Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezinụlọ Ndị Ihe Ọmụma Chineke Wusiri Ike

Ezinụlọ Ndị Ihe Ọmụma Chineke Wusiri Ike

“Inyeaka M Na-esi N’aka Jehova Bịa”

Ezinụlọ Ndị Ihe Ọmụma Chineke Wusiri Ike

OTU di na nwunye bi n’Argentina wuru mgbidi nkịtị iji kewaa ụlọ ha abụọ! Ha nwere esemokwu a na-apụghị idozi edozi; ha achọtụghị iji anya ahụ ibe ha.

Ọ dị mwute ịhụ na ọ bụghị nanị di na nwunye a nọ n’ụdị ọnọdụ a. Esemokwu, ekwesịghị ntụkwasị obi na oké ibu iro jupụtara n’ọtụtụ ezinụlọ. Nke a dị mwute ebe ọ bụ na ezinụlọ bụ ndokwa Chineke mere n’onwe ya. (Jenesis 1:27, 28; 2:23, 24) Onyinye a sitere n’aka Chineke bụ ebe dị mma ịnọ gosipụta ịhụnanya miri emi. (Rut 1:9) Site n’ịdị na-arụzu ọrụ Chineke nyere ha, ndị òtù ezinụlọ pụrụ ịsọpụrụ Jehova ma ghọọrọ ibe ha ngọzi. *

Ebe ọ bụ Chineke hiwere ezinụlọ, ọ dị anyị mkpa ikwe ka echiche ya kpụzie nghọta anyị nwere banyere otú ezinụlọ kwesịrị ịdị. Okwu ya na-enye anyị ọtụtụ ndụmọdụ bara uru, bụ́ ndị a kwadebere iji nyere ezinụlọ aka inwe ihe ịga nke ọma, karịsịa mgbe nsogbu bilitere. Banyere ihe bụ́ ọrụ ndị bụ́ di, Bible na-ekwu, sị: “Ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha.” Mgbe di na-emezu ihe a a chọrọ ya n’aka, obi na-adị nwunye ya ụtọ inwe “nkwanye ùgwù miri emi maka di ya.”—Ndị Efesọs 5:25-29, 33.

Banyere mmekọrịta ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha, Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị bụ́ nna, unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) N’otu aka ahụkwa, nke a na-eme ka e nwee obi ụtọ n’ezinụlọ, bụ́ nke na-eme ka ọ dịkwuoro ụmụaka mfe irubere ndị mụrụ ha isi.—Ndị Efesọs 6:1.

Ihe ndị a e kwuru n’elu bụ ihe atụ nke ndụmọdụ Bible magburu onwe ya maka ndụ ezinụlọ. Site n’itinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ, ọtụtụ ndị na-enwe obi ụtọ n’ebe obibi ha. Were di na nwunye ahụ bi n’Argentina, bụ́ ndị a kpọtụrụ aha ná mmalite, dị ka ihe atụ. Mgbe ha na Ndịàmà Jehova mụsịrị Bible ruo ọnwa atọ, ha malitere itinye ndụmọdụ ya ndị amamihe dị na ha maka alụmdi na nwunye n’ọrụ. Ha gbalịsiri ike ịdị na-ekwurịtakwu okwu, ịdị na-enwe ọmịiko n’ebe ibe ha nọ na ịdị na-agbaghara ibe ha. (Ilu 15:22; 1 Pita 3:7; 4:8) Ha mụtara ịdị na-achịkwa iwe ha na ịgakwuru Chineke maka enyemaka mgbe o yiri ka iwe ha ọ̀ gafewela ókè. (Ndị Kọlọsi 3:19) N’oge na-adịghị anya, ha kwaturu mgbidi ahụ ha wuru!

Chineke Pụrụ Iwusi Ezinụlọ Ike

Ịmụta na itinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ pụrụ iwusi ezinụlọ ike ịnagide nrụgide. Nke a dị oké mkpa n’ihi na e buru n’amụma na a ga-awakwasị ndokwa ezinụlọ n’ụzọ obi ọjọọ n’oge anyị a. Pọl buru amụma banyere mbelata nke omume ọma na ọdịda nke ọha mmadụ bụ́ nke e nwere n’oge a. O kwuru na ihe a ga-eji mara ‘ụbọchị ikpeazụ’ bụ eguzosighị ike n’ihe, enweghị “obi mmadụ” na ụmụ inupụrụ ndị mụrụ ha isi, ọbụna n’etiti ndị “na-enwe ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke.”—2 Timoti 3:1-5.

Ịgbalị ime ihe na-atọ Chineke ụtọ pụrụ inye aka ịlụso mmetụta ndị dị otú ahụ na-emerụ ahụ́ n’ime ezinụlọ ọgụ. Ọtụtụ ezinụlọ achọpụtala na ngwọta ime mmụọ dị ha mkpa iji nyere ha aka imeri ọtụtụ nsogbu ndị ha na-eche ihu. Ọ bụrụ na ndị òtù ezinụlọ achọọ ịnọgide soro Chineke na-enwe ezi mmekọrịta, ọ dị ha mkpa karịsịa itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ na ịmara na “ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ, n’efu ka ha dọgbuworo onwe ha n’ọrụ n’ime ya, bụ́ ndị na-ewu ya.” (Abụ Ọma 127:1) Ụzọ kachasịnụ e si enweta obi ụtọ n’ime ezinụlọ bụ ibute Chineke ụzọ ná ndụ ezinụlọ.—Ndị Efesọs 3:14, 15.

Na Hawaii, otu nwoke aha ya bụ Dennis chọpụtara na nke ahụ bụ eziokwu. Ọ bụ ezie na ọ sị na ya bụ Onye Kraịst, ihe e ji mara ya bụ okwu mkparị na ịlụ ọgụ. Mgbe ọ rụsịrị ọrụ agha, ọ ghọkwuru onye iwe ọkụ na onye na-ebu iwe n’obi. Ọ na-echeta, sị: “Ana m alụ ọgụ mgbe nile. Achọghị m ịma ihe ga-eme m, ụjọ ọnwụ anaghịkwa atụ m. Anọgidere m na-ekwu okwu mkparị, na-alụkwa ọgụ. Nwunye m, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, gbara m ume ịmụ Bible.”

Dennis jụrụ mgbalị nile nwunye ya mere. Otú ọ dị, àgwà e ji mara Ndị Kraịst nke nwunye ya na-akpa belatara àgwà ọjọọ ya. Dennis mechara soro nwunye ya na ụmụ ya gaa nzukọ Ndị Kraịst. Ka e mesịrị, a malitere iduziri Dennis ọmụmụ Bible, o nwekwara ezi ọganihu. Ọ kwụsịrị ise siga, bụ́ nke o seworo ruo afọ 28, kwụsịkwa iso ndị enyi ya bụ́ ndị na-eme ihe nile ọ chọrọ ịkwụsị na-akpakọrịta. N’ikele Jehova, Dennis kwuru, sị: “Ọnọdụ ezinụlọ m kara mma. Anyị na-aga nzukọ na ozi ọma dị ka ezinụlọ. Ụmụ m abụọ anaghịzi atụ m ụjọ n’ihi na amụtara m ịchịkwa iwe m, kwụsịkwa ikwu okwu mkparị. Anyị na-akparịta ụka, na-enwekwa nkwurịta okwu ndị dabeere na Bible. A sị na ọ bụghị eziokwu Bible, agaraghị m anọ n’ọnọdụ m nọ na ya taa; ana m ewebu nnọọ iwe ọkụ.”

Ezinụlọ pụrụ inweta obi ụtọ ma ha gbalịsie ime uche Jehova. Ahụmahụ egosila na a sịgodị na ọ bụ nanị otu onye òtù ezinụlọ na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, ihe na-aka mma karịa mgbe ọ na-enweghị onye na-etinye ya n’ọrụ. Iwulite ezinụlọ Ndị Kraịst bụ ọrụ siri ike nke chọrọ nkà na oge. Ma ndị òtù ezinụlọ dị otú ahụ ji n’aka na Jehova ga-eji ihe ịga nke ọma kwụghachi ha ụgwọ maka mgbalị ha. Ha pụrụ ikwughachi okwu ọbụ abụ ahụ, nke bụ́: “Inyeaka m na-esi n’aka Jehova bịa.”—Abụ Ọma 121:2.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Lee 2005 Calendar of Jehovah’s Witnesses, May/June.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

“Ezinụlọ ọ bụla n’eluigwe na n’ụwa sitere n’ebe [Chineke] nọ nweta aha ya.”—NDỊ EFESỌS 3:15.

[Igbe dị na peeji nke 8]

JEHOVA NA-EJI NDOKWA EZINỤLỌ AKPỌRỌ IHE

“Chineke wee gọzie ha: Chineke wee sị ha, Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa.”— Jenesis 1:28.

“Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova bụ . . . Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịn na-amị mkpụrụ n’ime ime ụlọ nke ụlọ gị.” —Abụ Ọma 128:1, 3.