Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-eme Ihe n’Eziokwu Na-ewetara Jehova Otuto

Ndị Na-eme Ihe n’Eziokwu Na-ewetara Jehova Otuto

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ndị Na-eme Ihe n’Eziokwu Na-ewetara Jehova Otuto

GBURUGBURU ụwa, a maara Ndịàmà Jehova—ma ndị na-eto eto ma ndị toworo eto—dị ka ndị na-eme ihe n’eziokwu. Tụlee ihe atụ si kọntinent atọ.

Olusola bụ́ onye dị afọ 17, nke bi na Nigeria, na-alọta akwụkwọ otu ụbọchị mgbe ọ hụrụ otu pọọsụ n’ala. O wegaara ya onyeisi ụlọ akwụkwọ ha, bụ́ onye gụrụ ego dị n’ime ya, ego ahụ dịkwa ₦6,200. Onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ nyeghachiri pọọsụ ahụ onye nkụzi nwe ya. Iji gosipụta ekele o nwere, onye nkụzi ahụ nyere Olusola ₦1,000 ma gwa ya ka o jiri ya kwụọ ụgwọ akwụkwọ ya. Mgbe ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ nụrụ ihe ahụ merenụ, ha kwara Olusola emo. Ụfọdụ izu ka nke ahụ gasịrị, otu nwa akwụkwọ kwuru na e zuru ego ya, n’ihi ya, a gwara ndị nkụzi ka ha nyochaa ụmụ akwụkwọ nile. Onye nkụzi ha gwara Olusola, sị: “Guzoro ebe a. Amaara m na dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, ị pụghị izu ohi.” A chọtara ego ahụ n’aka ụmụaka nwoke abụọ so ná ndị kwara Olusola emo, a takwara ha nnọọ ahụhụ. Olusola dere, sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ na a maara m dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-enweghị ihe ga-eme ka ha zuo ohi, si otú ahụ na-enye Jehova otuto.”

Ka Marcelo, bụ́ onye Argentina, si n’ụlọ ya na-apụ otu ụbọchị, ọ hụrụ otu akpa tọgbọ n’ala n’ebe na-adịghị anya site n’ụzọ azụ ụlọ ya. O buuru akpa ahụ baa n’ụlọ, ya na nwunye ya ejiri nlezianya meghee ya. Ọ tụrụ ha nnọọ n’anya ịhụ ego buru nnọọ ibu, kaadị e ji azụ ihe n’aka, na akwụkwọ ndọrọ ego dị iche iche a bịanyerela aka na ha, otu n’ime ha bụ nke a ga-eji dọrọ otu nde peso. Ha hụrụ nọmba fon n’otu risit. Ha kpọrọ onye nwe akpa ahụ ma mee ndokwa inyeghachi ya akpa ahụ na ihe nile dị n’ime ya n’ebe Marcelo na-arụ ọrụ. Mgbe onye nwe ya bịara, o yiri onye nọ n’oké nchegbu. Onye Marcelo na-arụrụ ọrụ gwara ya ka o wetuo obi, n’ihi na Marcelo bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Onye nwe akpa ahụ nyere Marcelo nanị peso 20 (ihe dị ka $6, U.S.), maka ịchọtara ya akpa ahụ. Nke a were onye ahụ Marcelo na-arụrụ ọrụ oké iwe n’ihi na ime ihe n’eziokwu Marcelo kpaliri nnọọ mmasị ya. Nke a nyere Marcelo ohere ịkọwara ya na dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, ya na-achọ ịdị na-eme ihe n’eziokwu mgbe nile.

Ahụmahụ na-esonụ si Kyrgyzstan. Rinat, otu nwata nwoke dị afọ isii, chọtara pọọsụ otu nwanyị bidebere ha. Ihe dị n’ime pọọsụ ahụ bụ 1,100 som (ihe dị ka $25, U.S.). Mgbe Rinat wegaara nwanyị ahụ pọọsu ya furu efu, ọ gụrụ ego ahụ ma gwa nne Rinat na som 200 ka na-efu. Rinat kwuru na ọ bụghị ya weere ego ahụ. Ha nile pụziri ịga chọọ ego ahụ furu efu, ha chọtakwara ya n’akụkụ ebe Rinat chọtara pọọsụ ahụ. Ọ tụrụ nwanyị ahụ n’anya. O kelere Rinat na nne ya, nke mbụ n’ihi iweghachiri ya ego ya furu efu, nakwa nke abụọ n’ihi ọzụzụ Rinat nwetara dị ka Onye Kraịst.