Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọ Udo nke Obi

Ịchọ Udo nke Obi

Ịchọ Udo nke Obi

ALBERT bụ nwoke nwere obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ya, nweekwa ụmụ abụọ na-enye ya ọṅụ. Ma ọ dị ya ka ò nwere ihe na-efunahụ ya ná ndụ. N’otu oge mgbe ọ na-agbalị ịchọta ọrụ, ọ banyere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma dụnyere òtù ọchịchị ọha na eze úkwù. Ọ ghọdịrị onye na-akwadosi òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Kọmunist e nwere n’ógbè ya ike.

Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ike ọchịchị Kọmunist gwụrụ Albert. O gbubiri ihe jikọtara ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma lekwasị anya n’ilekọta ezinụlọ ya. Ịhụ na ha na-enwe obi ụtọ ghọrọ ihe bụ́ isi ná ndụ ya. Ka o sina dị, ọ nọgidere na-adị Albert ka ọ̀ dị ihe kọrọ ná ndụ ya; ezi udo nke obi nọgidere na-akwa ya.

Ọ bụghị nanị Albert nwere ahụmahụ dị otú a. Ọtụtụ nde mmadụ anwalewo echiche, nkà ihe ọmụma na okpukpe dịgasị iche iji chọpụta ihe bụ́ nzube nke ndụ. N’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, òtù nnupụisi e nwere n’afọ ndị 1960 bụ òtù jụrụ ụkpụrụ omume ọha na eze. Ndị na-eto eto karịsịa chọrọ inweta obi ụtọ na nzube nke ndụ site n’ịṅụ ọgwụ ndị na-akpaghasị uche na nkà ihe ọmụma nke ndị a sị na ha bụ ndị isi na ndị nchụàjà nke òtù ahụ. Ka o sina dị, òtù nnupụisi ahụ ewetaghịrị ndị mmadụ ezi obi ụtọ. Kama nke ahụ, o nyere aka mee ka e nwee ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ́ na ndị na-eto eto na-akwa iko aghara aghara, na-eme ka ọha mmadụ na-adabakwu n’omume rụrụ arụ.

Ruo ọtụtụ narị afọ, ọtụtụ mmadụ achọwo inweta obi ụtọ site n’akụ̀ na ụba, ike, ma ọ bụ agụmakwụkwọ. Ihe ndị a na-emecha weta nkụda mmụọ. Jizọs kwuru, sị: “Ọbụna mgbe mmadụ nwere ihe n’ụba, ndụ ya adịghị esi n’ihe ndị o nwere apụta.” (Luk 12:15) Kama nke ahụ, ikpebisi ike ịchụso akụ̀ na ụba na-ewetakarị enweghị obi ụtọ. Bible na-ekwu, sị: ‘Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ amaghị ihe nke na-emerụkwa ahụ́, bụ́ ndị na-akwakpu mmadụ ná mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ nile, sitekwa n’ịchụso ịhụnanya nke a, ụfọdụ ejiriwokwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha aghara aghara.’—1 Timoti 6:9, 10.

Oleezi otú mmadụ pụrụ isi nweta udo nke obi na nzube nke ndụ? Ọ̀ bụ site n’ịnwale ihe ọ bụla ọ hụrụ, dị ka ịnọ n’ọchịchịrị na-agba akụ́ n’enweghị ebe e lekwasịrị anya na-agba ya? Ọ bụ ihe obi ụtọ ịmara na ọ bụghị otú ahụ. Dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ, a pụrụ inweta ha site n’igbo otu nnukwu mkpa, n’ezie, ọ bụkwa mkpa nke nanị ụmụ mmadụ nwere.

[Foto dị na peeji nke 3]

Ịchụso akụ̀ na ụba, ike ma ọ bụ agụmakwụkwọ ọ̀ ga-enyere gị aka ịchọta udo nke obi?