Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Arụmụka Bilitere n’Etiti Di na Nwunye

Mgbe Arụmụka Bilitere n’Etiti Di na Nwunye

Mgbe Arụmụka Bilitere n’Etiti Di na Nwunye

Ọ DỊGHỊ di ma ọ bụ nwunye isi zuru okè esemokwu di na nwunye na-atọ ụtọ, ma, ọ bụ ihe a na-ahụkarị. Ọ na-amalitekarị mgbe di ma ọ bụ nwunye gwara onye ibe ya okwu wutere ya. Olu na-ala elu, iwe arịakwa elu, na-akpata oké arụmụka a na-eji okwu ọjọọ arụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, onye nke ọ bụla arịkpuo ka eju, n’adịghị onye nke na-ekwe atụpụrụ ibe ya ọnụ. Ka oge ụfọdụ gasịrị, obi na-ajụrụ ha, onye nke ọ bụla arịọkwa ibe ya mgbaghara. Udo na-adịghachi—ma ọ dịghị ihe ọzọ, ruo mgbe arụmụka ọzọ ga-esu.

E jirila arụmụka di na nwunye mee ihe ọchị ọtụtụ mgbe ma jiri ya mee ọtụtụ ihe nkiri telivishọn, ma esemokwu di na nwunye abụtụghị ihe ọchị. N’ezie, otu ilu Bible na-ekwu, sị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha.” (Ilu 12:18) Ee, okwu ọjọọ pụrụ ịnọgide na-enye onye a gwara ya nsogbu n’obi ruo ogologo oge ka esemokwu bisịrị. Arụmụka pụdịrị iduga n’ime ihe ike.—Ọpụpụ 21:18.

N’ezie, n’ihi ezughị okè mmadụ, mgbe ụfọdụ, a pụghị izere nsogbu n’alụmdi na nwunye. (Jenesis 3:16; 1 Ndị Kọrint 7:28) N’agbanyeghị nke ahụ, e kwesịghị ile inwe oké esemokwu mgbe mgbe anya dị ka ihe na-adịghị ihe o mere. Ndị ọkachamara ekwuwo na ise okwu mgbe nile na-eme ka ọ dịrị di na nwunye mfe karị ịgba alụkwaghịm. N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ka gị na di ma ọ bụ nwunye gị mụta idozi arụmụka n’udo.

Ịtụle Ọnọdụ Ahụ

Ọ bụrụ na gị na di ma ọ bụ nwunye gị na-arụ ụka mgbe nile, gbalịa ịchọpụta ma è nwere otu ụzọ o si amalite. Gịnị na-emekarị mgbe gị na di ma ọ bụ nwunye gị na-ekwekọrịtaghị n’ihe? Ọ̀ na-adịrị unu mfe ịhapụ ihe a na-ekwu ma malite ịkparị ibe unu na iborịta ebubo? Ya bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị pụrụ ime?

Ihe mbụ ị ga-eme bụ iji obi ghere oghe tụlee otú gị onwe gị pụrụ isi na-atụnye ụtụ ná nsogbu ahụ. À na-akpasu gị iwe ngwa ngwa? È ji ịrụ ụka mara gị? Olee ihe di ma ọ bụ nwunye gị ga-ekwu banyere gị n’akụkụ a? Ajụjụ nke ikpeazụ a dị mkpa ka ị tụlee ya, n’ihi na ihe ị ghọtara dị ka ịrụ ụka pụrụ ịdị iche n’ihe di ma ọ bụ nwunye gị ghọtara.

Dị ka ihe atụ, ka e were ya na di gị ma ọ bụ nwunye gị anaghị ekwukarị okwu, ebe gị onwe gị na-ekwu ihe otú ọ dị gị n’obi ma na-eji oké mmetụta ekwu ya. I nwere ike ikwu, sị: “Mgbe m na-etolite, ọ bụ otú ahụ ka mmadụ nile n’ezinụlọ anyị si ekwurịta okwu. Ọ bụghị ịrụ ụka!” Ma eleghịkwa anya, ọ bụghị ịrụ ụka n’anya gị. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na di ma ọ bụ nwunye gị na-ele ihe i chere na ọ bụ ezoghị ọnụ anya dị ka arụmụka na-akpasu iwe na nke na-akpata esemokwu. Nanị ịmata na gị na di ma ọ bụ nwunye gị nwere ụzọ dịrịta iche unu si ekwupụta echiche unu pụrụ igbochi nghọtahie.

Ọzọkwa, cheta na ọ bụghị mgbe nile ka arụmụka na-agụnye iti mkpu. Pọl degaara Ndị Kraịst akwụkwọ, sị: “Ka e wepụ . . . iti mkpu na okwu mkparị n’ebe unu nọ.” (Ndị Efesọs 4:31) “Iti mkpu” na-ezo aka n’olu ịla elu, ebe “mkparị” na-ezo aka n’ụdị okwu e kwuru. Ọ bụrụ na e si otú ahụ lee ya anya, ọbụna okwu a gbanyere n’izu pụrụ ịbụ ịrụ ụka ma ọ bụrụ na ọ na-akpasu iwe ma ọ bụ na-eweda onye a gwara ya ala.

N’iburu ihe ndị e kwuru n’elu n’uche, cheghachi echiche banyere ihe ị na-eme mgbe gị na di ma ọ bụ nwunye gị na-ekwekọrịtaghị n’ihe. Ị̀ na-ekwesi olu ike? Dị ka anyị hụrụla, ihe ga-abụ azịza ziri ezi nye ajụjụ ahụ ga-adabere n’otú di ma ọ bụ nwunye gị si ele ihe anya. Kama ileghara echiche di ma ọ bụ nwunye gị anya ma kpọọ ya onye na-atụchakarị ihe, gbalịa ịhụ onwe gị otú o si ahụ gị, meekwa mgbanwe n’ebe ndị ọ dị mkpa. Pọl dere, sị: “Ka onye ọ bụla nọgide na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.”—1 Ndị Kọrint 10:24.

“Lezienụ Anya Otú Unu Si Aṅa Ntị”

Jizọs kwuru ihe ọzọ dị mkpa ime mgbe arụmụka bilitere mgbe ọ sịrị: “Lezienụ anya otú unu si aṅa ntị.” (Luk 8:18) N’ikwu eziokwu, ihe Jizọs na-ekwu banyere ya abụghị nkwurịta okwu n’alụmdi na nwunye. Ma, ụkpụrụ ahụ metụtara alụmdi na nwunye. Ị̀ na-aṅa di ma ọ bụ nwunye gị ntị nke ọma? Ị̀ na-aṅadị ya ntị aṅa? Ka ị̀ na-anapụ ya okwu n’ọnụ ma gwa ya nnọọ ihe ọ ga-eme banyere nsogbu ị na-aghọtabeghịdị nke ọma? Bible na-ekwu, sị: “Onye na-azaghachi okwu tupu ọ nụ, uche gbagọrọ agbagọ na ọnọdụ ihere ka ọ bụụrụ ya.” (Ilu 18:13) N’ihi ya, mgbe gị na di ma ọ bụ nwunye gị na-ekwekọrịtaghị n’ihe, ọ dị unu mkpa ikwurịta ya ma ṅaa onwe unu ntị n’ezie.

Kama ileda echiche di ma ọ bụ nwunye gị anya, gbalịsie ike igosi “mmetụta maka onye ọzọ.” (1 Pita 3:8) Na Grik mbụ, ihe bụ́ isi okwu a pụtara bụ iso onye ọzọ ata ahụhụ. Ọ bụrụ na ihe na-ewute nnọọ di ma ọ bụ nwunye gị, o kwesịkwara iwute gị. Gbalịsie ike ile ihe anya otú o si ele ya.

Ihe àmà na-egosi na nwoke ahụ na-atụ egwu Chineke bụ́ Aịzik mere otú ahụ. Bible na-agwa anyị na otu okwu ezinụlọ nke metụtara nwa ha nwoke bụ́ Jekọb wutere nwunye ya, bụ́ Ribeka, nke ukwuu. Ọ gwara Aịzik, sị: “Ike ndụ m agwụsịwo m site n’ihu ụmụ ndị inyom Het: ọ bụrụ na Jekọb lụrụ nwunye sitere n’ụmụ ndị inyom Het, dị ka ndị a, bụ́ site n’ụmụ ndị inyom ala nke a, uru gịnị ka ndụ baara m?”—Jenesis 27:46.

N’ikwu eziokwu, n’ihi nchegbu Ribeka nwere, o yiri ka ò kwubigara okwu ókè. A sị ka e kwuwe, ike ndụ ọ̀ gwụrụ ya n’ezie? Ọ̀ ga-akara ya mma n’ezie ịnwụ kama nwa ya nwoke ịlụ otu n’ime ụmụ ndị inyom Het? O yighị otú ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Aịzik eledaghị mmetụta Ribeka anya. Kama nke ahụ, Aịzik hụrụ na e nwere ezi ihe kpatara nchegbu Ribeka, o mekwara ihe maka ya. (Jenesis 28:1) Mee otú ahụ mgbe ọzọ ihe na-echegbu di ma ọ bụ nwunye gị. Kama ileghara ya anya dị ka ihe na-enweghị ihe ọ bụ, ṅaa di ma ọ bụ nwunye gị ntị, kwanyere echiche ya ùgwù, ma meghachi omume n’ụzọ na-egosi ọmịiko.

Ịṅa Ntị na Ezi Uche

Otu ilu Bible na-ekwu, sị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.” (Ilu 19:11) Mgbe gị na di ma ọ bụ nwunye gị nọ n’oké arụmụka, ọ na-adị nnọọ mfe ịgwagwara ya okwu ọjọọ ọ bụla ọ gwara gị. Ma, mgbe mgbe, nanị ihe nke a na-eme bụ ime ka arụmụka ahụ rịa elu. N’ihi ya, mgbe ị na-aṅa di ma ọ bụ nwunye gị ntị, kpebisie ike ịnụ ọ bụghị nanị ihe ndị ọ na-ekwu kamakwa mmetụta ndị kpaliri ya ikwu ihe ndị ahụ. Nghọta dị otú ahụ ga-enyere gị aka ịhụ, ọ bụghị nanị ihe kpasuru gị iwe, kamakwa ihe kpatara nsogbu ahụ.

Dị ka ihe atụ, ka e were ya na nwunye gị gwara gị, sị, “Ọ dịtụghị mgbe ị na-anọnyere m!” Iwe nwere ike iwe gị, gị achọọkwa ịgọrọ isi gị site n’ịgwa ya nke bụ́ eziokwu n’egosighị mmetụta ọ bụla. Ị pụrụ ịza ya, sị, “N’ọnwa gara aga, mụ na gị ji otu ụbọchị zuru ezu nọọ!” Ma ọ bụrụ na ị tọọ ntị n’ala, ị pụrụ ịchọpụta na ihe nwunye gị na-ekwu n’ezie abụghị ka i nyekwuo ya minit ma ọ bụ awa. Kama nke ahụ, ọ pụrụ ịbụ na ọ na-agwa gị ka i mesighachi ya obi ike, na-agwa gị na ọ dị ya ka ị na-eleghara ya anya ma ghara ịhụ ya n’anya.

Ka e were ya na ị bụ nwunye, di gị ekwupụtakwa nchegbu ya banyere ihe ị zụrụ n’oge na-adịghị anya. Ya egosi na ihe i mere juru ya nnọọ anya ma jụọ gị, sị, “Olee otú ị ga-esi mefuo ego ha otú ahụ?” Ọ pụrụ ịbụ na ihe mbụ ga-agbata gị n’obi bụ ịgọpụrụ onwe gị site n’ịgwa ya ego ole ezinụlọ unu nwere ma ọ bụ site n’iji ihe ị zụrụ tụnyere otu n’ime ndị ọ zụrụ. Otú ọ dị, nghọta ga-enyere gị aka ịhụ na ọ pụrụ ịbụ na di gị anaghị ekwu banyere naịra na kobo. Kama nke ahụ, ọ pụrụ ịbụ na ihe na-ewe ya iwe bụ na ị gwaghị ya agwa tupu i kpebie ịzụ ihe dị oké ọnụ.

N’ezie, di na nwunye nke ọ bụla pụrụ inwe ụzọ dị iche ha ga-esi kpebie otú oge ha ga-eji na-anọ ga-aha na otú ha ga-esi na-ekpebi ihe ha ga-azụ. Isi ihe a na-ekwu bụ na mgbe e nwere echiche dịgasị iche banyere otu ihe, nghọta ga-eme ka iwe gị ghara ịdị ọkụ ma nyere gị aka ịmata isi ihe na-ese okwu. Kama ime ihe ọ bụla batara gị n’obi mgbe ahụ, gbasoo ndụmọdụ onye so dee Bible bụ́ Jems nke bụ́ “ịdị ngwa n’ịnụ ihe, ghara ịdị ngwa n’ikwu okwu, ghara ịdị ngwa n’inwe ọnụma.”—Jems 1:19.

Mgbe ị na-ekwu okwu, cheta na otú i si agwa di ma ọ bụ nwunye gị okwu dị mkpa. Bible na-ekwu na “ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ.” (Ilu 12:18) Mgbe gị na di ma ọ bụ nwunye gị dabara n’arụmụka, okwu gị ọ̀ na-emerụ ahụ́ ka ọ̀ na-agwọ agwọ? Okwu gị ọ̀ na-emechi ụzọ, ka ọ̀ na-emeghe ụzọ maka mkpezi? Dị ka anyị hụworo, nanị ihe iwe na ime ihe n’echeghị ya eche na-eme bụ ịkpata esemokwu.—Ilu 29:22.

Ọ bụrụ na arụmụka aghọọ égbè ọnụ, gbalịsikwuo ike ilegide anya n’ihe a na-ekwu. Lekwasị anya n’ihe kpatara arụmụka, ọ bụghị n’onye gị na ya na-arụ ụka. Ka mkpa gị bụrụ ihe ziri ezi karịa ịbụ onye ikpe laara. Kpachara anya ka okwu gị ghara ịkwanye ọkụ n’arụmụka ahụ. Bible na-ekwu, sị: “Okwu mwute na-akpali iwe.” (Ilu 15:1) Ee, ihe i kwuru na otú i si kwuo ya ga-ekpebi ma di ma ọ bụ nwunye gị ọ̀ ga-akwado gị ka ọ̀ ga-emegide gị.

Ka Mkpa Gị Bụrụ Imezi Ihe, Ọ Bụghị Imeri

Mgbe a na-eme ihe banyere arụmụka, e kwesịrị ilekwasị anya n’idozi nsogbu ahụ ọ bụghị n’imeri onye nke ọzọ. Olee otú unu pụrụ isi kpezie? Ihe ga-akasị mee ka o kwe omume bụ ịchọpụta na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, karịsịakwa, ndị di kwesịrị ibute ụzọ n’ime otú ahụ. Kama ịdị ngwa n’iru ná nkwubi okwu banyere nsogbu e nwere, gịnị ma i lee ya anya otú Jehova si ele ya? Kpegara ya ekpere, chọọkwa udo nke Chineke nke ga-eche obi gị na ike iche echiche gị nche. (Ndị Efesọs 6:18; Ndị Filipaị 4:6, 7) Gbalịsie ike ịchọpụta ihe ga-amasị onye nke ọzọ ọ bụghị nanị ihe ga-amasị gị.—Ndị Filipaị 2:4.

Ihe na-emekarị ka ọnọdụ ọjọọ ka njọ bụ ikwe ka mkpasu iwe na mmetụta a na-achịkwaghị achịkwa chịkwaa echiche na omume gị. N’aka nke ọzọ, mmadụ ikwe ka Okwu Chineke gbazie ya na-eduga n’udo, nkwekọrịta, na ngọzi Jehova. (2 Ndị Kọrint 13:11) N’ihi ya, ka “amamihe nke sitere n’elu” na-eduzi unu, na-akpanụ àgwà ndị na-ewetara Chineke otuto, ma ritenụ uru dị ka “ndị na-eme udo.”—Jems 3:17, 18.

N’ezie, mmadụ nile kwesịrị ịmụta idozi arụmụka n’udo, ọbụna ma ọ bụrụ na nke a ga-achọ ka ha hapụ ihe ndị na-amasị ha. (1 Ndị Kọrint 6:7) Tinyenụ nnọọ ndụmọdụ Pọl n’ọrụ nke bụ́ iwepụ “iwe, ihe ọjọọ, okwu mkparị, wepụkwanụ okwu rụrụ arụ n’ọnụ unu. . . . Yipụnụ ụdị mmadụ ochie ahụ na omume ya, ma yikwasịnụ onwe unu ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ.”—Ndị Kọlọsi 3:8-10.

Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ị ga-ekwu ihe ndị ị ga-emesị kwaara ụta. (Jems 3:8) Mgbe nke a mere, rịọ di ma ọ bụ nwunye gị mgbaghara. Nọgide na-eme mgbalị. Ka oge na-aga, gị na di ma ọ bụ nwunye gị ga-ahụ na otú unu si edozi arụmụka akala nnọọ mma.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 22]

Nzọụkwụ Atọ Dị Mkpa n’Ịkwụsị Arụmụka

• Ṅaa di ma ọ bụ nwunye gị ntị.—Ilu 10:19

• Kwanyere echiche ya ùgwù.—Ndị Filipaị 2:4

• Meghachi omume n’ụzọ na-egosi ịhụnanya.—1 Ndị Kọrint 13:4-7

[Igbe/Foto dị na peeji nke 23]

Ihe I Nwere Ike Ime Ugbu A

Jụọ di ma ọ bụ nwunye gị ajụjụ ndị dị n’okpuru ebe a ma ṅaa ntị n’ihe ọ na-aza n’anapụghị ya okwu n’ọnụ. Mgbe ahụ, di ma ọ bụ nwunye gị pụkwara ime otu ihe ahụ.

• M̀ na-ekwesikarị olu ike?

• M̀ na-aṅa gị ntị n’ezie mgbe ị na-ekwu otú ihe dị gị n’obi, ka m̀ na-azaghachikarị n’ekweghị ka i kwuchaa?

• Okwu m ọ̀ na-ada ka nke onye na-enweghị mmetụta ma ọ bụ onye iwe ji?

• Olee ihe anyị abụọ pụrụ ime iji meziwanye otú anyị si ekwurịta okwu—karịsịa mgbe anyị na-ekwekọrịtaghị n’ihe?

[Foto dị na peeji nke 21]

Ị̀ na-aṅa ntị?

[Foto dị na peeji nke 22]

“Ọ dị m ka ị̀ na-eleghara m anya ma ghara ịhụ m n’anya”

[Foto dị na peeji nke 22]

“Ọ dịtụghị mgbe ị na-anọnyere m!”

[Foto dị na peeji nke 22]

“N’ọnwa gara aga, mụ na gị ji otu ụbọchị zuru ezu nọọ!”