Nsogbu Ọrụ
Nsogbu Ọrụ
“Ịga ọrụ—ịrụ ọrụ! Ọ bụ ihe na-enye nnọọ obi ụtọ ịma na anyị ka nwere ihe ndị kasị mma ime.”—Katherine Mansfield, onye edemede (1888-1923).
Ì NWERE ụdị echiche ahụ magburu onwe ya e kwuru banyere ya n’elu? Olee otú i si ele ọrụ anya? Ọ̀ pụrụ ịbụ na ị na-eche na ọrụ bụ ihe na-agwụ ike e ji echere ngwụsị izu bụ́ mgbe mmadụ na-ezuru ike? Ka ọrụ gị ò riela gị ahụ́?
Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-eji akụkụ ka ukwuu nke ụbọchị arụ ọrụ. Ọrụ pụrụ ikpebi ebe anyị ga-ebi na ụdị ndụ anyị ga-ebi. Malite n’oge okorobịa ha ruo mgbe ha lara ezumike nká, ọtụtụ na-achọpụta na ọrụ bụ ihe kasị achịkwa ndụ ha. Ụfọdụ n’ime anyị na-enweta ezi afọ ojuju n’ọrụ anyị. Ndị ọzọ na-eji ego ma ọ bụ ùgwù ha na-enweta atụ ọrụ ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, ebe ndị ọzọ na-ewere ọrụ dị ka nanị ihe e ji echere oge ma ọ bụ ọbụna dị ka ihe na-egbu oge.
E nwere ndị na-arụ ọrụ iji nweta ihe e ji ebi ndụ, e nwekwara ndị na-adịghị ihe ọzọ ha ji ndụ ha eme ma ọ́ bụghị ịrụ ọrụ; ndị ọzọ na-anwụ n’ọrụ ha ma ọ bụ n’ihi ọrụ ha. Dị ka ihe atụ, otu akụkọ Mba Ndị Dị n’Otu wepụtara na nso nso a na-ekwu na ọrụ na-akpata ihe mgbu na ọnwụ “karịa ka agha na ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ịṅụ oké mmanya na-ejikọ aka akpata.” N’ikwu banyere nke a, akwụkwọ akụkọ London bụ́ The Guardian kwuru, sị: “Ihe karịrị nde mmadụ abụọ na-anwụ kwa afọ n’ihi ihe mberede ma ọ bụ ọrịa ndị ọrụ na-akpata . . . Ịnọ ebe e nwere uzuzu, kemikal, ụ̀zụ̀ na ụzarị ọkụ na-akpata ọrịa cancer, ọrịa obi na ọrịa strok.” Iji ụmụaka akpa ego na ọrụ mmanye bụ nnọọ ihe ọjọọ abụọ ọzọ a na-ahụ n’ebe ọrụ taa.
E nwekwara ihe ọkà n’akparamàgwà mmadụ bụ́ Steven Berglas kpọrọ “oké ike ọgwụgwụ.” O ji ya kọwaa onye dị uchu n’ọrụ nke rurula n’ọkwá kasị elu n’ụlọ ọrụ ya ma “na-atụ oké egwu, na-enwe nchekasị, daa mbà n’obi n’ihi na o kweere na ya tọrọ atọ n’ọrụ nke ya na-apụghị ịhapụ na nke na-apụghịkwanụ inye ya afọ ojuju.”
Ịrụsi Ọrụ Ike na Ịrụgbu Onwe Onye n’Ọrụ
N’ụwa ebe ọtụtụ ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ ruo ọtụtụ awa, ọ dị mkpa ịmata ọdịiche dị n’etiti ndị na-arụsi ọrụ ike na ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ. Ọtụtụ ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ na-ewere ụlọ ọrụ dị ka ebe nchebe pụọ n’ụwa nke jupụtara n’ihe ize ndụ na nke a na-ejighị n’aka; ndị na-arụsi ọrụ ike na-ewere ịrụ ọrụ dị ka ihe dị mkpa na mgbe ụfọdụ dị ka ọrụ dịịrị ha. Ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ
na-ekwe ka ọrụ butere ihe ndị ọzọ nile a na-eme ná ndụ ụzọ; ndị na-arụsi ọrụ ike na-ama mgbe ha kwesịrị ịhapụ ọrụ ma malite iche banyere ihe ndị ọzọ, dị ka ihe atụ, ha na-echeta ịnọ ya mgbe ha na-eme ememe ncheta agbamakwụkwọ ha. Ọ na-atọ ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ ụtọ ịrụbiga ọrụ ókè, ọ na-akpalikwa ha akpali; ọ naghị adị ndị na-arụsi ọrụ ike otú ahụ.Ọha mmadụ nke oge a adịghị ekwe ka a hụ ọdịiche dị n’etiti ha abụọ n’ihi na ha na-eme ka ịrụbiga ọrụ ókè yie ihe na-adọrọ mmasị. Modem kọmputa, ekwe ntị na ígwè ozi pager pụrụ ime ka a ghara ịhụ ọdịiche dị n’etiti ebe ọrụ na ebe obibi. Ọ bụrụ na ebe ọ bụla pụrụ ịbụ ebe ọrụ, oge ọ bụla abụrụkwa oge ọrụ, ụfọdụ ga na-arụgbu onwe ha n’ọrụ.
Olee ihe ụfọdụ ndị na-eme maka àgwà dị otú ahụ na-adịghị mma? Ndị ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze ahụla na ndị na-arụbiga ọrụ ókè na ndị nchegbu banyere ọrụ rikpuru na-ewebatazi ihe ime mmụọ n’ebe ọrụ ha ma na-ejikọta okpukpe na ọrụ ha. Akwụkwọ bụ́ San Francisco Examiner kọrọ na “ọha na eze amarala banyere njikọta a na-ejikọta ihe ime mmụọ na ọrụ.”
Otu onye nta akụkọ kwuru banyere Silicon Valley, bụ́ ebe bụ́ isi a na-emepụta kọmputa na ngwá electronic ndị ọzọ na United States, sị: “Ka ndị isi ọrụ na-achọpụta na ebe ndọba ụgbọala ndị e nwere n’ebe ọrụ na-atọgbọrọ chakoo n’ihi ụkọ ndị ọrụ, a na-achọ ebe a ga-adọba ụgbọala achọ n’ebe ndị a na-amụ Bible n’oge mgbede.” Ihe ọ sọrọ nke ahụ ya pụta, ọtụtụ mmadụ n’ụwa nile achọpụtala na Bible nwere mmetụta dị mma n’otú ha si ele ọrụ anya, na-eme ka ha na-elekwu ndụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.
Olee otú Bible pụrụ isi nyere anyị aka ile ọrụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị? È nwere ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị pụrụ inyere anyị aka ịnagide ihe ịma aka ndị a na-enweta n’ebe ọrụ nke oge a n’ụzọ gara nke ọma? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.