‘Na-achịkwa Onwe Gị N’ọnọdụ Ọjọọ’
‘Na-achịkwa Onwe Gị N’ọnọdụ Ọjọọ’
“Ọ dịghị mkpa ka ohu nke Onyenwe anyị na-alụ ọgụ, kama ọ dị mkpa ka ọ na-emeso mmadụ nile n’ụzọ dị nro, . . . na-achịkwa onwe ya n’ọnọdụ ọjọọ.”—2 TIMOTI 2:24.
1. Ka anyị na-ekere òkè n’ozi Ndị Kraịst, olee ihe mere anyị ji ezute ndị na-akparị mmadụ mgbe ụfọdụ?
GỊNỊ ka ị na-eme mgbe i zutere ndị na-anabataghị gị ma ọ bụ ozi ị na-ezi? Ná nkọwa ya nke ụbọchị ikpeazụ, Pọl onyeozi buru amụma na ndị mmadụ ga-abụ “ndị nkwulu, . . . ndị nkwutọ, ndị na-enweghị njide onwe onye, ndị na-eme ihe ike ike.” (2 Timoti 3:1-5, 12) Ị pụrụ izute ndị dị otú ahụ mgbe ị nọ n’ozi ma ọ bụ n’oge ndị ọzọ.
2. Olee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị pụrụ inyere anyị aka iji amamihe emeso ndị kparịrị anyị ihe?
2 Ọ bụghị mmadụ nile na-akparị mmadụ bụ ndị ihe ọma na-adịtụghị amasị. Oké ihe isi ike ma ọ bụ nkụda mmụọ pụrụ ime ka mmadụ kparịa onye ọ bụla nọ ya nso. (Eklisiastis 7:7) Ọtụtụ ndị na-eme otú ahụ n’ihi ha bi ma na-arụ ọrụ ebe a na-ejikarị okwu mkparị eme ihe. Nke a adịghị eme ka anyị bụ́ Ndị Kraịst na-akparị mmadụ, ma ọ na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere ndị ọzọ ji eme otú ahụ. Gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe a kparịrị anyị? Ilu 19:11 na-ekwu, sị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.” Ndị Rom 12:17, 18 na-adụkwa anyị ọdụ, sị: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ. . . . Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, bụrụnụ ndị ha na mmadụ nile na-adị n’udo.”
3. Olee otú ime udo si emetụta ozi anyị na-ekwusa?
3 Ọ bụrụ n’ezie na anyị na-eme udo, ọ Ilu 17:27) Mgbe ọ na-ezipụ ndịozi ya ịga mee nkwusa, Jizọs dụrụ ha ọdụ, sị: “Mgbe unu na-abanye n’ime ụlọ, keleenụ ndị ezinụlọ ahụ [“sịnụ ka ụlọ ahụ nwee udo,” The New English Bible]; ọ bụrụkwa na ụlọ ahụ kwesịrị ekwesị, ka udo unu na-asị ka o nwee bịakwasị ya; ma ọ bụrụ na o kwesịghị ekwesị, ka udo nke si n’ebe unu nọ lọghachiri unu.” (Matiu 10:12, 13) Ozi anyị na-ezisa bụ ozi ọma. Bible na-akpọ ya “ozi ọma nke udo,” “ozi ọma nke obiọma ahụ na-erughịrị mmadụ nke Chineke,” na “ozi ọma nke a nke alaeze.” (Ndị Efesọs 6:15; Ọrụ 20:24; Matiu 24:14) Nzube anyị abụghị ịkatọ ihe onye anyị na-ezi ozi ọma kweere ma ọ bụ iso ya rụọ ụka, kama ọ bụ izi ya ozi ọma sitere n’Okwu Chineke.
ga-apụta ìhè ná mmụọ anyị na-egosipụta. Ọ ga-apụta ìhè n’ihe anyị na-ekwu ma na-eme, ikekwe, ihu anyị na ụda olu anyị ga-egosipụtakwa ya. (4. Gịnị ka ị pụrụ ikwu mgbe onye nwe ụlọ kwuru, sị, “Enweghị m mmasị” ọbụna tupu gị ekwuo ihe mere i ji bịa?
4 N’egeghị gị nnọọ ntị, onye nwe ụlọ pụrụ ikwu n’ike, sị, “Enweghị m mmasị.” N’ọtụtụ ọnọdụ, ị pụrụ ikwu, sị, “Achọburu m ịgụrụ gị nanị otu akụkụ Bible dị nkenke.” Ọ pụrụ ịbụ na ọ gaghị ajụ. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụ ihe kwesịrị ekwesị ikwu, sị: “Achọburu m ịgwa gị banyere mgbe a na-agaghị enwe ikpe na-ezighị ezi, mgbe mmadụ nile ga-amụtakwa ịhụ ibe ha n’anya.” Ọ bụrụ na nke ahụ emeghị ka ọ sị gị kọwaa ihe ị na-ekwu, ị pụrụ ịgbakwụnye, sị: “Ma o yiri ka i nweghị ohere ugbu a.” Ọ bụrụgodị na onye nwe ụlọ emeghachighị omume dị ka onye udo, ànyị ga-ekwubi na “o kwesịghị ekwesị”? N’agbanyeghị mmeghachi omume ya, cheta na Bible na-adụ anyị ọdụ ịdị “na-emeso mmadụ nile n’ụzọ dị nro, . . . na-achịkwa onwe [anyị] n’ọnọdụ ọjọọ.”—2 Timoti 2:24.
Onye Na-akparị Mmadụ n’Ihi na E Duhiere Ya
5, 6. Olee otú Sọl si mesoo ụmụazụ Jizọs ihe, gịnịkwa mere o ji mee otú ahụ?
5 Na narị afọ mbụ, a maara otu nwoke aha ya bụ Sọl nke ọma dị ka onye na-akparị mmadụ, na ọbụna dị ka onye na-eme ihe ike. Bible na-ekwu na ọ “na-ekupụ iyi egwu na igbu ọchụ dị ka ume megide ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị.” (Ọrụ 9:1, 2) O mesịrị kweta na ya bụbu “onye nkwulu na onye mkpagbu na onye na-akparị mmadụ.” (1 Timoti 1:13) Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị ikwu ya ghọrọ Ndị Kraịst, o kwuru banyere àgwà ya onwe ya na-akpaso ụmụazụ Kraịst, sị: “Ebe ọ bụkwa na m na-enwe ọnụma n’ụzọ gabigara ókè megide ha, eruru m n’ókè nke ịkpagbu ha ọbụna n’obodo ndị ọzọ.” (Ọrụ 23:16; 26:11; Ndị Rom 16:7, 11) E nweghị ihe gosiri na ndị ahụ na-eso ụzọ gbalịrị iso Sọl rụọ ụka mgbe o si otú ahụ na-akpa àgwà.
6 Gịnị mere Sọl ji kpaa àgwà otú ahụ? Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, o dere, sị: “Amaghị m nke a na-akọ, emekwara m ihe n’enweghị okwukwe.” (1 Timoti 1:13) Ọ bụ onye Farisii nke “a kụziiri ihe dị ka ụkpụrụ siri ike nke Iwu nke ndị nna ochie . . . si dị.” (Ọrụ 22:3) Ọ bụ ezie na ihe àmà na-egosi na onye nkụzi Sọl bụ́ Gameliel nwetụrụ uche ghere oghe, nnukwu onye nchụàjà bụ́ Keifas, bụ́ onye ya na Sọl kpawara, bụ onye na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè. Keifas bụ onyeisi na nkata a kpara bụ́ nke dugara n’ogbugbu e gburu Jizọs Kraịst. (Matiu 26:3, 4, 63-66; Ọrụ 5:34-39) Mgbe nke ahụ gasịrị, Keifas hụrụ na a pịara ndịozi Jizọs ihe, nyekwa ha iwu ịghara ịdị na-ekwusa ozi ọma n’aha Jizọs. Ọ bụ Keifas nọ n’isi ná nnọkọ ndị Sanhedrin mgbe iwe were ha, ha akpụpụ Stivin ma tụgbuo ya. (Ọrụ 5:27, 28, 40; 7:1-60) Sọl hụrụ mgbe a tụgburu Stivin na nkume, Keifas nyekwara ya ikike ịga n’ihu n’ịkwụsị mgbalị ụmụazụ Jizọs na-eme site n’ịnwụchi ha na Damaskọs. (Ọrụ 8:1; 9:1, 2) N’ihi na ọ bụ Keifas nyere ya ikike, Sọl chere na ihe ahụ ọ na-eme gosiri na ọ na-anụrụ Chineke ọkụ n’obi, ma n’ezie, o nweghị ezi okwukwe. (Ọrụ 22:3-5) N’ihi ya, Sọl aghọtaghị na Jizọs bụ ezi Mezaịa ahụ. Ma Sọl ghọtara onwe ya mgbe Jizọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite gwara ya okwu n’ụzọ ọrụ ebube n’okporo ụzọ e si aga Damaskọs.—Ọrụ 9:3-6
7. Gịnị mere Sọl n’ihi nzute o zutere Jizọs n’ụzọ e si aga Damaskọs?
7 Obere oge ka nke a gasịrị, e zipụrụ onye na-eso ụzọ bụ́ Ananaịas ịga gbaara Sọl àmà. Ị̀ gaara adị njikere ịgakwuru Sọl ịgbara ya àmà? Ụjọ jidere Ananaịas, ma o jiri obiọma gwa Sọl okwu. Àgwà Sọl gbanwere n’ihi nzute ahụ o zutere Jizọs n’ụzọ ọrụ ebube n’ụzọ e si aga Damaskọs. (Ọrụ 9:10-22) A bịara mara ya dị ka Pọl onyeozi, onye ozi ala ọzọ bụ́ Onye Kraịst nke na-anụ ọkụ n’obi.
Onye Nwere Obi Dị Nwayọọ Ma Nwee Obi Ike
8. Olee otú Jizọs si gosipụta àgwà Nna ya n’ebe ndị mere ihe ọjọọ nọ?
8 Jizọs bụ onye nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi nke nwere obi dị nwayọọ ma jiri obi ike mesoo ndị mmadụ ihe. (Matiu 11:29) O gosipụtara mmụọ nke Nna ya nke eluigwe, bụ́ onye na-agba ndị ajọ omume ume ịhapụ ụzọ ọjọọ ha. (Aịsaịa 55:6, 7) Mgbe ọ na-emeso ndị mmehie ihe, Jizọs matara mgbe e nwere ihe na-egosi na ha agbanweela, ọ gbakwara ndị dị otú ahụ ume. (Luk 7:37-50; 19:2-10) Kama ikpebi ihe ndị ọzọ bụ site n’ọdịdị elu ahụ́ ha, Jizọs ṅomiri obiọma, ndidi, na ogologo ntachi obi nke Nna ya n’olileanya nke ime ka ha chegharịa. (Ndị Rom 2:4) Ọ bụ uche Jehova ka ụdị mmadụ nile chegharịa na ka a zọpụta ha.—1 Timoti 2:3, 4.
9. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’otú Aịsaịa 42:1-4 si mezuo n’ahụ́ Jizọs?
9 N’ikwu otú Jehova si ele Jizọs Kraịst anya, Matiu, bụ́ onye so dee akụkụ Bible ndị kwuru banyere ndụ Jizọs hotara okwu amụma ndị a, sị: “Lee! Ohu m nke m họọrọ, onye m hụrụ n’anya, onye mkpụrụ obi m nwapụtara! M ga-eme ka mmụọ m dịkwasị ya, ọ ga-eme ka ihe bụ ikpe ziri ezi doo mba nile anya. Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghịkwa etisi mkpu ike, ọ dịghịkwa onye ga-anụ olu ya n’okporo ámá. Ọ dịghị ahịhịa amị e chihịara echihịa ọ ga-egwepịa, ọ dịghịkwa ogho oriọna na-akwụ anwụrụ ọ ga-emenyụ, ruo mgbe ọ ga-ezipụ ikpe ziri ezi ka o nwee ihe ịga nke ọma. N’ezie, n’aha ya ka mba nile ga-enwe olileanya.” (Matiu 12:17-21; Aịsaịa 42:1-4) N’ime ihe kwekọrọ n’okwu amụma ndị ahụ, Jizọs esoghị ndị mmadụ rụọ ụka na-enweghị isi. Ọbụna mgbe ọ nọ ná nsogbu, ọ gbara àmà banyere eziokwu ahụ n’ụzọ ruru ndị nwere obi eziokwu n’obi.—Jọn 7:32, 40, 45, 46.
10, 11. (a) Ọ bụ ezie na ndị Farisii so ná ndị kasị kwugide Jizọs, gịnị mere o ji gbaara ụfọdụ n’ime ha àmà? (b) Olee otú Jizọs si zaghachi ndị na-emegide ya mgbe ụfọdụ, ma gịnị ka ọ na-emeghị?
10 N’oge ozi ya, Jizọs gwara ọtụtụ ndị Farisii okwu. Ọ bụ ezie na ụfọdụ n’ime ha gbalịrị isi n’okwu ya mata ya n’ọnyà, Jizọs ekwubighị na ha nile nwere ebumnobi ọjọọ. Ihe àmà na-egosi na ihe mere Saịmọn, bụ́ onye Farisii nke yitụrụ ka ọ̀ na-akatọ mmadụ, ji kpọọ Jizọs òkù ka ọ bịa rie nri n’ụlọ ya bụ ka o nwee ike ịmatakwu ya nke ọma. Jizọs gara ma gbaara ndị bịara ebe ahụ àmà. (Luk 7:36-50) N’oge ọzọ, onye Farisii a ma ama aha ya bụ Nikọdimọs bịakwutere Jizọs n’abalị. Jizọs abaraghị ya mba n’ihi ichere ruo abalị tupu ya abịa. Kama nke ahụ, ọ gbaara Nikọdimọs àmà banyere ịhụnanya Chineke gosiri site n’izite Ọkpara ya iji megheere ndị ga-egosipụta okwukwe ụzọ maka nzọpụta. Jizọs jikwa obiọma kwupụta ịdị mkpa nke irubere ndokwa Chineke isi. (Jọn 3:1-21) Nikọdimọs mesịrị gbachitere Jizọs mgbe ndị Farisii ndị ọzọ kwuru okwu megide akụkọ ọma a kọrọ banyere Jizọs.—Jọn 7:46-51.
11 Jizọs hụrụ ihu abụọ nke ndị na-agbalị ịmata ya n’ọnyà. O kweghị ka ndị na-emegide ya duba ya n’ịrụ ụka na-enweghị isi. Otú ọ dị, mgbe o kwesịrị ekwesị, ọ zara ha okwu n’ụzọ dị mkpirikpi ma dị irè site n’ikwupụta ụkpụrụ, iji ihe atụ eme ihe, ma ọ bụ site n’ihota akụkụ Akwụkwọ Nsọ. (Matiu 12:38-42; 15:1-9; 16:1-4) N’oge ndị ọzọ, Jizọs gbachiri nnọọ nkịtị mgbe o doro ya anya na ọ dịghị ezigbo ihe ga-esi na nke ahụ pụta.—Mak 15:2-5; Luk 22:67-70.
12. Ọbụna mgbe e ji olu ike gwa Jizọs okwu, olee otú o si nyere ndị mmadụ aka?
12 Mgbe ụfọdụ, ndị ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-achịkwa ji olu ike gwa Jizọs okwu. Mgbe nke ahụ mere, ọ chịkwara onwe ya, ọbụnakwa jiri ike Chineke nyere ya mee ka ha nwere onwe ha. (Mak 1:23-28; 5:2-8, 15) Ọ bụrụ na ụfọdụ mmadụ ewee iwe ma jiri olu ike gwa anyị okwu mgbe anyị nọ n’ozi, ọ ga-adịkwa anyị mkpa ịchịkwa onwe anyị, anyị kwesịkwara ịgbalị iji obiọma na akọ mee ihe banyere ọnọdụ dị otú ahụ.—Ndị Kọlọsi 4:6.
N’ime Ezinụlọ
13. Mgbe ụfọdụ, olee ihe mere ndị mmadụ ji emegide onye òtù ezinụlọ ha nke malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible?
13 Mkpa ọ dị ka ụmụazụ Jizọs na-achịkwa onwe ha na-apụtakarị ìhè karịsịa n’ime ezinụlọ. Ọ na-agụsi onye eziokwu Bible nweworo mmetụta miri emi n’obi ya agụụ ike ka o nweekwa mmetụta dị otú ahụ n’ebe ndị ezinụlọ ya nọ. Ma dị ka Jizọs kwuru, ndị òtù ezinụlọ pụrụ ịdị na-ebu iro. (Matiu 10:32-37; Jọn 15:20, 21) E nwere ihe dịgasị iche pụrụ ịkpata nke a. Dị ka ihe atụ, ebe ọ bụ na ozizi Bible pụrụ inyere anyị aka ịghọ ndị na-eme ihe n’eziokwu, ndị na-arụ ọrụ dịịrị ha, na ndị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù, Akwụkwọ Nsọ na-akụzikwara anyị na, n’ọnọdụ ọ bụla anyị nọ na ya, ibu ọrụ bụ́ isi anyị nwere bụ ime uche Onye Okike anyị. (Eklisiastis 12:1, 13; Ọrụ 5:29) Onye òtù ezinụlọ anyị nke chere na iguzosi ike n’ihe anyị nye Jehova na-ebelatatụ ikike o nwere pụrụ iwe iwe. Mgbe anyị na-elebara ọnọdụ dị otú ahụ anya, lee ka o si dị mkpa anyị ịgbaso ihe nlereanya Jizọs nke ịchịkwa onwe ya!—1 Pita 2:21-23; 3:1, 2.
14-16. Gịnị mere ụfọdụ ndị na-emegidebu ndị òtù ezinụlọ ha ji gbanwee?
14 Ọtụtụ ndị na-ejere Jehova ozi ugbu a nweburu ndị di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ndị òtù ezinụlọ ndị ọzọ megidere mgbanwe ndị ha nọ na-eme mgbe ha malitere ịmụ Bible. Ọ pụrụ ịbụ na ndị ahụ na-emegide ha nụrụ ihe ndị na-ezighị ezi banyere Ndịàmà Jehova, ikekwe na-atụkwa egwu na ha ga-ewebata ihe ọjọọ n’ezinụlọ. Gịnị mere ha ji gbanwee àgwà ha? Ihe kpatara ọtụtụ n’ime ha bụ ezigbo ihe nlereanya nke ndị ahụ kwere ekwe setịpụrụ. N’ihi na onye nke ahụ kwere ekwe tinyere ndụmọdụ Bible n’ọrụ—na-agachi nzukọ Ndị Kraịst anya ma na-ekere òkè n’ozi ka ọ na-arụ ọrụ dịịrị ya n’ezinụlọ ma na-achịkwa onwe ya n’agbanyeghị okwu mkparị—mmegide ezinụlọ na-ebelatatụ mgbe ụfọdụ.—1 Pita 2:12.
15 Ọ pụkwara ịbụ na onye na-emegide onye ahụ kwere ekwe ekweghị ka e jiri Bible kọwaara ya ihe ndị na-edoghị ya anya n’ihi ịkpọasị na-enweghị isi o nwere ma ọ bụ n’ihi mpako. Nke ahụ bụ ihe otu nwoke bi na United States bụ́ onye sịrị na ya hụrụ mba ya n’anya nke ukwuu mere. N’otu oge, mgbe nwunye ya gara mgbakọ, ọ chịkọọrọ ákwà ya nile pụọ n’ụlọ. N’oge ọzọkwa, o weere égbè pụọ ma yie egwu na ya ga-agbagbu onwe ya. Ọ na-ekwu na ọ bụ okpukpe nwunye ya kpatara àgwà iberibe ọ bụla ya kpara. Ma nwunye ya gbalịsiri ike ịnọgide na-etinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ. Afọ 20 ka nwunye ya ghọsịrị otu n’ime Ndịàmà Jehova, ya onwe ya ghọkwara. N’Albania, otu nwanyị were iwe n’ihi na nwa ya nwanyị sooro Ndịàmà Jehova mụọ Bible, e mesịakwa mee ya baptizim. Nwanyị ahụ bibiri Bible nwa ya nwanyị ugboro 12. Mgbe ahụ, otu ụbọchị, o mepere Bible ọhụrụ nwa ya nwanyị hapụrụ n’elu tebụl. Ọ dabara na ebe Bible ahụ mepere bụ na Matiu 10:36, nwanyị ahụ ghọtakwara na ihe e kwuru n’ebe ahụ metụtara ya. Ka o sina dị, n’ihi nchegbu o nwere maka nwa ya, nwanyị ahụ dururu ya ebe ya na Ndịàmà ndị ọzọ ga-aba ụgbọ mmiri iji gaa mgbakọ n’Ịtali. Mgbe nwanyị ahụ hụrụ ịhụnanya, mmakụ na ihu ọchị nke ìgwè ahụ ma nụ ọchị ha ji obi ụtọ na-achị, obi ya malitere ịgbanwe. Obere oge ka nke a gasịrị, o kwetara ịmụ Bible. Taa, ọ na-agbalịsi ike inyere ndị na-emegide ndị ezinụlọ ha mgbe ha malitere ịmụ Bible aka.
16 N’otu oge, otu nwoke ji mma na-abara nwunye ya mba, jirikwa oké iwe na-ebo ya ebubo ka nwunye ya na-eru Ụlọ Nzukọ Alaeze nso. Nwunye ya ji olu ọma zaa ya, sị: “Bata n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma jiri anya gị hụrụ.” O mere otú ahụ, ka oge na-agakwa, ọ ghọrọ okenye ọgbakọ.
17. Ọ bụrụ na esemokwu ebilite n’ezinụlọ Ndị Kraịst, ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ dị aṅaa pụrụ inye aka?
17 Ya bụrụgodị na mmadụ nile nọ n’ezinụlọ gị bụ Ndị Kraịst, a pụrụ inwe oge esemokwu ga-adị n’ezinụlọ, ọbụnakwa ruo n’ókè nke na ụfọdụ na-agwa ibe ha okwu ọjọọ n’ihi ezughị okè mmadụ. E kwesịrị ịrịba ama na a dụrụ Ndị Kraịst oge ochie nọ n’Efesọs ọdụ, sị: “Ka e Ndị Efesọs 4:31) Ihe àmà na-egosi na ebe Ndị Kraịst nọ n’Efesọs bi, ezughị okè nke ha, nakwa n’ọnọdụ ụfọdụ, ụdị ndụ ha biburu, metụtara ha. Olee ihe ga-enyere ha aka ịgbanwe? Ọ dị ha mkpa ịbụ ndị ‘e mere ka ha dị ọhụrụ n’ikike nke na-akwali uche ha.’ (Ndị Efesọs 4:23) Ka ha na-amụ Okwu Chineke, na-atụgharị uche n’otú o kwesịrị isi metụta ndụ ha, na-eso Ndị Kraịst ibe ha na-akpakọrịta ma na-ekpesi ekpere ike, mkpụrụ nke mmụọ Chineke ga na-apụtakwu ìhè ná ndụ ha. Ha ga-amụta ‘imere ibe ha ebere, na-enwe obi ọmịiko, na-agbaghara ibe ha kpam kpam dị nnọọ ka Chineke gbaghakwaara ha kpam kpam site na Kraịst.’ (Ndị Efesọs 4:32) N’agbanyeghị ihe ndị ọzọ pụrụ ime, ọ dị anyị mkpa ịchịkwa onwe anyị, inwe obiọma, inwe ọmịiko, na ịdị na-agbaghara ndị ọzọ. N’ezie, anyị agaghị ‘eji ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ.’ (Ndị Rom 12:17, 18) Igosipụta ezi ịhụnanya n’iṅomi Chineke bụ ihe kwesịrị ekwesị ime mgbe nile.—1 Jọn 4:8.
wepụ obi ilu na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị n’ebe unu nọ tinyere ihe ọjọọ nile.” (Ndụmọdụ Dịịrị Ndị Kraịst Nile
18. N’ihi gịnị ka ndụmọdụ dị na 2 Timoti 2:24 ji kwesị ekwesị maka okenye nọ n’Efesọs oge ochie, oleekwa otú ọ pụrụ isi baara Ndị Kraịst nile uru?
18 Ndụmọdụ nke ịnọgide ‘na-achịkwa onwe anyị n’ọnọdụ ọjọọ’ metụtara Ndị Kraịst nile. (2 Timoti 2:24) Ma, ọ bụ Timoti ka e bu ụzọ nye ya, bụ́ onye ndụmọdụ ahụ dị mkpa mgbe ọ na-eje ozi dị ka okenye n’Efesọs. Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ e nwere ebe ahụ ezoghị nnọọ ọnụ n’ikwupụta echiche nke aka ha, ha nọkwa na-ezi ozizi na-ezighị ezi. N’ihi na ha aghọtachaghị ihe mere e ji nye Iwu Mozis, ha amataghị mkpa ọ dị inwe okwukwe, ịhụnanya na ezi akọ na uche. Mpako kpatara esemokwu nke mere ka ha na-arụrịta ụka, n’aghọtaghị isi ihe dị n’ozizi Kraịst na ịdị mkpa nke nsọpụrụ Chineke. Iji dozie nsogbu a, Timoti ga-ejigidesi eziokwu Akwụkwọ Nsọ ike ma dị nro ka ọ na-emeso ụmụnna ya ihe. Dị ka ndị okenye nke oge a, ọ maara na ìgwè atụrụ ahụ abụghị nke ya nakwa na ya kwesịrị imeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ ga-akwalite ịhụnanya na ịdị n’otu Ndị Kraịst.—Ndị Efesọs 4:1-3; 1 Timoti 1:3-11; 5:1, 2; 6:3-5.
19. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị nile ‘na-achọ umeala n’obi’?
19 Chineke na-agba ndị ya ume ‘ịchọ umeala n’obi.’ (Zefanaịa 2:3) Okwu Hibru maka “umeala n’obi” na-egosi ọnọdụ uche nke na-enyere mmadụ aka iji ndidi die mmerụ ahụ́, n’enweghị mgbakasị ahụ́, n’emegwaraghịkwa. Ka anyị na-arịọsi Jehova arịrịọ ike inyere anyị aka ka anyị wee nwee ike ịchịkwa onwe anyị na ịnọchite anya ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọbụna n’ọnọdụ ndị tara akpụ.
Gịnị Ka Ị Mụtara?
• Mgbe a gwara gị okwu mkparị, olee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị pụrụ inyere gị aka?
• Gịnị mere Sọl ji na-akparị mmadụ?
• Olee otú ihe nlereanya Jizọs si enyere anyị aka imeso ụdị mmadụ nile ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị?
• Uru ndị dị aṅaa pụrụ ịbịa site n’anyị ịkwa ire anyị nga n’ebe obibi?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 26]
N’agbanyeghị ụdị onye Sọl bụ, Ananaịas ji obiọma mesoo ya ihe
[Foto dị na peeji nke 29]
Onye Kraịst na-arụ ọrụ dịịrị ya n’ezinụlọ pụrụ ime ka mmegide ezinụlọ belatatụ
[Foto dị na peeji nke 30]
Ndị Kraịst na-akwalite ịhụnanya na ịdị n’otu