Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Deuterọnọmi 14:21 na-agụ, sị: “Unu erila ihe nwụụrụ onwe ya.” Nke ahụ ọ̀ na-emegide Levitikọs 11:40, bụ́ nke na-agụ, sị: “Onye na-eri ụfọdụ n’ime ozu ya ga-asụ uwe ya, rụọkwa arụọ ruo anyasị”?

Amaokwu abụọ a adịghị emegide onwe ha. Amaokwu nke mbụ ahụ na-ekwughachi iwu a machibidoro iri anụ nwụrụ anwụ, eleghị anya nke anụ ọhịa gburu. (Ọpụpụ 22:31; Levitikọs 22:8) Nke abụọ na-akọwa ihe onye Izrel pụrụ imewo ma ọ bụrụ na o mebie iwu ahụ, ikekwe n’amaghị ama.

Eziokwu ahụ bụ́ na Iwu ahụ machibidoro ihe ụfọdụ iwu apụtaghị na a gaghị emebi mmachibido iwu ahụ mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, e nwere iwu ndị megidere izu ohi, igbu mmadụ, ịgba àmà ụgha na ihe ndị ọzọ. E nwekwara ntaramahụhụ maka imebi iwu ndị ahụ Chineke nyere. Ntaramahụhụ ndị ahụ mesiri iwu ndị ahụ ike ma gosi otú ha dịruru ná mkpa.

Onye mebiri iwu ahụ megidere iri anụ nwụrụ anwụ ga-arụ arụ n’anya Jehova, ọ ghaghịkwa ịgbaso ụkpụrụ kwesịrị ekwesị maka ịdị ọcha. Ọ bụrụ na o meghị onwe ya ka ọ dị ọcha n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ ghaghị ‘ibu ajọ omume ya.’—Levitikọs 17:15, 16.