Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-eso Ndị Ị Hụrụ n’Anya Na-ekwurịta Okwu?

Ị̀ Na-eso Ndị Ị Hụrụ n’Anya Na-ekwurịta Okwu?

Ị̀ Na-eso Ndị Ị Hụrụ n’Anya Na-ekwurịta Okwu?

AKWỤKWỌ akụkọ Poland a na-ebipụta kwa izu bụ́ Polityka kwuru, sị: “Ikike anyị nwere iso ndị anyị hụrụ n’anya na-ekwurịta okwu na-ebelata n’ụzọ pụtara ìhè.” Na United States, a na-eme atụmatụ na ndị di na nwunye na-eji nanị minit isii enwe nkwurịta okwu bara uru n’ụbọchị. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-eche na ọkara nke nkewa na alụkwaghịm nile e nwere bụ n’ihi mbelata a a na-enwe ná nkwurịta okwu.

Gịnị banyere nkwurịta okwu n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha? Akwụkwọ ahụ a kpọtụrụ aha n’elu na-ekwu na ọtụtụ mgbe, “ọ na-abụ ịgba ajụjụ kama ịbụ nkwurịta okwu, dị ka: Kedụ maka ụlọ akwụkwọ? Olee maka ndị enyi gị?” Akwụkwọ ahụ na-ajụ, sị: “Olee otú ụmụ anyị ga-esi mụta otú e si amalite inwe mmekọrịta ruru n’obi?”

Ebe ọ bụ na nkà nkwurịta okwu dị mma anaghị abịa n’onwe ya, olee otú anyị pụrụ isi mee ka ikike nkwurịta okwu anyị kakwuo mma? Onye Kraịst na-eso ụzọ bụ́ Jems nyere anyị ndụmọdụ dị mkpa, sị: “Onye ọ bụla aghaghị ịdị ngwa n’ịnụ ihe, ghara ịdị ngwa n’ikwu okwu, ghara ịdị ngwa n’inwe ọnụma.” (Jems 1:19) Ee, iji nwee nkwurịta okwu na-ewuli elu, ọ dị mkpa ka anyị na-ege ntị nke ọma ma ghara iji enweghị ndidi nabiri mmadụ okwu n’ọnụ ma ọ bụ kwubie ihe onye ahụ na-achọ ikwu n’ekweghị ya kwuchaa. Zere nkatọ n’ihi na ọ pụrụ nnọọ ime ka nkwurịta okwu nyụọ ka ọkụ. Ọzọkwa, Jizọs jiri akọ jụọ ajụjụ, ọ bụghị iji gbaa onye ọ na-agwa okwu ajụjụ, kama ọ bụ iji dọpụta ihe dị onye ahụ n’obi na iji wusie mmekọrịta ya na onye ahụ ike.—Ilu 20:5; Matiu 16:13-17; 17:24-27.

N’itinye ụkpụrụ ndị dị mma a na-achọta n’ime Bible n’ọrụ, bute ụzọ n’iso ndị ị hụrụ n’anya na-ekwurịta okwu. Nke ahụ pụrụ ịrụpụta mmekọrịta na-ekpo ọkụ nke ga-adịgide ruo ọtụtụ afọ—ọbụna ruo ogologo ndụ gị nile.