Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“A Kpagburu Ya n’Ihi Okwukwe Ya”

“A Kpagburu Ya n’Ihi Okwukwe Ya”

“A Kpagburu Ya n’Ihi Okwukwe Ya”

OBODO Cernobbio nke dị n’ebe ugwu Ịtali wuru ebe ncheta n’ogige ntụrụndụ obodo ahụ iji cheta ndị e gburu n’ihi ịchọ ihe ndị ruuru ha. Otu n’ime mbadamba nkume ndị e debere n’ebe ncheta ahụ kwuru banyere Narciso Riet. A mụrụ ya na Germany, ndị mụrụ ya bụkwa ndị Ịtali, Riet ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova n’afọ ndị 1930. N’oge ọchịchị Hitler, a kpagburu Ndịàmà Jehova n’ihi na ha jụrụ ibuli Hitler elu karịa ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova.

Mgbe ndị Gestapo chọpụtara na Riet so ná ndị na-ewebata Ụlọ Nche n’ime ogige ịta ahụhụ, ọ gbagara Cernobbio. N’ebe ahụ, a gwara ya ka ọ sụgharịa Ụlọ Nche gaa n’asụsụ Italian ma kesaara ya ndị kwere ekwe ibe ya nọ nso n’ebe ahụ. A chọpụtara ọrụ o ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ. Onyeisi ndị uwe ojii SS na ndị òtù ya tibatara n’ụlọ Riet, nwụchie ya ma jichie ihe akaebe nke “mpụ o mere”—Bible abụọ na akwụkwọ ozi ole na ole! A gbaara Riet ụgbọ nwa mkpi laghachi Germany, tụkpuo ya n’ogige ịta ahụhụ Dachau, e gbukwara ya obere oge tupu Agha Ụwa nke Abụọ ebie. Mbadamba nkume ahụ dị na Cernobbio kwuru na “a kpagburu ya n’ihi okwukwe ya.”

Okwukwe Narciso Riet na nke ọtụtụ narị Ndịàmà ndị ọzọ ndị ndị Nazi kpagburu bụ ihe agbamume nye Ndị Kraịst nke oge a ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova, bụ́ nanị Onye ha kwesịrị ife ofufe n’eluigwe na ala. (Mkpughe 4:11) Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị a kpagbuworo n’ihi ezi omume.” Chineke ga-echeta ọrụ ha nile ma gọzie ha n’ihi obi ike ha.—Matiu 5:10; Ndị Hibru 6:10.