Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-eto Eto, Toonụ Jehova!

Ndị Na-eto Eto, Toonụ Jehova!

Ndị Na-eto Eto, Toonụ Jehova!

“Toonụ Jehova site n’ụwa . . . ma ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọ.”—ABỤ ỌMA 148:7, 12.

1, 2. (a) Ihe mgbochi ndị dị aṅaa ka ọtụtụ ndị na-eto eto maara? (b) Olee ihe mere ndị na-eto eto na-ekwesịghị iji na-ewe iwe n’ihi ihe ndị nne na nna ha gbochiri ha ime?

NDỊ na-eto eto maara nke ọma ihe ndị a na-ekwebeghị ka ha na-eme. Ọtụtụ n’ime ha pụrụ ịgwa gị n’egbughị oge afọ ole ha ga-eru tupu a na-ekwe ka nanị ha gafee okporo ámá ma ọ bụ tupu a na-ekwe ka ha mụrụ anya ruo oge ụfọdụ n’abalị ma ọ bụ nyaa ụgbọala. Mgbe ụfọdụ, onye ntorobịa pụrụ iche na a na-aza ya otu ihe n’ihe ka ọtụtụ n’arịrịọ ndị o ji ịnụ ọkụ n’obi rịọ, “Chere ruo mgbe i totụkwuru.”

2 Unu bụ́ ndị na-eto eto maara na ndị nne na nna unu chere na ọ bụ ihe amamihe dị na ya igbochi unu ime ihe ndị dị otú ahụ, ma eleghị anya, iji chebe unu. Unu makwa nnọọ na ọ na-atọ Jehova ụtọ mgbe unu na-erubere ndị nne na nna unu isi. (Ndị Kọlọsi 3:20) Otú ọ dị, ọ̀ dị mgbe ị na-eche na ndụ gị amalitebeghị? È gbochiri gị ime ihe nile dị mkpa ruo mgbe i totụkwuru? Nke ahụ abụtụghị nnọọ eziokwu! E nwere ọrụ na-aga n’ihu taa bụ́ nke dị nnọọ mkpa karịa ihe ùgwù ọ bụla ị pụrụ ịdị na-eche ka i toruo. À ga-ekwe ka unu bụ́ ndị na-eto eto sonye n’ọrụ a? Ọ bụghị nanị na a ga-ekwe—Chineke nke Kachasị Ihe Nile Elu kpọrọ nnọọ unu òkù isonye na ya!

3. Olee ihe ùgwù Jehova na-akpọ ndị na-eto eto òkù inwe, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-atụle ugbu a?

3 Olee ọrụ anyị na-ekwu maka ya? Rịba ama ihe dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke isiokwu a dabeere na ya: “Toonụ Jehova site n’ụwa . . . ma ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọ; ndị agadi, ha na ụmụntakịrị.” (Abụ Ọma 148:7, 12) Nke a bụ ihe ùgwù dị ukwuu i nwere: Ị pụrụ ito Jehova. Dị ka onye na-eto eto, obi ọ̀ dị gị ụtọ ikere òkè n’ọrụ ahụ? Obi dị ọtụtụ ụtọ ime otú ahụ. Iji hụ ihe mere o ji baa uru ime otú ahụ, ka anyị tụlee ajụjụ atọ. Nke mbụ, n’ihi gịnị ka i kwesịrị iji too Jehova? Nke abụọ, olee otú ị pụrụ isi too ya n’ụzọ dị irè? Nke atọ, olee oge kwesịrị ekwesị ịmalite ito Jehova?

Gịnị Mere A Ga-eji Too Jehova?

4, 5. (a) Dị ka Abụ Ọma nke 148 si kwuo, olee ọnọdụ na-anwụ ibobo n’ahụ́ anyị nọ na ya? (b) Olee otú ihe ndị e kere eke ndị na-apụghị ikwu okwu ma ọ bụ tụgharịa uche ga-esi na-eto Jehova?

4 Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ mere a ga-eji eto Jehova bụ n’ihi na ọ bụ Onye Okike. Abụ Ọma nke 148 na-enyere anyị aka ịmata eziokwu a. Chegodị echiche: Ọ bụrụ na ị hụ otu ìgwè buru ibu ji otu olu na-abụ otu abụ dị ụtọ na nke na-akpali akpali, olee otú obi ga-adị gị? Gịnị ma ọ bụrụ na ị maara na ihe abụ ahụ na-ekwu bụ ihe ndị mere eme, ihe ndị ị maara na ha dị mkpa, na ha na-enye ọṅụ ma na-akpali akpali? Ị̀ ga-enwe ọchịchọ ịmụta okwu abụ ahụ ma sonyere ndị na-abụ ya? Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị ga-eme otú ahụ. Abụ Ọma nke 148 na-egosi na ị nọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ ma bụrụ nke na-akpali nnọọ akpali karị. Abụ ọma ahụ kọwara otu ìgwè buru nnọọ ibu, ha nile ji otu olu na-eto Jehova. Otú ọ dị, ka ị na-agụ abụ ọma ahụ, ị pụrụ ịhụ ihe na-eju anya. Gịnị ka ọ bụ?

5 Ọtụtụ n’ime ndị ahụ na-enye otuto a kọwara n’Abụ Ọma nke 148 apụghị ikwu okwu ma ọ bụ ịtụgharị uche. Dị ka ihe atụ, anyị na-agụ na anyanwụ, ọnwa, kpakpando, snow, ifufe, ugwu, na ugwu nta na-eto Jehova. Olee otú ihe ndị a na-adịghị ndụ pụrụ isi mee otú ahụ? (Amaokwu nke 3, 8, 9) N’ezie, ọ bụ n’otu ụzọ ahụ osisi, ihe ndị dị n’ime mmiri na ụmụ anụmanụ si eto ya. (Amaokwu nke 7, 9, 10) Ì kiritụwo ịma mma nke anyanwụ ka ọ na-ada ma ọ bụ lee anya n’elu wee hụ ọnwa ka o ji nwayọọ nwayọọ na-agafe ọtụtụ kpakpando ma ọ bụ jiri obi ụtọ chịa ọchị ka ị na-ekiri ụmụ anụmanụ ka ha na-egwu egwu ma ọ bụ ibobo anwụọ gị n’ahụ́ n’ihi ọdịdị ala dị egwu? Ya bụrụ otú ahụ, ị “nụwo” abụ otuto nke ihe ndị e kere eke. Ihe nile Jehova mere na-echetara anyị na ọ bụ Onye Okike pụrụ ime ihe nile, na e nweghị nnọọ onye ọ bụla n’eluigwe na ala nke nwere ike, amamihe, ma ọ bụ ịhụnanya ha ka nke ya.—Ndị Rom 1:20; Mkpughe 4:11.

6, 7. (a) Olee ihe ndị e kere eke nwere ọgụgụ isi Abụ Ọma nke 148 na-ekwu na ha na-eto Jehova? (b) Gịnị pụrụ ịkpali anyị ito Jehova? Nye ihe atụ.

6 Abụ Ọma nke 148 na-ekwu na ihe ndị e kere eke nwere ọgụgụ isi na-eto Jehova. N’amaokwu nke 2, anyị na-agụ na “usuu ndị agha” Jehova, bụ́ ndị mmụọ ozi, nọ n’eluigwe na-eto Chineke. N’amaokwu nke 11, a kpọrọ ụmụ mmadụ dị ike, ndị dị ka ndị eze na ndị ikpe, òkù ka ha sonye n’otuto ahụ. Ọ bụrụ na ọ na-atọ ndị mmụọ ozi dị ike ụtọ ito Jehova, olee mmadụ nkịtị ga-ezi ezi ikwu na ya akarịala ime otú ahụ? Mgbe ahụzi, n’amaokwu nke 12 na nke 13, a kpọrọ unu bụ́ ndị na-eto eto òkù ka unu sonye ma too Jehova. À na-akpali gị ime nke ahụ?

7 Tụlee otu ihe atụ. Ọ bụrụ na i nwere otu ezigbo enyi nke nwere nkà pụrụ iche—ikekwe, n’egwuregwu, ise ihe, ma ọ bụ n’egwú—ị̀ ga-agwa ndị ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị enyi gị ndị ọzọ banyere ya? Obi abụọ adịghị ya na ị ga-eme otú ahụ. Ịmata ihe nile Jehova meworo pụrụ ime ka anyị nwee mmetụta yiri nke ahụ. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 19:1, 2 na-ekwu na eluigwe nke jupụtara na kpakpando na-eme ka e nwee “okwu ọnụ n’ụba.” Nye anyị, mgbe anyị na-eche banyere ihe ndị dị ịtụnanya Jehova meworo, anyị apụghị ịla azụ n’ịgwa ndị ọzọ banyere Chineke anyị.

8, 9. N’ihi ihe ndị dị aṅaa ka Jehova ji chọọ ka anyị na-eto ya?

8 Ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ mere anyị ga-eji na-eto Jehova bụ na ọ chọrọ ka anyị na-eme otú ahụ. N’ihi gịnị? Ọ̀ bụ n’ihi na ọ chọrọ otuto sitere n’aka ụmụ mmadụ? Ee e. Otuto pụrụ ịdị anyị bụ́ ụmụ mmadụ mkpa mgbe ụfọdụ, ma Jehova dị nnọọ elu karịa anyị. (Aịsaịa 55:8) Ọ bụghị onye na-ejighị n’aka ihe ọ pụrụ ime ma ọ bụ àgwà ndị o nwere. (Aịsaịa 45:5) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ chọrọ ka anyị na-eto ya, ọ na-atọkwa ya ụtọ mgbe anyị na-eme otú ahụ. N’ihi gịnị? Tụlee ihe abụọ kpatara ya. Nke mbụ, ọ maara na ọ dị anyị mkpa ito ya. O kenyere ọchịchọ nke inwe mkpa ime mmụọ n’ime anyị, mkpa nke ife ofufe. (Matiu 5:3) Ịhụ ka anyị na-egbo mkpa ahụ na-atọ Jehova ụtọ, dị nnọọ ka ọ na-atọ ndị mụrụ gị ụtọ ịhụ ka ị na-eri nri ha maara ga-adị gị mma n’ahụ́.—Jọn 4:34.

9 Nke abụọ, Jehova maara na ọ dị ndị ọzọ mkpa ịnụ ka anyị na-eto ya. Pọl onyeozi degaara nwa okorobịa bụ́ Timoti okwu ndị a: “Na-elezi onwe gị nakwa ozizi gị anya mgbe nile. Nọgide n’ihe ndị a, n’ihi na site n’ime nke a, ị ga-azọpụta ma onwe gị ma ndị na-ege gị ntị.” (1 Timoti 4:16) Ee, mgbe ị na-akụziri ndị ọzọ banyere Jehova Chineke, na-eto ya, ha onwe ha kwa pụrụ ịbịa mara Jehova. Ihe ọmụma dị otú ahụ pụrụ ime ka ha nweta ndụ ebighị ebi!—Jọn 17:3.

10. N’ihi gịnị ka obi anyị ji akpali anyị ito Chineke anyị?

10 E nwekwara ihe ọzọ mere a ga-eji na-eto Jehova. Cheta ihe atụ nke enyi gị nwere nkà. Ọ bụrụ na ị nụ ka ndị ọzọ na-ekwu okwu ụgha banyere ya, na-ekwutọ aha ọma ya, ọ̀ bụ na ị gaghị ekpebisikwu nnọọ ike ito ya? Ọtụtụ mmadụ na-ekwutọ Jehova n’ụwa a. (Jọn 8:44; Mkpughe 12:9) N’ihi ya, obi ndị hụrụ ya n’anya na-akpali ha ịgwa ndị mmadụ ihe bụ́ eziokwu banyere ya, na-eme ka ihe doo anya. Ị̀ ga-achọ igosipụta ịhụnanya na ekele i nwere maka Jehova ma gosi na ị chọrọ ka ọ bụrụ Onye ga-achị gị kama ikwe ka onye iro ya bụ́ isi, bụ́ Setan, chịwa gị? Ị pụrụ ime ihe ahụ nile site n’ito Jehova. Ajụjụ ọzọ bụzi otú ị ga-esi mee nke ahụ.

Otú Ụfọdụ Ndị Na-eto Eto Si Too Jehova

11. Olee ihe atụ Bible ndị na-egosi na ndị na-eto eto pụrụ ịdị nnọọ irè n’ito Jehova?

11 Bible na-egosi na mgbe mgbe ndị na-eto eto na-adị nnọọ irè n’ito Jehova. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwa agbọghọ onye Izrel bụ́ onye ndị Siria dọọrọ n’agha. O ji nkwuwa okwu gbaara nne ya ukwu àmà banyere Ịlaịsha bụ́ onye amụma Jehova. Ihe ndị o kwuru dugara n’ịrụ ọrụ ebube, nke a ghọkwara àmà siri ike. (2 Ndị Eze 5:1-17) Dị ka nwata, Jizọs jikwa nkwuwa okwu gbaa àmà. N’ime ihe nile o mere mgbe ọ na-etolite bụ́ ndị a pụrụ idewo n’Akwụkwọ Nsọ, Jehova họọrọ otu, mgbe Jizọs bụ́ onye dị afọ 12 ji obi ike jụọ ndị nkụzi okpukpe nọ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem ajụjụ ma mee ka ibobo nwụọ ha n’ahụ́ n’ihi otú o si ghọta ụzọ Jehova.—Luk 2:46-49.

12, 13. (a) Gịnị ka Jizọs mere n’ụlọ nsọ obere oge tupu ya anwụọ, mmetụta dịkwa aṅaa ka o nwere n’ahụ́ ndị nọ ebe ahụ? (b) Olee otú okwu otuto ụmụ okoro kwuru dị Jizọs?

12 Mgbe Jizọs toruru ogo mmadụ, o mekwara ka ụmụaka too Jehova. Dị ka ihe atụ, nanị ụbọchị ole na ole tupu ọnwụ ya, Jizọs nọrọ oge ụfọdụ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Bible kwuru na o mere ‘ihe ndị dị ịtụnanya’ n’ebe ahụ. Ọ chụpụrụ ndị na-eme ebe nsọ ahụ ọgba ndị ohi. Ọ gwọkwara ndị ìsì na ndị ngwụrọ. Nke ahụ kwesịrị imewo ka ndị nile nọ ebe ahụ, karịsịa ndị ndú okpukpe, too Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Mezaịa ahụ. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ọtụtụ n’ime ndị nọ ebe ahụ n’oge ahụ etoghị ha. Ha maara na ọ bụ Chineke zitere Jizọs, ma ụjọ ndị ndú okpukpe na-atụ ha. Otú ọ dị, otu ìgwè ji obi ike kwuo okwu. Ị̀ maara ndị ha bụ? Bible na-ekwu, sị: “Mgbe ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ hụrụ ihe ịtụnanya ndị [Jizọs] mere nakwa ụmụ okoro ndị na-eti mkpu n’ụlọ nsọ na-asị: ‘Biko, zọpụta Nwa Devid!,’ iwe were ha, ha wee sị [Jizọs]: ‘Ị̀ na-anụ ihe ndị a na-ekwu?’”—Matiu 21:15, 16; Jọn 12:42.

13 Ndị nchụàjà ahụ tụrụ anya na Jizọs ga-agwa ụmụ okoro ahụ na-eto ya ka ha mechie ọnụ. Ò mere otú ahụ? Ọ dịghị ma ọlị! Jizọs zara ndị nchụàjà ahụ, sị: “Ee. Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị nke a, ‘Site n’ọnụ ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara ka i meworo ka otuto pụta’?” O doro anya na obi dị Jizọs na Nna ya ụtọ maka otuto ụmụ okoro ahụ na-eto ya. Ụmụaka ahụ nọ na-eme ihe ndị nile toro eto nọ ebe ahụ kwesịrị imewo. Ọ bụ ezie na ha ka bụ ụmụaka, ọ ghaghị ịbụ na ha ghọtara ihe na-emenụ nke ọma. Ha hụrụ ka nwoke a na-eme ihe ndị dị ịtụnanya, jiri obi ike na okwukwe na-ekwu okwu, na-egosikwa ịhụnanya dị ukwuu o nwere maka Chineke na ndị ya. Ọ bụ onye o kwuru na ya bụ—“Nwa Devid” ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ Mezaịa. A gọziri ụmụaka ahụ maka okwukwe ha site n’ime ka ha nwee ihe ùgwù nke imezu amụma.—Abụ Ọma 8:2.

14. Olee otú onyinye ndị na-eto eto nwere pụrụ isi nyere ha aka ito Chineke?

14 Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya ndị dị otú ahụ? Anyị pụrụ ịmụta na ndị na-eto eto pụrụ ịbụ nnọọ ndị dị irè na-eto Jehova. Ha na-enwekarị onyinye nke ịhụ eziokwu ahụ n’ụzọ doro anya na n’ụzọ dị mfe, jiri ezi obi na ịnụ ọkụ n’obi na-egosipụta okwukwe ha. Ha nwekwara onyinye e kwuru banyere ya n’Ilu 20:29, sị: “Ịma mma ụmụ okorobịa ka ike ha bụ.” Ee, e ji ike na ume—ihe ndị bara nnọọ uru n’ito Jehova—gọzie unu bụ́ ndị na-eto eto. Olee kpọmkwem otú unu pụrụ isi jiri onyinye ndị dị otú ahụ mee ihe?

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Too Jehova?

15. Iji too Jehova n’ụzọ dị irè, ebumnobi dị aṅaa ka a chọrọ?

15 Ịdị irè na-amalite n’obi. Ị pụghị ito Jehova n’ụzọ dị irè ma ọ bụrụ na ị na-eme ya nanị n’ihi na ndị ọzọ chọrọ ka i mee ya. Cheta na iwu kachasị iwu nile bụ nke a: “Ị ghaghị iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37) Ị̀ matawo onye Jehova bụ n’ezie site n’ịmụ Okwu ya n’onwe gị? Ọmụmụ ihe dị otú ahụ kwesịrị ime ka ị hụ Jehova n’anya. Ụzọ bụ́ isi e si egosipụta ịhụnanya ahụ bụ site n’ito ya. Ozugbo ebumnobi gị doro gị anya ma sie ike, ị dịla njikere iji ịnụ ọkụ n’obi na-eto Jehova.

16, 17. Olee ụtụ omume na-atụnye n’ito Jehova? Kọwaa.

16 Ugbu a, ọbụna tupu ị tụlee ihe ị ga-ekwu, tụlee otú ị ga-esi kpaa àgwà. Ọ bụrụ na nwa agbọghọ Izrel ahụ biri n’oge Ịlaịsha na-akparị mmadụ, bụrụ onye na-adịghị akwanyere ndị ọzọ ùgwù, ma ọ bụ onye na-adịghị eme ihe n’eziokwu, ì chere na ndị Siria dọọrọ ya n’agha gaara ege ntị n’ihe o kwuru banyere onye amụma Jehova? Ikekwe ha agaaraghị ege ya ntị. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ dị ka ndị mmadụ hà ga-aka ege gị ntị ma ọ bụrụ na ha ahụ na ị na-akwanyere mmadụ ùgwù, na-eme ihe n’eziokwu ma na-akpa ezi àgwà. (Ndị Rom 2:21) Tụlee otu ihe atụ.

17 Otu nwata nwanyị dị afọ 11 nke bi na Portugal chere nrụgide nke iso mee ememe oge ezumike megidere akọ na uche ya e ji Bible zụọ ihu n’ụlọ akwụkwọ. O ji nkwanye ùgwù kọwaara onye nkụzi ya ihe mere o ji jụ, ma onye nkụzi ahụ kwara ya emo. Ka oge na-aga, onye nkụzi ahụ gbalịrị ugboro ugboro imenye ya ihere, jiri okpukpe ya na-eme ihe ọchị. Otú ọ dị, nwata nwanyị ahụ nọgidere na-akwanyere ya ùgwù. Ka afọ ụfọdụ gafere, nwanna nwanyị ahụ na-eto eto nọ na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile, onye ozi oge nile. N’otu mgbakọ, ọ nọ na-ekiri ka a na-eme ndị mmadụ baptizim, ọ matakwara otu n’ime ha. Ọ bụ onye ahụ bụbu onye nkụzi ya! Ka ha jisịrị anya mmiri ọṅụ makụọ onwe ha, onye nkụzi ahụ gwara onye ahụ bụbu nwa akwụkwọ ya na ya echefubeghị àgwà nkwanye ùgwù ya. Otu Onyeàmà letara onye nkụzi ahụ, onye nkụzi ahụ agwakwa ya banyere àgwà onye ahụ bụbu nwa akwụkwọ ya. N’ihi ya, a malitere ịmụrụ ya Bible, nwanyị a nabatakwara eziokwu Bible. Ee, omume gị pụrụ ịbụ ụzọ dị irè isi na-eto Jehova!

18. Gịnị ka onye na-eto eto pụrụ ime ma ọ bụrụ na ọ na-alatụ azụ n’ịmalite mkparịta ụka banyere Bible na Jehova Chineke?

18 Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe ụfọdụ ịmalite mkparịta ụka banyere okwukwe gị n’ụlọ akwụkwọ? Ọ bụghị nanị gị ka ọ dị otú ahụ. Otú ọ dị, ị pụrụ ime ihe ndị ọzọ ga-eji jụọ gị ajụjụ banyere okpukpe gị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ bụ ihe iwu kwadoro, e kwekwa ka a na-eme otú ahụ, gịnị ma i jiri akwụkwọ ndị dabeere na Bible gaa akwụkwọ ma gụọ ha n’oge e nwere nkwụsịtụ ma ọ bụ n’oge ndị ọzọ mgbe a na-ekwe ka e mee ihe dị otú ahụ? Ụmụ akwụkwọ ibe gị pụrụ ịjụ gị ihe ị na-agụ. Site n’ịza ha ajụjụ ahụ na ịkọrọ ha ihe ndị tọrọ gị ụtọ ị gụtara n’isiokwu ma ọ bụ n’akwụkwọ ahụ, ị ga-ahụ na ị malitedịlarị mkparịta ụka. Cheta ịjụ ha ajụjụ, na-achọpụta ihe ụmụ akwụkwọ ibe gị kweere. Gee ntị nke ọma, na-agwa ha ihe ndị ị mụtaworo site na Bible. Dị ka ahụmahụ ndị dị na peeji nke 29 na-egosi, ọtụtụ ndị na-eto eto na-eto Chineke n’ụlọ akwụkwọ. Nke a na-eme ka ha nwee ọṅụ dị ukwuu ma na-enyere ọtụtụ aka ịbịa mara Jehova.

19. Olee otú ndị na-eto eto pụrụ isi dịkwuo irè n’ozi ụlọ n’ụlọ ha?

19 Ozi ụlọ n’ụlọ bụ ụzọ kasị dị irè isi eto Jehova. Ọ bụrụ na i kerewebeghị òkè, gịnị ma i setịpụ ya dị ka ihe mgbaru ọsọ gị? Ọ bụrụ na i kerewela òkè, è nwere ihe mgbaru ọsọ ndị ọzọ ị pụrụ isetịpụrụ onwe gị? Dị ka ihe atụ, kama ikwu nanị otu ihe n’ọnụ ụzọ ọ bụla, chọọ ebe ndị i nwere ike imeziwanye, gwa ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị ọzọ nwere ahụmahụ ka ha tụọrọ gị aro. Mụta otú e si ejikwu Bible eme ihe, otú e si eme nletaghachi ndị dị irè, na otú e si amalite ọmụmụ Bible. (1 Timoti 4:15) Ka ị na-enyekwu Jehova otuto n’ụzọ ndị dị otú ahụ, otú ahụ ka ị ga na-adịkwu irè, otú ahụkwa ka ozi gị ga na-atọkwu gị ụtọ.

Olee Mgbe I Kwesịrị Ịmalite Ito Jehova?

20. N’ihi gịnị ka ọ na-enweghị ihe mere ndị ntorobịa kwesịrị iji na-eche na ha dị obere ito Jehova?

20 N’ime ajụjụ atọ dị n’isiokwu a, nke ikpeazụ a bụ nke azịza ya kasị mfe. Rịba ama azịza doro anya Bible nyere: “Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa.” (Eklisiastis 12:1) Ee, ugbu a bụ oge iji malite ito Jehova. Ị pụrụ ikwu, sị: “Erubeghị m ito Jehova. Enwebeghị m ahụmahụ. M kwesịrị ichere ruo mgbe m totụkwuru.” Ị bụghị onye mbụ nwere mmetụta dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, Jeremaịa na-eto eto gwara Jehova, sị: “Ewo, Onyenwe anyị Jehova! lee, amaghị m ikwu okwu, n’ihi na nwata ka m bụ.” Jehova mesiri ya obi ike na ọ dịghị ihe kwesịrị ime ka ọ tụọ ụjọ. (Jeremaịa 1:6, 7) N’otu aka ahụ, ọ dịghị ihe kwesịrị ime ka anyị na-atụ ụjọ mgbe anyị na-eto Jehova. E nweghị mmerụ ahụ́ ọ bụla pụrụ imetụta anyị nke Jehova na-apụghị ịgwọ kpamkpam.—Abụ Ọma 118:6.

21, 22. Gịnị mere e ji jiri ndị na-eto eto bụ́ ndị na-eto Jehova tụnyere igirigi, n’ihi gịnịkwa ka ntụnyere ahụ ji agba ume?

21 Anyị na-agbazi unu bụ́ ndị na-eto eto ume, sị: Unu alala azụ n’ito Jehova! Ugbu a unu ka na-eto eto bụ oge kasị mma isonye n’ọrụ kasị mkpa a na-arụ n’ụwa taa. Mgbe unu mere otú ahụ, unu ga-esonye n’ezinụlọ magburu onwe ya—ezinụlọ eluigwe na ala nke ndị na-eto Jehova. Jehova nwere obi ụtọ na ezinụlọ a gụnyere unu. Rịbanụ okwu ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ nke ọbụ abụ ahụ gwara Jehova ama: “Ndị gị bụ onyinye afọ ofufo n’ụbọchị usuu ndị agha gị; n’ịma mma nile nke ịdị nsọ, site n’afọ nke ụtụtụ; Gị nwe igirigi, bụ́ ụmụ okorobịa gị.”—Abụ Ọma 110:3.

22 Ọ na-enye obi ụtọ ịhụ igirigi ndị na-egbuke egbuke n’ụtụtụ, ọ́ bụghị ya? Ha na-enye ume ọhụrụ, na-egbuke egbuke, ma dị ọtụtụ nke na a pụghị ịgụta ha ọnụ. Ọ bụ otú ahụ ka Jehova si ahụ unu bụ́ ndị na-eto eto bụ́ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-eto ya n’ụbọchị ndị a siri ike obibi. O doro anya na nhọrọ unu mere ito Jehova na-eme ka obi ya ṅụrịa. (Ilu 27:11) Mgbe ahụzi, unu ndị na-eto eto, na-etonụ Jehova!

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị bụ ụfọdụ ihe ndị mere a ga-eji eto Jehova?

• Olee ihe atụ Bible ndị na-egosi na ndị na-eto eto pụrụ ịdị nnọọ irè n’ito Jehova?

• Olee otú ndị na-eto eto pụrụ isi na-eto Jehova taa?

• Olee mgbe ndị na-eto eto kwesịrị ịmalite ito Jehova, n’ihi gịnịkwa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Ọ bụrụ na enyi gị nwere nkà pụrụ iche, ọ̀ bụ na ị gaghị agwa ndị ọzọ banyere nke a?

[Foto dị na peeji nke 27]

Ụmụ akwụkwọ ibe gị pụrụ inwe mmasị n’ihe ndị i kweere

[Foto dị na peeji nke 28]

Ọ bụrụ na ị chọrọ imeziwanye ozi gị, gwa Onyeàmà nke nwere ahụmahụ karịa gị ka ọ tụọrọ gị aro