Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Na-ewepụta Onwe Ha

Ha Na-ewepụta Onwe Ha

Ha Na-ewepụta Onwe Ha

“NDỊ gị bụ onyinye afọ ofufo.” (Abụ Ọma 110:3) Okwu a nwere ihe pụrụ iche ọ pụtara nye ụmụ akwụkwọ 46 nke klas nke otu narị na iri na asatọ nke Watchtower Bible School of Gilead. Olee otú ha si kwadebe onwe ha iji gaa ụlọ akwụkwọ a, bụ́ nke na-azụ ndị ga-abụ ndị ozi ala ọzọ ije ozi maka mkpa ime mmụọ nke ndị bi ná mba ọzọ? Mike na Stacie, bụ́ ndị so na klas nke otu narị na iri na asatọ, kọwara, sị: “Mkpebi anyị mere ibi ndụ dị mfe nyeere anyị aka ibelata ihe ndị na-adọpụ uche na ilekwasị anya n’ihe ime mmụọ. Anyị kpebisiri ike ịghara ikwe ka ihe ịga nke ọma anyị na-enwe n’achụmnta ego mee ka anyị leghara ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ anyị anya.” Dị ka Mike na Stacie, ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ so na klas a wepụta onwe ha n’afọ ofufo, ha na-ejekwa ozi ugbu a dị ka ndị nkwusa Alaeze na kọntinent anọ.

Na Saturday, March 12, 2005, puku mmadụ isii, narị asatọ na iri anọ na atọ ji nnọọ obi ụtọ gee ntị n’usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ. Theodore Jaracz, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, bụ onyeisi oche. Mgbe ọ nabatasịrị ndị ọbịa si ala 28 n’ụzọ na-ekpo ọkụ, o lekwasịrị anya n’uru nkụzi Bible bara. N’ihota ihe onye nkụzi bụ́ onye America, bụ́ William Lyon Phelps, kwuru, ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “A pụrụ n’ezie ịkpọ onye ọ bụla nwere ihe ọmụma zuru ezu nke Bible onye gụrụ akwụkwọ.” N’agbanyeghị otú agụmakwụkwọ ụwa pụrụ ịbaru uru, ịmụ Bible ka ya baa uru. Ọ na-enyere ndị mmadụ aka inweta ihe ọmụma banyere Chineke, bụ́ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Nwanna Jaracz jara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ mma maka njikere ha dị ikerekwu òkè n’ọrụ nkụzi Bible zuru ụwa ọnụ, bụ́ nke a na-arụ n’ihe karịrị iri puku ọgbakọ itoolu na puku asatọ nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile.

Agbamume Bịara n’Oge Ya Maka Ndị ahụ Na-agụsị Akwụkwọ

Mgbe onyeisi oche kwusịrị okwu mmehie, William Samuelson kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Otú Ị Pụrụ Isi Dị Ka Osisi Oliv Nwere Akwụkwọ Ndụ n’Ụlọ Chineke,” nke dabeere n’Abụ Ọma 52:8. O kwuru na e ji osisi oliv mee ihe n’ụzọ ihe atụ n’ime Bible dị ka ihe nnọchianya nke ịmị mkpụrụ, ịma mma na ịdị ùgwù. (Jeremaịa 11:16) N’iji ụmụ akwụkwọ ahụ atụnyere osisi oliv, ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “Jehova ga-ewere unu dị ka ndị mara mma na ndị dị ùgwù ka unu ji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ ọrụ nkwusa Alaeze n’ebe ndị unu ga-eje ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ.” Dị nnọọ ka ọ dị osisi oliv mkpa inwe mkpọrọgwụ ndị bamiri n’ime ala iji lanahụ oké ọkọchị, ọ dịkwa ụmụ akwụkwọ ahụ mkpa ime ka mkpọrọgwụ ime mmụọ ha bamie abamie iji nwee ike ịnagide enweghị mmasị, mmegide, ma ọ bụ ule ndị ọzọ ha pụrụ izute ka ha na-eje ozi n’ala ọzọ.—Matiu 13:21; Ndị Kọlọsi 2:6, 7.

John E. Barr, bụ́ otu n’ime mmadụ atọ so n’Òtù Na-achị Isi bụ́ ndị keere òkè n’usoro ihe omume ahụ, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Unu Bụ Nnu nke Ụwa.” (Matiu 5:13) O kwuru na dị nnọọ ka nnu nkịtị na-echekwa nri ka ọ ghara imebi, otú ahụ ka ndị ozi ala ọzọ ahụ bụ́ ndị na-ekwusa banyere Alaeze Chineke ga-esi chebe ndụ nke ndị gere ha ntị, na-echebe ha pụọ ná nretọ nke omume na nke ime mmụọ. N’ikwuzi okwu dị ka nna nke na-agwa ụmụ ya okwu, Nwanna Barr gbara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ka ha na ndị ọzọ “na-adị n’udo.” (Mak 9:50) Ọkà okwu ahụ dụrụ ha ọdụ, sị: “Zụlitenụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ, hụkwanụ na àgwà na okwu ọnụ unu na-adị ụtọ ma na-egosipụta na unu na-echebara ndị ọzọ echiche mgbe nile.”

Otu n’ime ndị nkụzi Gilead, bụ́ Wallace Liverance, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Nọgide n’Ụgbọ Mmiri ná Mmiri Miri Emi.” Dị nnọọ ka ụgbọ mmiri nke na-aga na mmiri miri emi pụrụ ịdị na-aga ebe o kwesịrị ịga, otú ahụ ka ịghọta “ihe ndị miri emi nke Chineke”—eziokwu ndị metụtara nzube Chineke na otú a ga-esi mezuo ya—pụrụ isi nyere mmadụ aka inwe ọganihu ime mmụọ. (1 Ndị Kọrint 2:10) Nanị ịnọ na mmiri ime mmụọ na-emighị emi site n’inwe afọ ojuju n’ihe “ndị mbụ nke okwu dị nsọ nke Chineke” na-eme ka anyị ghara inwe ọganihu, ọ pụkwara ọbụna ime ka ‘ụgbọ anyị kpuo n’ihe banyere okwukwe anyị.’ (Ndị Hibru 5:12, 13; 1 Timoti 1:19) Nwanna Liverance kwubiri, sị: “Ka ‘ịdị omimi nke akụ̀ na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke’ kwagide unu n’ebe ndị unu ga-eje ozi ala ọzọ.”—Ndị Rom 11:33.

Onye nkụzi ọzọ nke Gilead bụ́ Mark Noumair kwuru okwu n’isiokwu bụ́, “Ị̀ Ga-ebi Ndụ Kwekọrọ n’Ihe Nketa Gị?” Ruo ihe karịrị afọ 60, Watchtower Bible School of Gilead enweela aha ọma ma bụrụ nke a pụrụ ịtụkwasị obi n’ihi ‘ọtụtụ ezi àmà’ nke ndị gụrụ akwụkwọ na ya gbara. (Jenesis 31:48) E nyefeela ụmụ klas nke otu narị na iri na asatọ ihe nketa Gilead a. Nwanna Noumair gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume iṅomi ndị Tekoa nke oge Nehemaịa ma jiri obi umeala na-akwado ọgbakọ dị n’ebe ha na-aga na ndị ozi ala ọzọ ibe ha. A dụrụ ha ọdụ izere àgwà mpako nke “ndị dị ebube,” bụ́ ndị Nehemaịa kwuru banyere ha, ma dịrị njikere ịrụ ọrụ n’achọghị ka a nụ aha ha.—Nehemaịa 3:5.

Ahụmahụ na Ajụjụ Ọnụ Ndị Nwere Ihe Mmụta

Isiokwu ọzọ sochirinụ n’usoro ihe omume ahụ bụ “Okwu Chineke Nọgidere Na-eto Eto.” (Ọrụ 6:7) Ná nduzi nke onye nkụzi Gilead bụ́ Lawrence Bowen, ụmụ akwụkwọ ahụ mere ihe ngosi nke ahụmahụ ndị ha nwere n’ozi ubi mgbe ha ka nọ n’ụlọ akwụkwọ. Ahụmahụ ndị ahụ na-egosi na ụmụ akwụkwọ ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi kpọsaa Okwu Chineke, nakwa na Jehova gọziri mgbalị ha n’ụba.

Richard Ashe gbara ndị òtù ezinụlọ Betel, bụ́ ndị ọrụ ha metụtara ụlọ akwụkwọ ahụ, ajụjụ ọnụ. Ihe ndị ha kwuru mere ka a ghọtakwuo otú ezinụlọ Betel si enyere ụmụ akwụkwọ Gilead aka irite uru kasị ukwuu n’agụmakwụkwọ ha. Geoffrey Jackson na ụfọdụ ndị gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilead n’oge gara aga kwurịtaziri okwu. Ha mere ka ọtụtụ ohere ndị ọrụ ozi ala ọzọ na-enye iji wetara Jehova otuto na nsọpụrụ pụta ìhè. Otu n’ime ha kwuru, sị: “Ndị mmadụ na-ahụ ihe ọ bụla ị na-eme dị ka onye ozi ala ọzọ. Ha na-ege gị ntị, na-ekiri gị, na-echetakwa.” N’ihi ya, a gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ịdị njikere ịdị na-esetịpụ ezi ihe nlereanya mgbe nile. Obi abụọ adịghị ya na ezi ndụmọdụ a ga-aba nnọọ uru n’oge ndị na-abịa n’ihu.

Stephen Lett, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu mmechi nke isiokwu ya bụ “Gaanụ n’Ihu Dị Ka Ndị Na-enye ‘Mmiri Dị Ndụ.’” (Jọn 7:38) O kwuru na n’ime ọnwa ise gara aga, ụmụ akwụkwọ ahụ ritere uru dị ukwuu site n’ịṅụju mmiri sitere n’Okwu eziokwu nke Chineke afọ. Ma gịnị ka ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ ga-eji ihe ọmụma ọhụrụ ndị ha nwetara mee? Nwanna Lett gbara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume iji achọghị ọdịmma onwe ha nanị soro ndị ọzọ kerịta mmiri ime mmụọ a ka ndị ọzọ wee nwee “isi iyi nke mmiri nke na-asụpụta asụpụta inye ndụ ebighị ebi” n’ime onwe ha. (Jọn 4:14) Ọkà okwu ahụ gbakwụnyere, sị: “Echefula inye Jehova, bụ́ ‘isi iyi nke mmiri na-enye ndụ,’ nsọpụrụ na otuto ruuru ya. Nwee ndidi mgbe ị na-ezi ndị sirila na Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ nke nọ n’ụkọ mmiri, pụta ihe.” (Jeremaịa 2:13) Nwanna Lett mechiziri site n’ịgba ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume iji ịnụ ọkụ n’obi na-eṅomi mmụọ nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ ma nọgide na-asị: “‘Bịa!’ Ka onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ bịakwa; ka onye ọ bụla nke chọrọnụ nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”—Mkpughe 22:17.

Nwanna Jaracz mechiri usoro ihe omume ahụ site n’ịgụpụta ozi ekele ndị e nwetara site ná mba dị iche iche. Mgbe nke a gasịrị, onye so na klas ahụ na-agụsị akwụkwọ gụpụtara akwụkwọ ozi ekele.

Ị̀ pụrụ iwepụta onwe gị ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu? Ya bụrụ otú ahụ, chụsoo ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ dị ka ụmụ akwụkwọ a mere. Nweta ọṅụ na afọ ojuju mmadụ na-enweta mgbe o ji obi ụtọ wepụta onwe ya ijere Chineke ozi—dị ka onye ozi ala ọzọ ma ọ bụ dị ka onye na-eje ozi ná mba ya.

[Igbe dị na peeji nke 13]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 8

Ọnụ ọgụgụ mba e zigara ha: 19

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 46

Nkezi afọ ndụ ha: 33.0

Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 16.5

Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 12.9

[Foto dị na peeji nke 15]

Klas nke Otu Narị na Iri na Asatọ Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead

Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Brockmeyer, A.; Moloney, S.; Symonds, N.; Lopez, Y.; Howard, C. (2) Jastrzebski, T.; Brown, D.; Hernandez, H.; Malagón, I.; Jones, A.; Connell, L. (3) Howard, J.; Lareau, E.; Shams, B.; Hayes, S.; Brown, O. (4) Burrell, J.; Hammer, M.; Mayer, A.; Kim, K.; Stanley, R.; Rainey, R. (5) Jastrzebski, P.; Zilavetz, K.; Ferris, S.; Torres, B.; Torres, F. (6) Connell, J.; Hernandez, R.; Moloney, M.; Malagón, J.; Shams, R.; Hayes, J. (7) Ferris, A.; Hammer, J.; Stanley, G.; Kim, C.; Symonds, S.; Lopez, D.; Burrell, D. (8) Brockmeyer, D.; Mayer, J.; Rainey, S.; Zilavetz, S.; Jones, R.; Lareau, J.