Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mari—Eze Nwanyị Oge Ochie nke Ọzara

Mari—Eze Nwanyị Oge Ochie nke Ọzara

Mari—Eze Nwanyị Oge Ochie nke Ọzara

ỌKÀ mmụta ihe ochie bụ́ onye France nke aha ya bụ André Parrot chetara, sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ mgbe m batara n’ime ụlọ m n’abalị ahụ mgbe mụ na ndị òtù m risịrị oriri maka ihe ọma meere anyị.” Na January 1934, na Tell Hariri, n’ebe dịdebere Abu Kemal n’akụkụ Yufretis nke dị na Siria, Parrot na ndị òtù ya gwupụtara ihe oyiyi e dere ihe na-esonụ n’elu ya: “Lamgi-Mari, eze Mari, nnukwu onye nchụàjà Enlil.” Obi tọrọ ha nnọọ ụtọ n’ihi ihe ahụ ha chọtara.

E mechaala chọta ebe obodo Mari dịbu! Olee uru ihe a a chọtara baara ndị na-amụ Bible?

Gịnị Mere O Ji Adọrọ Mmasị?

Ọ bụ ezie na a maara na e nwere ebe a na-akpọ Mari site n’ihe odide oge ochie, ọ dịghị onye maara kpọmkwem ebe ọ dị ruo ogologo oge. Dị ka ndị odeakwụkwọ ndị Sumer si kwuo, Mari bụ ebe e nwere usoro ndị eze, bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na n’otu oge ha chịrị Mesopotemia dum. N’ịbụ nke e wuru n’akụkụ Osimiri Yufretis, Mari nọ nnọọ n’ebe magburu onwe ya bụ́ ebe ụzọ ndị e si aga ahịa ndị jikọtara Ọwara Oké Osimiri Peasia na Asiria, Mesopotemia, Anatolia, na Ụsọ Oké Osimiri Mediterenian si gafee. A na-ebu ngwá ahịa ndị gụnyere osisi, ígwè, na nkume—bụ́cha ndị dị ụkọ na Mesopotemia—agafe obodo ahụ. Ụtụ isi a naara maka ngwá ahịa ndị a mebara nnọọ Mari, nyere ya aka ịchịkwa ógbè ahụ. Otú ọ dị, ọchịchị a kwụsịrị mgbe ndị Siria meriri Sagọn nke Akkad.

Ruo ihe dị ka narị afọ atọ ka e merisịrị Sagọn, ọtụtụ ndị gọvanọ bụ́ ndị soja chịrị Mari. N’oge ọchịchị ha, obodo ahụ maliteghachitụrụ inwe ihe ịga nke ọma. Otú ọ dị, ka ọ na-erule n’oge ọchịchị nke onye ọchịchị ikpeazụ ya, bụ́ Zimri-Lim, Mari nọ na-ada ada. Zimri-Lim nwara iwusi alaeze ukwu ya ike site n’ọtụtụ mmeri ndị o nwere n’agha, site n’ịbịanye aka n’ọtụtụ akwụkwọ nkwekọrịta udo, nakwa site n’ịlụ nwanyị n’ezinụlọ ụfọdụ. Ma n’ihe dị ka n’afọ 1760 T.O.A., Eze Hammurabi nke Babilọn meriri obodo ahụ ma bibie ya, kwụsị ihe Parrot kpọrọ “otu n’ime mmepeanya ndị kasịnụ e nwere n’ụwa oge ochie.”

Mgbe ndị agha Hammurabi bibiri Mari, ha amaghị na ha na-emere ndị ọkà mmụta ihe ochie na ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge a nnukwu ihe ọma. Ka ha na-akwatu mgbidi ndị e ji brik ndị a na-ahụghị n’ọkụ wuo, ha liri ihe owuwu ụfọdụ ruru mita ise n’ogo n’ebe ụfọdụ, si otú ahụ mee ka ha ghara ịdakpọsị ka oge na-agafe. Ndị ọkà mmụta ihe ochie egwupụtawo mkpọmkpọ ebe nke ụlọ arụsị na obí eze dị iche iche, tinyere ọtụtụ arịa na ọtụtụ puku ihe odide ndị na-eme ka a ghọtakwuo mmepeanya oge ochie.

Gịnị mere mkpọmkpọ ebe nke Mari ji adọrọ mmasị anyị? Tụlee mgbe nna ochie ahụ bụ́ Ebreham dịrị ndụ. A mụrụ Ebreham n’afọ 2018 T.O.A., narị afọ atọ na iri ise na abụọ ka oké Iju Mmiri ahụ gasịrị. Ọgbọ ya bụ nke iri site na Noa. N’irube isi n’iwu Chineke nyere ya, Ebreham hapụrụ obodo nna ya, bụ́ Ua, ma gaa Heran. N’afọ 1943 T.O.A., mgbe Ebreham dị afọ 75, ọ hapụrụ Heran gawa ala Kenan. Ọkà mmụta ihe ochie bụ́ onye Ịtali bụ́ Paolo Matthiae na-ekwu, sị: “Akụkọ ihe mere eme na-egosi na oge Ebreham si Ua kwaga Jeruselem [nke dị na Kenan] bụ oge Mari ka dị adị.” N’ihi ya, nchọta a chọtara Mari bara uru n’ihi na ọ pụrụ inyere anyị aka iji anya nke uche hụ oge ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ebreham dịrị ndụ. *Jenesis 11:10–12:4.

Gịnị Ka Mkpọmkpọ Ebe Ya Na-ekpughe?

Okpukpe gara nke ọma na Mari dị ka ọ dị n’akụkụ ndị ọzọ nke Mesopotemia. E weere ya iwu ji mmadụ ife ndị bụ́ chi. A na-achọpụta ihe bụ́ uche ndị bụ́ chi tupu e mee mkpebi ọ bụla dị mkpa. Ndị ọkà mmụta ihe ochie achọtawo mkpọmkpọ ebe nke ụlọ arụsị isii. Ụfọdụ n’ime ha bụ Ụlọ Arụsị nke Ọdụm (bụ́ nke e weere dị ka ụlọ arụsị Dagan, nke a kpọrọ Degọn na Bible) na ebe nsọ nke Ishtar, chi nwanyị ọmụmụ, nakwa nke chi anyanwụ bụ́ Shamash. Ụlọ arụsị ndị a nweburu ihe oyiyi nke chi a na-achụrụ àjà ma na-ekpegara ekpere na ha. Ndị na-efe ha na-edebe ihe oyiyi nke ebe ha ji ọnụ ọchị na-ekpe ekpere n’elu bench dị n’ebe nsọ ahụ, na-ekwere na ihe oyiyi ha ga-eme ka ofufe ha dịtee aka. Parrot kwuru, sị: “Dị ka kandụl a na-eji efe ofufe na Katọlik nke taa, ihe oyiyi ahụ na-anọchi anya onye ahụ na-efe arụsị ahụ, ma ọ na-anọchi anya ya karịadị kandụl.”

Ihe kasị dị ịrịba ama n’ihe ndị a chọtara ná mkpọmkpọ ebe Tell Hariri bụ mkpọmkpọ ebe obí eze nke e ji aha eze ikpeazụ biri na ya, bụ́ Eze Zimri-Lim, mara. Ọkà mmụta ihe ochie bụ́ onye France bụ́ Louis-Hugues Vincent kọwara ya dị ka “ihe owuwu oge ochie magburu onwe ya nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa.” Ọ dị ihe karịrị hekta abụọ na ọkara ma nwee ọnụ ụlọ na ogige dị narị atọ. Ọbụna n’oge ochie, e lere obí eze a anya dị ka otu n’ime ihe ndị dị ebube n’ụwa. N’akwụkwọ ya bụ́ Ancient Iraq, Georges Roux kwuru, sị: “Ọ bụ nnọọ ebe na-ewu ewu nke na Eze nke Ugarit, bụ́ obodo dị n’akụkụ osimiri dị na Siria, alaghị azụ izipụ nwa ya ka o mee njem dị narị kilomita isii n’ogologo gaa n’ime ime obodo nanị iji hụ ‘ụlọ Zimri-Lim.’”

Tupu ndị ọbịa eruo otu ogige sara mbara, ha na-esi n’otu ụzọ mbata e wugasịrị ụlọ elu n’akụkụ ya abụọ ruo n’obí eze ahụ e wusiri ike. Eze ikpeazụ nke Mari, bụ́ Zimri-Lim, na-anọ n’ocheeze a dọkwasịrị n’elu ebe e wuliri elu na-ahụ maka okwu ndị metụtara ịlụ agha, azụmahịa, na mmekọrịta nke ha na mba ndị ọzọ; nọrọ ebe ahụ na-ekpe ikpe; ma na-anabata ndị ọbịa na ndị nnọchianya nke mba ndị ọzọ. E nwere ebe ndị ọbịa, bụ́ ndị eze ahụ na-emere oké oriri nke nri na mmanya mgbe nile, na-ehi ụra. Ihe oriri ọ na-enye ha gụnyere anụ ehi a mịrị n’ọkụ ma ọ bụ nke e siri esi, anụ atụrụ, nke ele, azụ, na anụ ọkụkọ—a na-etinyecha ha n’ofe e ji garlic na ụdị akwụkwọ nri na cheese dị iche iche sie. Nri nhicha ọnụ a na-enye ha bụ mkpụrụ osisi a ghọtara ọhụrụ, ndị a mịrị amị, ma ọ bụ ndị e tere shuga na keeki ndị e ji kom kom ndị mara mma mee. A na-enye ndị ọbịa biya ma ọ bụ ụdị mmanya ndị ọzọ iji tajụọ akpịrị.

E ji ịdị ọcha kpọrọ ihe n’obí eze ahụ. A hụrụ ebe ịsa ahụ́ ndị nwere ọkwá ịsa ahụ́ ndị e ji ụrọ kpụọ na mposi ndị na-enweghị ihe ịnọ ọdụ. E ji bitumen tee ala nke ọnụ ụlọ ndị a nakwa akụkụ ala ala nke ahụ́ ájá ha. Mmiri ndị na-adịghị mma na-esi n’ọwara mmiri ndị e ji brik rụọ na-asọpụ, paịpụ mmiri ndị e ji ájá ụrọ kpụọ ma jiri bitumen techie ha ka na-arụkwa ọrụ ka puku afọ atọ na narị ise gasịrịla. Mgbe ndị nwunye atọ nke eze butere ọrịa na-egbu egbu, e nyere ntụziaka ka e zere ha kpamkpam. Ọ dịghị onye ga-aga nwanyị na-arịa ọrịa dị otú ahụ nso, nwanyị ahụ ga-anọpụkwa iche site n’ebe ndị mmadụ nọ. “Ọ dịghị onye ga-eji iko ya ṅụọ mmiri, rie ihe na tebụl ya, nọrọ ọdụ n’oche ya.”

Gịnị Ka Anyị Pụrụ Ịmụta Site n’Ihe Ochie Ndị Ahụ?

Parrot na ndị òtù ya chọtara puku mbadamba nkume cuneiform iri abụọ e ji asụsụ Akkadian dee ihe na ha. Mbadamba nkume ndị ahụ bụ akwụkwọ ozi na ihe odide ọchịchị na ndị nke azụmahịa. Ọ bụ nanị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ihe ochie ndị a ka e bipụtarala. Otú ọ dị, ha dị mpịakọta 28. Olee uru ha bara? Jean-Claude Margueron, bụ́ onye nduzi nke Nchọpụta Ihe Ochie nke Mari kwuru, sị: “Tupu a chọpụta ihe ochie nke Mari, anyị amachaghị banyere akụkọ ihe mere eme, omenala, na ndụ a dịrị kwa ụbọchị na Mesopotemia nakwa na Siria ná mmalite nke puku afọ nke abụọ. N’ihi ihe ndị a a chọtara, o kwela omume ịmata ihe ndị mere n’oge ahụ.” Dị ka Parrot kwuru, ihe ochie ndị ahụ “na-ekpughe myirịta dị ịrịba ama n’etiti ndị ha kpọrọ aha na ihe Agba Ochie na-agwa anyị banyere oge Ndị Nna Ochie.”

Mbadamba nkume ndị ahụ a chọtara na Mari na-emekwa ka a ghọtakwuo akụkụ Bible ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, ihe odide ndị ahụ na-egosi na iweghara ndị nwunye na iko nwanyị nke onye iro ha bụ “ihe e ji mara ndị eze n’oge ahụ.” Ndụmọdụ ahụ onye sabo bụ́ Ahitofel nyere nwa Eze Devid bụ́ Absalọm ka o dinaa ndị iko nwanyị nna ya abụtụghị ihe ọhụrụ.—2 Samuel 16:21, 22.

E mewo njem igwupụta ihe ochie na Tell Hariri ugboro 41 kemgbe afọ 1933. Otú ọ dị, ka ọ dị ugbu a, ọ bụ nanị hekta asatọ n’ime otu narị hekta na iri e nwere na Mari ka e nyochaworo. O yiri ka à ka ga-achọta ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-adọrọ mmasị na Mari, bụ́ eze nwanyị oge ochie nke ọzara.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 O yikwara nnọọ ka ndị Juu bụ́ ndị na-aga ibi n’ala ọzọ na Babilọn mgbe e bibisịrị Jeruselem na 607 T.O.A. hà si n’akụkụ mkpọmkpọ ebe nke Mari gafee.

[[Map dị na peeji 10]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ọwara Oké Osimiri Peasia

Ua

MESOPOTEMIA

Osimiri Yufretis

MARI

ASIRIA

Heran

ANATOLIA

KENAN

Jeruselem

Oké Osimiri Mediterenian (Oké Osimiri Ukwu)

[Foto dị na peeji nke 11]

N’ihe odide a, Eze Iahdun-Lim nke Mari turu ọnụ banyere ihe ndị o wuru

[Foto dị na peeji nke 11]

Nchọta a chọtara ihe oyiyi a nke Lamgi-Mari mere ka a mata kpọmkwem ebe Mari dịbu

[Foto dị na peeji nke 12]

Ebe e wuliri elu n’obí eze, bụ́ ebe ihe oyiyi nke chi nwanyị pụrụ ịdịwo

[Foto dị na peeji nke 12]

Ebe Ebih-Il, onye ọrụ obí eze Mari, na-ekpe ekpere

[Foto dị na peeji nke 12]

Mkpọmkpọ ebe Mari, nke na-egosi ihe owuwu ndị e ji brik ndị a na-ahụghị n’ọkụ wuo

[Foto dị na peeji nke 12]

Ebe ịsa ahụ́ dị n’obí eze

[Foto dị na peeji nke 13]

Mbadamba nkume nke Naram-Sin, bụ́ onye meriri Mari

[Foto dị na peeji nke 13]

A chọtara ihe dị ka puku mbadamba nkume “cuneiform” iri abụọ ná mkpọmkpọ ebe nke obí eze ahụ

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 10]

© Mission archéologique française de Tell Hariri - Mari (Syrie)

[Ebe E Sigasị Nweta Foto dị na peeji 11]

Ihe odide: Musée du Louvre, Paris; ihe a kpụrụ akpụ: © Mission archéologique française de Tell Hariri - Mari (Syrie)

[Ebe E Sigasị Nweta Foto dị na peeji 12]

Ihe a kpụrụ akpụ: Musée du Louvre, Paris; ebe e wuliri elu na ebe ịsa ahụ́: © Mission archéologique française de Tell Hariri - Mari (Syrie)

[Ebe E Sigasị Nweta Foto dị na peeji 13]

Mbadamba nkume: Musée du Louvre, Paris; mkpọmkpọ ebe obí eze: © Mission archéologique française de Tell Hariri - Mari (Syrie)