Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Pụrụ Ịnagide Ọnwụnwa Ọ Bụla!

Anyị Pụrụ Ịnagide Ọnwụnwa Ọ Bụla!

Anyị Pụrụ Ịnagide Ọnwụnwa Ọ Bụla!

Ị̀ NA-ECHE ọnwụnwa ihu ugbu a ná ndụ gị? Ọ̀ na-adị gị ka i nweghị olileanya, ka à ga-asị na ị pụghị ịnagide ya? Ị̀ na-atụdị ụjọ mgbe ụfọdụ na nsogbu gị pụrụ iche, nakwa na o nweghị ngwọta? Ya bụrụ otú ahụ, nwee obi ike! N’agbanyeghị ọnwụnwa ndị anyị pụrụ iche ihu, Bible na-emesi anyị obi ike na Chineke pụrụ inyere anyị aka imeri ha.

Bible na-ekweta na ndị ohu Chineke ‘ga-ezute ọnwụnwa dị iche iche.’ (Jems 1:2) Rịba okwu ahụ bụ́ “iche iche” (Grik poi·kiʹlos) ama. Dị ka e si jiri ya mee ihe n’oge ochie, okwu Grik mbụ ya pụtara “bara ụba” ma ọ bụ “tụrụ àgwà dị iche iche” ma na-ezo nnọọ aka ‘n’ọnwụnwa dịgasị iche iche.’ N’ihi ya, “ọnwụnwa dị iche iche” bụ ọnwụnwa ndị tụrụ àgwà dị iche iche, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova na-akwado anyị ka anyị wee nwee ike ịnagide nke ọ bụla n’ime ha. Gịnị mere anyị pụrụ iji jide nke ahụ n’aka?

“Obiọma Na-erughịrị Mmadụ nke Chineke Bụ́ nke A Na-egosipụta n’Ụzọ Dị Iche Iche”

Pita onyeozi na-ekwu na e mewo ka Ndị Kraịst “ruo újú site n’ọnwụnwa dị iche iche.” (1 Pita 1:6) O mesịrị kwuo n’akwụkwọ ozi o dere site n’ike mmụọ nsọ na “obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke” bụ “nke a na-egosipụta n’ụzọ dị iche iche.” (1 Pita 4:10) Okwu ndị ahụ bụ́ “n’ụzọ dị iche iche” nwere otu ụdị nke okwu Grik mbụ ahụ. N’ikwu banyere okwu a, otu ọkà mmụta Bible na-ekwu, sị: “Nke a bụ okwu na-egosipụta nnọọ mmetụta. . . . Ikwu banyere ebere [ma ọ bụ, obiọma na-erughịrị mmadụ] nke Chineke dị ka poikilos pụtara na o nweghị ọnọdụ ọ bụla ụmụ mmadụ na-eche ihu nke ebere Chineke na-apụghị imeri.” Ọ gara n’ihu na-ekwu, sị: “O nweghị ọnọdụ, nsogbu, ihe mberede ma ọ bụ mkpa chọrọ ime ihe ngwa ngwa nke a pụrụ inwe bụ́ nke ebere Chineke na-apụghị imeri, na nke ebere Chineke na-apụghị ịnagide n’ụzọ gara nke ọma ma merie. O nweghị ihe na-eme ná ndụ nke ebere Chineke na-apụghị inyere mmadụ aka ịnagide. Okwu a nke na-akọwa ihe n’ụzọ doro anya bụ́ poikilos na-echetara anyị ebere Chineke nke pụrụ inye aka n’ọnọdụ ọ bụla, bụ́ nke ruru eru n’ezie inyere anyị aka ịnagide ihe nile.”

Obiọma Na-erughịrị Mmadụ nke Chineke Na-enyere Anyị Aka Ịnagide Ọnwụnwa

Dị ka Pita si kwuo, otu ụzọ Chineke si egosipụta obiọma ya na-erughịrị mmadụ bụ site n’ụdị mmadụ dịgasị iche mejupụtara ọgbakọ Ndị Kraịst. (1 Pita 4:11) Ohu Chineke nke ọ bụla nwere onyinye ime mmụọ, ma ọ bụ ikike, ndị pụrụ ịbụ isi iyi nke agbamume nye ndị na-eche ọnwụnwa ihu. (Ndị Rom 12:6-8) Dị ka ihe atụ, ụfọdụ n’ime ndị nọ n’ọgbakọ bụ ndị nkụzi pụtara ìhè nke Bible. Okwu ha ndị nwere ihe mmụta na-akpali ma na-akwali ndị ọzọ ịtachi obi. (Nehemaịa 8:1-4, 8, 12) Ndị ọzọ na-eme nleta ọzụzụ atụrụ n’ụzọ chiri anya n’ụlọ ndị nkasi obi dị mkpa. A na-eji nleta ndị dị otú ahụ agba ndị ahụ ume, ‘na-akasi ha obi.’ (Ndị Kọlọsi 2:2) Mgbe ndị nlekọta mere ụdị nleta ndị ahụ na-ewusi okwukwe ike, ha na-enye ndị ha letara onyinye ime mmụọ. (Jọn 21:16) A makwaara ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ n’ihi ihu ọchị ha, ọmịiko ha na n’ihi iji ịdị nro na-emeso ndị kwere ekwe ibe ha, bụ́ ndị ọnwụnwa kpatawooro mwute, ihe. (Ọrụ 4:36; Ndị Rom 12:10; Ndị Kọlọsi 3:10) Ọmịiko na enyemaka nke sitere n’aka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị ahụ na-ahụ n’anya bụ ngosipụta dị ịrịba ama nke obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke.—Ilu 12:25; 17:17.

“Chineke nke Nkasi Obi Nile”

Karịsịa, Jehova na-enye nkasi obi. Ọ bụ “Chineke nke nkasi obi nile, bụ́ onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu nile anyị.” (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Amamihe dị n’Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee na ike mmụọ nsọ ya na-enye bụ ụzọ ndị bụ́ isi Jehova si aza ekpere anyị maka enyemaka. (Aịsaịa 30:18, 21; Luk 11:13; Jọn 14:16) Anyị pụrụ inweta agbamume site ná nkwa Pọl onyeozi ji ike mmụọ nsọ kwee. O kwuru, sị: “Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ ịnagide, kama mgbe ọnwụnwa ahụ bịara ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ ka unu wee nwee ike idi ya.”—1 Ndị Kọrint 10:13.

Ee, n’agbanyeghị ụdị ọnwụnwa anyị na-eche ihu, obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke ga-enyere anyị aka imeri ya. (Jems 1:17) Enyemaka bịara n’oge ya na nkwado kwesịrị ekwesi nke Jehova nyere ndị ohu ya—n’agbanyeghị òkè ọnwụnwa ha ma ọ bụ ihe ịma aka ha haruru—bụ otu ihe àmà nke “amamihe dịgasị iche iche nke Chineke.” (Ndị Efesọs 3:10) Ọ̀ bụ na i kwetaghị?

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Jehova na-enyere anyị aka ịnagide ọnwụnwa anyị dị iche iche