Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ito Jehova n’Ụlọ Akwụkwọ

Ito Jehova n’Ụlọ Akwụkwọ

Ito Jehova n’Ụlọ Akwụkwọ

GBURUGBURU ụwa, ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova na-achọ ụzọ isi na-eto Chineke n’ụlọ akwụkwọ—ma n’okwu ma n’omume ha. Lee ụfọdụ ahụmahụ ndị gosipụtara ịnụ ọkụ n’obi ha.

E kenyere otu Onyeàmà na-eto eto na Gris ide ihe odide banyere mmetọ ikuku. Mgbe ọ chọsịrị na Watch Tower Publications Index, ọ chọtara ihe o ji dee ihe odide ahụ na magazin Teta!, ma kwuo ná mmechi ihe odide ya na ọ bụ na Teta! ka ya nwetara ihe ya dere. Onye nkụzi ya gwara ya na nke ahụ bụ ihe odide kasị mma ya gụtụrụla. Onye nkụzi ahụ mechara jiri ihe ọmụma ahụ mee ihe n’otu nnọkọ nkwurịta okwu, ọ rụpụtakwara ihe dị mma. N’ihi ya, nwanna nwanyị ahụ na-eto eto kpebiri iwegara onye nkụzi ahụ mbipụta Teta! ndị ọzọ, gụnyere nke nwere usoro isiokwu bụ́ “Ndị Nkụzi—Gịnị Ka Anyị Ga-eme Ma E Wezụga Ha?” Onye nkụzi ahụ mesịrị too magazin Teta! n’ihu ụmụ klas ya, ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ rịọkwara ka e nye ha nke ha. Nwanna nwanyị ahụ wetara ụfọdụ magazin n’ụlọ akwụkwọ ka ha nwee ike ịgụ isiokwu ndị ọzọ.

Ná mba Benin, nke dị n’Africa, otu Onye Kraịst dị afọ iri na ụma nwetara ụdị nrụgide a na-adịghị ahụkebe. N’ikwekọ n’ihe a na-emekarị n’ebe ahụ, ndị nne na nna nke ọtụtụ ụmụ akwụkwọ gbakọrọ aka chọta ndị nkụzi ha ga na-akwụ ụgwọ ka ha na-akụziri ụmụ ha ihe ọmụmụ ndị siri ike iji kwadebe ụmụaka ahụ maka ule. Otú ọ dị, ndị nkụzi ahụ họọrọ ụtụtụ Saturday dị ka ụbọchị ha ga na-akụziri ha ihe. Onyeàmà ahụ na-eto eto jụrụ, na-asị: “Ụtụtụ Saturday bụ mgbe ọgbakọ dum ji emekọ nkwusa ọnụ. Ọ bụ oge na-akasị atọ m ụtọ n’izu, ọ dịghịkwa ihe m ga-eji ya gbanwere!” Nna ya, bụ́ onye nanị ya na-azụ ụmụ nakwa Onyeàmà, kwetara ihe ahụ nwa ya kwuru ma gbalịa ime ka ụfọdụ ndị nne na nna na ndị nkụzi ahụ gbanwee ndokwa ahụ. Otú ọ dị, ha nile jụrụ. Nwata nwanyị ahụ kpebiri ịghara ịga ihe ọmụmụ ahụ. Kama nke ahụ, ọ na-eso ọgbakọ ya eme nkwusa. Ụmụ klas ya kwara ya emo, na-agba ya ume ka ọ kwụsị ịgba àmà ma hapụ Chineke ya. Ha kwenyesiri nnọọ ike na ọ ga-ada ule ahụ. Otú ọ dị, ihe si na ya pụta bụ na ụmụ akwụkwọ ahụ a kụziiri ihe dara ebe nwanna anyị nwanyị gafere n’ule ahụ. Ọ dịghịzi mkpa ikwu na ha kwụsịrị ịkwa ya emo. Ugbu a, ụmụ akwụkwọ ahụ na-agwa ya, sị, “I kwesịrị ịnọgide na-efe Chineke gị.”

Na Czech Republic, a gwara otu nwata nwanyị dị afọ 12 ka o dee ihe odide iji kọwaa otu akwụkwọ. Mama ya gbara ya ume ka o jiri akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ mee ihe. Ọ malitere ihe odide ya site n’ịjụ ajụjụ ndị bụ́: “Gịnị ka i chere? Ònye pụrụ ịbụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ?” Ọ kọwara onye Jizọs bụ, ndụ ya n’elu ala, nakwa ozizi ya. Ọ kọziri ihe dị n’otu isiakwụkwọ nke isiokwu ya bụ “Ihe Mmụta Banyere Ịgbaghara Mmehie.” Onye nkụzi ya tipụrụ, sị, “Nke ahụ bụ nkọwa kasị mma i detụrụla kemgbe m maara gị!” o jikwa obi ekele nara akwụkwọ ahụ. Ụmụ akwụkwọ ibe ya ụfọdụ chọkwara inweta nke ha. N’ụbọchị so ya, nwata ahụ nwere obi ụtọ ikesa mkpụrụ 18 nke akwụkwọ ahụ.

Ndị na-eto eto dị otú ahụ na-enwe obi ụtọ dị ukwuu n’ito Jehova n’ụlọ akwụkwọ. Anyị nile kwesịrị iṅomi ịnụ ọkụ n’obi ha.