sị: “Ọnụ ọgụgụ mmadụ na-amụba amụba n’ụwa na-anọ agụụ.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Gburugburu ụwa, e mere atụmatụ na narị nde mmadụ asatọ na nde iri anọ na abụọ taa adịghị eri ihe ndị na-edozi ahụ́—ọnụ ọgụgụ ahụ na-arịkwa elu, a na-enwekwu nde mmadụ ise nọ n’agụụ kwa afọ.”

Mgbe ụfọdụ, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na South Africa na-enweta akwụkwọ ozi site n’aka ndị ogbenye. Dị ka ihe atụ, otu nwoke nke si Bloemfontein dere, sị: “Enweghị m ọrụ, ana m ezukwa ohi n’obodo a mgbe ọ bụla ohere dapụtara. Ọ bụrụ na ezughị m ohi, anyị na-anọ agụụ ruo ụbọchị ole na ole—ka m ghara ikwu banyere oké oyi ga na-atụ anyị. O nwetụghị ọrụ dịnụ. Ọtụtụ ndị na-agagharị n’okporo ụzọ na-achọ ọrụ na ihe ha ga-eri. Amaara m ndị ọzọ bụ́ ndị na-achọ nri n’ebe a na-ekpofu ahịhịa. Ụfọdụ na-egbu onwe ha. Ọtụtụ ndị dị ka m dara mbà n’obi, ha enweghịkwa olileanya. O yighị ka ọ̀ dị olileanya dịnụ. Chineke, bụ́ onye kere anyị inwe ọchịchọ iri nri na iyi uwe, ọ́ naghị ahụ nke a?”

E nwere azịza ndị na-akasi obi nye ajụjụ ndị na-enye nwoke a nsogbu n’obi. Dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi, azịza ndị a dị n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.