Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Adala Mbà n’Ime Ihe Dị Mma

Adala Mbà n’Ime Ihe Dị Mma

Adala Mbà n’Ime Ihe Dị Mma

PITA ONYEOZI gbara ume, sị: “Nọgidenụ na-eme omume dị mma n’etiti mba nile.” (1 Pita 2:12) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “mma” na-ezo aka n’ihe “mara mma, dị mma, dị ùgwù, magburu onwe ya.” N’oge anyị a, ọ pụrụ iyi ihe ezi uche na-adịtụghị na ya ịtụ anya na mmadụ nile ga na-akpa àgwà dị mma ma ọ bụ nke dị ùgwù. Otú ọ dị, taa, ndị Jehova n’ozuzu enwewo ihe ịga nke ọma n’itinye agbamume Pita n’ọrụ. N’ezie, a maara ha n’ụwa nile n’ihi omume ha dị mma.

Nke a dị ịrịba ama karịsịa mgbe anyị na-atụle nrụgide na nchegbu ndị anyị na-eche ihu ‘n’oge ndị a pụrụ iche nke siri ike obibi.’ (2 Timoti 3:1) Ọnwụnwa bụ akụkụ nke ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị, mmegide abụghịkwa ihe ọhụrụ nye Ndị Kraịst. Tụkwasị na nke ahụ, ọnwụnwa ụfọdụ na-anọru nwa oge, ebe ndị ọzọ na-anọgide n’akwụsịghị akwụsị, ọbụna na-akawanye njọ. Ka o sina dị, Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “Ka anyị ghara ịda mbà n’ime ihe dị mma, n’ihi na mgbe oge ya ruru anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.” (Ndị Galeshịa 6:9) Olee nnọọ otú ọ pụrụ isi kwe omume ime—nakwa ịnọgide na-eme—ihe dị mma mgbe a na-eche ọnwụnwa ndị na-agbawa obi na ibu iro na-adịghị akwụsị akwụsị ihu?

Ihe Ndị Pụrụ Inye Aka n’Ime Ihe Dị Mma

Ime ihe ‘dị mma, dị ùgwù, na nke magburu onwe ya’ bụ nnọọ ihe na-esite na mmadụ ime, àgwà na-esite n’obi. N’ihi ya, ịnọgide na-eme omume dị mma mgbe anyị na-eche ọnwụnwa na ihe isi ike ihu, abụghị ihe na-eme ná ndapụta, kama ọ na-esite n’ịgbaso ụkpụrụ Bible kwa ụbọchị na itinye ha n’ọrụ n’akụkụ nile nke ndụ anyị. Olee ihe ụfọdụ pụrụ inye aka n’akụkụ a. Tụlee ihe ndị na-esonụ.

Nwee ụzọ iche echiche Kraịst. Ọ na-achọ ịdị umeala n’obi iji die ihe pụrụ iyi ka ọ̀ bụ ihe na-ezighị ezi. Onye na-ebuli onwe ya elu eyighị ka ọ̀ ga-edi mmeso ọjọọ. Otú ọ dị, Jizọs “wedara onwe ya n’ala wee rube isi ruo ọnwụ.” (Ndị Filipaị 2:5, 8) Site n’iṅomi ya, ‘ike agaghị agwụ anyị ma ọ bụ anyị adaa mbà’ n’ije ozi anyị dị nsọ. (Ndị Hibru 12:2, 3) Jiri obi umeala na-erube isi site n’iji ọchịchọ obi na-ekwenyere ndị na-edu ndú n’ọgbakọ gị. (Ndị Hibru 13:17) Mụta ile ndị ọzọ anya dị ka hà “ka” gị, na-ebute ihe ndị metụtara ha ụzọ.—Ndị Filipaị 2:3, 4

Cheta na Jehova hụrụ gị n’anya. Anyị aghaghị ikweta na Jehova “dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ọ na-eche banyere anyị n’ezie ma chọọ ka anyị nweta ndụ ebighị ebi. (1 Timoti 2:4; 1 Pita 5:7) Ịdị na-echeta na ọ dịghị ihe pụrụ imebi ịhụnanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ ga-enyere anyị aka ịghara ịda mbà n’oge ọnwụnwa.—Ndị Rom 8:38, 39.

Tụkwasị Jehova obi n’ụzọ zuru ezu. Ịtụkwasị Jehova obi dị mkpa, karịsịa mgbe ọnwụnwa yiri ka ọ̀ bụ nke na-adịghị akwụsị akwụsị ma ọ bụ nke na-eyi ndụ egwu. Anyị aghaghị inwe ntụkwasị obi zuru ezu na Jehova agaghị ekwe ka ọnwụnwa ‘gabigara ihe anyị pụrụ ịnagide’ bịara anyị, nakwa na ọ ga-emere anyị “ụzọ mgbapụ” mgbe nile. (1 Ndị Kọrint 10:13) Anyị pụrụ ọbụna inwe obi ike mgbe e ji ọnwụ yie anyị egwu ma ọ bụrụ na anyị tụkwasịrị Jehova obi.—2 Ndị Kọrint 1:8, 9.

Nọgidesie ike n’ekpere. Ekpere sitere n’obi dị oké mkpa. (Ndị Rom 12:12) Ekpere e ji ezi obi kpee bụ otu n’ime ụzọ ndị anyị si abịaru Jehova nso. (Jems 4:8) Site n’ahụmahụ onwe onye, anyị na-aghọta na “n’agbanyeghị ihe ọ bụ nke anyị na-arịọ . . . , ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) Ọ bụrụ na Jehova ekwe ka ọnwụnwa nọgide dị ka ụzọ isi lee iguzosi ike n’ezi ihe anyị ule, anyị na-ekpe ekpere ka o nyere anyị aka idi ya. (Luk 22:41-43) Ekpere na-akụziri anyị na anyị anọtụghị nanị anyị, nakwa na site na Jehova ịnọ anyị n’akụkụ, anyị ga-anọgide na-enwe mmeri.—Ndị Rom 8:31, 37.

Ọrụ Ọma —‘Ihe Na-akpata Inye Otuto na Nsọpụrụ’

Site n’oge ruo n’oge, a na-eme ka Ndị Kraịst nile “ruo újú site n’ọnwụnwa dị iche iche.” N’agbanyeghị nke ahụ, anyị agaghị “ada mbà n’ime ihe dị mma.” Mgbe ị na-eche nrụgide ihu, nweta ume site n’ịghọta na ikwesị ntụkwasị obi gị ga-abụrịrị “ihe na-akpata inye otuto na ịdị ebube na nsọpụrụ.” (1 Pita 1:6, 7) Jiri ndokwa ime mmụọ nile Jehova mere iji wulie gị elu mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Mgbe nlebara anya dị gị mkpa, gakwuru ndị na-eje ozi dị ka ndị ọzụzụ atụrụ, ndị nkụzi na ndị na-enye ndụmọdụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ọrụ 20:28) Na-agachi nzukọ nile nke ọgbakọ anya, bụ́ ndị ‘na-akpali anyị ịhụ ndị ọzọ n’anya na ịrụ ezi ọrụ.’ (Ndị Hibru 10:24) Ịhazi ịdị na-agụ Bible kwa ụbọchị na inwe ọmụmụ ihe onwe onye ga-enye aka mee ka ị mụrụ anya ma gbasie ike n’ụzọ ime mmụọ; ikerechi òkè anya n’ozi Ndị Kraịst ga-emekwa otu ihe ahụ.—Abụ Ọma 1:1-3; Matiu 24:14.

Ka ị na-enwetakwu ịhụnanya na nlekọta Jehova, otú ahụ ka ọ ga-abụkwu ọchịchọ gị ịdị “na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ọrụ.” (Taịtọs 2:14) Cheta na, “onye tachiworo obi ruo ọgwụgwụ bụ onye a ga-azọpụta.” (Matiu 24:13) Ee, kpebisie ike ‘ịghara ịda mbà n’ime ihe dị mma’!

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

Anyị aghaghị inwe ntụkwasị obi zuru ezu na Jehova agaghị ekwe ka ọnwụnwa ‘gabigara ihe anyị pụrụ ịnagide’ bịara anyị, nakwa na ọ ga-emere anyị “ụzọ mgbapụ” mgbe nile

[Foto ndị dị na peeji nke 30]

Iji ọrụ n’aka n’ọrụ ọchịchị Chineke pụrụ inye aka kwadebe anyị iche ọnwụnwa ihu