Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị A Zọpụtara, Ọ Bụghị Nanị Site n’Ọrụ, Kama Site n’Obiọma Na-erughịrị Mmadụ

Ndị A Zọpụtara, Ọ Bụghị Nanị Site n’Ọrụ, Kama Site n’Obiọma Na-erughịrị Mmadụ

Ndị A Zọpụtara, Ọ Bụghị Nanị Site n’Ọrụ, Kama Site n’Obiọma Na-erughịrị Mmadụ

“A zọpụtawo unu site n’okwukwe . . . O siteghị n’ọrụ, ka mmadụ ọ bụla wee ghara inwe ihe ndabere maka ịnya isi.”—NDỊ EFESỌS 2:8, 9.

1. Olee otú Ndị Kraịst si dị iche n’ebe ndị mmadụ n’ozuzu nọ ma a bịa n’ihe ndị ha rụzuru n’otu n’otu, n’ihi gịnịkwa?

TAA, ndị mmadụ na-akpa nnọọ nganga n’ihe ndị ha rụzuru, ha na-adịkarịkwa ngwa itu ọnụ banyere ha. Ndị Kraịst dị iche. Ha na-ezere ikwubiga okwu ókè banyere ihe ndị ha rụzuru, ọbụna ihe ndị metụtara ezi ofufe. Ka ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihe ndị Jehova nile rụzuru, ha adịghị ebute ihe ndị ha rụzuru n’otu n’otu ụzọ. Ha ghọtara na n’ozi Jehova, ebumnobi ziri ezi dị mkpa karịa ihe mmadụ rụzuru n’onwe ya. Onye ọ bụla nke a ga-emesị nye onyinye nke ịdị ndụ ebighị ebi nwetara ya, ọ bụghị n’ihi ihe ndị ọ rụzuru, kama site n’okwukwe na obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.—Luk 17:10; Jọn 3:16.

2, 3. Olee ihe Pọl ji nyaa isi, n’ihi gịnịkwa?

2 Pọl onyeozi maara nke ọma na nke a bụ eziokwu. Mgbe o kpesịrị ekpere ugboro atọ ka o nwere onwe ya pụọ ‘n’ogwu n’anụ ahụ́ ya,’ Jehova zaghachiri ya, sị: “Obiọma m na-erughịrị mmadụ ezuworo gị; n’ihi na a na-eme ka ike m zuo okè n’adịghị ike.” N’iji umeala n’obi nakwere mkpebi Jehova, Pọl kwuru, sị: “Ya mere, n’ụzọ kasị enye ọṅụ, ọ kara m mma ịnya isi n’ihe metụtara adịghị ike m, ka ike nke Kraịst ahụ wee nọgide na-ekpuchi m dị ka ụlọikwuu.” Anyị kwesịrị ịchọ iṅomi àgwà ịdị umeala n’obi Pọl.—2 Ndị Kọrint 12:7-9.

3 Ọ bụ ezie na Pọl bụ onye a ma ama n’ọrụ Ndị Kraịst, ọ maara na ihe ndị ọ rụzuru abụghị n’ihi nkà ndị o nwere. O ji obi umeala kwuo, sị: “Ọ bụ m, bụ́ onye dị ala karịa onye kasị nta n’ime ndị nsọ nile, ka e nyere obiọma a na-erughịrị mmadụ, ka m wee kpọsaara ndị mba ọzọ ozi ọma banyere akụ̀ Kraịst ndị a na-apụghị ịghọta aghọta.” (Ndị Efesọs 3:8) Pọl etughị ọnụ ma ọ bụ lee onwe ya anya dị ka onye ka ndị ọzọ nsọ. “Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-enye ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.” (Jems 4:6; 1 Pita 5:5) Ànyị na-agbaso ihe nlereanya Pọl, jiri obi umeala na-ewere onwe anyị dị ka ndị dị ala karịa ụmụnna anyị ndị kasị dị ala?

“Na-ewere na Ndị Ọzọ Ka Unu”

4. Gịnị mere ọ pụrụ iji siere anyị ike mgbe ụfọdụ iwere na ndị ọzọ ka anyị?

4 Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “[Gharanụ] ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama site n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.” (Ndị Filipaị 2:3) Nke a pụrụ ịbụ ihe ịma aka, karịsịa ma ọ bụrụ na anyị nwere ihe ùgwù ije ozi. Eleghị anya, nsogbu ahụ na-ebilite n’ihi na mmụọ ịsọ mpi, bụ́ nke jupụtara nnọọ n’ụwa taa, emetụtala anyị ruo n’ókè ụfọdụ. Ikekwe dị ka ụmụaka, a kụziiri anyị ịdị na-eso ụmụnne anyị n’ụlọ ma ọ̀ bụ ụmụ klas anyị n’ụlọ akwụkwọ na-asọrịta mpi. Ọ pụrụ ịbụ na a na-agba anyị ume mgbe nile inweta ihe ùgwù nke ịbụ onye kasị eme egwuregwu n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ nwa akwụkwọ kasị mma e nwere n’ụlọ akwụkwọ. N’ezie, ọ bụ ihe kwesịrị ịja mma ime ike anyị nile n’ezi ihe ọ bụla anyị na-eme. Otú ọ dị, Ndị Kraịst na-eme otú ahụ, ọ bụghị iji dọta uche ndị ọzọ n’ebe ha nọ n’ụzọ na-enweghị isi, kama ọ bụ iji rite uru n’ụzọ zuru ezu n’ihe omume ahụ nakwa, ma eleghị anya, iji mee ka ndị ọzọ rite uru. Ma, ịchọ ka e too gị mgbe nile dị ka onye mbụ pụrụ ịkpata ọdachi. N’ụzọ dị aṅaa?

5. Ọ bụrụ na a chịkwaghị ya, na gịnị ka mmụọ ịsọ mpi pụrụ iduga?

5 Ọ bụrụ na a chịkwaghị ya, mmụọ ịsọ mpi ma ọ bụ nke ịbụ onye onwe ya na-ebu isi pụrụ ime ka mmadụ ghọọ onye na-adịghị akwanyere ndị ọzọ ùgwù na onye mpako. Ọ pụrụ ịdị na-enwere ndị ọzọ anyaụfụ n’ihi ikike na ihe ùgwù ndị ha nwere. Ilu 28:22 na-ekwu, sị: “Onye na-agbaso akụ̀ ka onye nwere anya ọjọọ bụ, ma ọ maghị na ihe ụkọ ga-abịakwute ya.” Ọ pụdịrị ọbụna iji mpako chọọ inweta ọkwá na-erughịrị ya. Iji mee ka ihe ọ na-eme yie ihe ziri ezi, o nwere ike ịmalite ịtamu ntamu ma na-akatọ ndị ọzọ—bụ́ omume Ndị Kraịst kwesịrị izere. (Jems 3:14-16) Otú o sina dị, ọ nọ n’ihe ize ndụ nke inwe àgwà nke iche nanị banyere onwe ya.

6. Olee otú Bible si dọọ aka ná ntị megide mmụọ ịsọ mpi?

6 N’ihi ya, Bible na-agba Ndị Kraịst ume, sị: “Ka anyị ghara ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, na-akpali ịsọ mpi n’etiti onwe anyị, na-enwere ibe anyị anyaụfụ.” (Ndị Galeshia 5:26) Jọn onyeozi kwuru banyere Onye Kraịst ibe ya nke o doro anya na o nwere ụdị mmụọ a. Jọn kwuru, sị: “Ọ dị ihe m degaara ọgbakọ, ma Daịọtrefis, onye na-achọ ịnọ n’ọkwá mbụ n’etiti ha, adịghị eji nkwanye ùgwù anabata ihe ọ bụla si anyị n’aka. Ọ bụ nke ahụ mere na, ọ bụrụ na mụ abịa, m ga-echeta ọrụ ya ndị ọ gara n’ihu na-arụ, jiri ajọ okwu na-ekwugheri ekwugheri banyere anyị.” Lee ka o si bụrụ ihe ọjọọ Onye Kraịst ịdaba n’ọnọdụ dị otú ahụ!—3 Jọn 9, 10.

7. Olee ihe Onye Kraịst ga-achọ izere n’ebe ọrụ nke taa bụ́ ebe e nwere asọmpi?

7 N’ezie, ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya iche na Onye Kraịst pụrụ izere ụdị nile nke ịsọ mpi kpamkpam. Dị ka ihe atụ, ọrụ ego ya pụrụ ịgụnye ya iso ndị ọzọ ma ọ bụ ụlọ ọrụ ndị na-emepụta otu ụdị ngwá ahịa ọ na-emepụta ma ọ bụ ndị nke na-arụ otu ụdị ọrụ ọ na-arụ azọ ndị ahịa. Otú ọ dị, ọbụna n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ọ dị mkpa ka Onye Kraịst jiri mmụọ nke nkwanye ùgwù, ịhụnanya na nchebara echiche zụọ ahịa ya. Ọ gaghị etinye aka n’omume ndị iwu na-akwadoghị ma ọ bụ ndị megidere ụkpụrụ Ndị Kraịst, ọ ga-ezerekwa ịbụ onye a maara nnọọ dị ka onye na-asọ mpi na anụ na-eri ibe ya. Ọ gaghị eche na ịbụ onye nke mbụ—ná nchụso ọ bụla—bụ ihe kasị mkpa ná ndụ. Ọ bụrụ na o kwesịrị ịdị otú ahụ n’ọrụ ego, lee otú o kwesịrị isi dị otú ahụ ọbụna karị n’ihe ndị metụtara ofufe!

‘Ọ Bụghị n’Iji Onwe Onye Atụnyere Onye nke Ọzọ’

8, 9. (a) Gịnị mere na ndị okenye ọgbakọ enweghị ihe mere ha ga-eji na-asọrịta mpi? (b) Gịnị mere 1 Pita 4:10 ji metụta ndị ohu Chineke nile?

8 E setịpụrụ àgwà Ndị Kraịst kwesịrị inwe n’ofufe ha n’ihe ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ, nke na-ekwu, sị: “Ka onye ọ bụla na-anwapụta ihe ọrụ nke ya bụ, mgbe ahụkwa ọ ga-eme ka o nwee aṅụrị n’ihe banyere nanị onwe ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye nke ọzọ.” (Ndị Galeshia 6:4) N’ịmara na ha na ibe ha adịghị asọrịta mpi, ndị okenye ọgbakọ na-arụkọ ọrụ ọnụ dị ka otu òtù. Ha na-enwe ọṅụ n’ụtụ onye nke ọ bụla pụrụ ịtụnye n’ọdịmma ọgbakọ. Ha si otú a na-ezere asọmpi na-emebi ihe ma na-esetịpụrụ ọgbakọ ezi ihe nlereanya nke ịdị n’otu.

9 N’ihi afọ ndụ, ahụmahụ ma ọ bụ ikike e bu pụta ụwa, ụfọdụ ndị okenye pụrụ ịdị na-arụsi ọrụ ike karịa ndị ọzọ, ma ọ bụ ya abụrụ na ha na-aghọta ihe karịa ndị ọzọ. N’ihi ya, ndị okenye nwere ibu ọrụ dịgasị iche n’ọgbakọ Jehova. Kama ịdị na-eji onwe ha atụnyere ibe ha, ha na-eburu ndụmọdụ a n’obi, nke bụ́: “Ruo n’ókè onye nke ọ bụla nataworo onyinye, jirinụ ya na-ejere ibe unu ozi dị ka ezi ndị nlekọta ụlọ nke obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke bụ́ nke a na-egosipụta n’ụzọ dị iche iche.” (1 Pita 4:10) N’eziokwu, akụkụ Akwụkwọ Nsọ a metụtara ndị ohu Jehova nile, n’ihi na ruo n’ókè ụfọdụ, ha nile natachara onyinye nke ezi ihe ọmụma, ha nile nwechakwara ihe ùgwù nke ikere òkè n’ozi Ndị Kraịst.

10. Nanị gịnị ga-eme ka Jehova nabata ozi dị nsọ anyị na-eje?

10 Ozi dị nsọ anyị na-eje na-amasị Jehova nanị mgbe anyị jere ya n’ihi ịhụnanya na nraranye anyị, ọ bụghị iji mee ka anyị dị elu karịa ndị ọzọ. N’ihi ya, ọ dị oké mkpa inwe echiche ziri ezi banyere ihe anyị na-eme iji kwado ezi ofufe. Ọ bụ ezie na ọ dịghị onye pụrụ ịma kpọmkwem ebumnobi onye ọzọ, Jehova “na-atụzi obi nile.” (Ilu 24:12; 1 Samuel 16:7) Ya mere, anyị kwesịrị ịdị na-ajụ onwe anyị site n’oge ruo n’oge, sị, ‘Olee ihe na-akpali m ịrụ ọrụ nke okwukwe?’—Ilu 24:3, 4; Matiu 5:8.

Ụzọ Ziri Ezi Isi Lee Ọrụ Anyị Anya

11. Ajụjụ ndị dị aṅaa banyere ihe anyị rụtara n’ozi ubi ka ezi uche dị na ya ịtụle?

11 Ọ bụrụ na ihe kasị mkpa iji nweta nnwapụta Jehova bụ inwe ezi ebumnobi, ruzie n’ókè ha aṅaa ka anyị kwesịrị iji ọrụ nke okwukwe anyị kpọrọ ihe? Ya bụrụhaala na anyị ji ezi ebumnobi eje ozi anyị, ọ̀ dị mkpa n’ezie idekọ ihe anyị rụzuru ma ọ bụ awa ole anyị jiri jee ozi? Amamihe dị n’ajụjụ ndị a ebe anyị na-achọghị iji awa ole anyị jiri jee ozi kpọrọ ihe karịa ọrụ nke okwukwe anyị ma ọ bụ kwe ka akụkọ ozi buru ibu ghọọ ihe ka mkpa n’ozi Ndị Kraịst anyị.

12, 13. (a) Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị mere anyị ji edekọ akụkọ ozi anyị? (b) Olee ihe ndị na-enye anyị ọṅụ mgbe anyị na-atụle akụkọ ozi nke ọrụ nkwusa anyị n’ụwa nile?

12 Rịba ama ihe akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova kwuru: “Ndị mbụ soro ụzọ Jizọs Kraịst nwere mmasị n’akụkọ banyere ọganihu ndị a na-enwe n’ọrụ nkwusa ahụ. (Mak 6:30) Akwụkwọ Bible bụ́ Ọrụ Ndịozi na-agwa anyị na ha dị ihe dị ka mmadụ 120 ndị nọ ya mgbe a wụsara ndị ahụ na-eso ụzọ mmụọ nsọ na Pentikọst. N’oge na-adịghị anya, ọnụ ọgụgụ ndị ahụ na-eso ụzọ ruru 3,000, mesịakwa ruo 5,000. . . . (Ọrụ 1:15; 2:5-11, 41, 47; 4:4; 6:7) Lee ka akụkọ banyere mmụba ndị a na-aghaghị isiwo gbaa ndị ahụ na-eso ụzọ ume!” N’ihi otu ihe ahụ, Ndịàmà Jehova taa na-agbalị inwe ezi ihe ndekọ nke ihe a rụzuru n’ụwa nile iji mezuo okwu Jizọs bụ́: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Akụkọ ozi ndị dị otú ahụ na-eme ka a mara kpọmkwem otú ọrụ ahụ si aga n’ụwa nile. Ha na-eme ka a mara ebe e nwere mkpa, ụdị akwụkwọ e ji amụ Bible a chọrọ na ole a chọrọ ya, iji mee ka ọrụ nkwusa ahụ na-aga n’ihu.

13 N’ihi ya, anyị inye akụkọ ozi anyị na-enyere anyị aka ịrụ ọrụ anyị nke ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’ụzọ dị irè karị. E wezụga nke ahụ, ọ̀ bụ na anyị adịghị enweta agbamume mgbe anyị nụrụ banyere ọrụ ụmụnna anyị na-arụ n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa? Akụkọ uto na mmụba a na-enwe n’ụwa nile na-enye anyị ọṅụ, na-akpali anyị ịrụkwu ọrụ, na-emesikwa anyị obi ike na anyị ga-enweta ngọzi Jehova. Leekwa obi ụtọ anyị na-enwe ịmata na akụkọ ozi nke anyị onwe anyị so n’akụkọ ozi ụwa nile! Nke anyị dị obere ma e jiri ya tụnyere ngụkọta nke akụkọ ozi nile, ma Jehova hụrụ ya. (Mak 12:42, 43) Cheta na ọ bụrụ na i nyeghị akụkọ ozi gị, akụkọ ozi ụwa nile agaghị ezu ezu.

14. E wezụga ikwusa ozi ọma na izi ihe, olee ihe ofufe anyị na-efe Jehova gụnyere?

14 N’ezie, ọtụtụ n’ime ihe Onyeàmà ọ bụla na-eme dị ka ohu Jehova raara onwe ya nye adịghị abanye n’akụkọ ozi ya. Dị ka ihe atụ, akụkọ ozi ahụ adịghị agụnye oge e ji nwee ọmụmụ Bible onwe onye, gaa nzukọ Ndị Kraịst ma kere òkè na ha, rụọ ọrụ ọgbakọ, nyere ndị kwere ekwe ibe anyị aka dị ka mkpa ha si dị, nye ego iji kwadoo ọrụ nkwusa Alaeze zuru ụwa ọnụ na ihe ndị ọzọ. Ya mere, ọ bụ ezie na akụkọ ozi ubi anyị na-arụ ọrụ nke ya n’inyere anyị aka ịnọgide na-anụ ọkụ n’obi n’ọrụ nkwusa ahụ na ịghara ịsụla azụ, anyị aghaghị idebe ya n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị. E kwesịghị ile ya anya dị ka laịsensị ndụ ebighị ebi.

“Na-anụ Ọkụ n’Obi Maka Ezi Ọrụ”

15. Ọ bụ ezie na nanị ọrụ apụghị ịzọpụta anyị, olee ihe mere o ji dị mkpa?

15 N’ụzọ doro anya, ọ bụ ezie na nanị ọrụ apụghị ịzọpụta anyị, ọ dị mkpa. Ọ bụ ya mere e ji akpọ Ndị Kraịst “ndị nke ya n’ụzọ pụrụ iche, . . . ndị na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ọrụ,” ọ bụkwa ya mere e ji agba ha ume ịdị “na-echebakwara ibe [ha] echiche iji kpalie inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.” (Taịtọs 2:14; Ndị Hibru 10:24) Nke ka mkpa bụ na onye ọzọ so dee Bible, bụ́ Jems, na-ekwu n’ụzọ dị mfe, sị: “Dị ka ahụ́ nke na-enweghị mmụọ bụ nke nwụrụ anwụ, otú ahụkwa ka okwukwe nke na-enweghị ọrụ bụ nke nwụrụ anwụ.”—Jems 2:26.

16. Olee ihe dị mkpa ọbụna karịa ọrụ, ma gịnị ka anyị na-aghaghị ịkpachara anya banyere ya?

16 Ọ bụ ezie na ezi ọrụ dị mkpa n’onwe ya, ebumnobi anyị ji arụ ya dị mkpa ọbụna karị. N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya anyị ịdị na-atụle ebumnobi anyị site n’oge ruo n’oge. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ọ dịghị onye pụrụ ikwu kpọmkwem ihe bụ́ ebumnobi ndị ọzọ, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịdị na-ekpe ndị ọzọ ikpe. A jụrụ anyị, sị: “Ònye ka ị bụ ikpe odibo onye ọzọ ikpe?” nyekwa anyị azịza doro anya bụ́: “N’ebe nna ya ukwu nọ ka ọ na-eguzo ma ọ bụ na-ada.” (Ndị Rom 14:4) Nna Ukwu mmadụ nile, bụ́ Jehova, na Onyeikpe ọ họpụtara, bụ́ Kraịst Jizọs, ga-ekpe anyị ikpe, ọ bụghị nanị dabere n’ọrụ anyị, kamakwa dabere n’ebumnobi anyị, ohere anyị nwere, ịhụnanya anyị na otú nraranye anyị ruru. Ọ bụ nanị Jehova na Kraịst Jizọs pụrụ ikpebi n’ụzọ ziri ezi ma ànyị emewo ihe Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ime mgbe o kwuru, sị: “Mee ike gị nile iche onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye a nwapụtara anwapụta, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.”—2 Timoti 2:15; 2 Pita 1:10; 3:14.

17. Ka anyị na-agbalị ime ike anyị nile, gịnị mere anyị kwesịrị iji buru Jems 3:17 n’uche?

17 Ezi uche dị n’ihe Jehova na-achọ n’aka anyị. Dị ka Jems 3:17 si kwuo, gụnyere ihe ndị ọzọ, ‘amamihe nke sitere n’elu nwere ezi uche.’ Ọ́ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya, nakwa ịrụzu ihe dị ukwuu, anyị iṅomi Jehova n’akụkụ a? N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ onwe anyị na ụmụnna anyị anya n’aka ime ihe na-agaghị ekwe omume.

18. Gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya ya ma anyị nwee echiche ziri ezi banyere ọrụ anyị na obiọma Jehova nke na-erughịrị mmadụ?

18 Ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-enwe echiche ziri ezi banyere ọrụ nke okwukwe anyị na obiọma Jehova nke na-erughịrị mmadụ, anyị ga-anọgide na-enwe ọṅụ nke na-eme ka ezi ndị ohu Jehova pụọ iche. (Aịsaịa 65:13, 14) N’agbanyeghị ihe ike kwere onye ọ bụla n’ime anyị mee, anyị pụrụ ịṅụrị ọṅụ ná ngọzi ndị Jehova na-awụsa ndị ya nile. Site n’ịnọgide “n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele,” anyị na-arịọ Chineke ka o nyere anyị aka ime ike anyị nile. Mgbe ahụ, anyị ga-ejide n’aka na “udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi [anyị] na ike iche echiche [anyị] nche site na Kraịst Jizọs.” (Ndị Filipaị 4:4-7) Ee, anyị pụrụ inweta nkasi obi na agbamume site n’ịmara na a pụrụ ichebe anyị, ọ bụghị nanị site n’ọrụ, kamakwa site n’obiọma Jehova nke na-erughịrị mmadụ!

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa Ihe Mere Ndị Kraịst

• ji ezere itu ọnụ banyere ihe ndị ha rụzuru?

• ji ezere igosi mmụọ ịsọ mpi?

• ji enye akụkọ ozi ubi ha?

• ji ezere ikpe Ndị Kraịst ibe ha ikpe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

“Obiọma m na-erughịrị mmadụ ezuworo gị”

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Ndị okenye na-aṅụrị ọṅụ n’ụtụ onye nke ọ bụla pụrụ ịtụnye n’ọdịmma ọgbakọ

[Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]

Ọ bụrụ na i nyeghị akụkọ ozi gị, akụkọ ozi ụwa nile agaghị ezu ezu