Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nne na Nna, Gboonụ Mkpa Ezinụlọ Unu

Ndị Nne na Nna, Gboonụ Mkpa Ezinụlọ Unu

Ndị Nne na Nna, Gboonụ Mkpa Ezinụlọ Unu

“Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha, . . . ọ jụwo okwukwe.”—1 TIMOTI 5:8.

1, 2. (a) Gịnị mere o ji bụrụ ihe na-agba ume ịhụ ka ezinụlọ dị iche iche na-abịakọ nzukọ Ndị Kraịst ọnụ? (b) Olee ihe ịma aka ụfọdụ ndị ezinụlọ na-eche ihu iji na-aga nzukọ n’oge?

MGBE i legharịrị anya n’ọgbakọ Ndị Kraịst tupu nzukọ amalite, ị pụrụ ịhụ ụmụaka dị ọcha ma yiri uwe ndị dị mma ka ha na ndị nne na nna ha na-anọdụ ala. Ọ́ bụghị ihe na-enye obi ụtọ ịhụ ịhụnanya na-adị n’ezinụlọ ndị dị otú ahụ—ịhụnanya maka Jehova nakwa maka ibe ha? Otú ọ dị, ọ dị mfe ichefu otú mgbalị a na-etinye iji hụ na ndị ezinụlọ gara nzukọ n’oge hà.

2 Ọtụtụ mgbe, ndị nne na nna na-eji ọrụ n’aka n’oge nile n’ụbọchị, n’ụbọchị nzukọ, ndị ezinụlọ na-eji ọrụ n’aka ọbụna karị. A ga-akwadebe ihe oriri, rụọ ọrụ ndị dị n’ụlọ, a ga-emekwa ihe omume ụlọ akwụkwọ. Ọ bụ ndị nne na nna na-arụ ọrụ kasịnụ, ha ga-ahụ na onye ọ bụla sara ahụ́, rie nri ma kwadebe n’oge. N’ezie, nye onye ji ụmụaka, ihe a na-atụghị anya ya pụrụ ime n’oge na-ekwesịtụdịghị ekwesị. Onye nke tọchara ndị ọzọ nwere ike dọwaa uwe ya ka ọ na-egwu egwu. Ọdụ nwa akwafuo nri ya. Ụmụaka nwere ike ịmalite ise okwu. (Ilu 22:15) Gịnị ka nke a na-arụpụta? Ọbụna atụmatụ ndị nne na nna leziri anya mee pụrụ ịkụ afọ n’ala. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-afọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile ka ezinụlọ ahụ na-abịarute nnọọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ezi oge tupu nzukọ amalite. Lee ihe na-agba ume ọ bụ ịhụ ha ebe ahụ kwa izu, kwa afọ, ka ụmụaka ahụ na-etolite ijere Jehova ozi!

3. Olee otú anyị si mara na Jehova ji ezinụlọ kpọrọ ihe nke ukwuu?

3 Ọ bụ ezie na ọrụ gị dị ka nne ma ọ bụ nna pụrụ isi ike mgbe ụfọdụ, ọbụna na-agwụ ike, ị pụrụ ijide n’aka na Jehova ji mgbalị ị na-eme kpọrọ ihe nke ukwuu. Jehova bụ Onye Malitere ndokwa ezinụlọ. Ya mere, Okwu ya na-ekwu na ezinụlọ ọ bụla si ebe Jehova nọ “nweta aha ya”—si n’aka ya malite. (Ndị Efesọs 3:14, 15) N’ihi ya, mgbe unu bụ́ ndị nne na nna na-agbalị ịrụzu ọrụ unu n’ime ezinụlọ unu n’ụzọ ziri ezi, unu na-asọpụrụ Eze Kachasị Elu n’eluigwe na ala. (1 Ndị Kọrint 10:31) Nke ahụ ọ́ bụghị ihe ùgwù dị ukwuu? Mgbe ahụ, ọ bụ ihe dabara adaba ka anyị tụlee ọrụ Jehova nyere ndị nne na nna. N’isiokwu a, anyị ga-atụle nke ahụ n’ihe metụtara igbo mkpa nke ndị ezinụlọ ha. Ka anyị tụlee ụdị mkpa atọ Chineke na-atụ anya ka ndị nne na nna na-egbo.

Igbo Mkpa Anụ Ahụ́

4. N’ezinụlọ, olee ndokwa ndị Jehova meworo iji gboo mkpa ụmụaka?

4 Pọl onyeozi dere, sị: “N’ezie, ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha, karịsịakwa ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya, ọ jụwo okwukwe, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Timoti 5:8) Mgbe Pọl sịrị “onye ọ bụla” n’ebe a, ònye ka o bu n’uche? Ọ bụ onyeisi ezinụlọ, nke na-abụkarị nna. Chineke nyekwara nwanyị ọrụ dị ùgwù nke ịbụrụ di ya onye inyeaka. (Jenesis 2:18) Ụmụ nwanyị nke oge Bible nyeere ndị di ha aka mgbe mgbe n’igbo mkpa ndị ezinụlọ ha. (Ilu 31:13, 14, 16) Taa, ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna na-amụba nnọọ amụba. * Ọtụtụ Ndị Kraịst bụ́ ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ na-eme nnọọ nke ọma n’igbo mkpa ndị ezinụlọ ha. N’ezie, ọ kacha mma ezinụlọ inwe ma nne ma nna, nna abụrụkwa onyeisi.

5, 6. (a) Olee ihe ịma aka ụfọdụ na-eche ndị na-agbalị igbo mkpa anụ ahụ́ nke ndị ezinụlọ ha ihu? (b) Ịnọgide na-enwe echiche dị aṅaa banyere ọrụ ego ga-enyere Ndị Kraịst na-egbo mkpa aka ịnọgide na-eme otú ahụ?

5 Na 1 Timoti 5:8, olee ụdị igbo mkpa Pọl bu n’uche? Ihe ndị gbara amaokwu ahụ gburugburu na-enye echiche na ihe ọ na-ekwu kpọmkwem bụ banyere mkpa anụ ahụ́ ezinụlọ. N’ụwa nke taa, e nwere ọtụtụ ihe mgbochi onyeisi ezinụlọ pụrụ iche ihu iji nwee ike igbo mkpa ahụ. Ihe isi ike akụ̀ na ụba jupụtara ebe nile n’ụwa, otú ahụkwa ka ọ dị enweghị ọrụ ruo nwa oge, ụkọ ọrụ na-amụba amụba, nakwa ịrị elu nke ihe ndị e ji ebi ndụ. Gịnị pụrụ inyere onye na-egbo mkpa aka ịnọgide na-eme otú ahụ n’agbanyeghị ihe ịma aka ndị dị otú ahụ?

6 Onye na-egbo mkpa kwesịrị icheta na ya na-arụ ọrụ Jehova nyere ya. Okwu Pọl ji ike mmụọ nsọ dee na-egosi na e ji nwoke nke nwere ike imezu iwu a ma jụ ime ya tụnyere onye ‘jụrụ okwukwe.’ Onye Kraịst ga-eme ihe nile ọ pụrụ ime iji zere inwe aha dị otú ahụ n’ihu Chineke. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị n’ụwa nke taa “enweghị obi mmadụ.” (2 Timoti 3:1, 3) N’ezie, ọtụtụ ndị nna adịghị arụ ọrụ dịịrị ha, na-ahapụ ezinụlọ ha n’enweghị onye nkwado. Ndị di bụ́ Ndị Kraịst enweghị obi ịkpọ nkụ dị otú ahụ n’ihe banyere igbo mkpa ndị ezinụlọ ha. N’adịghị ka ọtụtụ ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ, Ndị Kraịst na-egbo mkpa na-ele ọbụna ọrụ ndị dị nnọọ ala anya dị ka ihe dị ùgwù ma dị mkpa, ụzọ isi na-eme ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ, ebe ọ bụ na ọ na-enyere ha aka igbo mkpa nke ndị ha hụrụ n’anya.

7. Gịnị mere o ji daba adaba ka ndị nne na nna na-atụgharị uche n’ihe nlereanya Jizọs?

7 Ndị isi ezinụlọ pụkwara ịhụ ya dị ka ihe na-enye aka ịtụgharị uche n’ihe nlereanya zuru okè nke Jizọs. Cheta na Bible zoro aka n’ebe Jizọs nọ n’ụzọ amụma dị ka “Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi.” (Aịsaịa 9:6, 7) Dị ka “Adam ikpeazụ,” Jizọs nọchiri anya “nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam” dị ka nna nke ndị nile gosipụtara okwukwe n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. (1 Ndị Kọrint 15:45) N’adịghị ka Adam, bụ́ onye ghọrọ nna nke na-achọ ọdịmma onwe ya nanị, Jizọs bụ ezigbo nna. Bible na-ekwu banyere ya, sị: “Anyị esitewo na nke a mara ịhụnanya, n’ihi na onye ahụ tọgbọrọ mkpụrụ obi ya maka anyị.” (1 Jọn 3:16) Ee, Jizọs ji ọchịchọ obi ya nyefee ndụ ya maka ndị ọzọ. Otú ọ dị, kwa ụbọchị, o mekwara ka mkpa nke ndị ọzọ butere ndị nke ya ụzọ n’ihe ndị dị nta. Unu bụ́ ndị nne na nna kwesịrị iṅomi mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà ahụ.

8, 9. (a) Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ịmụta site n’aka nnụnụ n’ihe banyere iji achọghị ọdịmma onwe ha nanị na-egbo mkpa ụmụ ha? (b) Olee otú ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst si egosipụta mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà?

8 Ndị nne na nna pụrụ ịmụta ihe buru ibu banyere ịhụnanya achọghị ọdịmma onwe onye nanị site n’ihe Jizọs gwara ndị Chineke na-enupụ isi, sị: “Lee ọtụtụ ugboro m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị, dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya!” (Matiu 23:37) N’ebe a, Jizọs zoro aka ná nnekwu ọkụkọ na-achịkọta ụmụ ya na nku ya. N’eziokwu, ndị nne na nna pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’amamihe ebumpụta ụwa nke nnekwu ọkụkọ ji echebe ụmụ ya, ọ na-adị njikere itinye onwe ya n’ihe ize ndụ iji chebe ụmụ ya ka a ghara imerụ ha ahụ́. Otú ọ dị, ihe nne nnụnụ na-eme kwa ụbọchị dịkwa ịrịba ama. Ha na-anọgide na-efepụ ma na-efebata iji chọta ihe oriri. Ọbụna mgbe ike gwụsịrị ha, ha na-atụnye ihe oriri n’ọnụ ghere oghe nke ụmụ ha, ha na-elo ya ma mgbe mgbe, chọwa ọzọ. Ọtụtụ n’ihe ndị Jehova kere na-egosi na ha “maara ihe nke ukwuu” n’ụzọ ha si egbo mkpa ụmụ ha.—Ilu 30:24.

9 N’ụzọ yiri nke ahụ, Ndị Kraịst bụ́ ndị nne na nna gburugburu ụwa na-egosi mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. Kama ihe ọjọọ ga-eme ụmụ unu, unu ga-ahọrọ ka o mee unu. Ọzọkwa, unu na-adị njikere ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà kwa ụbọchị iji nwee ike igbo mkpa ụmụ unu. Ọtụtụ n’ime unu na-eteta ụra n’isi ụtụtụ iji rụọ ọrụ ndị na-agwụ ike ma ọ bụ ndị siri ike. Unu na-arụsi ọrụ ike iji nye ezinụlọ unu nri ndị na-edozi ahụ́. Unu na-agbalịsi ike ịhụ na ụmụ unu nwere uwe ndị dị ọcha, ebe obibi kwesịrị ekwesị, nakwa na ha nwetara agụmakwụkwọ zuru ezu. Unu na-emekwa ihe ndị a site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, site n’afọ ruo n’afọ. N’ezie, ịchụ onwe onye n’àjà na ndidi dị otú ahụ na-atọ Jehova ụtọ! (Ndị Hibru 13:16) Otú ọ dị, unu na-echetakwa na e nwere mkpa ndị ka sie ike unu ga-egboro ndị ezinụlọ unu.

Igbo Mkpa Ime Mmụọ

10, 11. Olee mkpa kachasịnụ ụmụ mmadụ nwere, gịnịkwa ka ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-aghaghị ibu ụzọ mee iji nwee ike igboro ụmụ ha mkpa a?

10 Igbo mkpa ime mmụọ dị mkpa ọbụna karịa igbo mkpa anụ ahụ́. Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụghị nanị n’achịcha ka mmadụ ga-esi dị ndụ, kama ọ bụ n’okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.” (Matiu 4:4; 5:3) Olee ihe unu bụ́ ndị nne na nna pụrụ ime iji na-egbo mkpa ime mmụọ?

11 Banyere isiokwu a a na-ekwu maka ya, ikekwe akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-ezokarị aka na ya bụ Deuterọnọmi 6:5-7. Biko, meghee Bible gị ma gụọ amaokwu ndị a. Rịba ama na e bu ụzọ gwa ndị nne na nna ka ha wusie mmekọrịta nke ha na Chineke ike, na-azụlite ịhụnanya maka Jehova ma na-etinye okwu ya n’obi ha. Ee, ọ dị mkpa ka ị na-amụchi Okwu Chineke anya, na-agụ Bible kwa ụbọchị ma na-atụgharị uche na ya ka i wee nweta ezi nghọta banyere ụzọ, ụkpụrụ, na iwu Jehova ma hụ ha n’anya. Ihe ga-esi na ya pụta bụ na obi gị ga-ejupụta n’eziokwu Bible ndị na-adọrọ adọrọ bụ́ ndị ga-eme ka i nwee ọṅụ, nsọpụrụ na ịhụnanya maka Jehova. Ị ga-enwe ezi ihe bara ụba ị ga-akụziri ụmụ gị.—Luk 6:45.

12. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Jizọs mgbe a bịara n’ịkụziri ụmụ ha eziokwu Bible?

12 Ndị nne na nna siri ike n’ụzọ ime mmụọ na-adị njikere itinye ndụmọdụ ahụ dị na Deuterọnọmi 6:7 bụ́ iji ohere ọ bụla dapụtaranụ ‘na-ezi’ ụmụ ha okwu Jehova n’ọrụ. ‘Izi ihe’ pụtara ịkụzi ihe na ime ka ọ banye n’ime obi mmadụ site n’ịkụzi ya ugboro ugboro. Jehova maara nke ọma na ọ dị anyị nile—karịsịa ụmụaka—mkpa ka a kụziere anyị ihe ugboro ugboro ka anyị wee nwee ike ịmụta ya. N’ihi ya, Jizọs kụziri otu ihe ugboro ugboro n’ozi ya. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ịdị umeala n’obi na ịghara ịdị na-asọrịta mpi, o ji ụzọ dịgasị iche kụziere ha ya. Ọ kụziiri ha ihe site n’iso ha tụgharịa uche, site n’ịmara ha atụ, ọbụna site n’ime ya n’onwe ya. (Matiu 18:1-4; 20:25-27; Jọn 13:12-15) Otú ọ dị, ọ bụ ihe dị ịrịba ama na Jizọs gosipụtara ndidi mgbe nile. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ dị ndị nne na nna mkpa ịchọta ụzọ ha ga-esi kụziere ụmụ ha eziokwu ndị bụ́ isi, jiri ndidi na-akụziri ha ụkpụrụ Jehova ugboro ugboro ruo mgbe ụmụ ha ghọtara ma tinye ha n’ọrụ.

13, 14. Olee oge ụfọdụ ndị nne na nna pụrụ iji kụziere ụmụ ha eziokwu Bible, na-eji ihe enyemaka ndị dị aṅaa?

13 Oge a na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ bụ oge dị nnọọ mma maka izi ihe dị otú ahụ. N’ezie, ọmụmụ Bible ezinụlọ chiri anya, nke na-ewuli elu ma na-enye obi ụtọ bụ ide ji ọnọdụ ime mmụọ ezinụlọ. Ọmụmụ ihe dị otú ahụ na-atọ ezinụlọ Ndị Kraịst gbaa gburugburu ụwa ụtọ, ha na-eji akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ndị nzukọ Jehova wepụtara eme ihe, na-eduzikwa ya n’ụzọ ga-egbo mkpa ụmụ ha. Akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ bụ onyinye pụrụ iche n’akụkụ a, otú ahụ ka ọ dịkwa akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. * Otú ọ dị, oge ọmụmụ ihe ezinụlọ abụghị nanị oge a na-eji akụziri ụmụaka ihe.

14 Dị ka Deuterọnọmi 6:7 na-egosi, e nwere ọtụtụ oge ndị unu bụ́ ndị nne na nna pụrụ iso ụmụ unu kwurịta banyere ihe ime mmụọ. Ma ùnu na-emekọ njem, na-arụkọ ọrụ ụlọ, ma ọ bụ na-atụrụkọ ndụ, unu pụrụ ịchọta ohere iji gboo mkpa ime mmụọ ụmụ unu. N’ezie, ọ dịghị mkpa ịdị na-ekwuru ụmụ unu “okwuchukwu” mgbe nile banyere eziokwu Bible. Kama nke ahụ, gbalịanụ ime ka nkwurịta okwu ezinụlọ bụrụ nke na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, magazin Teta! nwere ọtụtụ mbipụta ndị tụlere isiokwu dịgasị nnọọ iche iche. Isiokwu ndị dị otú ahụ pụrụ ịbụ ohere iji kwurịta banyere anụmanụ ndị Jehova kere, ebe ndị mara mma n’ụwa, nakwa ọdịiche dị ebube ndị dị n’ọdịnala ụmụ mmadụ na ụzọ ndụ ha. Mkparịta ụka ndị dị otú ahụ pụrụ ịkpali ụmụaka ịgụkwu akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ndị òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche, na-ebipụta.—Matiu 24:45-47.

15. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka ile ozi Ndị Kraịst anya dị ka ihe na-adọrọ mmasị na nke na-akwụghachi ụgwọ?

15 Iso ụmụ unu na-enwe nkwurịta okwu na-ewuli elu ga-enyere unu aka igbo mkpa ime mmụọ ọzọ. Ụmụaka bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịmụta iso ndị ọzọ na-ekwurịta banyere okwukwe ha n’ụzọ dị irè. Ka unu na-ekwurịta isi ihe ụfọdụ ndị na-adọrọ mmasị n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na Teta! unu pụrụ ịchọta ụzọ ndị ọzọ isi mee ka o kwekọọ n’ozi. Dị ka ihe atụ, unu pụrụ ịjụ, sị: “Ọ́ gaghị abụ ihe magburu onwe ya ma ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ amarakwuo ihe a banyere Jehova? Olee otú i chere anyị ga-esi mee ka mmadụ nwee mmasị n’isiokwu a?” Nkwurịta okwu ndị dị otú ahụ pụrụ inyere ndị na-eto eto aka ịzụlite mmasị dị ukwuu n’iso ndị ọzọ na-ekwurịta ihe ha na-amụta. Mgbe ahụ, mgbe ụmụ unu so unu na-aga ozi, ha na-ahụ n’onwe ha otú e si eji mkparịta ụka dị otú ahụ eme ihe. Ha pụkwara ịmụta na ozi ahụ bụ ọrụ na-adọrọ mmasị na nke na-enye obi ụtọ, nke na-enye afọ ojuju na ọṅụ dị ukwuu.—Ọrụ 20:35.

16. Gịnị ka ụmụaka pụrụ ịmụta site n’ige ntị n’ekpere ndị nne na nna ha?

16 Ndị nne na nna na-egbokwa mkpa ime mmụọ ụmụ ha mgbe ha na-ekpe ekpere. Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere, o sokwa ha kpee ekpere ọtụtụ mgbe. (Luk 11:1-13) Cheedị echiche otú ihe ha mụtara site n’isonyere Ọkpara Jehova n’onwe ya n’ekpere hà! N’ụzọ yiri nke ahụ, ụmụ unu pụrụ ịmụta ọtụtụ ihe site n’ekpere unu. Dị ka ihe atụ, ha pụrụ ịmụta na Jehova chọrọ ka anyị na-agwa ya okwu site n’obi anyị, na-agwa ya nsogbu ọ bụla anyị nwere. Ee, ekpere unu pụrụ inyere ụmụ unu aka ịmụta eziokwu ime mmụọ dị oké mkpa: Na ha pụrụ iso Nna ha nke eluigwe na-emekọrịta ihe.—1 Pita 5:7.

Igbo Mkpa Mmetụta Uche

17, 18. (a) Olee otú Bible si ekpughe ịdị mkpa nke igosi ụmụaka ịhụnanya? (b) Olee otú ndị nna kwesịrị isi na-eṅomi Jehova n’igosi ụmụ ha ịhụnanya?

17 N’ezie, ụmụaka nwekwara mkpa mmetụta uche. Okwu Chineke na-agwa ndị nne na nna mkpa ọ dị igboro ụmụ ha mkpa a. Dị ka ihe atụ, a gbara ndị inyom na-akatabeghị ahụ́ ume “ịhụ ụmụ ha n’anya.” Ha ime otú ahụ na ime ka ndị nne na-akatabeghị ahụ́ nwee uche ziri ezi nwere njikọ. (Taịtọs 2:4) N’ezie, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya igosi ụmụaka ịhụnanya. Nke a na-akụziri nwata ịhụ ndị ọzọ n’anya, ọ ga-abakwara ya uru ná ndụ ya nile. N’aka nke ọzọ, ọ bụ amaghị ihe ịghara ịhụ ụmụaka n’anya. Ọ na-akpata mwute dị ukwuu ma na-egosi na anyị adịghị eṅomi Jehova, bụ́ onye na-egosi anyị ịhụnanya dị ukwuu n’agbanyeghị ezughị okè anyị.—Abụ Ọma 103:8-14.

18 Ọbụna Jehova bu ụzọ hụ ụmụ elu ala ya n’anya. Dị ka 1 Jọn 4:19 na-ekwu, “o bu ụzọ hụ anyị n’anya.” Karịsịa unu bụ́ ndị nna kwesịrị iṅomi ihe nlereanya Jehova, buru ụzọ na-ewulite nkekọ ịhụnanya n’etiti unu na ụmụ unu. Bible na-agba ndị nna ume ịghara ịkpasu ụmụ ha iwe, “ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.” (Ndị Kọlọsi 3:21) Nne ma ọ bụ nna igosi na ọ hụghị ụmụ ya n’anya ma ọ bụ na o jighị ha kpọrọ ihe na-akpasu nnọọ ụmụaka ahụ iwe. Ndị nna ọ na-esitụrụ ike igosipụta mmetụta ha kwesịrị icheta ihe nlereanya Jehova. Ọbụna Jehova sitere n’eluigwe kwuo okwu iji gosi na ọ nwapụtara Ọkpara ya nakwa na ọ hụrụ ya n’anya. (Matiu 3:17; 17:5) Lee nnọọ ka nke ahụ na-aghaghị isiwo gbaa Jizọs ume! N’otu aka ahụ, ụmụaka na-enweta ume na obi ike dị ukwuu site n’okwu ndị na-egosipụta ịhụnanya na nnwapụta nke ndị mụrụ ha ji ezi obi na-ekwu.

19. Gịnị mere ịdọ aka ná ntị ji dị mkpa, oleekwa otú ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst si agbalị imeru ihe n’ókè?

19 N’ezie, ịhụnanya ndị nne na nna karịrị nanị okwu ọnụ. Omume bụ ụzọ bụ́ isi e si egosipụta ịhụnanya. Igbo mkpa ime mmụọ na nke anụ ahụ́ pụrụ ịbụ ngosipụta nke ịhụnanya ndị nne na nna nwere n’ebe ụmụ ha nọ, karịsịa mgbe ha na-eme nke ahụ n’ụzọ na-egosi na ọ bụ ịhụnanya bụ isi ihe na-akwali ha. Tụkwasị na nke ahụ, ịdọ aka ná ntị bụ ụzọ dị oké mkpa ndị nne na nna si egosipụta ịhụnanya ha n’ebe ụmụ ha nọ. N’ezie, “onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị.” (Ndị Hibru 12:6) N’aka nke ọzọ, ịghara ịdọ ụmụ ha aka ná ntị na-egosipụta na ndị nne na nna kpọrọ ụmụ ha asị! (Ilu 13:24) Ọ dịghị mgbe Jehova na-emebiga ihe ókè, ọ na-enye ịdọ aka ná ntị “ruo n’ókè kwesịrị ekwesị.” (Jeremaịa 46:28, NW) Ọ naghị adịrị ndị nne na nna na-ezughị okè mfe mgbe nile imeru ihe n’ókè otú ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbalị nile unu tinyere iji meruo ihe n’ókè n’ụzọ dị otú ahụ efughị ọhịa. Ịdọ aka ná ntị siri ike, nke e ji ịhụnanya nye na-enyere nwata aka itolite ma bie ndụ obi ụtọ na nke na-arụpụta ihe. (Ilu 22:6) Nke ahụ ọ́ bụghị ụdị ndụ nne na nna ọ bụla bụ́ Onye Kraịst na-achọ ka nwa ya bie?

20. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nye ụmụ ha ohere kasị mma nke ‘ịhọrọ ndụ’?

20 Mgbe unu bụ́ ndị nne na nna rụrụ ọrụ ahụ dị mkpa Jehova nyere unu—igbo mkpa ụmụ unu n’ụzọ anụ ahụ́, n’ụzọ ime mmụọ, nakwa n’ụzọ mmetụta uche—ụgwọ ọrụ ya na-adị ukwuu. Site n’ime otú ahụ, unu na-enye ụmụ unu ohere kasị mma nke ‘ịhọrọ ndụ’ na imesị nọgide ‘na-adị ndụ.’ (Deuterọnọmi 30:19) Ụmụaka ndị họọrọ ijere Jehova ozi ma nọgide n’ụzọ nke ndụ ka ha na-etozu okè na-ewetara ndị mụrụ ha ọṅụ dị ukwuu. (Abụ Ọma 127:3-5) Ọṅụ dị otú ahụ na-adịru ebighị ebi! Otú ọ dị, olee otú ndị na-eto eto pụrụ isi too Jehova taa? A ga-atụle ajụjụ ahụ n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 N’isiokwu a, a ga-ezo aka n’ebe onye na-egbo mkpa nọ dị ka nwoke. Otú ọ dị, ụkpụrụ ndị a ga-atụle metụtakwara ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị ọ bụ ha na-egbo mkpa ndị ezinụlọ ha.

^ par. 13 Ndị Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ime iji na-egboro ụmụ ha

• mkpa anụ ahụ́?

• mkpa ime mmụọ?

• mkpa mmetụta uche?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Ọtụtụ nnụnụ na-agbalịsi ike iji na-enye ụmụ ha nri

[Foto dị na peeji nke 20]

Ndị nne na nna aghaghị ibu ụzọ wusie mmekọrịta nke ha na Chineke ike

[Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]

Ndị nne na nna pụrụ ịchọta ọtụtụ ohere iji kụziere ụmụ ha banyere Onye Okike

[Foto dị na peeji nke 22]

Ụmụaka na-enweta ume na obi ike site n’inweta nnwapụta nke ndị mụrụ ha