Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgbasawanye Ozi Ọma ahụ n’Ebe Iso Ụzọ Kraịst Mere nke Ọma n’Otu Oge

Ịgbasawanye Ozi Ọma ahụ n’Ebe Iso Ụzọ Kraịst Mere nke Ọma n’Otu Oge

Ịgbasawanye Ozi Ọma ahụ n’Ebe Iso Ụzọ Kraịst Mere nke Ọma n’Otu Oge

ỊTALI, bụ́ ala ọdịdị ya yiri buutu nke dị n’ụsọ Oké Osimiri Mediterenian, bụ ebe ihe omume okpukpe na nke ọdịnala metụtaworo akụkọ ihe mere eme nke ụwa. Ịma mma nke ọdịdị ala ya ndị dịgasị iche, ọrụ nkà ya ndị na-ewu ewu, na nri ya ndị bụ́ eri amịcha aka na-adọta ọtụtụ ndị njem nleta. Nkụzi Bible na-agakwa nke ọma n’obodo a.

Ọ pụrụ ịbụ na mgbe mbụ Iso Ụzọ Kraịst rutere Rom—isi obodo nke ike ọchịchị ụwa e nwere mgbe ahụ—bụ mgbe ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu bụ́ ndị ghọrọ Ndị Kraịst na Pentikọst 33 O.A. si Jeruselem lọta. Ihe dị ka n’afọ 59 O.A., Pọl onyeozi letara Ịtali nke mbụ ya. N’obodo Putiolaị nke dịdebere osimiri, ọ “hụrụ ụmụnna” Ndị Kraịst.—Ọrụ 2:5-11; 28:11-16.

Dị ka Jizọs na ndịozi ya buru n’amụma, tupu ngwụsị nke narị afọ mbụ O.A., ndị jụrụ ezi ofufe jiri nwayọọ nwayọọ si n’ezi Iso Ụzọ Kraịst dapụsịa. Otú ọ dị, tupu ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a, ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs ebutewo ụzọ n’ikwusa ozi ọma ahụ gburugburu ụwa—gụnyere Ịtali.—Matiu 13:36-43; Ọrụ 20:29, 30; 2 Ndị Tesalonaịka 2:3-8; 2 Pita 2:1-3.

Mmalite Na-adịghị Agba Ume

N’afọ 1891, Charles Taze Russell, bụ́ onye na-eduzi ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ nke Ndị Mmụta Bible mgbe ahụ (dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ), letara obodo ụfọdụ dị n’Ịtali nke mbụ ya. O kwetara nnọọ na ihe si n’ozi o jere n’ebe ahụ pụta adịghị agba ume, na-asị: “Ọ dịghị ihe anyị hụrụ nke ga-eme ka anyị nwee olileanya na a ga-enwe owuwe ihe ubi ọ bụla n’Ịtali.” N’oge opupu ihe ubi nke 1910, Nwanna Russell gara Ịtali ọzọ ma kwuo okwu dabeere na Bible n’otu ụlọ egwuregwu dị n’etiti Rom. Gịnị si na ya pụta? Ọ kọrọ, sị: “Nzukọ ahụ agaghị nnọọ otú e si tụọ anya ya.”

N’ezie, ruo iri afọ ole na ole, nkwusa nke ozi ọma ahụ agachaghị nke ọma n’Ịtali, otu ihe so kpata ya bụ na ọchịchị aka ike Fascist kpagburu Ndịàmà Jehova. N’oge ahụ, Ndịàmà Jehova nọ n’obodo ahụ akarịghị otu narị na iri ise, bụ́ ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha mụtara eziokwu Bible n’aka ndị ikwu na ndị enyi ha bi ná mba ofesi.

Ọganihu Na-atụ n’Anya

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri, e zigara ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ n’Ịtali. Ma, dị ka akwụkwọ ozi ndị a chọtara n’ebe ndị ọchịchị na-edebe ihe gosiri, ndị nọ n’ọkwá dị elu na Vatican gwara ndị gọọmenti ka ha chụlaa ndị ozi ala ọzọ ahụ. A manyere ndị ozi ala ọzọ ahụ ịhapụ mba ahụ ma e wezụga mmadụ ole na ole n’ime ha.

N’agbanyeghị ihe mgbochi ndị e nwere, ìgwè mmadụ n’Ịtali malitere inuga ‘n’ugwu’ nke ofufe Jehova. (Aịsaịa 2:2-4) Ọnụ ọgụgụ Ndịàmà amụbawo nnọọ n’ụzọ dị ịrịba ama. N’afọ 2004, e nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa dị narị puku abụọ na iri puku atọ na atọ, narị ise na iri abụọ na asaa, nke a pụtara na otu onye ga-ekwusara narị mmadụ abụọ na iri anọ na asatọ bi ebe ahụ ozi ọma, narị puku mmadụ anọ na iri puku atọ na atọ, narị abụọ na iri anọ na abụọ bịakwara Ncheta nke ọnwụ Kraịst. E nwere puku ọgbakọ Ndịàmà Jehova atọ na iri anọ na itoolu na-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị na-eru ahụ́ ala. N’oge na-adịbeghị anya, e nwewo uto buru ibu kpọmkwem n’etiti ụfọdụ ndị bi ebe ahụ.

Ikwusa Ozi Ọma n’Ọtụtụ Asụsụ

Ọtụtụ mmadụ na-esi Africa, Eshia, na Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe akwabata n’Ịtali iji chọta ọrụ ka mma ma ọ bụ iji bie ndụ ka mma ma ọ bụkwanụ, mgbe ụfọdụ, iji gbanahụ ọnọdụ ndị tara akpụ. Olee otú a pụrụ isi nyere ọtụtụ nde mmadụ a aka n’ụzọ ime mmụọ?

Ọtụtụ Ndịàmà nọ n’Ịtali anakwerewo ihe ịma aka nke ịmụ asụsụ ndị siri ike, dị ka Albanian, Amharic, Arabic, Bengali, Chinese, Punjabi, Sinhala, na Tagalog. Malite n’afọ 2001, e duziri ihe ọmụmụ iji kụziere ndị a na-anụ ọkụ n’obi ịgba àmà n’asụsụ mba ọzọ. N’ime afọ atọ gara aga, puku Ndịàmà atọ, narị asaa na iri na otu gara ihe ọmụmụ 79 n’asụsụ 17. Nke a emewo ka o kwe ha omume ihiwe na iwusi otu narị ọgbakọ na iri anọ na isii na narị ìgwè abụọ na iri asaa na anọ ji asụsụ 25 eme ihe ike. Ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu esiwo otú a nụ ozi ọma ahụ ma malite ịmụ Bible. Mgbe mgbe, a na-enwe ihe ndị pụrụ iche na-esi na ya apụta.

Otu Onyeàmà Jehova gwara George, bụ́ onye India na-asụ asụsụ Malayalam, banyere Bible. N’agbanyeghị na o nwere nnukwu nsogbu n’ihe metụtara ọrụ, George ji obi ụtọ nabata ọmụmụ Bible. Ụbọchị ole na ole ka nke ahụ gasịrị, enyi George bụ́ Gil, bụ́ onye India na-asụ Punjabi, gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, a malitekwaara ya ọmụmụ Bible. Gil kọwaara Ndịàmà onye David, bụ́ onye India na-asụ Telugu, bụ. N’oge na-adịghị anya, David malitere ịmụ Bible. Ndị India abụọ ọzọ, bụ́ Sonny na Shubash, na David bi n’otu ụlọ. Ha abụọ sonyere n’ọmụmụ Bible ahụ.

Izu ole na ole ka e mesịrị, Dalip, bụ́ onye na-asụ Marathi, kpọrọ Ndịàmà na telifon. O kwuru, sị: “Abụ m enyi George. Ùnu nwere ike ịkụziri m Bible?” Sumit, bụ́ onye na-asụ Tamil, rịọkwara ka a mụwara ya Bible. N’ikpeazụ, enyi George ọzọ kpọrọ na telifon ma rịọ ka a bịa duziwere ya ọmụmụ Bible. George kpọtaziri nwa okorobịa ọzọ, bụ́ Max, n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ya onwe ya kwa rịọrọ ka a malite ịmụrụ ya Bible. Ka ọ dị ugbu a, a na-eduziri mmadụ isii ọmụmụ Bible, a na-emekwa ndokwa ịmalite iduziri mmadụ anọ ọzọ. A na-eduzi ha na Bekee, ọ bụ ezie na a na-ejikwa akwụkwọ ndị e dere n’asụsụ Hindi, Malayalam, Marathi, Punjabi, Tamil, Telugu, na Urdu eme ihe.

Ndị Ogbi “Anụ” Ozi Ọma Ahụ

E nwere ihe karịrị iri puku ndị ogbi itoolu n’Ịtali. Ihe dị ka n’afọ 1975, Ndịàmà malitere ilebara ịkụziri ha eziokwu Bible anya. Ná mmalite, ụfọdụ Ndịàmà bụ́ ndị ogbi kụziiri ndị ozi ibe ha bụ́ ndị chọrọ inye aka n’akụkụ ahụ Ụdị Asụsụ Ogbi Ịtali (ISL). Ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị ogbi maliteziri igosi mmasị na Bible. Ihe karịrị otu puku mmadụ na narị anọ bụ́ ndị na-asụ ISL na-abịa nzukọ Ndị Kraịst ugbu a. Ọgbakọ 15 na ìgwè 52 na-enwe nzukọ n’asụsụ ISL.

Ná mmalite, ọ na-abụkarị Ndịàmà n’otu n’otu na-agbara ndị ogbi àmà n’onwe ha. Ma n’afọ 1978, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị n’Ịtali malitere ịhazi mgbakọ maka ndị ogbi. N’ọnwa May nke afọ ahụ, a mara ọkwa na ná mgbakọ mba nile a na-aga inwe na Milan, a ga-enwe ebe e wepụtara maka ndị ogbi. E nwere mgbakọ sekit mbụ maka ndị ogbi n’Ụlọ Mgbakọ dị na Milan na February 1979.

Kemgbe ahụ, alaka ụlọ ọrụ ahụwo nnọọ na a na-enye ndị ogbi nri na-edozi ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ site n’ịgba ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị nkwusa ozi ọma ume ịmụtakwu asụsụ a. Kemgbe 1995, e zigawo ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche (ndị na-ezisa ozi ọma oge nile) n’ìgwè ụfọdụ ịzụ ndị ogbi bụ́ Ndịàmà n’ozi na ịhazi nzukọ Ndị Kraịst. Ụlọ Mgbakọ atọ nwere ngwá vidio ọgbara ọhụrụ iji mee ka ọ dịkwuo mfe ịhụ ihe a na-eme. E nwekwara ihe nkiri vidio Ndị Kraịst bụ́ ndị e ji enye ndị ogbi nri ime mmụọ.

Ndị mmadụ ahụwo na Ndịàmà na-egbo mkpa ime mmụọ nke ndị ogbi nke ọma. P@role & Segni, bụ́ magazin Òtù Ndị Ogbi Ịtali na-ebipụta, hotara ihe dị n’otu akwụkwọ ozi onye ụkọchukwu Katọlik dere, sị: “Ọ bụ ezigbo nsogbu mmadụ ịbụ onye ogbi n’ihi na ọ na-adị mkpa ilebara ya anya mgbe nile. Dị ka ihe atụ, ịbịa chọọchị n’onwe ya anaghị abụrụ ya nsogbu, ma ọ dị ya mkpa inwe onye ga na-atapịara ya ihe nile a na-agụ, ihe nile a na-ekwusa, ma ọ bụ abụ nile a na-abụ na chọọchị.” Magazin ahụ kwukwara na ụkọchukwu ahụ “kwetara na ọ bụ ihe dị mwute na chọọchị adịbeghị njikere ime ihe banyere nkwarụ ahụ, o kwukwara na a ga-aka elebara ndị ogbi anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova karịa na chọọchị.”

E Kwusaara Ndị Mkpọrọ Ozi Ọma

Mmadụ ọ̀ pụrụ inwere onwe ya mgbe ọ ka nọ n’ụlọ mkpọrọ? Ee, n’ihi na Okwu Chineke nwere ikike ime ka ndị nabatara ya ma tinye ya n’ọrụ ná ndụ ha “nwere onwe” ha. Ozi Jizọs ziri “ndị a dọọrọ n’agha” bụ nnwere onwe pụọ ná mmehie na okpukpe ụgha. (Jọn 8:32; Luk 4:16-19) N’Ịtali, a na-arụpụta ihe ndị magburu onwe ha site n’ikwusa ozi ọma n’ụlọ mkpọrọ. Ndị ọchịchị enyewo ihe fọrọ nke nta ka o ruo narị Ndịàmà Jehova anọ ikike ileta ndị mkpọrọ iji nyere ha aka n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bụ ndị mbụ na-abụghị ndị Katọlik rịọrọ ka e nye ha ikike dị otú ahụ ma nweta ya.

A pụrụ isi n’ụzọ ndị a na-atụghị anya ha gbasaa ozi Bible. Ndị mkpọrọ nwere ike ịgwa ibe ha banyere ọrụ nkụzi Bible nke Ndịàmà Jehova. Ụfọdụ n’ime ndị mkpọrọ ahụ arịọwokwa n’onwe ha ka Onyeàmà leta ha. Ma ọ bụ, ndị òtù ezinụlọ nke onye mkpọrọ bụ́ ndị maliterela ịmụ Bible agbaa onye mkpọrọ ahụ ume ka ọ rịọ ka Ndịàmà leta ya. Ụfọdụ ndị a tụrụ mkpọrọ mkpụrụ ọka maka igbu ọchụ na oké mpụ ndị ọzọ echegharịwo ma gbanwee ndụ ha kpamkpam. Nke a na-akwadebe ha maka ịrara ndụ ha nye Jehova Chineke na ịbụ ndị e mere baptizim.

N’ọtụtụ ụlọ mkpọrọ, e mewo ndokwa ikwu okwu ihu ọha ndị dabeere n’isiokwu dị iche iche nke Bible, icheta ọnwụ Jizọs, na igosi kaseti vidio ndị dabeere na Bible bụ́ ndị Ndịàmà Jehova wepụtara. Mgbe mgbe, ọtụtụ ndị mkpọrọ na-abịa nzukọ ndị a.

Iji nyere ndị mkpọrọ aka n’ụzọ ndị dị irè, Ndịàmà ekesawo ọtụtụ magazin ndị na-ekwu banyere isiokwu ndị ga-enyere ndị mkpọrọ aka. Otu n’ime magazin ndị dị otú ahụ bụ Teta! nke May 8, 2001, bụ́ nke tụlere isiokwu bụ́ “À Pụrụ Ime Ka Ndị Mkpọrọ Gbanwee?” Nke April 8, 2003, tụlere isiokwu bụ́ “Ọ Bụrụ na Onye Òtù Ezinụlọ Na-eji Ọgwụ Ọjọọ Eme Ihe—Gịnị Ka Ị Pụrụ Ime?” E nyewo ndị mkpọrọ ọtụtụ puku magazin ndị a. N’ihi ya, a na-eduziri ọtụtụ narị mmadụ ọmụmụ Bible. Ụfọdụ ndị nche ụlọ mkpọrọ egosiwokwa mmasị n’ozi Bible.

Mgbe otu onye mkpọrọ aha ya bụ Costantino natasịrị ndị isi ụlọ mkpọrọ ikike pụrụ iche, e mere ya baptizim n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na San Remo, otu narị Ndịàmà na iri atọ na asatọ bi n’ógbè ahụ bịakwara. Costantino bụ́ onye obi jupụtara n’aṅụrị kwuru, sị: “Ọ dị m ka è jiri ịhụnanya saa m ahụ́.” Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’ógbè ahụ hotara ihe onye nlekọta ụlọ mkpọrọ ahụ kwuru: “Ọ bụụrụ anyị nnọọ ihe obi ụtọ . . . inye ya ikike ime ihe a. Ihe ọ bụla ga-eme ka ndị mkpọrọ meziwanye otú ha na ndị mmadụ si emekọrịta ihe, àgwà ha, na ọnọdụ ime mmụọ ha kwesịrị ka e chebara ya echiche.” Obi dị nnọọ nwunye Costantino na nwa ya nwanyị ụtọ maka otú ihe ọmụma ziri ezi nke Bible siworo metụta ndụ Costantino: “Anyị ji ya eme ọnụ n’ihi mgbanwe ndị o meworo. Ọ ghọwo onye na-eme udo, ọ nọwokwa na-elebakwuru anyị anya. Anyị amaliteghachila ịtụkwasị ya obi na ịkwanyere ya ùgwù.” Ha onwe ha kwa amalitela ịmụ Bible na ịga nzukọ Ndị Kraịst.

A tụrụ Sergio, bụ́ onye a mara ikpe maka izu ohi, iji égbè apụnara mmadụ ihe, ibu ahịa iwu, na igbu ọchụ, ikpe ịnọ mkpọrọ ruo afọ 2024. Mgbe o nyochasịrị Akwụkwọ Nsọ ruo afọ atọ ma gbanwee ndụ ya, Sergio kpebiri ịbụ onye e mere baptizim. Ọ bụ onye mkpọrọ nke 15 n’ụlọ mkpọrọ Porto Azzurro, nke dị n’agwaetiti Elba, nke e mere baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọtụtụ ndị mkpọrọ ibe ya bịara lere baptizim ya, bụ́ nke weere ọnọdụ n’obere ọdọ mmiri a rụrụ n’ebe egwuregwu ụlọ mkpọrọ ahụ.

Leonardo, bụ́ onye a tụrụ mkpọrọ afọ 20, natara ikike pụrụ iche ịbụ onye e mere baptizim n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Parma. Mgbe ndị nta akụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’ógbè ya gbara ya ajụjụ ọnụ, Leonardo kwuru na ya chọrọ “ime ka o doo anya na ya ekpebiwo ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ bụghị iji mee ka a tọhapụ ya n’ụlọ mkpọrọ, kama iji gboo agụụ ime mmụọ na-agụsi ya ike.” Leonardo kwuru, sị: “Emewo m ọtụtụ ihe ọjọọ ná ndụ m, ma agbahapụwo m ha. Agbanwewo m, ọ bụ ezie na ọ dịghịrị m mfe. Ọ dị m mkpa ịnọgide na-eme ihe ziri ezi.”

Salvatore, bụ́ onye a mara ikpe maka igbu ọchụ, nọ n’ụlọ mkpọrọ nwere ọtụtụ ihe nchebe dị na Spoleto. Baptizim ya, bụ́ nke e mere n’ime ogige ụlọ mkpọrọ ahụ, dọọrọ mmasị ọtụtụ ndị. Onye nlekọta ụlọ mkpọrọ ahụ kwuru, sị: “E kwesịrị ime ka ọha na eze mara mkpa ọ dị ime nhọrọ ga-eme ka mmadụ na-akpasokwu ndị ọzọ àgwà ọma, nke a ga-abara ma ndị mkpọrọ ma ọha na eze uru.” N’ihi mgbanwe ndị Salvatore meworo, nwunye ya na nwa ya nwanyị na-aga nzukọ Ndịàmà Jehova ugbu a. E mere otu onye mkpọrọ nke Salvatore gbaara àmà baptizim dị ka ohu Jehova raara onwe ya nye.

Ịtali so n’ebe ndị Iso Ụzọ Kraịst gbasara ná mmalite ya. (Ọrụ 2:10; Ndị Rom 1:7) N’oge owuwe ihe ubi a, uto na mmụba ime mmụọ ka na-aga n’ihu n’otu ebe ndị ahụ Pọl na Ndị Kraịst ibe ya rụsiri ọrụ ike n’ikwusa ozi ọma ahụ.—Ọrụ 23:11; 28:14-16.

[Map dị na peeji 13]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

ỊTALI

Rom

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ụlọ Mgbakọ Bitonto na ọgbakọ na-asụ Ụdị Asụsụ Ogbi Ịtali nke dị na Rom

[Foto dị na peeji nke 16]

Eziokwu Bible na-eme ka ndị mkpọrọ “nwere onwe ha”

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

A ka na-enwe uto ime mmụọ n’ebe Iso Ụzọ Kraịst mere nke ọma n’otu oge