Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ndụ Dị Ugbu A”—Ịnụ Ụtọ Ya Ruo n’Isi!

“Ndụ Dị Ugbu A”—Ịnụ Ụtọ Ya Ruo n’Isi!

Akụkọ Ndụ

“Ndụ Dị Ugbu A”—Ịnụ Ụtọ Ya Ruo n’Isi!

DỊ KA TED BUCKINGHAM SI KỌỌ

Abụwo m onye ozi oge nile ruo afọ isii, lụọkwa nwanyị ruo ọnwa isii mgbe ọrịa polio jidere m n’otu ntabi anya. Ọ bụ n’afọ 1950, adịkwa m nanị afọ 24 n’oge ahụ. Ọnwa itoolu m nọrọ n’ụlọ ọgwụ nyere m ohere buru ibu iche echiche banyere ndụ m. N’ihi nkwarụ ọhụrụ a m nwere, gịnị ga-abụ ọdịnihu mụ na nwunye m, bụ́ Joyce?

NA 1938, papa m, bụ́ onye na-ejitụghị okpukpe kpọrọ ihe, nwetara akwụkwọ bụ́ Government. * Ọ pụrụ ịbụ ọgba aghara ọchịchị na agha na-aga ịda kpaliri ya inweta akwụkwọ ahụ. Amaara m na o nwetụghị mgbe ọ gụrụ ya, ma mama m bụ́ onye ji nnọọ okpukpe kpọrọ ihe gụrụ ya. O mere ihe kwekọrọ n’ozi dị na ya ozugbo. Ọ kwụsịrị ịga Chọọchị England ma ghọọ Onyeàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi n’agbanyeghị mmegide sitere n’aka papa m, ọ nọgidekwara na-ekwesị ntụkwasị obi dị ka Onyeàmà ruo mgbe ọ nwụrụ na 1990.

Mama m kpọọrọ m gaa nzukọ mbụ m so Ndị Kraịst nwee n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Epsom, nke dị n’ebe ndịda London. Ọgbakọ ahụ nọ na-ezukọ n’ebe bụbu ụlọ ahịa, anyị gekwara okwu ihu ọha a kpọnyere na teepụ, nke J. F. Rutherford kwuru, bụ́ onye na-elekọta ọrụ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. Nke ahụ masịrị m nnọọ nke ukwuu.

Oké bọmbụ a nọ na-atụ n’oge a wakporo London n’ike mere ka ndụ anyị dịwanye n’ihe ize ndụ. Ya mere, na 1940, papa m kpebiri na anyị ga-akwaga n’ebe ka dị nchebe—Maidenhead, bụ́ obodo nta dị kilomita 45 site n’ebe ọdịda anyanwụ London. Nke a bara uru n’ihi na ndị nkwusa 30 nọ n’ọgbakọ dị ebe ahụ bụụrụ anyị ezi isi iyi nke agbamume. Fred Smith, bụ́ onye siri ike n’ụzọ ime mmụọ nke e mere baptizim na 1917, nwere mmasị pụrụ iche n’ebe m nọ ma zụọ m ịghọ onye nkwusa dị irè karị. Aka m nwere ekele dị ukwuu n’ebe ọ nọ n’ihi ihe nlereanya na enyemaka ịhụnanya ya.

Ịbanye n’Ozi Oge Nile

Na 1941, mgbe m dị afọ 15, e mere m baptizim n’osimiri bụ́ Thames n’otu ụbọchị oyi na-atụ na March. Tupu mgbe ahụ, nwanne m nwoke nke okenye, bụ́ Jim, amalitela ije ozi oge nile. Taa, ya na nwunye ya bụ́ Madge bi na Birmingham, ka ha jisịrị ihe ka ọtụtụ n’afọ ndụ ha jeere Jehova ozi n’ọrụ sekit na distrikti na Britain nile. Nwanne m nwanyị nke nta bụ́ Robina na di ya, bụ́ Frank, ka bụ ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi.

Anọ m na-arụ ọrụ dị ka onye nhazi ego nke otu ụlọ ọrụ na-akwa ákwà. Otu ụbọchị, onyeisi ụlọ ọrụ ahụ kpọrọ m òkù n’ọfịs ya inye m ọrụ uru dị na ya nke bụ́ ịdị na-azụtara ụlọ ọrụ ahụ ihe. Otú ọ dị, ruo oge ụfọdụ, anọ m na-eche banyere ịgbaso ihe nlereanya nke nwanne m nwoke, ya mere, ejiri m olu ọma jụ ọrụ ahụ onye were m n’ọrụ chọrọ inye m ma kọwaara ya ihe mere m ji jụ ya. N’ụzọ tụrụ m n’anya, ọ jara m nnọọ mma maka ịchọ ịrụ ọrụ ọma Ndị Kraịst dị otú ahụ. Ya mere, mgbe mgbakọ distrikti e nwere na Northampton na 1944 gasịrị, aghọrọ m onye na-ezisa ozi ọma oge nile.

Ebe mbụ e zigara m bụ Exeter, n’ógbè nke Devon. N’oge ahụ, obodo a ka na-enwetaghachi onwe ya nke nta nke nta site na bọmbụ ndị a tụrụ na ya n’oge agha. Mụ na ndị ọsụ ụzọ abụọ bụ́ Frank na Ruth Middleton, bụ́ ndị na-emeso m ihe n’obiọma, bi n’otu ebe. Adị m nanị afọ 18, amachaghịkwa m otú e si asa ákwà na otú e si esi nri, ma ihe kara mma ka m na-amụtakwu ihe ndị a.

Onye mụ na ya so ezisa ozi ọma bụ Victor Gurd dị afọ 50, bụ́ onye Ireland nke nọworo na-eme nkwusa kemgbe afọ ndị 1920. Ọ kụziiri m ịhazi oge m n’ụzọ ga-abara m uru, inwekwu mmasị n’ịgụ Bible na ịmata uru nsụgharị Bible dị iche iche bara. N’afọ ndị ahụ dị oké mkpa, ihe nlereanya iguzosi ike n’ihe Victor bụ nnọọ ihe dị m mkpa.

Ihe Ịma Aka nke Ịnọpụ Iche

Agha ahụ abịawala ná njedebe, ma ndị ọchịchị ka na-achụgharị ụmụ okorobịa ka ha gaa agha. Awụchara m n’ihu ndị ikpe na 1943 na Maidenhead, bụ́ ebe m rịọrọ n’ụzọ doro anya ka a gụpụ m ná ndị ga-aga agha dị ka onye na-ekwusa Oziọma. Ọ bụ ezie a jụrụ ịnabata arịrịọ m, ekpebiri m ịkwaga Exeter iji were ozi m gaa n’ihu. Ya mere, ọ bụ n’Exeter ka a nọziri gwa m ka m wụchaa n’ụlọikpe ógbè ahụ. Mgbe ọ na-ama m ikpe ịga mkpọrọ ọrụ ahụhụ ruo ọnwa isii, onye majie gwara m na o wutere ya na mkpọrọ ahụ agaghị adịte aka karịa otú ahụ. Mgbe m nọsịrị n’ụlọ mkpọrọ ruo ọnwa isii ndị ahụ, e zighachiri m n’ụlọ mkpọrọ ruo ọnwa anọ ọzọ.

Ebe ọ bụ nanị m bụ Onyeàmà nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ, ndị na-elekọta ndị mkpọrọ na-akpọ m Jehova. O siiri m nnọọ ike ịza aha ahụ mgbe a na-akpọ aha, aghaghịkwa m ịza ya, ma lee ihe ùgwù ọ bụ ịnụ ka a na-akpọsa aha Chineke kwa ụbọchị! O mere ka ndị mkpọrọ ndị ọzọ mara na ọ bụ n’ihi mkpebi m ji akọ na uche mee dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova ka e ji tụkọọ mụ na ha mkpọrọ. Ka e mesịrị, a tụrụ Norman Castro mkpọrọ n’otu ụlọ mkpọrọ ahụ, a gbanwekwara aha anyị. Anyị ghọziri Mozis na Erọn.

E si n’Exeter kpọga m Bristol, mesịakwa kpọga m n’ụlọ mkpọrọ Winchester. Ọ bụghị mgbe nile ka ihe dị mma, ma omume ịkpa ọchị nyeere m aka. Mụ na Norman nwere obi ụtọ imekọ Ememe Ncheta mgbe anyị nọ na Winchester. Francis Cooke, bụ́ onye bịara ileta anyị n’ụlọ mkpọrọ, kwuuru anyị okwu Ememe Ncheta magburu onwe ya.

Mgbanwe Ndị E Nwere n’Afọ Ndị Sochiri Agha Ahụ

Ná mgbakọ e nwere na Bristol na 1946, bụ́ ebe a nọrọ wepụta akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ “Kwe Ka Chineke Bụrụ Onye-Ezi-Okwu,” ezutere m otu nwa agbọghọ mara mma, bụ́ Joyce Moore, onye na-asụkwa ụzọ na Devon. Ọbụbụenyi mụ na ya siwanyere ike, anyị lụkwara mgbe afọ anọ gasịrị na Tiverton, bụ́ ebe m nọ kemgbe 1947. Anyị bi n’otu ọnụ ụlọ anyị na-akwụ shịnị 15 na ya ($1.10, U.S.) kwa izu. Anyị biri ndụ obi ụtọ!

N’ime afọ mbụ nke alụmdi na nwunye anyị, anyị kwagakwara n’ebe ndịda na Brixham, bụ́ obodo mara mma nke nwere ọdụ ụgbọ mmiri bụ́ ebe mbụ a malitere iji ụgbụ yiri okoso egbu azụ. Otú ọ dị, anyị anọtebeghị aka n’ebe ahụ mgbe ọrịa polio jidere m ka anyị na-aga mgbakọ na London. Atụbọrọ m. Emechara m si n’ụlọ ọgwụ lọta—mgbe ọnwa itoolu gasịrị, dị ka m kwuru n’elu. O metụtara nnọọ aka nri m na ụkwụ m abụọ, ha ka dịkwa otú ahụ, ana m ejikwa mkpara aga ije. Nwunye m m hụrụ n’anya na-eji obi ụtọ anọnyere m mgbe nile, ọ na-agbakwa m ume, karịsịa ebe o jisiri ike nọgide n’ozi oge nile. Ma gịnị ka anyị ga-eme ugbu a? Aga m amata n’oge na-adịghị anya na aka Jehova adịghị mkpụmkpụ.

N’afọ na-esonụ, anyị gara mgbakọ na Wimbledon, London. N’oge a, anaghị m eji mkpara m eje ije. Anyị zutere Pryce Hughes, bụ́ onye na-elekọta ọrụ nkwusa na Britain, n’ebe ahụ. O kelere m ozugbo, sị: “Bịa! Anyị chọrọ iji gị mee ihe n’ọrụ sekit!” Ọ dịghị agbamume karịrị nke ahụ m nwetatụrụla! M̀ ga-arụli ya? Mụ na Joyce chere banyere nke ahụ, ma site n’ọzụzụ otu izu anyị nwetara, tinyere inwe ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova nọ, anyị laghachiri n’ebe ndịda nke ọdịda anyanwụ England, bụ́ ebe e kenyere m ije ozi dị ka onye nlekọta sekit. N’oge ahụ, adị m nanị afọ 25, ma aka m ji obi ekele miri emi echeta obiọma na ndidi nke Ndịàmà ahụ nyeere m nnọọ aka.

N’ime ozi ọchịchị Chineke nile anyị garala, mụ na Joyce hụrụ na ileta ọgbakọ dị iche iche kasị jikọta anyị na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị. Anyị enweghị ụgbọala, ya mere, anyị na-eji ụgbọ okporo ígwè ma ọ bụ bọs eme njem. Ọ bụ ezie na m ka na-amụta izere ihe ndị ọrịa m chọrọ ka m zere, anyị nwere ihe ùgwù ndị ahụ ruo n’afọ 1957. Ọ bụ ndụ na-eju afọ, ma n’afọ ahụ, anyị nwetara ihe ịma aka ọzọ.

Ịga Ozi Ala Ọzọ

Obi dị anyị nnọọ ụtọ mgbe a kpọrọ anyị òkù iso na klas nke 30 nke Gilead. Anọ m na-anagide ahụ́ mkpọnwụ m nke ọma, n’ihi ya, mụ na Joyce nakweere ọkpụkpọ òkù ahụ. Site n’ahụmahụ, anyị matara na Jehova na-enye ume mgbe nile ma ọ bụrụhaala na anyị chọrọ ime uche ya. Ọnwa ise nke ọzụzụ ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ na Watchtower Bible School of Gilead, nke dị n’ebe mara mma bụ́ South Lansing, New York, U.S.A., gwụrụ ngwa ngwa. Ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ bụ ndị di na nwunye na-eje ozi dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Mgbe a jụrụ ndị klas anyị ma ò nwere onye ga-achọ ije ozi n’ala ọzọ, anyị so ná ndị kwetaranụ ozugbo. Olee ebe anyị ga-aga? Ọ bụ Uganda, n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa!

Ebe ọ bụ na a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Uganda n’oge ahụ, a gbara m ume ịkwaga ná mba ahụ ma chọrọ ọrụ. Mgbe anyị jisịrị ụgbọ okporo ígwè na ụgbọ mmiri mee ogologo njem, anyị rutere Kampala, Uganda. Obi adịghị ndị ọrụ na-ahụ maka ndị si mba ọzọ mma ịhụ anyị, ma ha kwere ka anyị nọrọ ruo nanị ọnwa ole na ole. A gwaziri anyị ka anyị laa. Site ná ntụziaka sitere n’isi ụlọ ọrụ, anyị gara Northern Rhodesia (nke bụ́zi Zambia). Ọ bụ nnọọ ihe ọṅụ dị ukwuu izute anọ n’ime ndị anyị na ha nọrọ na klas na Gilead—Frank na Carrie Lewis, tinyere Hayes na Harriet Hoskins n’ebe ahụ. N’oge na-adịghị anya, e si ebe ahụ ziga anyị Southern Rhodesia (nke bụ́zi Zimbabwe).

Anyị ji ụgbọ okporo ígwè gaa. Tupu anyị eruo Bulawayo, anyị hụrụ Nsụda Mmiri Victoria magburu onwe ya, nke ahụ bụkwa nke mbụ anyị na-ahụ ya. Anyị na ezinụlọ McLuckie, bụ́ ndị so ná Ndịàmà mbụ gara biri n’ebe ahụ, biri ruo oge ụfọdụ. Ọ bụụrụ anyị ihe ùgwù ịmata ha nke ọma n’ime afọ 16 sochirinụ.

Ịnagide Mgbanwe

Mgbe ọzụzụ izu abụọ nke ịmata Africa nke ọma gasịrị, a họpụtara m ije ozi dị ka onye nlekọta distrikti. Ịgba àmà n’ọhịa Africa pụtara ibu mmiri, nri, ihe ndị e ji ehi ụra, uwe, ihe e ji egosi slide na ígwè na-enye ọkụ, nnukwu ákwà ọcha e ji egosi slide na ihe ndị ọzọ dị mkpa. A na-akwakọnyeju ihe a nile n’obere ụgbọala nke siri ike ibu anyị gafere ụzọ ndị na-adịghị mma e nwere ebe ahụ.

Mụ na ndị nlekọta sekit bụ́ ndị Africa rụkọrọ ọrụ, ebe Joyce ji obi ụtọ nyere ndị nwunye ha na ụmụ ha ndị sonyeere anyị aka. Ịga ije n’ala Africa nke ahịhịa jupụtara na-agwụ ike, karịsịa n’oge okpomọkụ, ma n’oge na-adịghị anya achọpụtara m na ọnọdụ ihu igwe a na-eme ka ọ dịrị m mfe ịnagide ọnọdụ ahụ́ ike m, enwekwara m ekele maka nke ahụ.

Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị bi ebe ahụ dara ogbenye. Ọtụtụ mikpuru onwe ha n’ọdịnala na nkwenkwe ụgha, ha na-alụkwa ọtụtụ ụmụ nwanyị, n’agbanyeghị nke ahụ, ha nwere nkwanye ùgwù miri emi maka Bible. N’ebe ụfọdụ, a na-enwe nzukọ ọgbakọ n’okpuru nnukwu osisi nwere ndò, n’oge uhuruchi kwa, a na-eji ìhè ọkụ mpanaka ahụ ụzọ. Ibobo na-anwụ anyị n’ahụ́ mgbe ọ bụla anyị na-amụ Okwu Chineke n’okpuru mbara igwe nke jupụtara na kpakpando, nke bụ́ akụkụ dị ebube nke ihe ndị Chineke kere.

Igosi ndị Africa bi n’ugbo vidio ndị Watch Tower Society wepụtara bụ ahụmahụ ọzọ anyị na-agaghị echefu echefu. Otu ọgbakọ pụrụ inwe Ndịàmà 30, ma n’oge ndị ahụ, anyị maara na anyị pụrụ ịtụ anya 1,000 mmadụ ma ọ bụ karịa!

N’ebe ndị e nwere okpomọkụ, mmadụ pụrụ ịrịa ọrịa, ma ọ na-adị mkpa mgbe nile inwe echiche ziri ezi. Mụ na Joyce mụtara ịnagide ihe nke ọma—anagidere m ọrịa ịba m na-arịa site n’oge ruo n’oge, Joyce nagidekwara ọrịa nje na-akpata.

E mechara ziga anyị n’alaka ụlọ ọrụ dị na Salisbury (nke bụ́zi Harare), bụ́ ebe anyị nwere ihe ùgwù nke iso ndị ohu Jehova ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi jekọọ ozi, ndị ụfọdụ n’ime ha bụ Lester Davey, tinyere George na Ruby Bradley. Gọọmenti họpụtara m ije ozi dị ka onye na-edeba alụmdi na nwunye n’akwụkwọ, bụ́ nke nyeere m aka iduziri ụmụnna ndị Africa agbamakwụkwọ, si otú a mee ka nkekọ alụmdi na nwunye n’ime ọgbakọ sikwuo ike. Mgbe afọ ole na ole gasịrị, enwetara m ihe ùgwù ọzọ. M ga na-eleta ọgbakọ nile na-adịghị asụ asụsụ ndị Africa ná mba ahụ. Ruo ihe karịrị afọ iri, mụ na Joyce si otú a mata ụmụnna anyị, anyị ṅụrịkwara ọṅụ n’ọganihu ime mmụọ ha. N’oge ahụ, anyị letakwara ụmụnna anyị na Botswana na Mozambique.

Ịga Ebe Ọzọ

Mgbe anyị jisịrị obi ụtọ nọọ ọtụtụ afọ n’ebe ndịda Africa, na 1975, e zigara anyị Sierra Leone, n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa. N’oge na-adịghị anya, anyị gara nọrọ n’alaka ụlọ ọrụ, bụ́ ebe ọhụrụ e kenyere anyị ọrụ, ma anyị anọteghị aka. Amalitere m ịrịa ọrịa na inwe ike ọgwụgwụ n’ihi ọrịa ịba rịasiri m ike, emesịkwara m gaa nara ọgwụgwọ na London, bụ́ ebe a dụrụ m ọdụ ka m ghara ịlaghachi Africa. Nke a wutere anyị, ma ezinụlọ Betel dị na London jiri ịhụnanya nabata mụ na Joyce. Ọtụtụ ụmụnna ndị Africa nọ n’ọgbakọ ndị dị na London mekwara ka ọ dị anyị ka ànyị ka nọ ebe anyị nọbu. Ka ahụ́ ike m nọ na-akawanye mma, anyị nwetara ọrụ ọzọ, a gwara m ka m na-elekọta Ngalaba Na-ahụ Maka Ịzụta Ihe. N’ihi mmụba ndị e nwere n’afọ ndị sochirinụ, nke a abụwo ọrụ na-atọ ụtọ.

Ná mmalite nke afọ ndị 1990, ezigbo nwunye m bụ́ Joyce malitere ịrịa otu ụdị ọrịa akwara, ọ nwụkwara na 1994. Ọ bụwo nwunye na-ahụ na-anya, nke na-eguzosi ike n’ihe, na nke kwesịrị ntụkwasị obi, na-adị njikere mgbe nile ịnagide ọnọdụ ọ bụla chere anyị ihu. Iji nagide mfu dị otú a, achọpụtawo m na ọ dị mkpa ịnọgide na-eji nnọọ ihe ime mmụọ akpọrọ ihe ma na-elepụ anya n’ihu. Iji ekpere na-agbaso ezi usoro ihe omume ọchịchị Chineke, gụnyere ime nkwusa, na-enyekwara m aka itinye uche m n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu.—Ilu 3:5, 6.

Ije ozi na Betel bụ ihe ùgwù na ụzọ ndụ dị mma. E nwere nnọọ ọtụtụ ndị ntorobịa mụ na ha so arụ ọrụ, anyị na-enwekwa ọṅụ dị ukwuu. Otu ngọzi anyị na-enwe bụ ọtụtụ ndị ọbịa na-eleta anyị na London. Mgbe ụfọdụ, ana m ahụ ezigbo ndị enyi m bụ́ ndị si n’ebe ndị m jere ozi n’Africa bịa, ana m echetaghachi ihe ndị na-enye obi ụtọ mere n’oge gara aga. Ihe ndị a nile na-enyere m aka ịnọgide na-anụ ụtọ “ndụ dị ugbu a” ruo n’isi na iji obi ike na olileanya na-eche banyere ndụ “nke ahụ gaje ịbịa.”—1 Timoti 4:8.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara na 1928, ma a dịghịzi ebipụta ya.

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụ na mama m na 1946

[Foto dị na peeji nke 26]

Mụ na Joyce n’ụbọchị agbamakwụkwọ anyị na 1950

[Foto dị na peeji nke 26]

Ná mgbakọ e nwere na Bristol na 1953

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Ije ozi n’ìgwè dịpụrụ adịpụ (n’elu) na n’otu ọgbakọ (n’ala) dị na Southern Rhodesia, nke bụ́zi Zimbabwe