Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ—Ọ̀ Bụ Ngọzi Ka Ọ̀ Bụ Ọbụbụ Ọnụ?

Ọrụ—Ọ̀ Bụ Ngọzi Ka Ọ̀ Bụ Ọbụbụ Ọnụ?

Ọrụ—Ọ̀ Bụ Ngọzi Ka Ọ̀ Bụ Ọbụbụ Ọnụ?

“Ọ dịghị ezi ihe dị n’ime mmadụ [ma ọ bụghị ime] ka mkpụrụ obi ya hụ ezi ihe n’ime ndọgbu nke ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ.”—Eklisiastis 2:24.

“IKE na-agwụ m mgbe m rụsịrị ọrụ ụbọchị.” N’otu nchọpụta e mere n’oge na-adịbeghị anya, nke ahụ bụ otú otu onye n’ime mmadụ atọ ọ bụla ná ndị e were n’ọrụ si kọwaa mmetụta ha na-enwekarị. Nke a abụghịrị ndị bi n’ebe a na-enwe nrụgide ihe ijuanya; ha na-arụ ọrụ ruo ogologo oge karị ma na-eji ọrụ ka ukwuu ala n’ụlọ—ma nwee ndị isi ọrụ na-adịghị ekelekarị ha maka ọrụ ha.

Mmalite nke imepụta ngwá ahịa n’ụba emeela ka ọtụtụ ndị ọrụ chee na ha bụ ndị na-arụpụta nanị obere ihe n’ime nnukwu ụlọ ọrụ na-adịghị echebara ha echiche. A na-ekpuchikarị ọgụgụ isi na nkà. Nke a na-emetụta nnọọ àgwà ndị mmadụ na-enwe banyere ọrụ. Ọ na-adị nnọọ mfe ịbịanyụ mmasị mmadụ na-enwe n’ọrụ ya. A pụrụ imenyụ ọchịchọ mmadụ ịbụ ọkà n’ọrụ aka ya. Ihe ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka mmadụ gharazie inwe mmasị n’ọrụ ahụ, ikekwe mee ka onye ahụ kpọọ ọrụ ya asị.

Inyocha Àgwà Anyị

N’ezie, ọ bụghị mgbe nile ka anyị pụrụ ịgbanwe ọnọdụ anyị. Otú ọ dị, ọ̀ bụ na i kwetaghị na anyị pụrụ ịgbanwe àgwà anyị? Ọ bụrụ na ị chọpụta na, ruo n’ókè ụfọdụ, ị na-enwe àgwà na-adịghị mma banyere ọrụ, ọ ga-abara gị uru ịtụle echiche na ụkpụrụ Chineke ndị metụtara isiokwu a. (Eklisiastis 5:18) Ọtụtụ ndị achọpụtala na ịtụle ihe ndị a emeela ka ha nwetatụ obi ụtọ na afọ ojuju n’ọrụ ha.

Chineke bụ Onye Ọrụ Kasịnụ. Chineke bụ onye ọrụ. Ikekwe, anyị esibeghị otú ahụ lee ya anya, ma nke ahụ bụ otú o si buru ụzọ kọwaa onwe ya na Bible. Ihe ndekọ Jenesis malitere site n’ikwu na Jehova kere eluigwe na ụwa. (Jenesis 1:1) Chee banyere ọrụ dị iche iche Chineke rụrụ mgbe o bidoro ike ihe—omenkà, onye nhazi, injinia, onye ọkà n’ise ihe, ọkà n’ịhọrọ ngwá ọrụ kwesịrị ekwesị, ọkà n’ihe owuwu, ọkà n’ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ihe, ọkà n’ihe ndị dị ndụ, ọkà n’ihe banyere ndụ ụmụ anụmanụ, ọkà n’ịhazi ihe, ọkà n’asụsụ, ikwu nanị ole na ole.—Ilu 8:12, 22-31.

Olee otú ọrụ Chineke dịruru ná mma? Ihe ndekọ Bible na-ekwu na “ọ dị mma,” na “ọ dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:4, 31) N’ezie, ihe e kere eke “na-akọ nsọpụrụ Chineke,” anyị onwe anyị kwesịkwara ito ya!—Abụ Ọma 19:1; 148:1.

Otú ọ dị, ọrụ Chineke akwụsịghị mgbe o kere eluigwe na ala a na-ahụ anya na mmadụ abụọ mbụ ahụ. Ọkpara Jehova, bụ́ Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Nna m anọgidewo na-arụ ọrụ ruo ugbu a.” (Jọn 5:17) Ee, Jehova anọgidewo na-arụ ọrụ site n’igbo mkpa ihe ndị o kere eke, ịkwagide ha na ichebe ndị na-efe ya ofufe kwesịrị ntụkwasị obi. (Nehemaịa 9:6; Abụ Ọma 36:6; 145:15, 16) Ọ na-eji ọbụna ụmụ mmadụ, “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ,” arụ ọrụ ụfọdụ.—1 Ndị Kọrint 3:9.

Ọrụ pụrụ ịbụ ngọzi. Ọ̀ bụ na Bible ekwughị na ọrụ bụ ọbụbụ ọnụ? Jenesis 3:17-19 pụrụ iyi ka ọ̀ na-egosi na Chineke nyere Adam na Iv ntaramahụhụ n’ihi nnupụisi ha site n’ibo ha ibu arọ nke ịrụ ọrụ. Mgbe Chineke na-ama mmadụ abụọ mbụ ahụ ikpe, ọ gwara Adam, sị: “N’ọsụsọ ihu gị ka ị ga-eri nri, ruo mgbe ị ga-alọta n’ala.” Nke ahụ ọ̀ bụ ịbụ ọrụ nile ọnụ?

Ee e. Kama nke ahụ, n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi nke Adam na Iv, a gaghị agbasa Paradaịs Iden ahụ n’oge ahụ. Chineke bụrụ ala ọnụ. Ọsụsọ na mmadụ ịdọgbu onwe ya n’ọrụ bụ ihe a chọrọ n’aka mmadụ iji nweta ihe ọ ga-eri site n’ala.—Ndị Rom 8:20, 21.

Kama ịkọwa ọrụ dị ka ọbụbụ ọnụ, Bible na-egosi na ọ bụ ngọzi a ga-eji kpọrọ ihe. Dị ka e kwuru n’elu, Chineke n’onwe ya bụ onye na-arụsi ọrụ ike. Ebe ọ bụ na o kere ụmụ mmadụ n’onyinyo ya, Jehova enyela ha ume na ikike ịchịkwa ihe ndị o kere eke dị n’ụwa. (Jenesis 1:26, 28; 2:15) Chineke nyere ha ọrụ ahụ tupu ya ekwuo okwu ndị ahụ dị na Jenesis 3:19. Ọ bụrụ na ọrụ bụ ọbụbụ ọnụ, nakwa na ọ bụ ihe ọjọọ, Jehova agaraghị agwa ndị mmadụ ka ha na-arụ ya. Noa na ezinụlọ ya nwere ọrụ dị ukwuu ịrụ tupu Iju Mmiri ahụ na mgbe ọ gasịrị. N’oge Ndị Kraịst, a gbakwara ndị na-eso ụzọ Jizọs ume ịrụ ọrụ.—1 Ndị Tesalonaịka 4:11.

N’agbanyeghị nke ahụ, anyị nile maara na ọrụ pụrụ ịdị na-agwụ ike n’oge a. Nrụgide, ihe ize ndụ, ịtụ ọ̀bọ̀, ihe agaghị ka e si chee ya, asọmpi, aghụghọ na ikpe na-ezighị ezi bụ nanị ụfọdụ n’ime “ogwu na uke” ndị e ji mara ọrụ n’oge a. Ma ọrụ n’onwe ya abụghị ọbụbụ ọnụ. N’Eklisiastis 3:13, Bible na-akpọ ọrụ na ihe ndị na-esi na ya apụta onyinye sitere n’aka Chineke.—Lee igbe bụ́ “Ịnagide Nrụgide Ndị Ọrụ Na-akpata.”

Ị pụrụ iji ọrụ gị too Chineke. Kemgbe ụwa, a na-eto ndị mmadụ maka ịrụ ezigbo ọrụ na ime nke ọma n’ọrụ ha. Ịrụ ezigbo ọrụ bụ otu n’ime ihe ndị bụ́ isi na-egosi na mmadụ nwere echiche Bible banyere ọrụ. Chineke n’onwe ya na-arụ ọrụ ya nke ọma. O nyela anyị nkà na ikike, ọ chọkwara ka anyị jiri nkà anyị rụpụta ezigbo ihe. Dị ka ihe atụ, n’oge a na-ewu ụlọikwuu n’Izrel oge ochie, Jehova nyere ndị dị ka Bezalel na Ọhọliab amamihe, nghọta na ihe ọmụma, bụ́ nke nyeere ha aka ịrụ ọrụ nkà na ọrụ aka ndị a kapịrị ọnụ. (Ọpụpụ 31:1-11) Nke a na-egosi na Chineke nwere mmasị pụrụ iche n’abamuru, nkà, na akụkụ ndị ọzọ nke ọrụ ha.

Nke a na-emetụta nnọọ otú anyị si ele nkà na ọrụ anyị anya. Ọ na-enyere anyị aka ile ha anya dị ka onyinye sitere n’aka Chineke, bụ́ ndị a na-ekwesịghị iji gwurie egwu. N’ihi ya, a na-adụ Ndị Kraịst ọdụ ịdị na-arụ ọrụ ha dị ka à ga-asị na Chineke n’onwe ya na-enyocha ọrụ ha: “Ihe ọ bụla unu na-eme, jirinụ mkpụrụ obi dum na-arụ ya dị ka ọ bụ nye Jehova, ọ bụghịkwa nye ndị mmadụ.” (Ndị Kọlọsi 3:23) E nyere ndị ohu Chineke iwu iji ịdị uchu na-arụ ọrụ, si otú ahụ na-eme ka ozi Ndị Kraịst na-adọrọkwu mmasị ndị ọrụ ibe ha na ndị ọzọ.—Lee igbe bụ́ “Itinye Ụkpụrụ Bible n’Ọrụ n’Ebe Ọrụ.”

N’iburu nke a n’uche, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị otú ọrụ anyị na-adịru ná mma na otú anyị na-adịru uchu na ya. Ọrụ anyị ọ̀ ga-atọ Chineke ụtọ? Ànyị na-enwe nnọọ afọ ojuju n’otú anyị si arụ ọrụ ndị e kenyere anyị? Ma ọ́ bụghị otú ahụ, anyị kwesịrị imeziwanye ihe.—Ilu 10:4; 22:29.

Ekwela ka ọrụ kpagbuo ihe ime mmụọ. Ọ bụ ezie na a na-aja onye na-arụsi ọrụ ike mma, a ka nwere isi ihe ọzọ dị mkpa iji nweta afọ ojuju n’ọrụ na ná ndụ anyị. Ọ bụ ihe ime mmụọ. Eze Solomọn, bụ́ onye rụsiri ọrụ ike ma nụ ụtọ akụ̀ na ụba na ntụsara ahụ́ mmadụ pụrụ inweta ná ndụ, kwubiri, sị: “Tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.”—Eklisiastis 12:13.

O doro anya na anyị aghaghị ịtụle ihe bụ́ uche Chineke n’ihe ọ bụla anyị na-eme. Ànyị na-arụ ọrụ kwekọrọ n’uche ya, ka ọ̀ ga-abụ na anyị na-arụ ọrụ megidere uche ya? Ànyị na-agbalị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, ka ànyị na-achọ ime nanị ihe na-amasị anyị? Ọ bụrụ na anyị adịghị eme uche Chineke, anyị ga-emecha nwee obi nkoropụ, owu ọmụma, tọgbọrọkwa chakoo.

Steven Berglas kwuru na ndị isi ọrụ nwere oké ike ọgwụgwụ ‘na-achọrọ ezigbo ọrụ ga-enye ha obi ụtọ ma mee ka ọ bụrụ ọrụ ha ga na-arụ mgbe nile.’ Ọ dịghị ọrụ dị mma karịa ijere Onye ahụ nyere anyị nkà na ume ịrụ ọrụ ndị bara uru ozi. Ịrụ ọrụ nke na-eme Onye Okike anyị obi ụtọ ga-ewetara anyị afọ ojuju. Jizọs weere ọrụ Jehova nyere ya dị ka ihe na-edozi ahụ́, nke na-eju afọ, na nke na-enye ume ọhụrụ dị ka ihe oriri. (Jọn 4:34; 5:36) Chetakwa na Chineke, bụ́ Onye Ọrụ Kasịnụ, na-akpọ anyị òkù ịghọ ndị ha na ya “na-arụkọ ọrụ.”—1 Ndị Kọrint 3:9.

Ife Chineke na ito eto n’ụzọ ime mmụọ na-akwadebe anyị maka ọrụ na ibu ọrụ na-enye obi ụtọ. Ebe ọ bụ na ọrụ na-akpatakarị nrụgide na obi erughị ala, na-achọkwa ọtụtụ ihe n’aka anyị, okwukwe anyị siri ike na anyị iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe pụrụ inye anyị ume dị anyị mkpa ka anyị na-agbalị ịbụ ndị ọrụ ma ọ bụ ndị isi ọrụ ka mma. N’aka nke ọzọ, ihe ndị a na-ahụ ná ndụ n’ajọ ụwa a pụrụ ime ka anyị mara ebe ndị ọ dị anyị mkpa iwusikwu okwukwe anyị ike.—1 Ndị Kọrint 16:13, 14.

Mgbe Ọrụ Ga-abụ Ngọzi

Ndị na-agbalịsi ike ugbu a ijere Chineke ozi pụrụ ilepụ anya n’ihu ịhụ mgbe ọ ga-eweghachi Paradaịs, ọrụ na-eju afọ ga-ejupụtakwa n’ụwa nile. Onye amụma Jehova bụ́ Aịzaịa buru amụma banyere otú ndụ ga-adị n’oge ahụ, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie. . . . Ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.”—Aịsaịa 65:21-23.

Lee otú ọrụ ga-esi bụrụ ngọzi n’oge ahụ! Site n’ịmụta ihe bụ́ uche Chineke n’ebe ị nọ na ime ihe kwekọrọ na ya, soro ná ndị Jehova ahụ a gọziri agọzi ma ‘hụ ezi ihe mgbe nile ná ndọgbu nile ị na-adọgbu onwe gị n’ọrụ.’—Eklisiastis 3:13.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Chineke bụ Onye Ọrụ Kasịnụ: Jenesis 1:1, 4, 31; Jọn 5:17

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Ọrụ pụrụ ịbụ ngọzi: Jenesis 1:28; 2:15; 1 Ndị Tesalonaịka 4:11

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Ị pụrụ iji ọrụ gị too Chineke: Ọpụpụ 31:1-11; Ndị Kọlọsi 3:23

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Ekwela ka ọrụ kpagbuo ihe ime mmụọ: Eklisiastis 12:13; 1 Ndị Kọrint 3:9

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

ỊNAGIDE NRỤGIDE NDỊ ỌRỤ NA-AKPATA

Ndị ọkachamara n’ihe banyere nkà ọgwụ akọwaala nrụgide a na-enwe n’ebe ọrụ dị ka ihe ize ndụ ọrụ na-akpata. Ọ pụrụ ịkpata ọnyá afọ na ịda mbà n’obi, ọ pụkwara ọbụna iduga na mmadụ igbu onwe ya. Ndị Japan nwere ihe ha na-akpọ ya—karoshi, “ọnwụ oké ọrụ na-akpata.”

Ọtụtụ ihe ndị na-eme n’ebe ọrụ pụrụ ịkpata nrụgide. Ndị a na-agụnye ịgbanwe oge na ọnọdụ ọrụ, mmadụ na onyeisi ọrụ ya inwe nsogbu, ịgbanwe ihe mmadụ na-arụ ma ọ bụ ụdị ọrụ ya, ịla ezumike nká na ịbụ onye a chụrụ n’ọrụ. Ụfọdụ na-agbanwe ọrụ ha ma ọ bụ ebe ha na-arụ ya iji zere nrụgide dị otú ahụ. Ndị ọzọ na-achọ ikpuchi nrụgide dị otú ahụ ma mesịa chọpụta na ọ gaferela n’akụkụ ndị ọzọ nke ndụ, karịsịa n’ezinụlọ. Ụfọdụ mmadụ na-ata ahụhụ n’ụzọ mmetụta uche ma si otú a nwee ịda mbà n’obi na obi nkoropụ.

A kwadebere nnọọ Ndị Kraịst nke ọma ịlụso nrụgide ndị ọrụ na-akpata ọgụ. E nwere ọtụtụ ụkpụrụ ndị bụ́ isi dị n’ime Bible, bụ́ ndị pụrụ ịkwagide anyị n’oge ndị tara akpụ ma nwee mmetụta dị mma n’ọnọdụ ime mmụọ na nke mmetụta uche anyị. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru, sị: “Unu echegbula onwe unu ma ọlị maka echi, n’ihi na ụbọchị na-esonụ ga-enwe nchegbu nke ya. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya.” Agbamume a na-enye anyị ebe a bụ ka anyị lekwasị anya ná nsogbu nke taa, ọ bụghị na nke echi. N’ụzọ dị otú a, anyị na-ezere ime ka nsogbu anyị yie ka ha buru ibu karịa otú ha dị n’ezie, bụ́ nke ga-eme ka nrụgide anyị na-enwe bukwuo ibu.—Matiu 6:25-34.

Ọ dị Ndị Kraịst mkpa ịdabere n’ike Chineke, ọ bụghị na nke ha. Mgbe anyị chere na ọ dịghịzi ihe anyị ga-emeli, Chineke pụrụ inye anyị udo ya ma mee ka anyị nwee ọṅụ, nyekwa anyị amamihe iji nagide ihe isi ike ọ bụla. Pọl onyeozi dere, sị: “Nọgidenụ na-enweta ike n’ime Onyenwe anyị nakwa n’ịdị ike nke ume ya.”—Ndị Efesọs 6:10; Ndị Filipaị 4:7.

N’ikpeazụ, ọbụna ọnọdụ ndị na-akpata nrụgide pụrụ ịrụpụta ezi ihe. Ọnwụnwa pụrụ ime ka anyị legara Jehova anya, chọọ ya ma tụkwasị ya obi. Ọ pụkwara ime ka anyị nọgide na-azụlite àgwà Ndị Kraịst na ikike iji tachie obi ná nrụgide. Pọl na-adụ anyị ọdụ, sị: “Ka anyị na-enwe aṅụrị mgbe anyị nọ ná mkpagbu, ebe anyị maara na mkpagbu na-arụpụta ntachi obi; ntachi obi, n’aka nke ya, na-arụpụta ọnọdụ a nwapụtara anwapụta; ọnọdụ ahụ a nwapụtara anwapụta, n’aka nke ya, na-arụpụta olileanya.”—Ndị Rom 5:3, 4.

Ya mere, ọbụna nrụgide pụrụ ịbụ ihe mkpali maka uto ime mmụọ kama ịbụ ihe na-akpata obi nkoropụ na iru újú.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

ITINYE ỤKPỤRỤ BIBLE N’ỌRỤ N’EBE ỌRỤ

Omume na àgwà Onye Kraịst n’ebe ọrụ ya dị pụrụ ime ka ozi Bible dọrọ mmasị ndị ọrụ ibe ya na ndị ọzọ. N’akwụkwọ ozi o degaara Taịtọs, Pọl onyeozi gbara ndị nọ n’ọnọdụ yiri nke ndị e were n’ọrụ ume ka ha “na-edo onwe ha n’okpuru [ndị isi ọrụ] ha n’ihe nile, na-emekwa ihe dị ha ezi mma, ghara ịdị na-azaghachi n’ụzọ isi ike, ghara izu ohi, kama na-egosi ezi ikwesị ntụkwasị obi zuru ezu, ka ha wee chọọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma n’ihe nile.”—Taịtọs 2:9, 10.

Dị ka ihe atụ, tụlee ihe otu ọchụ ntá ego degaara isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova: “Ana m edetara unu akwụkwọ iji nata unu ikike iwe Ndịàmà Jehova n’ọrụ. Achọrọ m iwe ha n’ọrụ n’ihi na amaara m n’ezie na ha na-eme ihe n’eziokwu, bụrụkwa ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, ha agaghịkwa aghọgbu gị. Nanị ndị m tụkwasịrị obi n’ezie bụ Ndịàmà Jehova. Biko, nyerenụ m aka.”

Kyle bụ Onye Kraịst nke na-arụ ọrụ dị ka onye na-anabata ndị mmadụ n’otu ụlọ akwụkwọ na-abụghị nke gọọmenti. N’ihi nghọtahie, otu onye ọrụ ibe ya kpọrọ ya iyi n’ihu ụfọdụ ụmụ akwụkwọ. Kyle na-echeta, sị: “Aghaghị m ịkpachara anya ka m wee ghara iwetara aha Jehova nkọcha.” Kyle ji ụbọchị ise chee otú ọ pụrụ isi tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Otu n’ime ha dị ná Ndị Rom 12:18: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, bụrụnụ ndị ha na mmadụ nile na-adị n’udo.” O zigaara onye ọrụ ibe ya ahụ ozi e-mail ma rịọ ya mgbaghara maka esemokwu ahụ dị n’etiti ha. Kyle gwara onye ọrụ ibe ya ahụ ka o cheretụ ma ọrụ gbasaa ka ha kwurịta okwu ma dozie esemokwu ha. Mgbe ha mere nke ahụ, obi jụụrụ onye ọrụ ibe Kyle, o kwukwara na amamihe dị n’ihe Kyle mere. Ọ gwara Kyle, sị, “Nke a aghaghị ịbụ n’ihi okpukpe gị” ma makụọ ya n’ụzọ na-ekpo ọkụ mgbe ha chọrọ ịla. Gịnị bụ nkwubi okwu Kyle? “Anyị apụtụghị imehie ihe ma anyị tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ.”

[Foto dị na peeji nke 4, 5]

Ọtụtụ ndị ọrụ na-eche na ha bụ ndị na-arụpụta nanị obere ihe n’ime nnukwu ụlọ ọrụ na-adịghị echebara ha echiche

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ụlọ Ọrụ Japan Na-ahụ Maka Ihe Ọmụma, Onye Nnọchianya Ukwu nke Japan na New York

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 8]

Ụwa: Foto NASA