Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Philo nke Aleksandria—Ịgwakọta Akwụkwọ Nsọ na Akọmakọ

Philo nke Aleksandria—Ịgwakọta Akwụkwọ Nsọ na Akọmakọ

Philo nke Aleksandria—Ịgwakọta Akwụkwọ Nsọ na Akọmakọ

N’AFỌ 332 T.O.A., Alexander Onye Ukwu banyere Ijipt. Tupu ya agawa n’ebe ọwụwa anyanwụ ná mmeri ọ nọ na-emeri ụwa, o wuru otu obodo ọ kpọrọ Aleksandria. Ọ ghọrọ ebe ọdịnala ndị Gris hiwere isi. Ihe dị ka n’afọ 20 T.O.A., a mụrụ onye mmeri ọzọ n’ebe ahụ, onye ngwá agha ya na-abụghị mma agha na ube kama echiche nkà ihe ọmụma. A maara ya dị ka Philo nke Aleksandria, ma ọ bụ Philo Judaeus n’ihi na ọ bụ onye Juu.

Mgbasasị nke ndị Juu gbasasịrị mgbe e bibisịrị Jeruselem n’afọ 607 T.O.A., mere ka ọtụtụ ndị Juu gaa biri n’Ijipt. Ọtụtụ puku n’ime ha biri n’Aleksandria. Otú ọ dị, ndị Juu na ndị Gris ha na ha bi ebe ahụ nwere nsogbu. Ndị Juu jụrụ ife chi ndị Gris ebe ndị Gris kwara Akwụkwọ Nsọ Hibru emo. N’ịbụ onye Juu nwetara agụmakwụkwọ ndị Gris, Philo maara esemokwu ahụ nke ọma. O kweere na ọ bụ okpukpe ndị Juu bụ ezi okpukpe. Ma n’adịghị ka ọtụtụ ndị ọzọ, Philo chọrọ ụzọ na-agaghị akpata esemokwu isi dọta ndị Jentaịl ife Chineke. Ọ chọrọ ime ka okpukpe ndị Juu masị ha.

Inye Ihe Odide Ochie Nkọwa Ọhụrụ

Dị ka ọtụtụ ndị Juu bi n’Aleksandria, asụsụ bụ́ isi Philo na-asụ bụ Grik. N’ihi ya, ọ bụ nsụgharị Septuagint Grik nke Akwụkwọ Nsọ Hibru ka ọ mụrụ. Ka ọ na-enyocha ihe odide Septuagint, ọ bịara kwenyesie ike na o nwere echiche nkà ihe ọmụma ụfọdụ nakwa na Mozis bụ “ọkà ihe ọmụma ụbụrụ na-aghọ nkọ.”

Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, ndị ọkachamara ndị Gris lere akụkọ banyere ndị chi na chi nwanyị dị iche iche—ndị dike na ndị mmụọ ọjọọ a kọrọ banyere ha n’akụkọ ifo Gris oge ochie ha—anya dị ka ihe siri ike nkweta. Ha malitere ịkọwagharị akụkọ ochie ndị ahụ. Ọkà mmụta akụkọ ihe mere eme nke Gris oge ochie bụ́ James Drummond kwuru banyere usoro ha na-eji eme ihe, sị: “Ọkà ihe ọmụma ga-ebu ụzọ chọpụta ihe ndị na-apụtaghị ìhè akụkọ ifo pụtara, kwubiekwa, site n’okwu ndị ezi uche na-adịghị na ha bụ́ ndị jupụtara n’ime ha, na ndị dere ha chọrọ iji nkọwa ndị doro anya e nyere na ha kpughee eziokwu miri emi nke na-emeghe mmadụ anya.” A na-akpọ usoro a ịkọwa ihe akụkọ pụtara n’ụzọ ihe atụ, Philo nwakwara iji ya kọwaa Akwụkwọ Nsọ.

Dị ka ihe atụ, tụlee Jenesis 3:22 ná nsụgharị Bagster nke Septuagint, bụ́ nke na-asị: “Onyenwe Anyị Chineke meere Adam na nwunye ya uwe akpụkpọ, yiwekwa ha ya.” Ndị Gris chere na ọ ga-abụ Chineke Kasị Elu iweda onwe ya ala ịkwa uwe. N’ihi ya, Philo hụrụ okwu ndị ahụ dị ka ihe atụ ma kwuo, sị: “Uwe akpụkpọ ahụ nọchiri anya anụ ahụ́ nkịtị, ya bụ, ahụ́ anyị; n’ihi na mgbe Chineke buru ụzọ kee ọgụgụ isi ahụ, ọ kpọrọ ya Adam; mgbe nke ahụ gasịrị, o kere ihe na-eme ka ọ na-emegharị ahụ́, bụ́ nke ọ kpọrọ Ndụ. N’ikpeazụ, o kekwara anụ ahụ́ bụ́ nke dị mmadụ ahụ mkpa ma nye ya aha ihe atụ bụ́ uwe akpụkpọ.” Philo si otú ahụ chọọ ime ka Chineke imere Adam na Iv uwe bụrụ ihe a ga-atụle n’ụzọ nkà ihe ọmụma.

Tụleekwa Jenesis 2:10-14, bụ́ nke kwuru banyere mmiri ndị dị n’ogige Iden ma kpọọ aha osimiri anọ ndị na-esi n’ogige ahụ asọpụta. Philo nwara ịchọpụta ihe ọzọ okwu ndị ahụ pụtara n’abụghị nkọwa nke otú ebe ahụ dị. Mgbe o kwusịrị banyere ala ahụ n’onwe ya, o kwuru, sị: “Ma eleghị anya, akụkụ Akwụkwọ Nsọ a nwekwara ihe ọ pụtara n’ụzọ ihe atụ; n’ihi na osimiri anọ ahụ bụ ihe atụ nke àgwà ọma anọ.” Ọ kọrọ akọmakọ na osimiri Paịshọn nọchiri anya akọ, osimiri Gaịhọn nọchiri anya iji ihe akpọrọ ihe, Taịgris nọchiri anya obi ike, Yufretis anọchiekwa anya ikpe ziri ezi. Nkọwa ihe atụ si otú ahụ nọchie anya nkọwa nke otú ebe dị.

Philo ji ihe atụ kọwaa akụkọ banyere okike, ihe ndekọ nke ogbugbu Ken gburu Ebel, Iju Mmiri nke ụbọchị Noa, nghagbu nke asụsụ na Bebel, na ụkpụrụ ndị dị n’Iwu Mozis. Dị ka ihe atụ dị na paragraf bu nke a ụzọ gosiri, ọ na-ekwenyekarị n’ihe nkịtị amaokwu Bible pụtara, mgbe ahụzi, kwuo ihe ọ ghọtara ọ pụtara n’ụzọ ihe atụ site n’ikwu ihe dị ka: “Ma eleghị anya, anyị kwesịrị ile okwu ndị a anya dị ka ihe atụ.” N’ihe odide Philo, ọ na-emesi ihe atụ ike ma, n’ụzọ dị mwute, ọ dịghị akọwa ihe doro anya Akwụkwọ Nsọ pụtara.

Ònye Bụ Chineke?

Philo ji ihe atụ bụ́ ịgba rụọ ụka iji gosi na Chineke dị adị. Mgbe ọ kọwasịrị ala, mmiri, mbara dị iche iche, na kpakpando, o kwubiri, sị: “Ụwa bụ ọrụ nkà kasịnụ a rụtụrụla, ka à ga-asị na onye rụrụ ya bụ onye kasị nwee ahụmahụ na ihe ọmụma. Nke a bụ ihe mere anyị ji kwere na e nwere Chineke.” Arụmụka a bụ ịgba.—Ndị Rom 1:20.

Ma mgbe Philo kọwara ọdịdị nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, o si nnọọ n’eziokwu kpafuo. Philo kwuru na Chineke “enweghị àgwà ndị pụrụ iche,” nakwa na ‘a pụghị ịghọta Chineke aghọta.’ Philo sịrị na ọ baghị uru ịgbalịwa ịmata Chineke, n’ihi na “ịnwa imekwu otú ahụ, iji chọpụta ọdịdị ma ọ bụ àgwà ndị pụrụ iche nke Chineke, bụ nnọọ ihe nzuzu.” Echiche a esighị na Bible, kama o sitere n’aka ọkà ihe ọmụma na-ekpere arụsị bụ́ Plato.

Philo kwuru na ọ bụ ihe na-agatụghị ekwe omume ịmata onye Chineke bụ nke na ịkpọ ya otu aha bụ ihe na-agaghị ekwe omume. Philo kwuru, sị: “N’ihi ya, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na ọ dịghị aha ga-ekwesị ekwesị ịkpọ onye nanị ya bụ n’ezie Chineke dị ndụ.” Lee ka nke ahụ si bụrụ ụgha!

Bible gosiri n’ụzọ doro anya na Chineke nwere aha. Abụ Ọma 83:18 na-ekwu, sị: “Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” Aịsaịa 42:8 kwuru na Chineke kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m.” N’ihi gịnị ka Philo, bụ́ onye Juu maara amaokwu Bible ndị a, ji kụzie na Chineke enweghị aha? Ọ bụ n’ihi na ọ nọghị na-akọwa Chineke nke Bible nke bụ́ onye, kama ọ nọ na-akọwa chi na-enweghị aha nke a na-apụghị ijekwuru ejekwuru nke nkà ihe ọmụma ndị Gris.

Gịnị Bụ Mkpụrụ Obi?

Philo kụziri na mkpụrụ obi dị iche n’anụ ahụ́. O kwuru na mmadụ bụ “anụ ahụ́ na mkpụrụ obi.” Mkpụrụ obi ò nwere ike ịnwụ anwụ? Leenụ ihe Philo kọwara: “Mgbe anyị dị ndụ, ahụ́ anyị dị ndụ ọ bụ ezie na mkpụrụ obi anyị nwụrụ anwụ ma bụrụ nke e liri n’anụ ahụ́ anyị, ka à ga-asị na e liri ya n’ili. Ma, ọ bụrụ na [ahụ́] anwụọ, mgbe ahụzi, mkpụrụ obi ga-ebi ụdị ndụ kwesịịrị ya, a ga-atọhapụ ya n’ahụ́ mmehie na nke nwụrụ anwụ bụ́ ebe e keburu ya agbụ.” Nye Philo, ọnwụ nke mkpụrụ obi bụ ihe atụ. Ọ naghị anwụ anwụ n’ezie. Ọ pụghị ịnwụ anwụ.

Ma, olee ihe Bible na-akụzi banyere mkpụrụ obi? Jenesis 2:7 na-ekwu, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, O wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” Dị ka Bible si kwuo, ụmụ mmadụ enweghị mkpụrụ obi; kama nke ahụ, ha bụ mkpụrụ obi.

Bible na-akụzikwa na mkpụrụ obi pụrụ ịnwụ anwụ. Ezikiel 18:4 na-ekwu, sị: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” Site n’ihe akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a kwuru, n’ụzọ ziri ezi, anyị pụrụ ikwubi n’otu ihe: Mmadụ bụ mkpụrụ obi. N’ihi ya, mgbe mmadụ nwụrụ, ọ bụ mkpụrụ obi nwụrụ.—Jenesis 19:19. *

Mgbe Philo nwụsịrị, ndị Juu ejighị ozizi ya kpọrọ ihe. Otú ọ dị, Krisendọm nabatara ozizi ya. Eusebius na ndị ndú ndị ọzọ nke chọọchị kweere na a tọghatara Philo ịghọ Onye Kraịst. Jerome denyere aha ya ná Ndị Nna Chọọchị. Ọ bụ Ndị Kraịst si n’ezi ofufe dapụ chekwara ihe odide Philo, ọ bụghị ndị Juu.

Ihe odide Philo dugara ná mgbanwe n’okpukpe. Ozizi ya dugara ndị bụ́ Ndị Kraịst n’ọnụ n’ịnabata ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi bụ́ nke na-ekwekọghị n’Akwụkwọ Nsọ. Ozizi Philo banyere Logos (ma ọ bụ, Okwu) ahụ tụnyere ụtụ ná mwepụta nke ozizi Atọ n’Ime Otu, bụ́ ozizi na-ekwekọghị na Bible nke Iso Ụzọ Kraịst si n’ezi ofufe dapụ na-ezi.

Ekwela Ka E Duhie Gị

Ka ọ na-amụ Akwụkwọ Nsọ Hibru, Philo hụrụ na “ọ dịghị nkọwa ihe atụ nke ihe ndị e dere ebe ahụ pụrụ ikpuchi nke ọ hapụrụ.” Otú ọ dị, na Deuterọnọmi 4:2, Mozis kwuru banyere Iwu Chineke, sị: “Unu atụkwasịla ihe n’okwu ahụ nke mụ onwe m na-enye unu n’iwu, unu agụbikwala ihe n’ime ya, idebe ihe nile Jehova, bụ́ Chineke unu, nyere n’iwu, bụ́ nke mụ onwe m na-enye unu n’iwu.” N’agbanyeghị ezi ebumnobi nile o yiri ka ò nwere, Philo jiri ọtụtụ akọmakọ ndị yiri oké anwụrụ ọkụ kpuchie ntụziaka doro anya dị n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ.

Pita onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụghị site n’ịgbaso akụkọ ụgha e ji akọ chepụta ka anyị ji mee ka unu mata banyere ike na ọnụnọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.” (2 Pita 1:16) N’adịghị ka ihe odide Philo, ntụziaka Pita nyere ọgbakọ Ndị Kraịst mbụ dabeere n’eziokwu nakwa ná nduzi nke mmụọ Chineke, “mmụọ nke eziokwu ahụ,” bụ́ nke duuru ha gaa n’eziokwu nile.—Jọn 16:13.

Ọ bụrụ na i nwere mmasị ife Chineke nke Bible, nduzi ziri ezi dị gị mkpa, ọ bụghị nkọwa ndị e ji echiche mmadụ nye. Ezi ihe ọmụma banyere Jehova na uche ya dị gị mkpa, ọ dịkwa gị mkpa ịdị umeala n’obi iji bụrụ nwa akwụkwọ nwere uche ghere oghe. Ọ bụrụ na i jiri àgwà ọma ahụ mụọ Bible, ị ga-amata “ihe odide ndị ahụ dị nsọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka ị mara ihe maka nzọpụta site n’okwukwe n’ihe metụtara Kraịst Jizọs.” Ị ga-ahụ na Okwu Chineke pụrụ ime ka i “ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu maka ezi ọrụ ọ bụla.”—2 Timoti 3:15-17.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 Akwụkwọ bụ́ The Jewish Encyclopedia nke 1910 na-ekwu banyere mkpụrụ obi, sị: “Nkwenkwe bụ́ na mkpụrụ obi na-adịgide ndụ mgbe ahụ́ nwụsịrị bụ akọmakọ nke ndị nkà mmụta ma ọ bụ ndị ọkà mmụta okpukpe, ọ dabereghị n’okwukwe bụ́ isi, n’ihi ya kwa, ọ dịghị ebe a kụziri ya n’ụzọ doro anya n’ime Akwụkwọ Nsọ.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 10]

OBODO PHILO

Philo biri ma rụọ ọrụ n’Aleksandria nke Ijipt. Ruo ọtụtụ narị afọ, obodo ahụ bụ ebe bụ́ isi a na-ede akwụkwọ n’ụwa na ebe ndị ọkà mmụta na-akparịta ụka.

Ụmụ akwụkwọ mụtara ihe n’aka ndị ọkà mmụta a ma ama bụ́ ndị kụziri ihe n’ụlọ akwụkwọ ndị e nwere n’obodo ahụ. A bịara mara ọ́bá akwụkwọ Aleksandria n’ụwa nile. Ọ bịara nwee ọtụtụ narị puku akwụkwọ ka ndị na-elekọta ya gbalịrị inweta akwụkwọ ọ bụla e dere.

Ka e mesịrị, nkwanye ùgwù a na-enye Aleksandria na ọtụtụ akwụkwọ nkà ihe ọmụma ya belatawara obere obere. Ndị eze ukwu chịrị na Rom lekwasịrị anya n’ịkwalite obodo nke ha, Europe ghọziri ebe ọdịnala hiwere isi. Ọdịda Aleksandria kụụrụ ọnụ na narị afọ nke asaa O.A. mgbe ndị agha wakporo obodo ahụ. Ruo taa, ọdịda nke ọ́bá akwụkwọ ahụ a ma ama ka na-ewute ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme, ụfọdụ n’ime ha na-ekwukwa na o jiri otu puku afọ dọlaa mmepeanya azụ.

[Ebe E Si Nweta Foto]

L. Chapons/Illustrirte Familien-Bibel nach der deutschen Uebersetzung Dr. Martin Luthers

[Igbe dị na peeji nke 12]

NKỌWA IHE ATỤ TAA

Okwu ihe atụ na-abụkarị “iji ihe atụ ndị e chepụtara echepụta ekwu eziokwu ma ọ bụ ụkpụrụ ndị metụtara ịdị adị nke mmadụ.” A na-ekwu na ihe odide ndị e ji ihe atụ mee ihe na ha na-ekwu ihe ndị ka mkpa zoro ezo. Dị ka Philo nke Aleksandria, ụfọdụ ndị nkụzi okpukpe nke oge a na-eji ihe atụ akọwa Bible.

Tụlee Jenesis isi 1-11, bụ́ ebe e dekọrọ akụkọ ihe mere eme mmadụ site n’okike ruo ná nchụsasị nke ndị mmadụ n’ụlọ elu Bebel. The New American Bible, bụ́ nsụgharị nke ndị Katọlik, na-ekwu banyere akụkụ Bible ahụ, sị: “Iji mee ka ndị Izrel bụ́ ndị ga-echebe eziokwu ndị dị n’isiakwụkwọ ndị a ghọta ha, ọ dị mkpa ka e kwupụta ha site n’ihe ndị mmadụ maara nke ọma n’oge ahụ. N’ihi ya, a ghaghị ime ka eziokwu ndị ihe odide ahụ kpuchiri pụta nnọọ ìhè.” Ihe ọ na-ekwu bụ na e kwesịghị ile Jenesis isi 1-11 anya n’ụzọ nkịtị. Kama nke ahụ, dị nnọọ ka uwe na-ekpuchi ahụ́, okwu ndị ahụ nwere ihe ndị ka mkpa ha kpuchiri.

Otú ọ dị, Jizọs kụziri na ihe ndị ahụ e kwuru n’isiakwụkwọ ndị mbụ nke Jenesis mere otú ahụ n’ụzọ nkịtị. (Matiu 19:4-6; 24:37-39) Ndịozi bụ́ Pọl na Pita kụzikwara otu ihe ahụ. (Ọrụ 17:24-26; 2 Pita 2:5; 3:6, 7) Ndị mmụta Bible nwere obi eziokwu na-ajụ nkọwa ndị na-ekwekọghị n’akụkụ nile nke Okwu Chineke.

[Foto dị na peeji nke 9]

Nnukwu ụlọ nduzi ndị ọrụ ụgbọ mmiri nke Aleksandria

[Ebe E Si Nweta Foto]

Archives Charmet/Bridgeman Art Library