Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Mgbe ha nụrụ na Pita bụ́ onye a tụrụ mkpọrọ nọ n’ọnụ ụzọ, gịnị mere ndị na-eso ụzọ ji kwuo, sị: “Ọ bụ mmụọ ozi ya”?—Ọrụ 12:15.

N’ihie ụzọ, ọ pụrụ ịbụ na ndị ahụ na-eso ụzọ chere na otu mmụọ ozi na-anọchite anya Pita guzo n’ọnụ ụzọ ámá. Tụlee ihe gbara amaokwu a gburugburu.

Herọd, bụ́ onye gburu Jems, nwụchiri Pita. N’ihi ya, ndị na-eso ụzọ ahụ nwere ezi ihe mere ha ga-eji kwere na a ga-egbu Pita. N’ịbụ onye e kere ụdọ ígwè, ìgwè ndị agha anọ dị mmadụ anọ anọ bụ́ ndị na-agbanwerịta onwe ha chere Pita bụ́ onye a tụrụ mkpọrọ nche. Ya mere, n’otu abalị, site n’aka otu mmụọ ozi, a tọhapụrụ ma kpọpụta ya n’ụlọ mkpọrọ n’ụzọ ọrụ ebube. Mgbe Pita mesịrị ghọta ihe na-emenụ, o kwuru, sị: “Ugbu a ka m maara n’ezie na Jehova zitere mmụọ ozi ya wee gbapụta m n’aka Herọd.”—Ọrụ 12:1-11.

Pita gara ozugbo n’ụlọ Meri, nne Jọn Mak, bụ́ ebe ọtụtụ ndị na-eso ụzọ zukọrọ. Mgbe ọ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ nke ọnụ ụzọ ámá, otu nwa agbọghọ bụ́ odibo aha ya bụ Roda gara ịza aka a kụrụ. Mgbe ọ ghọtara na ọ bụ olu Pita, ọ gbaara ọsọ ịga gwa ndị ọzọ n’ebughị ụzọ mepeere ya ụzọ! Na mbụ, ndị na-eso ụzọ ahụ apụghị ikweta na Pita nọ n’ọnụ ụzọ ámá. Kama nke ahụ, n’ihie ụzọ ha chere, sị: “Ọ bụ mmụọ ozi ya.”—Ọrụ 12:12-15.

Ndị na-eso ụzọ hà kweere na e gbuwo Pita nakwa na ọ bụ mmụọ ya nke na-enweghịzi anụ ahụ́ nọ n’ọnụ ụzọ ámá? O yitụghị ka ha ga-eche otú ahụ, n’ihi na ndị na-eso ụzọ Jizọs maara eziokwu Akwụkwọ Nsọ banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ—na ha “adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5, 10) Mgbe ahụ, gịnị pụrụ ịbụ ihe ndị na-eso ụzọ bu n’uche mgbe ha kwuru, sị: “Ọ bụ mmụọ ozi ya”?

Ndị na-eso ụzọ Jizọs maara na kemgbe ụwa, ndị mmụọ ozi enyeworo ndị Chineke aka. Dị ka ihe atụ, Jekọb kwuru banyere “mmụọ ozi ahụ nke na-agbapụta m n’aka ihe ọjọọ nile.” (Jenesis 48:16) N’ikwukwa banyere nwatakịrị nọ n’etiti ha, Jizọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Hụnụ na unu eledaghị otu n’ime ndị a dị nta anya; n’ihi na asị m unu na ndị mmụọ ozi ha n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke nọ n’eluigwe mgbe nile.”—Matiu 18:10.

N’ụzọ na-akpali mmasị, nsụgharị Bible bụ́ Young’s Literal Translation of the Holy Bible ji okwu ahụ bụ́ agʹge·los (“mmụọ ozi”) mee ihe dị ka “onye ozi.” O yiri ka è nwere nkwenkwe dị n’etiti ndị Juu ụfọdụ nke bụ́ na ohu Chineke nke ọ bụla nwere mmụọ ozi nke ya— ya bụ, “mmụọ ozi na-echebe ya.” N’eziokwu, echiche a adabereghị kpọmkwem n’Okwu Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ pụrụ ịbụ na mgbe ndị na-eso ụzọ kwuru, sị, “Ọ bụ mmụọ ozi ya,” ha nọ na-eche na ọ bụ mmụọ ozi nke na-anọchite anya Pita guzo n’ọnụ ụzọ ámá.