Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere na e gbughị Devid na Bat-sheba n’ihi iko ha kwara, ma nwa ha mụrụ ọhụrụ anwụọ?

Iwu Mozis kwuru, sị: “Mgbe a ga-ahụta nwoke ka ya na nwanyị na-edina, bụ́ nwanyị nke di lụtaworo, ha abụọ ga-anwụkwa, bụ́ nwoke ahụ nke ya na nwanyị ahụ na-edina, na nwanyị ahụ: i wee kpochapụ ihe ọjọọ ahụ n’Izrel.” (Deuterọnọmi 22:22) A sị na Jehova Chineke kwere ka ndị ikpe bụ́ ụmụ mmadụ kpee Devid na Bat-sheba ikpe banyere mmehie ha, a gaara egbu mmadụ abụọ ahụ kwara iko. Ebe ọ bụ na ndị ikpe bụ́ ụmụ mmadụ apụghị ịma ihe dị n’obi, ikpe ha ga-adabere n’ihe ndị ha chọpụtara na ndị ahụ mere ihe ọjọọ mere. Iwu kwuru na a ga-egbu onye ọ bụla kwara iko. E nyeghị ndị ikpe Izrel ikike ịgbaghara mmehie ahụ.

N’aka nke ọzọ, ezi Chineke ahụ pụrụ inyocha obi ma gbaghara mmehie ma ọ hụ ihe ọ ga-eji mee otú ahụ. Ebe okwu ahụ metụtara Devid, bụ́ onye O sooro gbaa ndụ inye ya Alaeze, Jehova họọrọ ime ihe dị iche ma jiri aka ya hụ banyere okwu ahụ. (2 Samuel 7:12-16) “Onyeikpe ụwa nile” nwere ikike ime nhọrọ dị otú ahụ.—Jenesis 18:25.

Gịnị ka Jehova hụrụ ka ọ na-enyocha obi Devid? Ihe e dekwasịrị n’elu Abụ Ọma nke 51 na-ekwu na abụ ọma a na-ekpughe mmetụta Devid nwere “mgbe Netan, bụ́ onye amụma, bịakwutere ya, mgbe ọ bakwusịịrị Bat-sheba.” Abụ Ọma nke 51:1-4 na-ekwu, sị: “Meere m amara, Chineke, dị ka ebere Gị si dị: dị ka ịba ụba nke obi ebere Gị nile si dị hichapụ njehie m nile. Sụchaa m nke ọma dị ka ákwà ka ajọ omume m pụọ n’ime m, meekwa ka m si ná mmehie m dị ọcha. N’ihi na mụ onwe m maara njehie m nile: mmehie m dịkwa n’ihu m mgbe nile. Megide Gị, nanị Gị, ka m mehieworo, ọ bụkwa ihe jọrọ njọ n’anya Gị ka m meworo.” Ọ ghaghị ịbụ na Jehova lere oké ịkwa ụta a ọ hụrụ n’obi Devid anya dị ka ihe àmà nke ezi nchegharị ma kpebie na e nwere ihe ndabere maka imere ndị ahụ mere ihe ọjọọ ebere. Ọzọkwa, Devid n’onwe ya bụ onye na-eme ebere, Jehova na-emekwara ndị na-eme ebere ebere. (1 Samuel 24:4-7; Matiu 5:7; Jems 2:13) N’ihi ya, mgbe Devid kwetara mmehie ya, Netan gwara ya, sị: “Jehova emewokwa ka mmehie gị gabiga; ị gaghị anwụ.”—2 Samuel 12:13.

Devid na Bat-sheba agaghị agbanahụ ihe nile si ná mmehie ha pụta. Netan gwara Devid, sị: “N’ihi na i mewo ka ndị iro Jehova kpọluo mkpọlu nke ukwuu n’okwu a, nwa nwoke nke a mụụrụ gị, aghaghị ịnwụkwa.” Nwa ha malitere ịrịa ọrịa ma nwụọ n’agbanyeghị ọnụ Devid buru na újú o ruru ruo ụbọchị asaa.—2 Samuel 12:14-18.

Ọ na-esiri ụfọdụ ike ịghọta ihe mere nwa ahụ ga-eji nwụọ, ebe Deuterọnọmi 24:16 kwuru, sị: “A gaghị emekwa ka ụmụ nwụọ n’ọnọdụ ndị bụ́ nna ha.” Ma anyị aghaghị icheta na, a sị na ndị ikpe bụ́ mmadụ ji aka ha kpee ikpe ahụ, nne na nna ahụ, tinyere nwa ahụ a ka bu n’afọ gaara anwụ. Ọ pụkwara ịbụ na ọnwụ nwa ahụ nyeere Devid aka ịghọtakwu n’ụzọ doro anya otú mmehie ya na Bat-sheba wuteruru Jehova. Anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova kpere ikpe ziri ezi n’okwu a, n’ihi na “ụzọ ya zuru okè.”—2 Samuel 22:31.

[Foto dị na peeji nke 31]

Devid gosipụtara ezi nchegharị